Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 27


Isi 27

Jisus wee nye ha iwu ịkpọ Nzukọ-nsọ ahụ n’aha ya—Ị gbasa-ozi ya na ịchụ-aja mgbaghara-mmehie ya mejupụtara ozi-ọma ya—A na-enye ndị mmadụ iwu ka ha chegharịa ma e mee ha baptism ka e wee sachaa ha site na Mụọ Nsọ—Ha kwesịrị ịdị ọbụna otu Jisus dị. Ihe dịka site na afọ 34 ruo 35 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma o wee ruo na dịka ndị na-eso ụzọ Jisus na-aga njem ma na-ekwusa ihe ndị ha nụworo ma hụ kwa, ma na-eme baptism n’aha nke Jisus, o wee ruo na ndị na-eso ụzọ ya gbakọtara ma ajikọta onwe ha ọnụ na nnukwu ekpere na bobubu-ọnụ.

2 Ma Jisus agosịrị ha onwe ya ọzọ, n’ihi na ha nọ na-ekpe ekpere nye Nna n’aha ya; ma Jisus bịara ma guzoro n’etiti ha, ma sị ha: Gịnị ka unu chọrọ ka m nye unu?

3 Ma ha sịrị ya: Onye-nwe, anyị chọrọ ka ị gwa anyị aha nke anyị ga-akpọ nzukọ-nsọ nke a; n’ihi na e nwere ịrụ-ụka nile nʼetiti ndị ahụ gbasara ihe nke a.

4 Ma Onye-nwe sịrị ha: N’ezie, n’ezie, asị m unu, gịnị mere ndị ahụ ga-eji na-atamu ma na arụ-ụka n’ihi ihe nke a?

5 Ha agụbeghị akwụkwọ-nsọ nile, nke sị na unu ga-ewekwasị onwe unu aaha nke Kraịst, nke bụ aha m? N’ihi na n’aha nke a ka a ga-akpọ unu n’ụbọchị ikpe-azụ;

6 Ma onye ọbụla nke wekwasịrị onwe ya aha m, ma anọgide ruo ọgwụgwụ, onye ahụ a ga-azọpụta ya n’ụbọchị ikpe-azụ.

7 Ya mere, ihe ọbụla unu ga-eme, unu ga-eme ya n’aha m; ya mere unu ga-akpọ nzukọ-nsọ ahụ n’aha m; ma unu ga-akpọkụ Nna n’aha m ka o wee gọzie nzukọ-nsọ ahụ n’ihi m.

8 Ma olee otu o siri bụrụ anzukọ-nsọ bm ma ọbụghị na a kpọrọ ya n’aha m? N’ihi na ọbụrụ na a kpọọ nzukọ-nsọ n’aha Moses mgbe ahụ ọ bụ nzukọ-nsọ Moses; ma-ọbụ ọbụrụ na a kpọọ ya aha mmadụ mgbe ahụ ọ bụ nzukọ-nsọ nke mmadụ; mana ọbụrụ na a kpọọ ya n’aha m mgbe ahụ ọ bụ nzukọ-nsọ m, ma ọbụrụ na e wukwasịrị ha n’ozi-ọma m.

9 N’ezie asị m unu, na e wukwasịrị unu n’ozi-ọma m; ya mere unu ga-akpọ ihe ọbụla unu na-akpọ, n’aha m, ya mere ọbụrụ na unu kpọkuo Nna, maka nzukọ-nsọ ahụ, ọbụrụ na ọ bụ n’aha m Nna ga-anụ olu unu;

10 Ma ọbụrụ na nzukọ-nsọ ahụ e wuru ya n’ozi-ọma m mgbe ahụ ka Nna ga-egosịpụta ọrụ nke ya nile na ya.

11 Mana ọbụrụ na e wukwasịghị ya n’ozi-ọma m, ma e wukwasịrị ya n’ọrụ nile nke mmadụ, ma-ọbụ n’ọrụ nile nke ekwensu, n’ezie asị m unu ha nwere an̄ụrị n’ọrụ ha nile n’ihi nwa oge, ma emesịa kwa ogwụgwụ ahụ ga-abịa, ma a aga-egbutu ha ma tụba ha n’ime ọkụ, site n’ebe nke na-enweghị nlaghachị.

12 N’ihi na ọrụ ha nile ana-eso ha, n’ihi na ọ bụ n’ihi ọrụ ha nile ka e jiri gbutuo ha; ya mere cheta ihe nile nke m gwaworo unu.

13 Lee enyewo m unu aozi-ọma m, ma nke a bụ ozi-ọma ahụ nke m nyeworo unu—na m bịara n’ime ụwa ime buche nke Nna m, n’ihi na Nna m zitara m.

14 Ma Nna m zitara m ka e wee abulie m n’elu obe; ma mgbe e buliworo m n’elu obe, ka m wee bdọtara mmadụ nile onwe m, ka dịka ndị mmadụ sịworo bulie m elu ọbụna otu ahụ ka Nna ga-esi bulie ndị mmadụ elu, iguzoro n’iru m, ka cekpe ha ikpe maka ọrụ ha nile, ma ha dị mma ma-ọbụ ma ha dị njọ.

15 Ma n’ihi nke a ka e abuliteworo m elu; ya mere, dịka ike nke Nna siri dị aga m adọtara onwe m mmadụ nile, ka e wee kpee ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị.

16 Ma ọ ga-eru, na onye ọbụla achegharịrị ma e bmee ya baptism n’aha m a ga-emejupụta ya; ma ọbụrụ na ọ cnagide ruo na ọgwụgwụ, lee, ya ka m ga-agụ onye ikpe-na-amaghị n’iru Nna m n’ụbọchị nke m ga-eguzoro ikpe ụwa ikpe.

17 Ma onye nke na-anagideghị ruo na ọgwụgwụ, onye ahụ bụ onye a ga-egbutu kwa ma tụba n’ime ọkụ, site n’ebe nke ha na-agaghị alaghachị ọzọ, n’ihi aikpe-ziri-ezi nke Nna.

18 Ma nke a bụ okwu ahụ nke o nyeworo ụmụ nke mmadụ. Ma n’ihi nke a ọ na-emejupụta okwu nile nke o nyeworo, ma ọ naghị ekwu okwu ụgha, ma ọ na-emejupụta okwu ya nile.

19 Ma aọdịghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha nwere ike ịba n’ala-eze ya; ya mere ọdighị ihe ga-aba n’ime bizu-ike ya ma ọbụghị ndị ahụ csachaworo uwe ha nile n’ọbara m, n’ihi okwukwe ha, na nchegharị nke mmehie ha nile, na ikwesị-ntụkwasị-obi ha ruo na n’ọgwụgwụ

20 Ugbua nke a bụ iwu-nsọ ahụ: aChegharịa, unu nsọtụ nile nke ụwa, ma bịakwute m ma ka e bmee unu baptism n’aha m, ka e wee cdoo unu nsọ site na nnabata nke Mụọ Nsọ ahụ, ka unu wee guzoro dn’enweghị ntụpọ n’iru m n’ụbọchị ikpe-azụ.

21 N’ezie, n’ezie, asị m unu, nke a bụ ozi-ọma m; ma unu matara ihe ndị nke unu ga-emerịrị n’ime nzukọ-nsọ m; n’ihi na ọrụ nile nke unu hụworo m na-arụ nke ahụ ka unu ga-arụ kwa; n’ihi na ihe ahụ nke unu hụworo m na arụ ọbụna nke ahụ ka unu ga-arụ.

22 Ya mere, ọbụrụ na unu mee ihe ndị a unu nwere ngọzi, n’ihi na a ga ebuli unu elu n’ụbọchị ikpe-azụ.

23 Dee ihe nile nke unu hụworo ma nụ kwa, ma ọbụghị ndị nke a sị aedela.

24 Dee ọrụ nile nke ndị a, nke ga-adi, ọbụna dịka e deworo ya, maka ihe ndị ahụ dị na mbụ.

25 N’ihi na lee, site n’ime akwụkwọ nile ndị nke e deworo, na ndị nke a ga-ede, ka a ga-esi akpee ndị a ikpe, n’ihi na site na ha ka ndị mmadụ ga-esi mata bọrụ ha nile.

26 Ma lee, ihe nile Nna adere ha; ya mere site n’akwụkwọ nile nke a ga-ede ka a ga-esi kpee ụwa ikpe.

27 Ma mata nụ na aunu ga-abụ ndị ikpe nke ndị a, dịka ikpe nke m ga-enye unu siri dị, nke ga-ezi-ezi. Ya mere, olee bụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ? N’ezie asị m unu, ọbụna cdịka m dị.

28 Ma ugbua a na m aagakwuru Nna. Ma n’ezie asị m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna n’aha m a ga-enye unu ya.

29 Ya mere, arịọ, ma unu ga-anata; kụọ aka, ma a ga-emeghere unu; n’ihi na onye nke na-arịọ, na-anata; ma nye onye nke na-akụ aka, a ga-emeghere ya.

30 Ma ugbua, lee, ọn̄ụ m dị ukwuu, ọbụna ruo ojuju, n’ihi unu, na kwa ọgbọ nke a; e, ma ọbụna Nna na-an̄ụrị, na kwa ndị mụọ-ozi nile dị nsọ, n’ihi unu na ọgbọ nke a; n’ihi na aọdịghị onye ọbụla n’ime ha furu efu.

31 Lee ọ dị m ka asị na unu ga-aghọta, n’ihi na ana m ekwu maka ndị nke dị ndụ augbua bn’ọgbọ nke a; ma ọdịghị onye ọbụla n’ime ha furu efu; ma n’ime ha enwere m uju nke cọn̄ụ.

32 Mana lee, ọ na-ewute m maka aọgbọ nke anọ site n’ọgbọ nke a, n’ihi na a na-eduru ha ndị-a-dọkpụrụ n’agha site na ya ọbụna dịka e siri mee nwa-nwoke nke mbibi; n’ihi na ha ga-ere m maka ọla-ọcha na ọla-edo, na maka ihe nke bahụhụ na emebi na nke ndị-ori nwere ike ịkụka ma zuo ori. Ma n’ụbọchị ahụ ka m ga-eleta ha, ọbụna n’ịtụgharị ọrụ ha nile n’isi nile nke ha.

33 Ma o wee ruo na mgbe Jisus kwuchaworo ihe nkwupụta nile ndị a ọ sịrị ndị na-eso uzo ya: Baa nụ site an’ọnụ-ụzọ-ama ahụ dị kwa mkpafa; n’ihi mkpafa ka ọnụ-ụzọ-ama ahụ dị, ma wara-wara ka ụzọ ahụ dị nke na-eduba na ndụ, ma ole na ole ka ha dị bụ ndị chọtara ya; mana obosara ka ọnụ-ụzọ-ama ahụ dị, ma mbara ka ụzọ ahụ dị nke na-eduba n’onwu, ma ọtụtụ ka ha dị bụ ndị na-aga njem n’ime ya, ruo mgbe abalị bịara, n’ime nke na-enweghị onye nwere ike ịrụ ọrụ.