Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 23


Nkọwasị nke Alma na ndị nke Onye-nwe, ndị a chụbara n’ime ọzara ahụ site na ndị nke eze Noa.

Mejupụtara isi 23 na 24.

Isi 23

Alma wee jụ ibu eze—O wee jee-ozi dịka onye isi nchụ-aja—Onye-nwe wee taa ndị ya ahụhụ, ma ndị Leman wee merie ala nke Hilam—Amiulọn, onye-ndu nke ndị nchụ-aja ajọọ-omume nke Eze Noa, wee chịa n’okpuru eze ndị Leman. Ihe dịka n’afọ 145 ruo 121 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua Alma, ebe Onye-nwe dọworo ya aka na ntị na ndị-agha eze Noa ga-abịakwasị ha, ma ebe o meworo ka ndị ya mata maka ya, ya mere ha chịkọtara igwe-anụ ha ọnụ, ma were site na mkpụrụ-akụkụ ha, ma pụọ baa n’ime ọzara ahụ n’iru ndị-agha nke eze Noa.

2 Ma Onye-nwe gbara ha ume, na ndị nke eze Noa enweghị ike ịchụfe ha ibibi ha.

3 Ma ha gbara ọsọ njem ụbọchị asatọ baa n’ime ọzara ahụ.

4 Ma ha batara n’otu ala, e, ọbụna ala mara ezigbo mma ma nwee ihe mmasị, ala nke mmiri dị ọcha.

5 Ma ha rụnyere ụlọ ikwuu ha nile, ma malite ịkọ ala, ma malite iwu ọtụtụ ụlọ: e, ha na-agba mbọ, ma rụọ ọrụ karịa.

6 Ma ndị ahụ chọsịrị ike na Alma ga-abụ eze ha, n’ihi na ọ bụ onye nwere ịhụ-n’anya nke ndị ya.

7 Mana ọ sịrị ha: Lee, ọ dịghị mkpa na anyị ga-enwe eze; n’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru: Unu aagaghị eweli otu anụ-arụ karịa ibe ya, ma-ọbụ otu onye agaghị eche onwe ya ịkarị onye ọzọ; ya mere a sị m unu ọdịghị mkpa na unu ga-enwe eze.

8 Otu o sila dị, asị na o kwere mee na unu ga-enwe ndị ezi-omume oge nile ịbụ eze unu ọ ga-adị mma ka unu nwee eze.

9 Mana cheta aajọọ-omume nke eze Noa na ndị nchụ-aja ya nile; ma mụ n’onwe m ka e bjidere n’ọnya, ma mee ọtụtụ ihe nke bụ arụ n’anya nke Onye-nwe, nke kpataara m nchegharị siri ike;

10 Otu o sila dị, mgbe annukwu mkpagbu gasịworo, Onye-nwe nụrụ akwa m nile, ma zaa ekpere m nile, ma o mewo m ngwa-ọrụ n’aka ya abụọ n’iweta bọtụtụ n’ime unu n’ọmụma nke ezi-okwu ya.

11 Otu o sila dị, n’ime nke a anaghị m eto onwe m, n’ihi na etozughị m inye onwe m otuto.

12 Ma ugbua a sị m unu, unu enwewo ọchịchị aka-ike n’aka eze Noa, ma nọdụwo n’ịbụ-oru n’aka ya na ndị nchụ-aja ya nile, ma ha ewebatawo unu n’ime ajọọ-omume; ya mere e kere unu agbụ, jiri aagbụ nke ajọọ-omume.

13 Ma ugbua dịka a napụtaworo unu site n’ike nke Chineke site n’agbụ ndị a nile; e, ọbụna site n’aka nke eze Noa na ndị ya, na kwa site n’agbụ nile nke ajọo-omume, ọbụna otu a a chọrọ m ka unu aga-nọgidesike na bntọhapụ nke a nke e sịworo mee ka unu nwere onwe unu, ma ka unu cghara ịtụkwasị nwoke ọbụla obi ịbụ eze nye unu.

14 Ma kwa atụkwasịla onye ọbụla obi ịbụ aonye-nkuzi unu ma-ọbụ onye-ozizi-ozi-ọma unu, ma ọbụghị ma-ọbụ onye nke Chineke, na-aga n’ụzọ ya nile ma na-edebe iwu-nsọ ya nile.

15 Otu a ka Alma kuziri ndị ya, na onye ọbụla aga-ahụ onye-agbata-obi ya n’anya dịka onwe ya, na a gaghị enwe bndọrọ-ndọrọ n’etiti ha.

16 Ma ugbua, Alma bụ aonye isi nchụ-aja ha, ebe ọ bụ onye-nchọpụta nke nzukọ-nsọ ha.

17 Ma o wee ruo na ọdịghị onye natara aikike ikwu ozi-ọma ma-ọbụ ịkụzi ma ọbụghị na o si n’aka ya site na Chineke. Ya mere o doro ndị nchụ-aja ha nile nsọ na ndị nkuzi ha nile; ma ọdịghị ndị e doro nsọ ma ọbụghị ndị ezi-omume.

18 Ya mere ha chere ndị nke ha nche, ma ana-azụ ha site n’ihe nile gbasara ezi-omume.

19 Ma o wee ruo na ha malitere ime nke-ọma karịa n’ala ahụ; ma ha kpọrọ ala ahụ Hilam.

20 Ma o wee ruo na ha mụbara ma mee nke-ọma karịa n’ala nke Hilam ahụ; ma ha wuru otu obodo-ukwu, nke ha kpọrọ obodo-ukwu nke Hilam.

21 Otu o sila dị Onye-nwe hụrụ mkpa ọ dị aịta ndị ya ahụhụ, e, ọ na-anwale bndidi ha na okwukwe ha.

22 Otu o sila dị—onye ọbụla tinyere antụkwasị-obi ya na ya onye ahụ ka a ga bebuli elu n’ụbọchị ikpe-azụ. E, ma otu a ka ọ dị ndị nke a.

23 N’ihi na lee, a ga m egosị gị na e wetara ha n’ịbụ-oru, ma ọdịghị onye nwere ike ịnapụta ha karịa Onye-nwe Chineke, e, ha ọbụna Chineke nke Abraham na Aịsak na nke Jekọb.

24 Ma o wee ruo na ọ napụtara ha, ma o gosịrị ha ike-ukwu ya, ma ịn̄ụrị ọn̄ụ ha nile dịịrị ukwuu.

25 N’ihi na lee, o wee ruo na mgbe ha nọ n’ala nke Hilam, e, n’obodo-ukwu nke Hilam, mgbe ha n’akọ ala gburu-gburu ebe ahụ, lee otu igwe ndị-agha nke ndị Leman nọ n’oke-ala ahụ nile.

26 Ugbua o wee ruo na ụmụnne nwoke Alma gbapụrụ site n’ubi ha nile, ma chịkọta onwe ha ọnụ n’obodo-ukwu nke Hilam; ma ha tụrụ nnukwu egwu n’ihi mpụta nke ndị Leman.

27 Mana Alma gara n’iru ma guzoro n’etiti ha, ma gbaa ha ume ka ha ghara ịtụ-egwu, mana ha ga-echeta Onye-nwe Chineke ha na ọ ga-anapụta ha.

28 Ya mere ha kwụsịrị ịtụ-egwụ ha nile, ma malite ibeku Onye-nwe ka o mee ka obi nile nke ndị Leman dị nro, ka ha wee debe ha, na ndị nwunye ha nile, na ụmụ ha.

29 Ma o wee ruo na Onye-nwe mere ka obi nile nke ndị Leman dị nro. Ma Alma na ụmụnne ya nwoke gara n’iru ma nyefee onwe ha n’aka ha ma ndị Leman wee nwere onwunwe ala nke Hilam.

30 Ugbua ndị-agha nile nke ndị Leman, ndị soro ndị nke eze Lịmhaị, efuwọrịị n’ime ọzara ahụ ọtụtụ ụbọchị gara aga.

31 Ma lee, ha achọtawọrịị ndị nchụ-aja nke eze Noa, n’ebe ha kpọrọ Amiulọn; ma ha amalitewọrịị inwe ala nke Amiulọn ma malitewo ịkọ ala.

32 Ugbua aha onye-ndu nke ndị nchụ-aja ahụ nile bụ Amiulọn.

33 Ma o wee ruo na Amiulọn rịọrọ ndị Leman; ma ziga kwa ndị nwunye ha nile, ndị bụ aụmụada nke ndị Leman, ịrịọ ụmụnne ha nwoke, ka ha ghara ibibi ndị di ha nile.

34 Ma ndị Leman nwere aọmiko n’arụ Amiulọn na ụmụnne ya nwoke, ma ha ebibighị ha, n’ihi ndị nwunye ha.

35 Amiulọn na ụmụnne ya nwoke sonye ndị Leman, ma ha na-aga njem n’ọzara ahụ n’ịchọta ala nke Nifaị mgbe ha chọpụtara ala nke Hilam, nke Alma nwere ya na ụmụunne ya nwoke.

36 Ma o wee ruo na ndị Leman kwere Alma nkwa na ụmụnne ya nwoke, na ọbụrụ na ha ga-egosị ha ụzọ nke dugara n’ala nke Nifaị na ha ga-ekwe ha nkwa ndụ ha na ntọhapụ ha.

37 Mana mgbe Alma gosịworo ha ụzọ ahụ nke dugara n’ala nke Nifaị ndị Leman edebeghị kwa nkwa ha kwere; mana ha debere andị nche gburu-gburu ala nke Hilam ahụ, iche Alma na ụmụnne ya nwoke.

38 Ma ndị fọdụrụ n’ime ha gara n’ala nke Nifaị, ma ụfọdụ n’ime ha lagachịrị n’ala nke Hilam, na kwa kpọrọ tinyere onwe ha ndị nwunye na ụmụ nke ndị nche nile ahụ ndị a hapụworo n’ala ahụ.

39 Ma eze nke ndị Leman ekwenyeworo Amiulọn na ọ ga-abụ onye-eze na onye-ọchịchị nye ndị ya, ndị nọ n’ala nke Hilam; otu o sila dị ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla megidere ọchịchọ nke eze nke ndị Leman.