Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 3


Isi 3

Eze Benjamịn wee gaa n’iru n’ịgwa ha okwu—Onye-nwe nke Pụrụ Ime Ihe nile ga-ezisa ozi ọma n’etiti ndị mmadụ n’ụlọ nke ejiri ụrọ wuo—Ọbara ga-apụta site n’oghere ntakịrị ọbụla mgbe ọ na-achụ aja mgbaghara mmehie nile nke ụwa—Nanị aha ya bụ nke site na ya nzọpụta ga-abịa—Ndị mmadụ ga-ewepụ mmadụ nke anụ arụ ma ghọọ ndị Nsọ site n’Aja mgbaghara mmehie ahụ—Ntaram-ahụhụ nke ndị ajọọ-mmadụ ga-adị ka ọdọ-ọkụ na nkume-ọkụ. Ihe dịka n’afọ 124 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ọzọ ụmụnne m nwoke, a ga m akpọ ige ntị unu, n’ihi na enwere m ihe ole na ole ọzọ m ga-agwa unu; n’ihi na lee, e nwere m ọtụtụ ihe m ga-agwa unu gbasara ihe nke ga-abịa.

2 Ma ihe ndị ahụ nke m ga-agwa unu ka e mere ka m mata site n’ọnụ aonye mụọ-ozi sitere n’ebe Chineke nọ bịa. Ma ọ sịrị m: Teta; ma e tetara m, ma lee o guzoro n’iru m.

3 Ma ọ sịrị m: Teta, ma nụrụ okwu nile nke m ga-agwa gị, n’ihi na lee, a bịara m ikwupụtara gị aozi ọma nke oke ọn̄ụ.

4 N’ihi na Onye-nwe anuwo ekpere gị nile, ma o kpewo site n’ezi-omume gị, ma o zitawo m ka m kwupụtara gị ka i wee n̄ụrịa ọn̄ụ; na ka i wee kwupụtara ndị gị, ka ha wee jupụta kwa n’ọn̄ụ.

5 N’ihi na lee, oge ahụ na-abịa, ma ọ dighị anya, mgbe n’ike, aOnye-nwe nke Pụrụ Ime Ihe nile onye na-achị, onye dịịrị, ma dị site mgbe ebighi-ebi nile ruo mgbe ebighi-ebi nile, ga-arịdata site n’elu-igwe n’etiti ụmụ nke mmadụ, ma ga-ebi bn’ụlọ e jiri ụrọ wuo, ma ga-agagharị n’etiti ndị mmadụ, na-arụ nnukwu cọrụ-ebube nile, dịka ịgwọ ndị ọrịa, ịkpọlite ndị nwụrụ-anwụ, ime ka ndị ngwọrọ gaa ije, ka ndị isi nweta ịhụ-ụzọ ha, na ndị ntị chiri ka ha nụ ihe, na ịgwọ ụdị ọrịa nile dị iche iche.

6 Ma ọ ga-achụpụ aekwensu nile, ma-ọbụ mụọ ọjọọ nile nke na-ebi n’ime obi nile nke ụmụ nke mmadụ.

7 Ma lee, ọ ga-ata ahụhụ aọnwụnwa nile, na ihe mgbu nke arụ, bagụụ, akpịrị-ịkpọ-nkụ, na ịda mba, ọbụna karịa nke mmadụ nwere ike cịta, ma ọbụghị na ọ bụ nke ọnwụ, n’ihi na lee, dọbara na-apụta site n’ohere ntakịrị nile, oke nnukwu ka eihe mgbu ya ga-adị n’ihi ajọọ-omume na ihe arụ nile nke ndị ya.

8 Ma a ga-akpọ ya aJisus Kraịst, bỌkpara nke Chineke, cNna nke elu-igwe na ụwa, Onye-okike nke ihe nile site na mmalite, ma dnne ya ka a ga-akpọ eMeri.

9 Ma lee, ọ na-abịakwute ndị ya, ka anzọpụta wee bịakwasị ụmụ nke mmadụ ọbụna site bn’okwukwe n’aha ya; ma ọbụna mgbe ihe nke a mesịrị, ha ga-ewere ya ka mmadụ, ma sị na o nwere cajọọ-mụọ, ma ha dga-eti ya ihe, ma ha ega-akpọgide ya n’obe.

10 Ma ọ aga-ebilite bn’ụbọchị nke atọ site na ndị nwụrụ anwụ, ma lee, ọ na-eguzo cikpe ụwa ikpe; ma lee, ihe ndị a nile ka a na-eme ka ikpe ziri ezi wee bịakwasị ụmụ nke mmadụ.

11 N’ihi na lee, ma aọbara ya kwa bna-achụ-aja maka mmehie nile nke ndị ahụ cdaworo site na njehie nke Adam, ndị nwụworo na-amaghị uche nke Chineke gbasara ha, ma-ọbụ ndị mehieworo dna-amaghị-ama.

12 Mana ahụhụ, ahụhụ ga-adịrị ya bụ onye matara na ya anupụrụ isi megide Chineke! N’ihi na nzọpụta anaghị abịara ndị dị otu a ma ọbụghị ma-ọbụ site na nchegharị na okwukwe bn’Onye-nwe Jisus Kraịst.

13 Ma Onye-nwe Chineke ezipụwo ndị-amụma ya dị nsọ n’etiti ụmụ nke mmadụ nile, ikwupụta ihe ndị a nye ebo nile, mba, na asụsụ, na site na ya onye ọbụla ga-ekwere na Kraịst ga-abịa, otu onye ahụ ga-enweta ansachapụ nke mmehie ha nile, ma n̄ụrịa na nnukwu ọn̄ụ karịrị-akarị, ọbụna bdịka a ga-asị na ọ bịawọrịị n’etiti ha.

14 Ma na Onye-nwe Chineke hụrụ na ndị ya bụ ndị na-akpọ-ekwe-nkụ, ma ọ họpụtara ha iwu, ọbụna aiwu nke Moses.

15 Ma ọtụtụ ihe iriba-ama nile, na ihe-ebube nile, ana ụdị nile, na onyinyo nile ka o gosịrị ha, gbasara ọbịbịa ya; na kwa ndị-amụma dị nsọ gwara ha gbasara ọbịbịa ya; ma na ha mesịrị obi ha ike, ma ha aghọtaghị na biwu nke Moses abaghị uru ma ọbụghị na o sitere n’aja mgbaghara mmehie nke ọbara ya.

16 Ma ọbụna ọbụrụ na okwere omume na aụmụ-ntakịrị nwere ike ime mmehie e nweghị ike ịzọpụta ha; ma na a sị m unu a bgọziri ha agọzi n’ihi na lee, dịka n’ime Adam, ma-ọbụ site n’okike, ha na-ada, ọbụna otu ahụ ọbara nke Kraịst na-achụ-aja mgbaghara mmehie ha nile.

17 Ma nke ka nke, a sị m unu, na aa gaghị enwe aha ọzọ e nyere ma-ọbụ ụzọ ọzọ ọbụla ma-ọbụ ụdị ọzọ bnzọpụta ga-esi bịara ụmụ nke mmadụ, nanị n’ime na site n’aha nke cKraịst, Onye-nwe nke Pụrụ Ime Ihe nile.

18 N’ihi na lee ọ na-ekpe ikpe, ma ikpe ya zịrị ezi; ma nwata agaghị ala n’iyi nke nwụrụ na nwata ya; ma na ndị mmadụ na-an̄ụ ọmụma ikpe nye mkpụrụ-obi nke ha ma ọbụghị ma ha wedatara onwe ha ala ma adịrị dịka ụmụ-ntakịrị, ma kwere na nzọpụta dịịrị, ma dị, ma ga-abịa, n’ime ma site bn’ọchụchụ-aja mgbaghara mmehie ọbara nke Kraịst, Onye-nwe nke Pụrụ Ime Ihe nile.

19 N’ihi na ammadụ nke ụdị okike bụ onye-iro Chineke, ma ọ bụrụworiị site bn’ọdịda nke Adam, ma ga-abụ, ruo mgbe nile na mgbe nile, ma ọbụghị ma o ckwenyere na nkwalite nile nke dMụọ Nsọ, ma wepụ ịbụ mmadụ nke anụ arụ, ghọọ eonye-nsọ site n’aja mgbaghara mmehie nke Kraịst Onye-nwe, ma dịrị dịka fnwata, na-adanye, dị nwayọ, dị umeala, nwe ndidi, jupụta n’ịhụ n’anya, dị na njikere ịdanye n’ihe nile nke Onye-nwe hụworo na o kwesịrị ịbịakwasị ya, ọbụna dịka nwatakịrị na adanyere nna ya.

20 Ma nke ka nke, a sị m gị, na oge ahụ ga-abịa mgbe aọmụma nke Onye-nzọpụta ahụ ga-agbasa ruo bmba, ebo, asụsụ, na ndị mmadụ.

21 Ma lee, mgbe oge ahụ ga-abịa, ọdịghị onye a ga-ahụ ana-enweghị ụta n’iru Chineke, ma ọbụghị ma-ọbụ ụmụ-ntakịrị, nanị site na nchegharị na okwukwe n’aha nke Onye-nwe Chineke nke Pụrụ Ime Ihe nile.

22 Ma ọbụna n’oge a, mgbe ị ga akụziwororịị ndị gị ihe nile nke Onye-nwe Chineke gị nyeworo gị n’iwu, ọbụna mgbe ahụ ka a ga-ahụ ha na-enweghị ntụpọ n’iru Chineke nanị dịka okwu nile nke m gwaworo gị siri dị.

23 Ma ugbua e kwuwo m okwu nile nke Onye-nwe Chineke nyeworo m n’iwu.

24 Ma otu a ka Onye-nwe kwuru: Ha ga-eguzoro dịka ihe ịgba-ama doro anya megide ndị a, n’ụbọchị ikpe; site na nke a ga-esi kpee ha ikpe, onye ọbụla dịka ọrụ ya nile siri dị, ma ha dị mma ma-ọbụ ma ha dị njọ.

25 Ma ọbụrụ na ha dị njọ a ga-enyefe ha an’olile-anya dị egwu nke ịta ụta onwe ha na ihe arụ nile, nke na-akpatara ha ịlaghachị azụ site n’iru Onye-nwe n’ime ọnọdụ nke bịhuju anya na ịta ahụhụ agwụgh-agwụ, site n’ebe ha na-agaghị enwe ike ịlaghachị ọzọ; ya mere ha an̄ụwo ọmụma-ikpe nye mkpụrụ-obi nke ha nile.

26 Ya mere, ha an̄ụwo site n’iko nke oke iwe nke Chineke, nke ikpe-zịrị-ezi na-enweghị kwa ike ọzọ ịgọnarị ha dịka ọ ga-agọnarị na aAdam ga-ada n’ihi iri bmkpụrụ-osisi a sị erila; ya mere, cebere agaghị enwekwa oke n’arụ ha ọzọ ruo mgbe nile.

27 Ma antaram-ahụhụ ha dị ka bọdọ-ọkụ na nkume-ọkụ, nke ire ọkụ ya na-enweghị mmenyụ, na nke anwụrụ-ọkụ ya na-arigoro elu ruo mgbe nile na mgbe nile. Otu a ka Onye-nwe nyeworo m iwu. Amen.