Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 29


Isi 29

Mosaịa wee tụpụta uche ka ahọpụta ndị-ikpe n’ọnọdụ onye eze—Ndị eze na-abụghị ndị ezi-omume na-edụba ndị ha n’ime mmehie—Alma nke ka bụrụ nwata ka a họpụtara onye-isi-ikpe site n’olu nke ndị ahụ—Ọ bụ kwa onye isi nchụ-aja na Nzukọ-nsọ ahụ—Alma nke ka bụrụ Okenye na Mosaịa wee nwụọ. Ihe dịka n’afọ 92 ruo 91 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua mgbe Mosaịa meworo nke a o zipụrụ ozi gburu-gburu ala ahụ nile, n’etiti ndị ahụ nile, na-achọ ịmata ọchịchọ ha gbasara onye ga-abụ eze ha.

2 Ma o wee ruo na olu ndị ahụ bịara, na-asị: Anyị na-achọsike ka Erọn nwa gị bụrụ eze anyị na onye-ọchịchị anyị.

3 Ugbua Erọn agbagowọrịị ruo n’ala nke Nifaị, ya mere eze ahụ enweghị ike inyefe ala-eze ahụ n’aka ya; ọbụghị ma Erọn ọ ga-ewekwasị onwe ya ala-eze ahụ. ọbụghị ma o nwere onye n’ime aụmụ nwoke nke Mosaịa chọrọ iwekwasị onwe ha ala-eze ahụ.

4 Ya mere eze Mosaịa zipụrụ ọzọ n’etiti ndị ahụ; e, ọbụna okwu e dere ede ka o zipụrụ n’etiti ndị ahụ. Ma ndị a bụ okwu nile ndị ahụ e dere, na-asị:

5 Lee, O unu ndị m, ma-ọbụ ụmụnne m nwoke, n’ihi na e chere m maka unu n’ụzọdị-elu otu ahụ, a chọrọ m ka unu tụlee ihe ahụ nke a kpọrọ unu ka unu tụlee—n’ihi na unu chọsiri ike inwe aeze.

6 Ugbua a na m ekwupụtara unu na onye nke kwesịrị inwe ala-eze ahụ ajụwo, ma ọ gaghị ewe kwasị onwe ya ala-eze ahụ.

7 Ma ugbua ọbụrụ na a ga-enwe onye-ọzọ ahọpụtara n’ọnọdụ ya, lee egwu na-atụ m na ndọrọ-ndọrọ ga-apụta n’etiti unu. Ma onye matara ma ọbụghị nwa m nwoke, onye nke nwe ala-eze ahụ, nwere ike tụgharịa iwe iwe ma dọkpụrụ ụfọdụ n’ime ndị a tinyere onwe ya, nke ga-ebute agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile n’etiti unu, nke ga-abụ ihe ga-akpata ịkwafu nnukwu ọbara na ijehie n’ụzọ nke Onye-nwe, e, ma bibie mkpụrụ-obi nke ọtụtụ mmadụ.

8 Ugbua a sị m unu ka anyị nwe amamihe ma tụlee ihe ndị a, n’ihi na anyị ekwesịghị ibibi nwa m nwoke, ọbụghị ma anyị kwesịrị ibibi onye ọzọ ma ọbụrụ na ahọpụta ya n’ọnọdụ ya.

9 Ma ọbụrụ na nwa m nwoke ga-atụgharị ọzọ na mpako ya na ihe efu ya nile o nwere ike iwegachị ihe nile ndị o kwuworo, ma wereghachị ihe kwesịrị ya n’ala-eze ahụ, nke ga-eme ya na ndị ya ime nnukwu mmehie.

10 Ma ugbua ka anyị nwe amamihe ma lee anya n’iru maka ihe ndị a, ma mee ihe nke ga-eweta udo nke ndị a.

11 Ya mere a ga m abụ eze unu ụbọchị m nile fọdụrụ; otu o sila dị, aka anyị họpụta bndị-ikpe, ikpe ndị a ikpe dịka iwu anyị siri dị; ma anyị ga-ahazigharị ihe-omume nke ndị a ọhụrụ, n’ihi na anyị ga-ahọpụta ndị amamihe ịbụ ndị-ikpe, ndị ga-ekpe ndị a ikpe dịka iwu-nsọ nile nke Chineke siri dị.

12 Ugbua ọ ka mma na Chineke kpere mmadụ ikpe karịa mmadụ, n’ihi na ikpe Chineke nile n’ezi ezi oge nile, ma na ikpe nile nke mmadụ anaghị ezi ezi oge nile.

13 Ya mere, ọbụrụ na o kwere omume na unu ga-enwe andị ezi-omume ịbụ ndị eze unu, ndị ga-ehiwe iwu-nsọ nile nke Chineke, ma kpee ndị a ikpe dịka iwu ya nile siri dị, e, ọbụrụ na unu ga-enwe ndị mmadụ ịbụ ndị eze unu ndị ga-eme ọbụna dịka nna m bBenjamịn mere nye ndị ya—a sị m unu, ọbụrụ na nke a ga-adị otu a oge nile mgbe ahụ ọ ga-adị mkpa na unu ga-enwe ndị eze oge nile ịchị unu.

14 Ma ọbụna mụ n’onwe m arụwo ọrụ jiri ike nile na ike nke mụọ nile nke m nwetaworo, ịkụziri unu iwu-nsọ nile nke Chineke, na iwube udo gburu-gburu ala ahụ, ka a ghara inwe agha ọbụla ma-ọbụ ndọrọ-ndọrọ, izu ori, ma-ọbụ ịpụnara ihe, ma-ọbụ igbu mmadụ, ma-ọbụ ụdị ajọọ-omume ọbụla;

15 Ma onye ọbụla meworo ajọọ-omume, ya ka m ataworo ahụhụ dịka iwu nke o mebiworo siri dị, dịka iwu nke e nyeworo anyị site n’aka nna anyị ha siri dị.

16 Ugbua a sị m unu, na n’ihi na mmadụ nile ezighị ezi ọ dịghị mkpa na unu ga-enwe eze ma-ọbụ ndị eze ịchị unu.

17 N’ihi na lee, ka nnukwu aajọọ-omume ha nke otu bajọọ eze kpatara ka e mee, e, ma lee nnukwu mbibi!

18 E, cheta eze Noa, aajọọ-omume ya na ihe arụ ya nile, na kwa ajọọ-omume na ihe arụ nile nke ndị ya. Lee ụdị nnukwu mbibi bịakwasịrị ha; na kwa n’ihi ajọọ-omume ha nile e webatara ha n’ime bịbụ-oru.

19 Ma ma ọbụghị maka ọnọdụ ogbugbo nke Onye-okike amamihe-nile ha, ma nke a n’ihi ezigbo nchegharị ha, ha gararịị n’enweghị mgbanarị anọgide n’ime ịbụ-oru ruo ugbua.

20 Mana lee, ọ napụtara ha n’ihi na aha nwere umeala n’onwe ha n’iru ya; ma n’ihi na ha bbekusịrị ya mkpu akwa ike ọ napụtara ha site n’ịbụ-oru; ma otu a ka Onye-nwe na arụ ọrụ jiri ike ya n’ihe nile n’etiti ụmụ nke mmadụ, na-esetịpụ aka nke cebere nye ha bụ ndị tinyere dntụkwasị-obi ha na ya.

21 Ma lee, ugbua a sị m unu, unu enweghị ike ịchụtu onye eze ajọọ-omume ma ọbụghị site na nnukwu ndọrọ ndọrọ, na ịkwafu nnukwu ọbara.

22 N’ihi na lee, o nwere andị enyi ya n’ajọọ-omume, ma ọ na-edebe ndị nche ya gburu-gburu ya; ma ọ na-adowasị iwu nile nke ndị chịworo n’ezi-omume tutu ya achịwa; ma ọ na-azọgide n’okpuru ụkwụ ya iwu-nsọ nile nke Chineke;

23 Ma ọ na-eme iwu nile, ma na-ezipụ ha n’etiti ndị ya, e, iwu nile n’ụdị aajọọ-omume nke ya n’onwe ya; ma onye ọbụla nke na erubeghị-isi n’iwu ya nile ka ọ na-eme ka e bibie; ma onye ọbụla nke nupụrụ isi megide ya ọ ga-ezipụ ndị-agha ya megide ha n’agha, ma ọbụrụ na o nwee ike ọ ga-ebibi ha; ma otu a onye na-abụghị ezigbo eze na-eduhie ụzọ nile nke ezi-omume nile.

24 Ma ugbua lee a sị m unu, ọ dịghị mkpa na ụdị ihe arụ ndị a ga-abịakwasị unu.

25 Ya mere, họrọ nụ site n’olu ndị a, ndị-ikpe, ka e wee kpee unu ikpe dịka iwu nile nke e nyeworo unu site na ndị nna anyị ha siri dị, ndị bụ ezie, na ndị e nyere ha site n’aka nke Onye-nwe.

26 Ugbua o zughị ọha ọnụ na olu nke ndị ahụ chọrọ ihe ọbụla na-abụghị nke zịrị-ezi; ma na o zuru ọha na ndị ka ntakịrị n’ime ndị ahụ ịchọ nke ahụ na-akwụghị ọtọ; ya mere nke a ka unu ga-achọpụta ma mee ya iwu unu—ime ihe nile unu na-eme site n’olu nke ndị ahụ.

27 Ma aọbụrụ na oge bịa na olu nke ndị ahụ ga-ahọrọ ajọọ-omume, mgbe ahụ bụ oge nke ikpe nile nke Chineke ga-abịakwasị unu; e, mgbe ahụ bụ oge ọ ga-eleta unu site na nnukwu mbibi ọbụna dịka o sịworo leta ala nke a.

28 Ma ugbua ọbụrụ na unu nwere ndị-ikpe, ma ha anaghị ekpe unu ikpe dịka iwu nke e nyeworo siri dị, unu nwere ike ime ka e kpee ha ikpe n’aka onye ikpe ka elu.

29 Ọbụrụ na ndị-ikpe unu ka elu anaghị ekpe ikpe zịrị ezi, unu ga-eme ka ọnụ-ọgụgụ nta nke ndị-ikpe unu kara dị ala gbakọta ọnụ, ma ha ga-ekpe ndị-ikpe kara dị elu ikpe, dịka olu ndị ahụ siri dị.

30 Ma e enye m unu iwu ime ihe ndị a n’egwu nke Onye-nwe; ma a na m enye unu iwu ime ihe ndị a, ma na unu enwela eze; na ọbụrụ na ndị a emee mmehie na ajọọ-omume ha ga-aza ha n’isi nke onwe ha.

31 N’ihi na lee a sị m unu, mmehie nke ọtụtụ mmadụ esitewo n’ajọọ-omume nke ndị eze ha; ya mere ajọọ-omume ha nile ka a na-aza n’isi nke ndị eze ha.

32 Ma ugbua a chọrọ m ka aahaghị-n’otu nke a ghara ịdị ọzọ n’ala nke a, nke ka nke n’etiti ndị nkem a; mana a chọrọ m ka ala nke a bụrụ ala nke bntọhapụ, ma cmmadụ ọbụla ga-enwe ọn̄ụ na ihe nile ruru ya na ohere ya nile otu aka ahụ, ọbụrụraa na Onye-nwe hụrụ na o kwesịrị na anyị ga-ebi ma keta ala ahụ, e, ọbụna ọbụrụraa na ụmụ ụmụ anyị ọbụla na-anọ n’elu iru nke ala ahụ.

33 Ma ọtụtụ ihe ndị ka nke a ka eze Mosaịa dere nye ha, na-asaghere ha ọnwụnwa nile na nsogbu nile nke eze ezi-omume, e, ụfụ nile nke mkpụrụ-obi maka ndị ha, na kwa ntamu nile nke ndị ahụ nye eze ha; ma ọ kọwara ha nile nye ha.

34 Ma ọ gwara ha na ihe ndị a ekwesịghị ịdị; kama ka ibu-arọ ahụ bịakwasị ndị ahụ nile, ka onye ọbụla wee buru akụkụ nke ya.

35 Ma ọ saghekwaara ha nsụ-ahịa nile ha rụrụ ọrụ n’okpuru ya site n’inwe onye-eze n’enweghị ezi-omume ka ọ chịa ha;

36 E, ajọọ-omume ya nile na ihe arụ nile, na agha nile, na ndọrọ-ndọrọ nile, na ịkwafu ọbara, na izu ori, na ịpụnara ihe na ịgba akwụnakwụna nile, na ụdị ajọọ-omume nile nke a na-apụghị ịgụta ọnụ—na-agwa ha na ihe ndị a ekwesịghị ịdị, na ha kpachapụrụ anya na-emegide iwu-nsọ nile nke Chineke.

37 Ma ugbua o wee ruo, mgbe eze Mosaịa zipụworo ihe ndị a n’etiti ndị ahụ e mere ka ha kwenye n’ezi-okwu nke okwu ya nile.

38 Ya mere ha wepụrụ obi ha n’ịchọ eze, ma wee nwe ọnụnụ-ọkụ n’obi karịa na onye ọbụla ga-enwe ohere ahataha gburu-gburu ala ahụ nile, e, ma onye ọbụla gosịrị ịdị na njikere ịza ajụjụ maka mmehie nile nke onwe ya.

39 Ya mere, o wee ruo na ha kpọkọtara onwe ha ọnụ n’otu n’otu gburu-gburu ala ahụ nile, ịtụnye olu ha gbasara ndị ga-abụ ndị-ikpe ha, ikpe ha ikpe dịka aiwu ahụ nke e nyeworo ha siri dị; ma ha nwere oke ọn̄ụ n’ihi bntọhapụ nke e nyeworo ha.

40 Ma ha gbasịrị ike n’ịhụ n’anya n’ebe Mosaịa nọ; e, ha weliri ya elu karịa onye ọbụla ọzọ; n’ihi na ha elekwasịghị ya anya dịka eze ọchịchị-aka-ike nke na-achọ uru, e, maka uru ahụ bụ oke uru nke na-emebi mkpụrụ-obi; n’ihi na ọ naghị akụ na ụba n’aka ha, ọbụghị ma o nwere mmasị n’ịkwafu ọbara; mana o hiwewo audo n’ala ahụ, ma o kwenyeworo ndị ya na a ga-anapụta ha site n’ụdị ịbụ-oru nile dị iche iche; ya mere ha buliri ya elu, e, karịa, na-enweghị atụ.

41 Ma o wee ruo na ha rọpụtara andị-ikpe ịchị ha, ma-ọbụ ikpe ha ikpe dịka iwu ahụ siri dị, ma nke a ka ha mere gburu-gburu ala ahụ nile.

42 Ma o wee ruo na a họpụtara Alma ịbụ onye-isi-ikpe mbụ, ebe ọ bụ kwa onye isi nchụ-aja, ebe nna ya nyefeworo ọkwa ahụ n’aka ya, ma ebe o nyewokwara ya ọrụ gbasara ihe-omume nile nke nzukọ-nsọ ahụ.

43 Ma ugbua o wee ruo na Alma agara ije n’ụzọ nile nke Onye-nwe, ma o debere iwu-nsọ ya nile, ma o kpere ikpe nile ziri ezi; ma e nwere udo esepụghị aka n’ala ahụ dum.

44 Ma otu a malitere ọchịchị nke ndị-ikpe gburu-gburu ala ahụ nile nke Zarahemla, n’etiti ndị ahụ nile a na-akpọ ndị Nifaị; ma Alma bụ onye mbụ na onye-isi-ikpe.

45 Ma ugbua o wee ruo na nna ya nwụrụ, ebe ọ gbara iri afọ asatọ na abụọ, ebe o biworo ndụ imejupụta iwu-nsọ nile nke Chineke.

46 Ma o wee ruo na Mosaịa nwụkwara, n’ime iri afọ atọ na atọ nke ọchịchị ya; ebe ọ gbara airi afọ isii na atọ; nke mere ha nile, narị afọ ise na iteghete site n’oge Lihaị hapụrụ Jerusalem.

47 Ma otu a ka ọchịchị nke ndị eze nye ndị Nifaị siri gwụchaa; ma otu a ka ụbọchị nile nke Alma siri gwụchaa, onye bụ onye-nchọpụta nke nzukọ-nsọ ha.