Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 18


Isi 18

Jisus wee hiwe oriri-nsọ n’etiti ndị Nifaị—E nyere ha iwu ikpe ekpere oge nile n’aha ya—Ndị nke riri anụ-arụ ya ma n̄ụọ ọbara ya n’etozughị-oke a ga-ama ha ikpe—Ndị na-eso ụzọ ya e nyere ha ike inyefe Mụọ Nsọ. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma o wee ruo na Jisus nyere ndị-na-eso ụzọ ya iwu ka ha wetara ya aachịcha na mmanya.

2 Ma mgbe ha gaworo iweta achịcha na mmanya, o nyere igwe-mmadụ ahụ iwu-nsọ ka ha nọdụ onwe ha ọdụ n’ala.

3 Ma mgbe ndị-na-eso ụzọ ya jiworo aachịcha na mmanya bịa, o weere ụfọdụ achịcha ahụ ma nyawaa ma gọzie ya; ma o nyere ndị na-eso ụzọ ya ma nye ha iwu-nsọ ka ha rie.

4 Ma mgbe ha riworo ma rijuo afọ, o nyere iwu ka ha nye igwe-mmadụ ahụ.

5 Ma mgbe igwe-mmadụ ahụ riworo ma rijuo afọ, ọ sịrị ndị-na-eso ụzọ ya ahụ: Lee a ga-enwe otu onye a ga-echi echichi n’etiti unu, ma ya ka m ga-enye ike na ọ aga-anyawa achịcha ma gọzie ya ma nye ya ndị nke nzukọ-nsọ m, nye ndị nile ga-ekwere ma e mee ha baptism n’aha m.

6 Ma nke a ka unu ga n’echeta ime oge nile, ọbụna dịka m meworo, ọbụna dịka m nyawaworo achicha ma gọziwo ya ma nyewo unu ya.

7 Ma nke a ka unu ga-eme na ancheta nke arụ m, nke m gosịworo unu. Ma ọ ga-abụ ihe mgba-ama nye Nna na unu na-echeta m oge nile. Ma ọbụrụ na unu na-echeta m oge nile unu ga-enwe Mụọ m ka ọ na-anọnyere unu.

8 Ma o wee ruo na mgbe o kwuru okwu ndị a, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha were mmanya sitere n’iko ahụ ma n̄ụbiri site na ya, ma na ha kwesịrị inye kwa igwe mmadụ ahụ ka ha wee n̄ụọ site na ya.

9 Ma o wee ruo na ha mere otu ahụ, ma n̄ubiri site na ya ma afọ juru ha; ma ha nyere igwe-mmadụ ahụ, ma ha n̄ụrụ, ma afọ juru ha.

10 Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya meworo nke a, Jisus sịrị ha: Ngọzi na-adịrị unu n’ihi ihe nke a nke unu meworo, n’ihi na nke a bụ imejupụta iwu-nsọ m nile, ma nke a na-agbara Nna aka-ebe na unu nọ na njikere ime ihe ahụ nke m nyeworo unu n’iwu.

11 Ma otu a ka unu ga na-emere ndị nke chegharịrị ma e mee ha baptism n’aha m; ma unu ga-eme ya na ncheta nke ọbara m, nke m kwafuworo nye unu, ka unu wee gbaara Nna aka-ebe na unu na-echeta m oge nile. Ma ọbụrụ na unu na-echeta m oge nile unu ga-enwe Mụọ m ka ọ na-anọnyere unu.

12 Ma ana m enye unu iwu-nsọ na unu ga-eme ihe ndị a. Ma ọbụrụ na unu ga-eme ihe ndị a oge nile ngọzi na-adịrị unu, n’ihi na e wukwasịrị unu n’elu ankume m.

13 Mana onye ọbụla n’etiti unu ga-eme karịa ma-ọbụ welata aka karịa ndị a ewukwasịghị ha n’elu nkume m, kama ewukwasịrị ha n’elu ntọ-ala aja; ma mgbe mmiri-ozuzo ga-agbadata, ma ide-mmiri nile abịa, ma ifufe nile efee, ma fekwasị ha, ha aga-ada, ma bọnụ-ụzọ ama nile nke ala-mụọ dị na njikere, meghee ịnabata ha.

14 Ya mere ngọzi na-adịrị unu ma ọbụrụ na unu ga-edebe iwu-nsọ m nile, nke Nna nyeworo m iwu ka m nye unu.

15 N’ezie, n’ezie, asị m unu, unu ga na-echerịrị nche ma ana-ekpe ekpere oge nile, eleghị anya ekwensu anwa unu ọnwụnwa, ma duru unu pụọ ndị ọ dọkpụụrụ n’agha.

16 Ma dịka m siworo kpee ekpere n’etiti unu ọbụna otu ahụ ka unu ga-esi na-ekpe ekpere na nzukọ-nsọ m, n’etiti ndị nke m chegharịrị ma e mee ha baptism n’aha m. Lee abụ m aìhè ahụ; e doziwo m ihe bima-atụ nye unu.

17 Ma o wee ruo na mgbe Jisus gwaworo ndị na-eso ụzọ ya okwu nile ndị a, ọ tụghari-kwara ọzọ n’ebe igwe-mmadụ ahụ nọ ma sị ha:

18 Lee, n’ezie, n’ezie, asị m unu, unu ga na-echerịrị nche na-ekpe ekpere oge nile adịghị ama ama unu abanye n’ime ọnwụnwa; n’ihi na aSetan na-achọ inweta unu, ka o wee yọchaa unu dịka ọka.

19 Ya mere unu ga na-ekpere Nna oge nile n’aha m;

20 Ma aihe ọbụla unu ga-arịọ Nna n’aha m, nke zịrị ezi, na-ekwere na unu ga-anata, lee a ga-enye unu ya.

21 aNa-ekpe nụ ekpere, n’ezi na ụlọ unu nye Nna oge nile n’aha m, ka e wee gọzie ndị nwunye unu na ụmụ unu.

22 Ma lee, unu ga na-ezukọta ọtụtụ mgbe; ma unu agaghị egbochi onye ọbụla ịbịakwute unu mgbe unu ga-ezukọta, kama kwee ha ka ha bịakwute unu ma egbochila ha;

23 Mana unu ga ana-ekpere ha ekpere, ma agaghị achụpụ ha; ma ọbụrụ na ha bịakwute unu ọtụtụ mgbe unu ga-ekpere ha ekpere nye Nna, n’aha m.

24 Ya mere, welite aìhè unu elu ka ọ na-enwu nye ụwa. Lee abụ m bìhè ahụ nke unu ga-ewelite elu—ịhe ahụ unu hụworo m na-eme. Lee unu hụrụ na mụ ekpewo ekpere nye Nna, ma unu nile ahụwo ya.

25 Ma unu hụrụ na mụ enyewo iwu na aonye ọbụla n’ime unu agaghị apụ, mana kama e nyewo m iwu ka unu bịakwute m, ka unu wee bmetụ-aka ma hụ; ọbụna otu ahụ ka unu ga-eme nye ụwa; ma onye ọbụla na-emebi iwu-nsọ nke a, na-enye onwe ya ka e dụba ya n’ime onwunwa.

26 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Jisus kwusịworo okwu ndị a, ọ tụgharịkwara anya ya ọzọ lekwasị ndị na-eso uzo ya ndị ọ họrọworo, ma sị ha:

27 Lee n’ezie, n’ezie, asị m unu, a na m enye unu iwu-nsọ ọzọ, ma mgbe ahụ a ga m agakwuru aNna m ka m wee mejupụta biwu-nsọ ndị ọzọ ndị o nyeworo m.

28 Ma ugbua lee, nke a bụ iwu-nsọ ahụ nke m nyeworo unu, na unu agaghị ekwe onye ọbụla unu matara amata aiketa-oke nke arụ na ọbara m bn’etozughị-oke, mgbe unu ga-eke ya;

29 N’ihi na onye ọbụla na-eri ma na-an̄ụ arụ na aọbara m bn’etozughị-oke na-eri ma na-an̄ụ ọmụma-ikpe nye mkpụrụ-obi ya; ya mere ọbụrụ na unu matara na mmadụ etozughị etozu iri na ịn̄ụ nke arụ na ọbara m unu ga-egbochi ya.

30 Otu o sila dị, unu agaghị aachụpụ ya site n’etiti unu, mana unu ga-akụziri ya ozi-ọma ma ga-ekpere ya ekpere nye Nna, n’aha m; ma ọbụrụ na o chegharịa ma e mee ya baptism n’aha m, mgbe ahụ ka unu ga-anabata ya, ma ga-ekenye ya site n’arụ na ọbara m.

31 Mana ọbụrụ na o chegharịghị, agaghị agụnye ya n’etiti ndị m, ka ọ ghara ibibi ndị m, n’ihi na lee a matara m aatụrụ m, ma agụrụ ha ọnụ.

32 Otu o sila dị, unu agaghị achụpụ ya site n’ụlọ-nzukọ unu nile, ma-ọbụ ebe nile unu na anọ efe Chineke, n’ihi na nye ụdị ahụ ka unu ga-aga n’iru na-ekwusa ozi-ọma; n’ihi na unu amataghị ma ha ga-alaghachị ma chegharịa, ma jiri nzube juru-eju nke obi bịakwute m, ma aga m aagwọ ha; ma unu ga-abụ ngwa-ọrụ nke iwetara ha nzọpụta.

33 Ya mere, debe ihe ndị a nke m nyeworo unu iwu-nsọ ka unu ghara ịbịa n’okpuru aamam-ikpe; n’ihi na ahụhụ na-adịrị ya bụ onye Nna ga-ama ikpe.

34 Ma a na m enye unu iwu-nsọ nile ndị a n’ihi ịrụrịta-ụka nile nke na-adị n’etiti unu. Ma ngọzi na-adịrị unu ma ọbụrụ na aunu enweghị ịrụrịta-ụka nile n’etiti unu.

35 Ma ugbua ana m agakwuru Nna, n’ihi na ọ dị mkpa na m ga-agakwuru Nna an’ihi unu nile.

36 Ma o wee ruo na mgbe Jisus bịaworo na ngwụcha nke ihe nkwupụta ndị a, o jiri aaka ya metụ bndị na-eso ụzọ ya ndị nke ọ họrọworo, n’otu n’otu, ọbụna ruo mgbe o metụsịworo ha nile, ma gwa ha okwu dịka o metụrụ ha aka.

37 Ma igwe-mmadụ ahụ anụghị okwu nile nke o kwuru, ya mere ha agbaghị ama; mana ndị na-eso ụzọ ya gbara-ama na o nyere ha aike inye bMụọ Nsọ. Ma aga m egosị unu ma emesịa na ama nke a bụ ezi-okwu.

38 Ma o wee ruo na mgbe Jisus metụworo ha nile aka, aigwe-ojii bịara ma kpuchie igwe-mmadụ ahụ nke mere na ha enweghị ike ịhụ Jisus.

39 Ma mgbe e kpuchịrị ha ọ pụrụ site n’ebe ha nọ, ma rịgoro n’elu-igwe. Ma ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ma gbaa-ama na ọ rigokwara ọzọ n’elu-igwe.