Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 18


Isi 18

Alma kwusara ozi-ọma na nzuzo—Ọ kọwara ọgbụgba-ndụ nke baptism ma mee baptism na mmiri nile nke Mọmọn—Ọ haziri nzukọ-nsọ nke Kraịst ma chie ndị nchụ-aja echichi—Ha kwadoro onwe ha ma kụziere ndị mmadụ ihe—Alma na ndị ya wee gbanarị Eze Noa baa n’ime ọzara ahụ. Ihe dịka n’afọ 147 ruo 145 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, o wee ruo na Alma, onye gbanarịworo ụmụ-oru nke eze Noa, achegharịrị site na mmehie ya nile na ajọọ-omume nile, ma jegharịa na nzuzo n’etiti ndị mmadụ, ma malite ikuzi okwu nile nke Abịnadaị—

2 E, gbasara ihe ahụ nke ga-abịa, na kwa gbasara mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ-anwụ, na amgbapụta nke ndị mmadụ, nke a ga-eweta na mmezu site bn’ike, na ntaram-ahụhụ nile, na ọnwụ nke Kraịst, na mbilite n’ọnwụ ya na irigoro baa n’elu-igwe.

3 Ma ka ha ra bụ ndị na-anụ okwu ya ka ọ kuziere. Ma ọ kuziiri ha na nzuzo, ka ọ ghara ịbịaru na mmata nke eze ahụ. Ma ọtụtụ kwere okwu ya nile.

4 Ma o wee ruo na ka ha ra bụ ndị kwere ya garuru aebe nke a kpọrọ Mọmọn, ebe e nwetaworo aha ya site n’eze ahụ, ebe ọ dị n’oke ala nile nke ala ahụ nke ihe jupụtara ya mgbe ụfọdụ ma-ọbụ oge ụfọdụ, bụ anụ-ọhịa nile.

5 Ugbua, e nwere na Mọmọn isi-mmiri nke mmiri dị ọcha, ma Alma gara n’ebe ahụ, ebe na nso nso mmiri ahụ enwere igbidigbi ọhịa nke ụmụ nke-nke osisi-jupụtara, ebe o zoro onwe ya n’oge ehihie site n’ọchịchọ nile nke eze ahụ na-achọ ya.

6 Ma o wee ruo na ka ha ra bụ ndị kweere ya gara ebe ahụ ịnụ okwu ya nile.

7 Ma o wee ruo mgbe ọtụtụ ụbọchị gafeworo, e nwere ezigbo ọnụ-ọgụgụ gbakọrọ ọnụ n’ebe nke Mọmọn ahụ, ịnụrụ okwu nile nke Alma. E, ha nile gbakọrọ ọnụ ndị kwere n’okwu ya, ịnụrụ okwu ya. Ma ọ akụziiri ha, ma kwuoro ha ozi-ọma nchegharị, na mgbapụta, na okwukwe n’Onye-nwe.

8 Ma o wee ruo na ọ sịrị ha: Lee, n’ebe a bụ mmiri nile nke Mọmọn (n’ihi na otu a ka a na-akpọ ha) ma ugbua, dịka unu achọsịrị ike ịbata bn’otu nke Chineke, na ka a na-akpọ unu ndị nke ya, ma cdị na njikere iburita ibu-arọ onye ọbụla nye ibe ya, ka ha wee dị mfe;

9 E, ma dị na njikere isoro ndị na-eru uju iru uju; e, ma kasie ha obi bụ ndị chọrọ nkasi-obi, na iguzo dịka andị aka-ebe nke Chineke n’oge nile na n’ihe nile, na n’ebe nile nke unu ga-anọ n’ime ya, ọbụna ruo ọnwụ, ka unu wee nwee mgbapụta site na Chineke, ma ka a gụnye unu n’ọnụ-ọgụgụ ndị nke bmbilite n’ọnwụ nke mbụ, ka unu wee nwee cndụ ebighi-ebi—

10 Ugbua a sị m unu, ọbụrụ na nke a bụ ọchịchọ obi unu nile, gịnị ka unu nwere megide aime unu baptism n’aha Onye-nwe, dịka aka-ebe n’iru ya na unu baworo n’ime bọgbụgba-ndụ unu na ya, na unu ga-ejere Ya ozi ma debe iwu-nsọ ya nile, ka o wee wụkwasi unu Mụọ ya n’ujụ ya nile?

11 Ma ugbua mgbe ndị ahụ nụworo okwu ndị a nile, ha kụrụ aka ha n’ọn̄ụ, ma tie: Nke a bụ ọchịchọ nke obi anyị nile.

12 Ma ugbua o wee ruo na Alma kpọrọ Hilam, ebe ọ bụ otu n’ime ndị mbụ, ma gaa ma guzoro n’ime mmiri ahụ, ma tie, na-asị: O Onye-nwe, wụkwasị Mụọ gị n’arụ nwa-oru gị, ka o wee rụọ ọrụ a n’ịdị nsọ nke obi.

13 Ma mgbe o kwusịworo okwu ndị a, aMụọ nke Onye-nwe dakwasịrị ya, ma ọ sịrị: Hilam, a na m beme gị baptism, ebe m nwere cikike site na Chineke nke Pụrụ Ime Ihe nile, dịka ịgba-ama na ị baworo n’ime ọgbụgba-ndụ ị jere ya ozi ruo mgbe ị nwụrụ dịka arụ na-anwụ anwụ; ma ka Mụọ nke Onye-nwe wụkwasị gị; ma ka o nye gị ndụ-ebighi-ebi, site na dmgbapụta nke Kraịst, onye o kwadoworo site na entọ-ala nke ụwa.

14 Ma mgbe Alma kwuworo okwu ndị a nile, ma Alma ma Hilam ka e aliri n’ime mmiri ahụ; ma ha biliri ma pụta site na mmiri ahụ na-an̄ụrị ọn̄ụ, ebe ha jupụtara na Mụọ ahụ.

15 Ma ọzọ, Alma kpọrọ onye ọzọ, ma banye nke ugboro abụọ n’ime mmiri ahụ, ma mee ya baptism dịka nke mbụ, nanị na olighị onwe ya ọzọ n’ime mmiri ahụ.

16 Ma n’ụdị dị otu a ka o mere onye ọbụla nke gabara n’ebe nke Mọmọn ahụ baptism; ma ha dị n’ọnụ-ọgụgụ narị abụọ na mkpụrụ-obi anọ; e, ma e amere ha baptism n’ime mmiri nke Mọmọn ahụ, ma e mejupụtara ha bn’amara nke Chineke.

17 Ma a kpọrọ ha nzukọ-nsọ nke Chineke, ma-ọbụ anzukọ-nsọ nke Kraịst, site n’oge ahụ gaa n’iru. Ma o wee ruo na onye ọbụla nke e mere baptism site n’ike na ikike nke Chineke a gụnyere ya na nzukọ ya.

18 Ma o wee ruo na Alma, ebe o nwere aikike sitere na Chineke, chiri ndị nchụ-aja; ọbụna otu onye nchụ-aja nye iri ise ọbụla nke ọnụ-ọgụgụ ha ka o chiri echichi ikwusa ozi-ọma nye ha, na bikuziri ha gbasara ihe ndị metụtara ala-eze Chineke ahụ.

19 Ma o nyere ha iwu na ha agaghị akụzi ihe ọbụla ma ọbụghị ihe ndị ahụ ọ kuziworo, na nke e kwuworo site n’ọnụ nke ndị-amụma nile dị nsọ.

20 E, ọbụna o nyere ha iwu na ha agaghị aekwusa ozi-ọma ọbụla ma ọbụghị nchegharị na okwukwe n’Onye-nwe, onye gbapụtaworo ndị ya.

21 Ma o nyere ha iwu na agaghị enwe andọrọ-ndọrọ otu onye na ibe ya, kama na ha ga-ele anya n’iru jiri botu anya, ebe ha nwere otu okwukwe na otu baptism, ebe ha nwere obi e jikọtara ọnụ cn’idi n’otu na n’ịhụ n’anya otu n’ebe ibe ya nọ.

22 Ma otu a o nyere ha iwu ikwusa ozi-ọma. Ma otu a ha ghọrọ aụmụ nke Chineke.

23 Ma o nyere ha iwu na ha ga-edebe aụbọchị izu-ike ma debe ya nsọ, na kwa ụbọchị nile ha ga-enye Onye-nwe Chineke ha ekele.

24 Ma o nyekwara ha iwu na ndị nchụ-aja ahụ ndị o chiworo, ga aarụ ọrụ n’aka ha maka nkwado nke onwe ha.

25 Ma e nwere otu ụbọchị n’ime otu izu-ụka nile nke e wepụtara iche na ha ga-akpọkọta onwe ha ọnụ ịkụziri ndị ahụ, na aịkpọ-isi-ala nye Onye-nwe Chineke ha, na kwa, dịka mgbe ọbụla ha nwere ike ka ha, kpọkọta onwe ha ọnụ.

26 Ma ndị nchụ-aja ahụ agaghị na-adabere n’arụ ndị ahụ maka nkwado ha; kama site n’ọrụ nke ha ka ha ga na-anata aamara nke Chineke, ka ha wee gbasie-ike na Mụọ, ebe ha nwere bmmata nke Chineke, ka ha wee kuzie n’ike na ikike sitere na Chineke.

27 Ma ọzọ Alma nyere iwu na ndị nke nzukọ-nsọ ahụ ga-ekesa site n’ihe onwunwe ha, aonye ọbụla dịka nke o nwere siri dị; ọbụrụ na o nwere n’uju karịa ọ ga-ekesa n’uju karịa; ma n’aka nke onye nwere nanị nke ntakịrị, nanị nke ntakịrị ka a ga-achọ; ma onye nke na-enweghị, a ga-enye ya.

28 Ma otu a ha ga-enye ihe onwunwe ha site na mmasị nke onwe ha na ọchịchọ-ọma n’ebe Chineke nọ, Ma nye ndị nchụ-aja ahụ nile chọrọ enyem-aka, e, ma nye onye ọbụla chọrọ enye m aka, mkpụrụ-obi gba ọtọ.

29 Ma nke a ka ọ sịrị ha, ebe e nyeworo ya n’iwu site na Chineke; ma ha agara ije kwụ-ọtọ n’iru Chineke, bna-enyerịta otu onye nye ibe ya, ma nke arụ ma na nke mụọ dịka mkpa ha nile na ọchịchọ ha nile siri dị.

30 Ma o wee ruo na ihe nile ndị a ka e mere n’ime Mọmọn, e, n’akụkụ ammiri nke Mọmọn, n’ime oke-ọhịa ahụ nke dị nso mmiri nile nke Mọmọn; e, ebe nke Mọmọn, mmiri nile nke Mọmọn, oke-ọhịa nke Mọmọn ahụ, lee otu ịma-mma ha siri dị n’anya nke ndị ahụ n’ebe ahụ bịara na mmata nke Onye-mgbapụta ha; e, ma lee otu e siri gọzie ha, n’ihi na ha ga-abụ abụ otuto nye ya ruo mgbe nile.

31 Ma ihe ndị a ka e mere an’oke nile nke ala ahụ, ka ha ghara ịbịa na mmata nke eze ahụ.

32 Mana lee o wee ruo na eze ahụ, ebe ọ chọpụtaworo otu mmegharị arụ n’etiti ndị ahụ, zigara ụmụ-oru ya iche ha. Ya mere n’ụbọchị nke ha na-akpọkọta onwe ha ọnụ ịnụ okwu nke Onye-nwe a chọpụtara ha nye eze ahụ.

33 Ma ugbua eze ahụ sịrị na Alma na-akpasu ndị ahụ n’inupu-isi megide ya; ya mere o zipụrụ ndị-agha ya ibibi ha.

34 Ma o wee ruo na aa gwara Alma na ndị nke Onye-nwe maka ọbịbịa nke ndị-agha eze ahụ; ya mere ha weere ụlọ ikwuu ha nile ma kpọrọ ezi na ụlọ ha nile ma pụọ, baa n’ime ọzara ahụ.

35 Ma ha dị n’ọnụ-ọgụgụ ihe dịka mkpụrụ-obi narị anọ na iri ise.