Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 30


Isi 30

Ndị Jentaịlụ ụbọchị-ikpe-azụ e nyere ha iwu ka ha chegharịa, bịakwute Kraịst, ma ka a gụnye ha nʼụlọ nke Israel. Ihe dịka site na afọ 34 ruo 35 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị Jentaịlụ, ma nụrụ okwu nile nke Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ, nke o anyeworo m iwu ka m wee kwuo gbasara unu, n’ihi na, lee o nyere m iwu ka m wee dee, na-asị:

2 Tụgharịa, unu andị Jentaịlụ nile, site n’uzo ajọọ-omume unu nile; ma bchegharịa site n’ime ajọọ-ihe unu nile, n’ikwu-okwu ụgha nile na nghọgbu nile, na site n’ịgba akwụnakwụna nile unu, na site na ihe arụ nzuzo unu nile, na ife-arụsị unu nile, na igbu-mmadụ unu nile, na nchụ-aja aghụghọ unu nile, na ntaji-anya unu nile, na esem-okwu unu nile, na site n’ajọọ-omume na ihe arụ nile, ma bịakwute m, ma ka e mee unu baptism n’aha m, ka unu wee nweta nsachapụ nke mmehie unu nile, ma ka e mejupụta unu na Mụọ Nsọ, ka e wee cgụnye unu n’ọnụ-ọgụgụ nke ndị m ndị bụ nke ụlọ nke Israel.