Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 26


Isi 26

Jisus wee kọwadaruo ihe nile ala site na mmalite ruo n’ọgwụgwụ—Ụmụaka na ụmụ-ntakịrị wee kwupụta ihe ndị dị ịtụ-n’anya ndị a na-enweghị ike ide ede—Ndị nọ na Nzukọ-nsọ nke Kraịst na-enwekọrịta ihe nile onu n’etiti ha. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Jisus kọsịworo ihe ndị a ọ kọwadaruru ha ala nye igwe-mmadụ ahụ; ma ọ kọwadaruru ihe nile ala nye ha, ma ndị ukwu ma ndị nta.

2 Ma ọ sịrị: aakwụkwọ-nsọ ndị a, nke unu na-ejighi n’onwe unu, Nna nyere iwu ka m nye unu ya; n’ihi na ọbụụrụ amamihe n’ime ya ka e wee nye ha ọgbọ ndị na-abịa-abịa.

3 Ma ọ kọwadaruru ihe nile ala, ọbụna site na mmalite ruo oge nke ọ ga-abịa an’otuto ya—e, ọbụna ihe nile nke ga-abịa n’elu iru nke ụwa, ọbụna ruo mgbe bihe nile-e jiri mee ihe ga-agbaze site na ịdị oke ọkụ, ma a cga-afụkọta ụwa ọnụ dịka akwụkwọ e dere ede, ma elu-igwe nile na ụwa ga-agabiga;

4 Ma ọbụna ruo na annukwu na ụbọchị ikpe-azụ ahụ, mgbe ndị nile, na ebo nile, na mba nile na asụsụ nile bga-eguzoro n’iru Chineke, ka e kpee ha ikpe maka ọrụ ha nile, ma ha dị mma ma-ọbụ ma ha dị njọ—

5 Ọ bụrụ na ha dị mma, gaa na ambilite n’ọnwụ nke ndụ mgbe nile na-adigide; ma ọbụrụ na ha dị njọ, gaa na mbilite nke ọmụma-ikpe; ebe ha dị n’ahịrị abụọ na-enweghị ike izute onwe ha, otu dị n’otu akụkụ na nke ọzọ n’akụkụ nke ọzọ, dịka ebere ahụ, na bikpe ahụ ziri-ezi, na ịdị-nsọ nke dị n’ime Kraịst siri dị, onye nọ ctutu ụwa amalite.

6 Ma ugbua a gaghị enwe ike ide ha n’ime akwụkwọ a ọbụna aotu uzo n’uzo otu narị akụkụ nke ihe nile nke Jisus kụziiri ndị ahụ n’ezie;

7 Mana lee aepekele nile nke Nifaị banyere akụkụ nke karịrị n’ihe nile nke ọ kụziiri ndị ahụ.

8 Ma ihe ndị a ka m deworo, ndị bụ akụkụ nke ka ntakịrị n’ihe ndị ahụ ọ kụziiri ndị ahụ; ma e dewo m ha n’ihi ebum-n’obi na e nwere ike iweta kwa ha ọzọ nye ndị a, asite na ndị Jentaịlụ, dịka okwu nile nke Jisus kwuworo siri dị.

9 Ma mgbe ha ga-anatawọrịị nke a, nke dị mkpa na ha ga-ebu-ụzọ nweta, inwale okwukwe ha, ma ọbụrụ na ha ga-ekwere ihe ndị a mgbe ahụ ka a ga-ekpughere ha ihe ndị nke akarịrị nnukwu.

10 Ma ọbụrụ na ha agaghị e kwere ihe ndị a, mgbe ahụ ka a aga-ejichi ihe ndị nke karịrị nnukwu site n’ebe ha nọ, ruo n’amam-ikpe ha.

11 Lee, a chọrọ m ide ha, ihe nile ndị a kanyere n’elu epekele nke Nifaị, mana Onye-nwe jụrụ ya, na-asị: Aga m aanwale okwukwe nke ndị m.

12 Ya mere mụ, Mọmọn, na-ede ihe ndị Onye-nwe nyeworo m n’iwu. Ma ugbua mụ, Mọmọn, na-abịa na ngwụcha nke ikwu okwu m nile, ma na-aga n’iru ide ihe ndị e nyeworo m n’iwu.

13 Ya mere ọ ga-adị m mma ka unu hụ na Onye-nwe kụziiri ndị ahụ ihe n’ezi-okwu, mkpụrụ ụbọchị atọ; ma mgbe nke ahụ mesịrị o agosịrị ha onwe ya ọtụtụ mgbe, ma nyawa bachịcha ọtụtụ mgbe, ma gọzie ya, ma nye ha ya.

14 Ma o wee ruo na ọ kụziri ma kwusaa ozi-ọma nye aụmụ nke igwe-mmadụ ahụ ndị nke e kwuworo maka ha, ma ọ btọghepụrụ ire ha nile, ma ha kwusaara ndị nna ha nnukwu ihe ịtụ-n’anya nile, ọbụna karịa ka o kpugheworo nye ndị ahụ; ma ọ tọghepụrụ ire ha nile ka ha wee kwuo okwu.

15 Ma o wee ruo na mgbe ọ rigoworo n’elu-igwe—nke ugboro abụọ na o gosịrị ha onwe ya, ma ọ gakwuworo Nna, mgbe ọ agwọsịworo ndị ọrịa ha, na ndị ngwọro ha, ma meghee anya nile nke ndị isi ha ma kwụsị-imechị ntị nile nke ndị na-echi ntị, ma ọbụna o mewo ụdị ịgwọ-ọrịa nile dị iche iche n’etiti ha, ma kulite otu nwoke site na ndị nwụrụ-anwụ, ma o gosipụtawo ha ike ya, ma ọ rịgokwuruwo Nna.

16 Lee, o wee ruo n’echi ya na igwe-mmadụ ahụ kpọkọtara onwe ha ọnụ, ma ha hụrụ ma nụ kwa ihe ụmụ ndị a kwuru; e, ọbụna aụmụaka meghere ọnụ ha nile ma kwuo ihe dị ịtụ-n’anya; ma ihe ndị nke ha kwuru a jụrụ ka onye ọbụla ghara ide ha.

17 Ma o wee ruo na andị na-eso uzo ahụ nke Jisus họrọworo malitere site n’oge ahụ gaa n’iru bime baptism na ịkụziri ka ha ra bịakwutere ha; ma ka ha ra bụ ndị e mere baptism n’aha nke Jisus emejupụtara ha na Mụọ Nsọ.

18 Ma ọtụtụ n’ime ha hụrụ ma nụ ihe ndị a na-enweghị-ike ikwu, ndị ana-adịghị n’iwu ka e dee ha.

19 Ma ha kụziri, ma ha kwusara ozi-ọma otu onye nye ibe ya; ma ha nwekọrịtara aihe nile bn’otu n’etiti ha, onye ọbụla na-eme ihe ziri-ezi, otu na ibe ya.

20 Ma o wee ruo na ha mere ihe nile ọbụna dịka Jisus nyeworo ha n’iwu.

21 Ma ndị ahụ e mere baptism n’aha nke Jisus a kpọrọ ha anzukọ-nsọ nke Kraịst.