Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 12


Isi 12

Jisus wee kpọọ ma nye iri na abụọ ahụ ike—O wee kwuoro ndị Nifaị okwu yiri Okwu Chukwu ahụ e kwuru n’elu Ugwu—O wee kwuo Nkwupụta-Ịdị-Ngọzi nile—Nkuzi ya nile gafere ma buruzie iwu nke Moses ụzọ—E nyere ndị mmadụ iwu ka ha zuo oke ọbụna dịka ya na Nna ya zuru oke—Tulee Matiu 5. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma o wee ruo na mgbe Jisus gwaworo Nifaị okwu nile ndị a, ma gwa ndị ahụ a kpọworo, (ugbua ọnụ-ọgụgụ nke ndị a kpọworo, ma nata ike na ikike ime baptism, dị airi na abụọ) ma lee, o setịpụrụ aka ya, nye igwe mmadụ ahụ ma tikuo ha, na-asị: bNgọzi na-adịrị unu ma o bụrụ na unu ga-an̄a ntị n’okwu nile nke iri na abụọ ndị a ndị m chọrọworo site n’etiti unu ilekọta unu, na ịbụ ndị-ozi unu; ma ha ka m nyeworo ike ka ha jiri mmiri mee unu baptism; ma mgbe e jiworo mmiri mesịa unu baptism, lee, aga m eji ọkụ na Mụọ Nsọ mee unu baptism; ya mere ngọzi na-adịrị unu ma ọbụrụ na unu ga-ekwere na m ma e mee unu baptism, mgbe unu hụsịworo m ma mata na m nọ.

2 Ma ọzọ, ngọzi na-adịrị ha karịa bụ ndị aga-ekwere n’okwu unu nile n’ihi na unu ga-agba-ama na unu ahụwo m, ma na unu matara na m nọ. E, ngọzi na-adịrị ndị ga-ekwere n’okwu unu nile, ma bgbadata n’ime omimi nile nke obi umeala ma e mee ha baptism, n’ihi na a cga-eji ọkụ na Mụọ Nsọ leta ha, ma ha ga-anata nsachapụ nke mmehie ha nile.

3 E, ngọzi na-adịrị ndị adara ogbenye n’ime mụọ ndị bna-abịakwute m, n’ihi na nke ha ka ala-eze nke elu-igwe bụ.

4 Ma ọzọ, ngọzi na-adịrị ndị nile na-eru uju, n’ihi na a ga-akasi ha obi.

5 Ma ngọzi na-adịrị ndị dị anwayọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa bụwa.

6 Ma ngọzi na-adịrị ndị nile aagụụ na-agụ ma bakpịrị na-akpọ kwa ha nkụ n’ịchụso cezi-omume, n’ihi na a ga-emejupụta ha na Mụọ Nsọ.

7 Ma ngọzi na-adịrị ndị ana-eme ebere, n’ihi na ha ga-enweta ebere.

8 Ma ngọzi na-adịrị ndị nile dị aọcha n’obi, n’ihi na ha bga-ahụ Chineke.

9 Ma ngọzi na-adịrị ndị nile ana-eme udo, n’ihi na a ga-akpọ ha bụmụ nke Chineke.

10 Ma ngọzi na-adịrị ndị nile a ana-esogbu n’ihi aha m, n’ihi nke ha ka ala-eze nke elu-igwe bụ.

11 Ma ngọzi na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ ga-agwa unu okwu ọjọọ ma sogbuo unu, ma ga-ekwu ụdị okwu ọjọọ nile megide unu na-abụghị ezi-okwu, n’ihi m;

12 N’ihi na unu ga-enwe nnukwu ọn̄ụ ma nwee ọn̄ụ karịa, n’ihi na nnukwu ka aụgwọ ọrụ unu ga-adị n’elu-igwe; n’ihi na otu ahụ ka ha sogburu ndị-amụma nile ndị buru unu uzo.

13 N’ezie, n’ezie, asị m unu, enyere m unu ịbụ annu nke ụwa; mana ọbụrụ na nnu ahụ ga-etụfu ụtọ ya olee ebe a ga-esi tinye ụwa nnu? Nnu ahụ adịghị kwa ihe ọ dị mma ya site mgbe ahụ, kama ka e tufuo ya na ka ndị mmadụ na-azọ ya ụkwụ.

14 N’ezie, n’ezie, asị m unu, enyere m unu ịbụ ìhè nke ndị a. Obodo-ukwu nke e wuru n’elu ugwu enweghị ike izo-ezo.

15 Lee, ndị mmadụ ha na-amụnye aoriọna ma debe ya n’okpuru iko-ntụtụ? E-e, kama n’elu osisi ịdọba oriọna, ma ọ na-enye ndị nile nọ n’ime ụlọ ahụ ìhè;

16 Ya mere ka aìhè unu si otu a n’enwu n’iru ndị a, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu ma nye Nna unu nke bi n’elu-igwe otuto.

17 Unu echela na m bịara ibibi iwu ahụ ma-ọbụ ndị-amụma. Abịaghị m ibibi kama imezu;

18 N’ihi na n’ezie asị m unu, otu mpekere ma-ọbụ otu nke dịkasịrị ntakịrị agabigabeghị site an’iwu ahụ, kama n’ime m e mejupụtawo ha nile.

19 Ma lee, enyewo m unu iwu ahụ na iwu-nsọ ahụ nile nke Nna m, ka unu wee kwere na m, ma na unu ga-echegharị site na mmehie nile unu, ma bịakwute m jiri aobi tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị. Lee, unu nwere iwu-nsọ nile ahụ n’iru unu, ma e mezuwo biwu ahụ.

20 Ya mere bịakwute m ma ka a zọpụta unu; n’ihi na n’ezie asị m unu, na ma ọbụghị na unu ga-edebe iwu-nsọ m nile, nke m nyeworo unu n’oge nke a, unu enweghị ike n’ọnọdụ ọbụla ịba n’ala-eze nke elu-igwe.

21 Unu anụwo na ndị mgbe ochie ekwuwo ya, ma e dekwara ya n’iru unu, na ị gaghị aegbu mmadụ, ma onye ọbụla ga-egbu mmadụ ga-anọ n’ihe egwu nke ikpe nke Chineke;

22 Mana asị m unu, na onye ọbụla na-eweso nwanne ya iwe ga-anọ n’ihe egwu nke ikpe ya. Ma onye ọbụla ga-asị nwanne ya Raka, ga-anọ n’ihe egwu nke ndị-kansul ahụ; ma onye ọbụla ga-asị, Gị onye-nzuzu, ga-anọ n’ihe egwu nke ala-mụọ.

23 Ya mere, ọbụrụ na unu ga-abịakwute m, ma-ọbụ ga-achọ ịbịakwute m, ma cheta na nwanne gị nwere ihe megide gị—

24 Gawa gakwuru nwanne gị, ma buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị adị n’udo ma mgbe ahụ jiri nzube zuru oke nke obi bịakwute m, ma aga m anabata gị.

25 Kwekọrịta gị na onye iro gị ọsọ-ọsọ mgbe gị na ya nọ n’ụzọ, adịghị ama ama mgbe ọbụla ọ ga-enweta gị, ma a ga-atụba gị n’ụlọ-mkpọrọ.

26 N’ezie, n’ezie, asị m gị, ọdịghị ụzọ ọbụla ị ga-esi pụta n’ebe ahụ ruo mgbe ị kwụworo sinaịn ikpe-azụ. Ma mgbe ị nọ n’ụlọ-mkpọrọ ị ga-enwe ike ịkwụ ọbụna otu asinaịn? N’ezie, n’ezie, asị m gị, E-e.

27 Lee, ndị mgbe ochie dere ya, na ị agaghị aakwa iko.

28 Mana asị m unu, na onye ọbụla lekwasịrị nwanyị anya, ainweso ya agụụ ọchịchọ nke anụ-arụ, akwawọrịị iko n’ime obi ya.

29 Lee, enye m unu iwu-nsọ, ka unu ghara ikwe nke ọbụla n’ime ihe ndị a ịbata n’ime aobi unu.

30 N’ihi na ọ ka mma na unu jụrụ onwe unu ihe ndị a, n’ime nke unu ga-ebulite aobe unu, karịa na a ga-atụba unu n’ala-mụọ.

31 Edewo ya, na onye ọbụla ga-achụpụ nwunye ya, ka o nye ya ihe e dere ede nke aalụkwaghị m.

32 N’ezie, n’ezie, asị m unu, na onye ọbụla aga-achụpụ nwunye ya, ma ọbụghị maka bịkwa-iko, na-eme ka ọ ckwaa iko; ma onye ọbụla ga-alụ onye ahụ a gbaara alụkwaghị m na-akwa iko.

33 Ma ọzọ e dere ya, ị gaghị an̄ụ-iyi, kama Ị ga-emere Onye-nwe aịn̄ụ-iyi gị nile.

34 Mana n’ezie, n’ezie, asị m unu, aan̄ụla iyi ma ọlị; ọbụghị ijiri elu-igwe, n’ihi na o bụ oche-eze Chineke.

35 Ọbụghị ijiri ụwa n’ihi na ọ bụ ebe mgbakwasị-ụkwụ ya.

36 Ọ bụghị ma unu ga-eji isi unu n̄ụọ iyi, n’ihi na unu enweghị ike ime otu agịrị-isi ojii ma-ọbụ nke ọcha;

37 Mana ka ikwukọrịta okwu unu bụrụ E, e; E-e, e-e; n’ihi na ihe ọbụla sitere na nke karịrị nke a bịa bụ ajọọ ihe.

38 Ma lee, e dere ya, aotu anya maka otu anya, na otu mkpụrụ eze maka otu mkpụrụ eze;

39 Mana asị m unu, na unu agaghị aeguzogide ajọọ ihe, kama onye ọbụla ga-akụ unu ihe na nti aka nri, btụgharịa kwara ya nti nke ọzọ;

40 Ma ọbụrụ na onye ọbụla ga-agbara gị akwụkwo n’ụlọ ikpe ma napụ gị uwe elu-arụ gị, mee ka o were kwa uwe ime-arụ gị;

41 Ma onye ọbụla ga-akwagide gị ịga otu maịlụ, soro ya gaa abụọ.

42 aNye onye nke na-arịọ gị, ma site na onye nke ga-achọ ịgbaziri gị ihe agbanyekwala ya azụ.

43 Ma lee e dekwara ya, na ị ga-ahụ onye-agbata-obi gị n’anya ma kpọọ onye iro gị asị;

44 Mana lee asị m unu, hụ andị iro unu n’anya, gọzie ha bụ ndị na-akọcha unu, na-emere ndị kpọrọ unu asị ihe ọma, ma bna-ekpere ndị na-eji unu eme ihe nleda-anya ma na-esogbu unu ekpere;

45 Ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu bi n’elu-igwe; n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ waara onye ọjọọ na onye ọma.

46 Ya mere ihe ndị ahụ nke bụụrụ nke mgbe ochie, nke dịịrị n’okpuru iwu, n’ime m ka e mezuru ha nile.

47 aIhe ochie nile agafewo, ma ihe nile aghọwo ihe ọhụrụ.

48 Ya mere ọ ga-adị m mma ka unu azuo oke ọbụna dịka m, ma-ọbụ Nna unu nke bi n’elu-igwe zuru oke.