Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 15


Isi 15

Otu Kraịst siri bụrụ Nna na Ọkpara—Ọ ga-arịọchịte arịrịọ ma buru njehie nile nke ndị ya—Ha na ndị-amụma nile dị nsọ bụ mkpụrụ afọ ya—Ọ na-eweta na mmezu Mbilite-n’ọnwụ ahụ—Ụmụntakịrị nwere ndụ ebighi-ebi. Ihe dịka n’afọ 148 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua Abịnadaị sịrị ha: Ọ dị m ka unu ghọta na aChineke n’onwe ya ga-arịdata n’etiti ụmụ nke mmadụ, ma ọ bga-agbapụta ndị ya.

2 Ma n’ihi na ọ ana-ebi n’anụ-arụ a ga-akpọ ya Ọkpara nke Chineke, ma ebe o debeworo anụ arụ ahụ n’okpuru nke ọchịchọ nke bNna ahụ, ebe ọ bụ Nna na Ọkpara ahụ—

3 Nna ahụ, an’ihi na a btụrụ ime ya site n’ike Chineke; na Ọkpara ahụ, n’ihi anụ-arụ; otu a wee ghọọ Nna ahụ na Ọkpara—

4 Ma ha bụ aotu Chineke, e, bNna nke mgbe cEbighi-ebi ahụ n’ezie nke elu-igwe na nke ụwa.

5 Ma otu a anụ-arụ ebe ọ ghọrọ ihe dị n’okpuru Mụọ, ma-ọbụ Ọkpara ahụ nye Nna, ebe ọ bụ otu Chineke, atara ahụhụ ọnwụnwa, ma ọ dabaghị n’ọnwụnwa ahụ, kama ọ hapụrụ onwe ya ka akwa ya emu, ma bpịa ya ụtarị, ma chụpụ ya, ma ndị ya cajụ ya.

6 Ma mgbe ihe nile ndị a gasịrị, mgbe ọ rụsịrị ọrụ-ebube nile n’etiti ụmụ nke mmadụ, a ga-eduru ya, e, ọbụna adịka Aịsaịa kwuru, dịka atụrụ n’iru onye na-akpụcha ya ajị dara ogbu, otu a ka ọ bna-asagheghị ọnụ ya.

7 E, ọbụna otu a a ga-eduru ya, akpọgide ya n’obe, ma gbuo ya, anụ-arụ ahụ abụrụ ihe emere ka ọ dị n’okpuru ọbụna ruo ọnwụ, bọchịchọ nke Ọkpara ahụ abụrụ ihe elomiri n’ime ọchịchọ nke Nna ahụ.

8 Ma otu a Chineke wee dọbie aagbụ nile nke ọnwụ, ebe o bmeriworo ọnwụ; wee nye Ọkpara ahụ ike ịrịọ carịrịọ maka ụmụ nke mmadụ—

9 Ebe ọ rigoroworo n’elu-igwe, ebe o nwere afọ nile nke ebere; ebe o jupụtara n’ọmiko n’ebe ụmụ nke mmadụ nọ; ebe ọ nọ n’etiti ha na ikpe-zịrị-ezi; ebe ọ dọbiworo agbụ nile nke ọnwụ, ebe o wereworo n’isi aonwe ya ajọọ-omume ha na njehie ha nile, ebe ọ gbapụtaworo ha, ma bmetazuo ihe nile ikpe zịrị-ezi chọrọ.

10 Ma ugbua a sị m unu, onye ga-ekwupụta ọgbọ ya? Lee, a sị m unu, na mgbe e jiworo mkpụrụ-obi ya mee ihe-nchụ-aja nke mmehie ọ ga-ahụ amkpụrụ-afọ ya. Ma ugbua gịnị ka unu kwuru? Ma onye ga-abụ mkpụrụ-afọ ya?

11 Lee a sị m unu, na onye ọbụla nụworo okwu nile nke andị-amụma nile, e, ndị-amụma nile dị nsọ ndị buworo amụma gbasara ọbịbịa nke Onye-nwe—A sị m unu, na ndị nile n̄aworo ntị n’okwu ha nile, ma kwere na Onye-nwe ga-agbapụta ndị ya, ma lekwasịwo anya n’ụbọchị ahụ maka nsachapụ nke mmehie ha nile, A sị m unu, na ndị a bụ mkpụrụ-afọ ya ma-ọbụ ndị nketa nke bala-eze Chineke.

12 N’ihi na ndị a bụ ndị ahụ ao buruworo mmehie ha nile; ndị a bụ ndị ahụ ọ nwụworo n’ihi ha, ịgbapụta ha site na njehie ha nile. Ma ugbua, ha abụghị mkpụrụ-afọ ya?

13 E, ma ndị-amụma ha abụghị, onye ọbụla nke megheworo ọnụ ya ibu-amụma, nke na-adababeghị n’ime njehie, a na m ekwu maka ndị-amụma nile dị nsọ site na mgbe ụwa malitere? A sị m unu na ha bụ mkpụrụ-afọ ya.

14 Ma ndị a bụ ha ndị akwupụtaworo udo, ndị wetaworo ozi nile nke ihe ọma, ndị kwupụtaworo nzọpụta; ma sị Zaịọn: Chineke gị na-achị!

15 Ma O lee otu ịma-mma n’elu ugwu-ukwu nile ka ọba-ụkwụ ha dị!

16 Ma ọzọ lee otu ịma-mma n’elu ugwu-ukwu nile ka ọba ukwu nke ndị ahụ ka na-ekwupụta udo dị!

17 Ma ọzọ, lee otu ịma-mma n’elu ugwu-ukwu nile ka ọba ụkwụ nke ndị ga-ekwupụta udo ma emesịa dị, e, site n’oge a ga n’iru ruo na mgbe nile!

18 Ma lee, A sị m unu, nke a abụghị ihe nile. N’ihi na O lee ịma-mma n’elu ugwu-ukwu nile ka aọba-ụkwụ ya nile dị nke na-eweta ozi nile, nke bụ onye-nchọpụta nke budo, e, ọbụna Onye-nwe, onye gbapụtaworo ndị ya; e, ya onye nyeworo ndị ya nzọpụta;

19 N’ihi na asị na ọbụghị maka mgbapụta nke O meworo nye ndị ya, nke a kwadoro site na antọ-ala nke ụwa, A sị m unu, asị na ọbụghị maka nke a, ụmụ mmadụ nile gaara balawọrịị n’iyi.

20 Ma lee, agbụ nile nke ọnwụ ka a ga-adọbi, ma Ọkpara ahụ na-achị, ma o nwere ike n’ebe ndị nwụrụ-anwụ nọ; ya mere, ọ na-eweta na mmezu mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ-anwụ.

21 Ma mbilite n’ọnwụ na-abịa, ọbụna ambilite n’ọnwụ nke mbụ; e, ọbụna mbilite n’ọnwụ nke ndị biworọrịị, na ndị bị, na ndị ga-ebi, ọbụna ruo na mbilite n’ọnwụ nke Kraịst—n’ihi na otu a ka a ga-akpọ ya.

22 Ma ugbua, mbilite n’ọnwụ nke ndị-amụma nile, na ndị nile nke kweworo n’okwu ha nile, ma-ọbụ ndị nile nke debeworo iwu-nsọ nile nke Chineke, ga-apụta na mbilite n’ọnwụ nke mbụ; ya mere, ha bụ mbilite n’ọnwụ nke mbụ.

23 A kpọlitere ha aibinyere Chineke onye gbapụtaworo ha; otu a ha nwere ndụ ebighi-ebi site na Kraịst, onye bdọbiworo agbụ nile nke ọnwụ.

24 Ma ndị a bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite n’ọnwụ nke mbụ; ma ndị a bụ ndị ahụ nke nwụworọrịị tutu Kraịst abịa, n’amaghị-ama ha, na-enwetaghị anzọpụta e kwupụtara nye ha. Ma otu a Onye-nwe na-eweta mweghachi nke ndị a; ma ha nwere oke na mbilite n’ọnwụ nke mbụ, ma-ọbụ nwere ndụ-ebighi-ebi, ebe Onye-nwe gbapụtara ha.

25 Ma aụmụtakịrị kwa nwere ndụ ebighi-ebi.

26 Ma lee, ma atụọ egwụ, ma ma-jijiji n’iru Chineke, n’ihi na unu kwesịrị ịma-jijiji; n’ihi na Onye-nwe adịghị agbapụta otu n’ime ndị bna-enupu isi megide ya ma cnwụọ n’ime mmehie ha nile; e, ọbụna ndị nile ahụ laworọrịị n’iyi n’ime mmehie ha nile site na mgbe ụwa malitere, ndị siteworo na mkpachara-anya nupu-isi megide Chineke, ndị mataworọrịị iwu-nsọ nile nke Chineke, ma ha anaghị edebe ha; dndị a bụ ndị ena-enweghị-oke na mbilite n’ọnwụ nke mbụ.

27 Ya mere ọ bụ na unu ekwesịghị ịma-jijiji? N’ihi na nzọpụta anaghị abịara onye dị otu a; n’ihi na Onye-nwe agbapụtabeghị onye dị otu a; e, ọbụghị ma Onye-nwe o nwere ike ịgbapụta ndị di otu a; n’ihi na ọ gaghị agọnarị onwe ya; n’ihi na ọ gaghị agọnarị aikpe zịrị-ezi mgbe o na-emezu mkpebi ya.

28 Ma ugbua a sị m unu na oge ahụ ga-abịa na nzọpụta nke Onye-nwe ka a aga-ekwupụta nye mba, ebo, asụsụ, na mmadụ nile.

29 E, Onye-nwe, andị-nche gị ga-ewelite olu ha; n’otu olu ka ha ga-abụkọta abụ ọnụ; n’ihi na ha ga-ahụ anya na anya, mgbe Onye-nwe ga-eweta Zaịọn ọzọ.

30 Tịpụ mkpu ọn̄ụ, bụkọtanụ abụ ọnụ, unu mkpomkpo ebe nile nke Jerusalem; n’ihi na Onye-nwe akasịwo ndị ya obi, ọ gbapụtawo Jerusalem.

31 Onye-nwe agbawo ogwe-aka nsọ ya ọtọ n’anya nile nke mba nile; ma nsọtụ nile nke ụwa ga-ahụ nzọpụta nke Chineke anyị.