Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 9


Isi 9

N’ime ọchịchịrị ahụ, olu nke Kraịst kwupụtara mbibi nke ọtụtụ mmadụ na ọtụtụ obodo-ukwu n’ihi ajọọ-omume ha—O kwupụtakwara ịdị-nsọ ya, maa ọkwa na iwu nke Moses e mejupụtawo ya, ma na-akpọkụ ndị mmadụ ka ha bịakwute ya ma ka a zọpụta ha. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma o wee ruo na e nwere aolu a nụrụ n’etiti ndị nile bi n’ụwa, n’elu iru nile nke ala nke a, na-eti;

2 Ahụhụ, ahụhụ, ahụhụ na-adịrị ndị a; aahụhụ na-adịrị ndị bị n’ụwa nile ma ọbụghị na ha ga-echegharị; n’ihi na ekwensu bna-achị ọchị, ma ndị mụọ-ozi ya nile na-an̄ụrị, n’ihi ụmụ-nwoke nile na ụmụ-ada nile mara mma nke ndị m e gburu, ma ọ bụ n’ihi ajọọ-omume ha na ihe arụ nile ka ha daworo!

3 Lee, nnukwu obodo-ukwu Zarahemla ahụ ka m gbaworo ọkụ, na ndị nile bi n’ime ya.

4 Ma lee, nnukwu obodo-ukwu Moronaị ka m meworo ka e mikpuo n’omimi nile nke osimiri ahụ, ma ndị nile bi n’ime ya ka mmiri rie ha.

5 Ma lee, nnukwu obodo-ukwu Moronaịha ahụ ka m jiworo aja kpuchie, ma ndị nile bi n’ime ya, izo ajọọ-omume ha nile na ihe arụ ha nile site iru m, ka ọbara nke ndị-amụma nile na ndị-nsọ nile ghara ịbịalitekwute kwa m ọzọ imegide ha.

6 Ma lee, obodo-ukwu nke Gịlgal ka m meworo ka e mikpuo, ma ndị nile bi n’ime ya ka e lie ha n’omimi nile nke ala ahụ;

7 E, ma obodo-ukwu nke Onaịha na ndị nile bi n’ime ya, na obodo-ukwu nke Mokọm na ndị nile bi n’ime ya; ma obodo-ukwu nke Jerusalem na ndị nile bi n’ime ya; ma ammiri nile ka m meworo ka ha bịalite n’ọnọdụ ha, izo ajọọ-omume ha na ihe arụ ha nile site n’iru m ka ọbara nke ndị-amụma nile na ndị-nsọ nile ghara ịbịalitekwute kwa m ọzọ megide ha.

8 Ma lee, obodo-ukwu nke Gadiandaị, na obodo-ukwu nke Gadiọmna, na obodo-ukwu nke Jekọb, na obodo-ukwu nke Gịmgịmno, ndị a nile ka m meworo ka e mikpuo ha, ma mee augwu-nta nile na ndagwurugwụ nile n’ọnọdụ ha nile, ma ndị nile bi n’ime ya ka m liworo n’omimi nile nke ụwa, izo ajọọ-omume ha na ihe arụ ha nile site n’iru m, ka ọbara nke ndị-amụma na ndị-nsọ ghara ịbịalitekwute kwa m ọzọ megide ha.

9 Ma lee, nnukwu obodo-ukwu Jekọbugat ahụ, nke ndị ahụ bi n’ime ya bụ ndị nke eze Jekọb, ka m meworo ka a kpọọ ya ọkụ n’ihi mmehie ha nile na ajọọ-omume ha, nke karịrị ajọọ-omume nile nke ụwa nile, n’ihi aigbu-mmadụ nzuzo ha na ntụgwa ha nile; n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị bibiri udo nke ndị m na ọchịchị nke ala ahụ; ya mere e mere m ka a kpọọ ha ọkụ, bibibi ha site n’iru m, ka ọbara nke ndị-amụma na ndị nsọ ghara ịbịalitekwute kwa m ọzọ megide ha.

10 Ma lee, obodo-ukwu nke Leman, na obodo-ukwu nke Jọsh, na obodo-ukwu nke Gad, na obodo-ukwu nke Kịshkumen, ka m meworo ka a gbaa ha ọkụ, na ndị nile bi n’ime ya, n’ihi ajọọ-omume ha n’ịchụpụ ndị-amụma ahụ, na ịtụ ndị ahụ m zitara ikwupụtara ha gbasara ajọọ-omume ha na ihe arụ ha nile okwute.

11 Ma n’ihi na ha chụpụrụ ha nile, na e nweghị onye ezi-omume n’etiti ha, ezidagara m aọkụ ma bibie ha, na ajọọ-omume na ihe arụ ha nile a ga-ezobe ya site n’iru m, ka ọbara nke ndị-amụma na ndị-nsọ nile ndị m zigara n’etiti ha agaghị etiku m bsite n’ime ala megide ha.

12 Ma aọtụtụ nnukwu mbibi nile ka m meworo ka ọ bịakwasị ala nke a, na bịakwasị ndị nke a, n’ihi ajọọ-omume ha na ihe arụ ha nile.

13 O unu nile ndị e adebeworo n’ihi na unu kara bụrụ ndị ezi-omume karịa ha, unu agaghị alaghachịkwute m ugbua a, ma chegharịa site na mmehie unu nile, ma ka a gbanwe unu, ka m wee bgwọọ unu?

14 E, n’ezie asị m unu, ọbụrụ na unu aga-abịakwute m unu ga-enwe bndụ-ebighi-ebi. Lee, caka nke ebere m e setịpụworo unu ya, ma onye ọbụla ga-abịa, ya ka m ga-anabata; ma ngọzi na-adịrị ndị na abịakwute m.

15 Lee, abụ m Jisus Kraịst Ọkpara nke Chineke. Ọ bụ m akere elu-igwe nile n’ụwa, na ihe nile dị n’ime ha. Mụ na Nna m nọ site na mmalite. bA nọ m n’ime Nna m, ma Nna m nọ kwa n’ime m; ma n’ime m ka Nna m nyeworo aha ya otuto.

16 Abịakwutere m ndị nke m ma ndị nke m aanabataghị m. Ma akwụkwọ-nsọ nile gbasara ọbịbịa m e mezuwo ha.

17 Ma ka ha ra bụ ndị nabataworo m, ha ka m anyeworo ịghọ ụmụ nwoke nke Chineke; ma ọbụna otu ahụ ka m ga-enye ka ha ra ga-ekwere n’aha m, n’ihi na lee, site na m ka bmgbapụta ga-esi bịa, ma n’ime m ka e mezuru ciwu nke Moses.

18 Abụ m aìhè na ndụ nke ụwa. Abụ m bAlfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ.

19 Ma unu agaghị enyelite kwa m ịkwafu ọbara aọzọ; e, ịchụ-aja unu nile na onyinye nsure ọkụ unu nile a ga-akwụsị ha, n’ihi na-agaghị m anabata ịchụ-aja unu nile na onyinye nsure ọkụ unu nile.

20 Ma unu ga-enye an’ịchụrụ m aja obi tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị. Ma onye ọbụla ga-abịakwute m jiri obi tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị, ya ka m ga-eji ọkụ na Mụọ Nsọ bmee baptism, ọbụna dịka ndị nke Leman, n’ihi okwukwe ha nʼime m n’oge nke mgbanwe ha, e jiri ọkụ ma jiri Mụọ Nsọ mee ha baptism, ma ha amataghị ya.

21 Lee, abịarutawo m ụwa iwetara ndị ụwa mgbapụta, ịzọpụta ndị ụwa site na mmehie.

22 Ya mere, onye ọbụla achegharịrị ma bịakwute m dịka bnwa ntakịrị, ya ka m ga-anabata, n’ihi na ala-eze Chineke bụ nke ndị dị otu a. Lee, n’ihi na maka ndị dị otu a ka m ctọgbọworo ndụ m, ma e welitawo kwa m ya ọzọ; ya mere chegharịa nụ, ma bịakwute m unu nsọtụ nile nke ụwa, ma ka a zọpụta unu.