Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 25


Isi 25

N’Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, ndị mpako na ndị ajọọ-omume a ga-ere ha ọkụ dị ka ahihịa kpọrọ-nkụ—Elaịja ga-alaghachị tutu nnukwu na ụbọchị ahụ dị oke egwu—Tulee Malakaị 4. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 N’ihi-na lee, ụbọchị ahụ na-abịa nke aga-ere ọkụ dịka ite ọkụ; ma bndị mpako nile, e, na ndị nile na eme ajọọ-omume, ga-abụ ahihịa kpọrọnkụ; ma ụbọchị nke na-abịa ga-erechapụ ha, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru, ka o wee ghara ịhapụrụ ha mgbọrọgwụ ma-ọbụ ngalaba.

2 Mana nye unu ndị na atụ-egwu aha m, ka aỌkpara nke Ezi-omume ga-eji ọgwụgwọ na nku ya nile bilite; ma unu ga-aga nʼiru ma btolite dịka cụmụ-ehi nọ n’ụlọ-anụ.

3 Ma unu aga-azọda ndị ajọọ-omume; n’ihi na ha ga-abụ ntụ n’okpuru ụkwụ unu n’ụbọchị nke m ga-eme nke a, ka Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha kwuru.

4 Cheta nu iwu nke Moses, nwa-oru m, nke m nyere ya n’iwu na aHoreb maka Israel nile, jiri usoro iwu nile na ikpe nile.

5 Lee, a ga m ezitara unu aElaịja onye-amụma ahụ tutu ọbịbịa nke nnukwu bụbọchị ahụ dị egwu nke Onye-nwe;

6 Ma ọ aga-atụgharị obi nke ndị nna nye ndị bụ ụmụ, na obi nke ndị bụ ụmụ nye ndị nna ha, ka m wee ghara ịbịa ma jiri ọbụbụ-ọnụ tie ụwa otiti ihe.