Akwụkwọ nsọ
Nke-nke nkọwa gbasara Akwụkwọ nke Mọmọn


Nke-nke nkọwa gbasara
Akwụkwọ nke Mọmọn

Akwụkwọ nke Mọmọn bụ akụkọ-ndekọta dị nsọ banyere ndị mgbe ọchịe bi n’Amerika, ma a kanyere ya n’elu ọtụtụ mbara igwe. Ụdị epekele igwe anọ ka e kwuru maka ha n’ime akwụkwọ ahụ n’onwe ya:

  1. Epekele nile nke Nifaị, nke dị ụdị abụọ; ndị Ntakịrị Epekele, na ndị Nnukwu Epekele. Nke mbụ kara lekwasị anya n’odide ihe nke mụọ na ije-ozi na ozizi nke ndị-amụma, ebe nke ikpeazụ ka e jiri dekarịa akụkọ ihe nke ụwa ndị ahụ ọ gbasara (1 Nifaị 9:2–4). Site n’oge Mosaịa, otu o sịla dị, epekele ndị nnukwu ahụ kwa gbakwunyere ihe nke mụọ ndị dị kwa ezi mkpa.

  2. Epekele nile nke Mọmọn, nke ihe dị n’ime ya bụ akụkọ mkpirisi si n’aka Mọmọn site n’Epekele ndị Nnukwu nke Nifaị, nwere ọtụtụ nkọwa. Epekele ndị a kwa nwere n’ime ha ịga n’iru nke akụkọ si n’aka Mọmọn na mgbakwụnye si n’aka nwa ya nwoke Moronaị.

  3. Epekele nile ndị nke Ita, nke gosịrị akụkọ nke ndị Jared. Akụkọ-ndekọta a ka e gburu na mkpirisi site n’aka Moronaị, onye tinyere nkọwa nke onwe ya ma chịkọta akụkọ-ndekọta ahụ ya na akụkọ ozuru-ọha n’okpuru isi okwu “Akwụkwọ nke Ita.”

  4. Epekele nile nke Bras e wetara site n’aka ndị nke Lihaị si na Jerusalem n’ime afọ 600 tupu amụọ Kraịst. Ndị a bu n’ime ha “akwụkwọ ise nke Moses,… Na kwa akụkọ-ndekọta nke ndị Juu site na mmalite,… gbada ruo na mbido ọchịchị nke Zedekaịa, eze nke Juda; Na kwa ibu-amụma nile nke ndị-amụma dị nsọ” (1 Nifaị 5:11–13). Ọtụtụ nn̄omi sitere n’epekele ndị a, n̄omiri Aịsaịa na ndị ọzọ bụ ndị-amụma si na Bible na ndị na esịghị na Bible, pụtara n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ.

Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ ihe dị n’ime ya bụ isi akụkụ iri na ise ma-ọbụ nkewa, ihe e jiri mara ha ma e wezuga otu, bụ akwụkwọ, a gụrụ aha nke onye kachara dee ya. Akụkụ nke mbụ (akwụkwọ isii ndị mbụ, kwụsịrị na Ọmnaị) bụ ntụgharị-asụsụ si n’Epekele ndị Ntakịrị nke Nifaị. N’etiti akwụkwọ ndị nke Ọmnaị na Mosaịa bụ nke ntinye a akpọrọ Okwu nile nke Mọmọn. Ntinye a jikọtara akụkọ-ndekọta ahụ a kanyere n’elụ Epekele ndị Ntakịrị ya na mkpirisi edemede nke Mọmọn banyere Epekele ndị Nnukwu.

Akụkụ kacha ogologo, site na Mosaịa ruo Mọmọn, isi 7, ma achịkọta ha, bụ ntụgharị-asụsụ nke igbu na mkpirisi nke Mọmọn gburu ya n’Epekele ndị Nnukwu nke Nifaị. Akụkụ mmechi ahụ, site na Mọmọn isi 8, ruo na ngwụcha ukwu akwụkwọ, ka a kanyere site n’aka nwa Mọmọn nwoke bụ Moronaị, onye mgbe o dechaworo akụkọ-ndekọta nke ndụ nna ya, gburu akụkọ-ndekọta nke ndị Jared na mkpirisi (dịka Akwụkwọ nke Ita) ma e mesịa o tinye akụkụ ndị a na-akpọ Akwụkwọ nke Moronaị.

N’ime ma-ọbụ ihe dịka 421, mgbe a mụworo Kraịst, Moronaị, bụ onye ikpeazụ na ndị-amụma Nifaị ndị mụtara akụkọ gbasara ihe gara aga, rachịrị akụkọ-ndekọta dị-nsọ ahụ ma zoo ha nye Onye-nwe, ka e wee wepụta ha n’oge ikpeazụ, dịka olu nke Chineke buru ụzọ gbaa ama site n’ọnụ ndị-amụma ya mgbe ọchịe. N’ime 1823 mgbe a mụworo Kraịst otu Moronaị a, bụzi onye e sịworo n’ọnwụ kulite, gara leta Onye-amụma Joseph Smith ma e mesịa o nyefee epekele ahụ a kanyere ihe n’aka ya.