Akwụkwọ nsọ
Ákára ihu-akwụkwọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn


Akwụkwọ nke Mọmọn

Nkọwasi E Dere Site
N’aka nke Mọmọn
N’elu Epekele
E Wetara Site N’epekele nile nke Nifaị

Ya mere, ọ bụ na mkpirisi akụkọ-ndekọta banyere ndị Nifaị, na kwa ndị Leman—E degaara ndị Leman, ndị bụ ndị fọdụrụ bụ nke ụlọ nke Israel; na kwa ndị Juu na Jentaịlụ—E dere n’ụdị iwu-nsọ, na kwa site n’ike nke mụọ ibu-amụma na nke nkpughe—E dere ma rachie, ma zookwara ya Onye-nwe, ka a ghara imebi ha—Ka ha pụtakwa site n’onyinye na ike nke Chineke, maka nsụgharị-okwu dị n’ime ya—A rachịrị site n’aka nke Moronaị, ma zookwara ya Onye-nwe, ka ha pụta kwa mgbe oge ruru site n’aka ndị Jentaịlụ—Nsụgharị-okwu dị n’ime ya site n’onyinye nke Chineke.

Na mkpirisi ewepụtara site n’Akwụkwọ nke Ita kwa, nke bụ akụkọ-ndekọta nke ndị Jared, ndị gbasasịrị n’oge Onye-nwe gwakọtara asụsụ ha, mgbe ha nọrịị n’ewu ụlọ-elụ tọwa iji garuo elu-igwe—Nke ga-egosị ndị fọdụrụ nke ụlọ nke Israel ọtụtụ nnukwu ihe Onye-nwe meworo nye ndị nna ha; na kwa ka ha nwee ike ịmata ọgbụgba-ndụ nile nke Onye-nwe, na achụpụghị ha ruo mgbe nile—Na kwa ime ka ndị Juu na ndị Jentaịlụ kwenye na Jisus bụ Kraịst ahụ, Chineke mgbe Ebighi-ebi, na-egosị onwe ya mba nile—Ma ugbua, ọbụrụ na e nwere ndehie ha bụ nghọtahịe nke mmadụ; ya mere, a katọkwala ihe nile nke Chineke, ka e wee nweta gị n’ụdị ndị na-enweghị ntụpọ n’oche ikpe nke Kraịst.

Ntụgharị-asụsụ nke mbụ ya site n’epekele nile n’Asụsụ Bekee sitere
n’aka Joseph Smith Nta

Mbipụta Asụsụ Bekee nke mbụ e bipụtara na
Palmyra, New York, USA, n’afọ 1830