Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 29


Isi 29

Mpụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe iriba-ama na Onye-nwe amalitewo ịkpọkọta Israel ma mejupụta ọgbụgba-ndụ ya nile—Ndị nke jụrụ mkpughe ụbọchị-ikpe-azụ ya nile na onyinye nile a ga-abụ ha ọnụ. Ihe dịka site na afọ 34 ruo 35 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua lee, asị m unu na mgbe Onye-nwe ga-ahụ n’okwesịrị, na amamihe ya, na ihe nkwupụta nile ndị a aga-abịakwute ndị Jentaịlụ dịka okwu ya siri dị, mgbe ahụ unu ga-amata na bọgbụgba-ndụ ahụ nke Nna meworo ya na ụmụ nke Israel, gbasara mkpọghachị ha n’ala nile nke nketa ha, na amalitewọrịị inwe mmezu.

2 Ma unu ga-amata na okwu nile nke Onye-nwe, nke e kwuworo site na ndị-amụma ahụ nile dị nsọ, a ga-emezu ha nile; ma unu enweghị ike ikwu na Onye-nwe ana-egbu oge ya ịbịakwute ụmụ nke Israel.

3 Ma unu enweghị ike iche n’obi unu nile na okwu nile nke e kwuworo bụ n’efu, n’ihi na lee, Onye-nwe ga-echeta ọgbụgba-ndụ ya nke o meworo nye ndị ya nke ụlọ nke Israel.

4 Ma mgbe unu ga-ahụ ihe nkwupụta nile ndị a na-apụta n’etiti unu, mgbe ahụ unu enwekwaghị ike ịjụ n’ụzọ-ịkwa-emo ihe nile nke Onye-nwe mere, n’ihi na amma-agha nke bikpe-ziri-ezi ya dị n’aka nri ya; ma lee, n’ụbọchị ahụ, ọbụrụ na unu ga-ajụ n’uzo ịkwa-emo ihe nile o mere ọ ga-eme ka ọ gabiga unu ọsọ-ọsọ.

5 aAhụhụ na-adịrị onye nke bna-ajụ ihe nile nke Onye-nwe na-eme nʼụzọ ịkwa-emo; e, ahụhụ na-adịrị onye nke cna-agọnarị Kraịst ahụ na ọrụ ya nile.

6 E, aahụhụ na-adịrị onye nke ga-agọnarị mkpughe nile nke Onye-nwe, na nke ga-asị Onye-nwe anaghị kwa arụ ọrụ site na mkpughe, ma-ọbụ site n’ibu-amụma, ma-ọbụ site bn’onyinye nile, ma-ọbụ site n’asụsụ nile, ma-ọbụ site n’ọgwụgwọ-ọrịa nile, ma-ọbụ site n’ike nke Mụọ Nsọ!

7 E, ma ahụhụ na adịrị onye nke ga-asị n’ụbọchị ahụ, inweta auru, na enweghị ike inwe bọrụ-ebube Jisus Kraịst mere; n’ihi na onye nke na-eme nke a ga-adị ka cnwa-nwoke nke mbibi, onye nke a na enweghị ebere nye, dịka okwu nke Kraịst siri dị!

8 E, ma unu ekwesịkwaghị aịma-ọsụ ọzọ, ma-ọbụ bịjụ n’ụzo ịkwa-emo, ma-ọbụ jiri cndị Juu gwuo egwu, ma-ọbụ ndị ọbụla nke fọdụrụ nke ụlọ nke Israel; n’ihi na lee, Onye-nwe na echeta ọgbụgba-ndụ o mere nye ha, ma ọ ga-emere ha dịka ihe ahụ nke ọ n̄ụworo n’iyi.

9 Ya mere unu ekwesịghị iche na unu nwere ike ịtụgharị aka-nri nke Onye-nwe n’aka-ekpe, ka o wee ghara ime ihe e kpebiri n’ikpe ruo na mmejupụta nke ọgbụgba-ndụ ahụ nke o meworo nye ụlọ nke Israel.