Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 21


Isi 21

A ga-akpọkọta Israel mgbe Akwụkwọ nke Mọmọn pụtara—A ga-ehiwe ndị Jentaịlụ dịka ndị nwere onwe ha na Amerika—A ga-azọpụta ha ma ọbụrụ na ha e kwere ma rube-isi; ma ọbụghị otu ahụ, a ga-ebepụ ma bibie ha—Israel ga-ewu Jerusalem Ọhụrụ ahụ, ma agbụrụ nile ndị furu-efu ga-alaghachị. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma n’ezie asị m unu, ana m enye unu ihe iriba-ama, ka unu wee mata aoge ahụ mgbe ọ ga-afọdụ nwantịntị ka ihe ndị a mee—na aga m akpọkọta bata, site n’ogologo mkposasị ha, ndị m, O ụlọ nke Israel, ma ga-ehiwe kwa ọzọ n’etiti ha Zaịọn m;

2 Ma lee, nke a bụ ihe ahụ nke m ga-enye unu maka ihe iriba-ama—n’ihi na n’ezie asị m unu na mgbe ihe ndị a nke m na-ekwupụtara unu, na nke m ga-ekwụpụtara unu ma emesịa maka onwe m, na site n’ike nke Mụọ Nsọ nke a ga-enye unu site na Nna, a ga-eme ka ndị Jentaịlụ mata ya ka ha wee mata gbasara ndị a bụ ndị fọdụrụ nke ụlọ nke Jekọb, na gbasara ndị m nke a ndị ha ga-ekposasị;

3 N’ezie, n’ezie, asị m unu, mgbe a ga-eme ka ha mata aihe ndị a site na Nna, ma ga-esi na Nna pụta, site na ha bịaruo unu;

4 N’ihi na ọ bụ amamihe n’ime Nna na a ga-ehiwe ha n’ala nke a, ma e dozie ha dịka andị nwere onwe ha site n’ike nke Nna, ka ihe ndị a wee site n’aka ha pụta ruo mkpụrụ-afọ unu nke fọdụrụ, ka e wee mejupụta bọgbụgba-ndụ nke Nna nke ọ gbaworo ya na ndị ya, O ụlọ nke Israel;

5 Ya mere, mgbe ọrụ nile ndị a na ọrụ nile nke a ga-arụ n’etiti unu ma emesịa ga-esi n’aka andị Jentaịlụ pụta, ruo bmkpụrụ-afọ unu ndị ga-ala-azụ n’ekweghị ekwe n’ihi ajọọ-omume.

6 N’ihi na otu a ka ọ masịrị Nna na ọ ga-esị n’aka andị Jentaịlụ pụta, ka o wee gosịpụta ike ya nye ndị Jentaịlụ, n’ihi nke a ka ndị Jentaịlụ, ma ọbụrụ na ha ghara imesi obi ha ike, ka ha wee chegharịa ma bịakwute m ma e mee ha baptism n’aha m ma mata maka ihe ndị bụ ezi-okwu nke ozizi m, ka e wee bgụnye ha n’etiti ndị m, O ụlọ nke Israel;

7 Ma mgbe ihe ndị a ruru na amkpụrụ-afọ gị ga-amalite ịmata ihe ndị a—ọ ga-abụ ihe iriba-ama nye ha, ka ha wee mata na ọrụ nke Nna amalitewọrịị ruo na nmejupụta nke ọgbụgba-ndụ ahụ nke o meworo nye ndị bụ nke ụlọ nke Israel.

8 Ma mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa, ọ ga-eru na ndị-eze ga-emechi ọnụ ha; maka ihe nke a na-agwabeghị ha ka ha ga-ahụ; ma ihe ahụ nke ha na-anụbeghị ka ha ga-atụgharị uche na ya.

9 N’ihi na n’ụbọchị ahụ, n’ihi m ka Nna ga-arụ ọrụ, nke ga-abụ annukwu na ọrụ dị ịtụ n’anya n’etiti ha; ma a ga-enwe n’etiti ha ndị na-agaghị e kwere ya, ọbụnadị na otu nwoke ga-ekwupụtara ha ya.

10 Mana lee, ndụ nke nwa-oru m ga-adị n’aka m; ya mere ha agaghị emeru ya arụ, ọbụnadị na a aga-emebi ụdị ya n’ihi ha. Mana aga m agwọ ya, n’ihi na aga m egosị ha na bamamihe m karịrị aghụghọ nke ekwensu.

11 Ya mere ọ ga-eru na onye ọbụla na-agaghị ekwe n’okwu m nile, onye abụ m Jisus Kraịst, nke Nna ga-eme ka ao wepụtara ndị Jentaịlụ, ma ọ ga-enye ya ike ka o wee wepụtara ha ndị Jentaịlụ, (a ga-eme ya ọbụna dịka Moses kwuru) a bga-ebepụ ha site n’etiti ndị m ndị bụ nke ọgbụgba-ndụ ahụ.

12 Ma ndị m bụ ndị fọdụrụ nke Jekọb ga-anọ n’etiti ndị Jentaịlụ, e, n’etiti ha dịka aọdụm n’etiti ụmụ anụmanụ nke ime ọhịa, dịka nwa ọdụm n’etiti igwe-atụrụ ahụ, nke ọbụrụ na ọ banye bga-azọda ma ga-adọkasị irighiri-irighiri, ma ọdịghị onye ga-enwe ike anapụta.

13 A ga-ewelite aka ha elu megide ndị iro ha nile, ma ndị iro ha nile a ga-ebepụ ha.

14 E, ahụhụ na adịrị ndị Jentaịlụ ma ọbụghị na ha achegharịrị; n’ihi na ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ, ka Nna kwuru, na aga m ebepụ ịnyịnya unu site n’etiti unu, ma aga m ebibi ụgbọ-ala unu nile;

15 Ma aga m ebepụ obodo-ukwu nile nke ala unu, ma tụda ebe unu nile ewusịrị ike;

16 Ma aga m ebepụ ndị amụsụ nile site n’ala unu, ma unu agaghị enwe ndị ọkọwa-akara aka;

17 aArụsị a pịrị-apị unu nile ka m ga-ebepụ kwa, na ihe a pịrị-apị unu nile guzoro eguzo site n’etiti unu, ma unu agaghị efe kwa ọrụ-aka nile unu ọzọ;

18 Ma aga m efopụ osisi unu nile site n’etiti unu; otu ahụ ka m ga-esi bibie obodo-ukwu unu nile.

19 Ma ọ ga-eru na aokwu ụgha nile, na nghogbu nile, na ntaji-anya nile, na esem-okwu nile, nchụ-aja aghụghọ nile, na akwụnakwụna nile, a ga-akwụsị ha.

20 N’ihi na ọ ga-eru, ka Nna kwuru, na n’ụbọchị ahụ ndị ọbụla na-agaghị echegharị ma bịakwute Ọkpara m hụrụ n’anya, ha ka m ga-ebepụ site n’etiti ndị m, O ụlọ nke Israel;

21 Ma aga m abọkwasị ha ọbọ na iwe, ọbụna dịka n’arụ ndị na-ekweghị-ekwe, udị nke ha na-anụbeghị.

22 Mana ọbụrụ na ha ga-echegharị ma n̄aa ntị n’okwu m nile, ma ghara imesi obi ha ike, aga m aehiwe nzukọ-nsọ m n’etiti ha, ma ha ga-abata n’ime ọgbụgba-ndụ ahụ ma bagụnye ha n’etiti ndị a fọdụrụ nke Jekọb, nye ndị m nyeworo ala nke a maka ihe nketa ha;

23 Ma ha ga-enyere ndị m aka, ndị fọdụrụ nke Jekọb, na kwa ka ha ra bụ nke ụlọ nke Israel ga-abịa, ka ha wee wuo obodo-ukwu, nke a-ga akpọ aJerusalem Ọhụrụ ahụ.

24 Ma mgbe ahụ ka ha ga-enyere ndị m aka ka e wee kpọkọta bata ha, ndị e kposasịrị nʼelu iru nile nke ala ahụ, bata n’ime Jerusalem Ọhụrụ ahụ.

25 Ma mgbe ahụ ka aike nke elu-igwe ga-agbadata n’etiti ha; ma a bga kwa m anọ n’etiti.

26 Ma mgbe ahụ ka ọrụ nke Nna ga-amalite n’ụbọchị ahụ, ọbụna mgbe a ga-ekwusa ozi-ọma nke a n’etiti ndị fọdụrụ na ndị a. N’ezie, asị m unu, n’ụbọchị ahụ ka ọrụ nke Nna aga-amalite n’etiti ndị m nile gbasasịrị, e, ọbụna agbụrụ nile nke bfuworo efu, nke Nna dupụworo site na Jerusalem.

27 E, ọrụ ahụ ga-amalite n’etiti ndị m nile agbasasịrị, site na Nna ịkwado uzo ahụ site n’ebe ha ga-abịakwute m, ka ha wee kpọkụo Nna n’aha m.

28 E, ma mgbe ahụ ka ọrụ ahụ ga-amalite, site na Nna n’etiti mba nile n’idozi uzo nke a ga-esi akpọkọta ha n’ụlọ n’ala nke nketa ha.

29 Ma ha ga-apụ site na mba nile; ma ha agaghị apụ aọsọ-ọsọ, ma-ọbụ jiri mgbapụ laa n’ihi na aga m eburu ha uzo gaa, ka Nna kwuru, ma aga m abụ onye nche na azụ ha.