Akwụkwọ nsọ
3 Nifaị 22


Isi 22

N’ụbọchị ndị ikpe-azụ, Zaịọn na mpaghara-ukwu ya nile, ka a ga-ehiwe, ma a ga-ekpokọbata Israel n’ebere na ịdị-nro—Ha ga-an̄ụrị ọn̄ụ—Tulee Aịsaịa 54. Ihe dịka afọ 34 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma mgbe ahụ ka ihe ahụ e dere ede ga-eme: Bụọ abụ, O ndị n’enweghị ike ịmụ nwa, unu ndị na-amụghị nwa; tipụta an’ịbụ abụ, ma tisie mkpu ike, unu ndị na-ataghị ahụhụ ịmụ nwa; n’ihi na ụmụ nke tọgbọrọ-n’efu ka ọtụtụ karịa ụmụ nke nwunye lụrụ di, ka Onye-nwe kwuru.

2 Mee ka ebe ụlọ ikwuu gị bụwanye ibu, ma mee ka ha setịpụ akwa-mkpuchi nile nke ebe obibi gị nile; e debekwala, gbatịa ụdọ gị nile ogologo ma mee ka astek unu nile sie ike.

3 N’ihi na ị ga-agbasasị n’aka nri ma n’aka ekpe, ma mkpụrụ-afọ gị ga-eketa ndị aJentaịlụ ma mee obodo-ukwu tọgbọrọ-n’efu nile ka mmadụ biri na ha.

4 Atụla egwu, n’ihi na ihere agaghị eme gị; ọbụghị ma ị ga-enwe mgbagwoju-anya, n’ihi na-agaghị etinye gị an’ihere; n’ihi na ị ga-echefu ihere nke mgbe okorọbịa gị, ma ị gaghị echeta ihere e mere gị na mgbe okorọbịa gị, ma ị gaghị echeta kwa ihere e mere gị maka na di gị nwụrụ-anwụ ọzọ.

5 N’ihi na onye kere gị, di gị, Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha bụ aha ya; ma Onye-Mgbapụta gị, Onye-Nsọ nke Israel—Chineke nke ụwa nile ka a ga-akpọ ya.

6 N’ihi na Onye-nwe akpọwo gị dịka nwanyị a jụrụ-ajụ ma nwe mwute na mụọ, na nwunye nke okorọbịa, mgbe a jụrụ gị, ka Chineke kwuru.

7 Na nwa oge ka m jụworo gị, mana nnukwu ebere nile ka m ga-eji kpọkọta gị.

8 Na nwa ntakịrị iwe e zoro m iru m site n’ebe ị nọ na nwa oge, mana obi-ọma mgbe nile na-adigide ka m ga-eji mere gị aebere, ka Onye-nwe Onye-Mgbapụta gị kwuru.

9 N’ihi anke a, bmmiri nile nke Noa nye m, n’ihi na dịka m n̄ụworo-iyi na mmiri nile nke Noa agaghị ekpuchi kwa ụwa ọzọ, otua ka m n̄ụworo iyi na m agaghị ewere gị oke iwe.

10 N’ihi na augwu-ukwu nile ga-apụ ma a ga-ewepụ ugwu-nta nile, mana obi-ọma m agaghị esị n’ebe ị nọ bpụọ, ọbụghị ma ọgbụgba-ndụ nke udo m a ga ewepụ ya, ka Onye-nwe nke nwere obi ebere n’arụ gị kwuru.

11 O gị onye a na-akpagbu akpagbu, oke-ikuku-mmiri na ebugharị, ma a naghị akasị gị obi! Lee, aga m eji aokwute nile tụrụ ọmarịcha agwa wugharịa gị, ma jiri ọmarịcha ọla-safaịa nile tụọ ntọ-ala gị nile.

12 Ma aga m eji ọla-aget nile mee ọnụ-uzọ nta gị nile, ma jiri ọla-kabọnkụl mee ọnụ-uzo-ama gị nile, ma jiri okwute nile na amasị anya mee oke-ala gị nile.

13 Ma aụmụ gị nile a ga-akụziri ha ihe site n’aka Onye-nwe; ma nnukwu ka udo nke ụmụ gị ga-adị.

14 aN’ezi-omume ka a ga-ehiwe gị; ị ga-anọ n’ebe dị anya site na mmegbu n’ihi na ị gaghị atụ egwu, ma site n’ihe iyi egwu n’ihi na ọ gaghị abịa gị nso.

15 Lee, ha ga-agbakọtarịrị ọnụ imegide gị, ọbụghị site na m; ndị ọbụla ga-agbakọta ọnụ imegide gị ga-ada n’ihi gị.

16 Lee, ekewo m onye-ọkpụ-ụzụ nke na-afụ unyi nile dị n’ọkụ, na nke na-ewepụta ngwa-ọrụ maka ọrụ ya; ma ekewo m onye-mbibi ka o bibie.

17 Ọ dịghị ngwa-agha ọbụla a kpụrụ imegide gị ga-eme nke ọma; ma ire ọbụla nke ga-ekwu ajọọ-okwu megide gị n’ikpe, ị ga-ama ya ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ụmụ-oru nke Onye-nwe, ma ezi-omume ha si na m, ka Onye-nwe kwuru.