Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 10


Isi 10

Eze Leman wee nwụọ—Ndị ya bụ ndị ime ọhịa ma dị egwu ma kwere na omenala ụgha nile—Zinịf na ndị ya wee nwe mmeri megide ha. Ihe dịka n’afọ 187 ruo 160 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na anyị malitere ọzọ ihiwe ala-eze ahụ ma anyị malitere ọzọ inwere ala ahụ n’udo. Ma e mere m ka e nwee ngwa-ọgụ nile nke agha e mere n’ụdị ọbụla, na site na nke a m ga-enwe ngwa-ọgụ maka ndị m chere oge ndị Leman ga-abịalite ọzọ ịlụ ọgụ megide ndị m.

2 Ma e debere m ndị nche gburu-gburu ala ahụ, ka ndị Leman ghara ịbịakwasị anyị ọzọ n’amaghị ama ma bibie anyị; ma otu a ka m siri chee ndị m na igwe anụ m nile ma debe ha site n’ịdaba n’aka nke ndị iro anyị nile.

3 Ma o wee ruo na anyị ketara ala ahụ nke ndị nna anyị ruo ọtụtụ afọ, e, ruo afọ iri abụọ na abụọ.

4 Ma e mere m ka ndị nwoke kọọ ala, ma kụọ ụdị akụkụ nile dị iche-iche na ụdị amkpụrụ-osisi nile dị iche-iche n’ụdị ọbụla.

5 Ma e mere m ka ndị nwanyị kụọ ogho, ma dọlịa, ma rụọ ọrụ, ma rụọ ụdị ọmarịcha akwa linen nile dị iche-iche, e, ma aakwa n’ụdị ọbụla, ka anyị wee kpuchie ịgba-ọtọ anyị; ma otu a anyị mere nke ọma n’ala ahụ—otu a anyị nwegidere udo n’ala ahụ ruo afọ iri abụọ na abụọ.

6 Ma o wee ruo na eze aLeman nwụrụ, ma nwa ya nwoke malitere ịchị n’ọnọdụ ya. Ma ọ malitere ịkpalite ndị ya n’inupu isi megide ndị m, ya mere ha malitere ịkwado maka agha, na ịbịalite n’ibu agha megide ndị m.

7 Ma na e zigawo m ndị-onyota-ọgba-ama gaa gburu-gburu ala ahụ nke aShemlọn, ka m wee chọpụta nkwadobe ha nile, ka m wee chere ha, ka ha ghara ịbịakwasị ndị m ma bibie ha.

8 Ma o wee ruo na ha bịakwasịrị elu-elu nke ala ahụ nke Shaịlọm, jiri imerime igwe ha nile, ụmụ-nwoke aji ngwa-ọgụ nke bụta, ma jiri arọ, ma jiri mma-agha nile, ma jiri mma agha rọrọ arọ, ma jiri okwute, ma jiri ébè; ma ha kpụrụ isi ha nke mere na ha gbaa ọtọ; ma ha yiri ihe nkedo ukwu nke akpụkpọ-anụ n’ukwu ha nile.

9 Ma o wee ruo na e mere m ka ndị ụmụ-nwanyị na ụmụ-ntakịrị nke ndị m ka aga zoo ha n’ime ozara ahụ; na kwa mee ka ndị nwoke kara nka m nile nwere ike ibu ngwa-agha, na kwa ndị okorọbịa m nile nwere ike ibu ngwa-agha, ga kpọkọta onwe ha ọnụ ilụso ndị Leman agha; ma e debere m ha n’ọnọdụ ha nile, onye ọbụla dịka afọ ole ọgbara siri dị.

10 Ma o wee ruo na anyị gbagoro ịbuso ndị Leman agha; ma mụ, ọbụna mụ, na nka m, gbagoro ịbuso ndị Leman agha. Ma o wee ruo na anyị gara an’ike nke Onye-nwe n’ịlụ agha.

11 Ugbua, ndị Leman adịghị ihe ha matara gbasara Onye-nwe, ma-ọbụ maka ike nke Onye-nwe, ya mere ha dabere n’elu ike nke onwe ha. Ma na ha bụụrụ ndị gbasịrị ike, dịka isi ike nke mmadụ siri dị.

12 Ha bụụrụ andị ime ọhịa, ma dị egwụ, na ndị akpịrị na-akpọ-nkụ maka ọbara, na-kwere bn’omenala nke ndị nna ha, nke bụ nke a—ikwere na a chụpụrụ ha site n’ala Jerusalem n’ihi ajọọ-omume nke ndị nna ha, ma na e mejọrọ ha n’ime ozara ahụ site n’aka ụmụnne ha nwoke, na e mejọkwara ha mgbe ha na-agafee osimiri ahụ;

13 Ma ọzọ, na e mejọrọ ha mgbe ha nọ n’ala nke anketa mbụ ha, mgbe ha gafesịworo osimiri ahụ, ma ihe ndị a nile n’ihi na Nifaị kara nwe okwukwe n’idebe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe—ya mere Onye-nwe bgosịrị ya iru ọma, n’ihi na Onye-nwe nụrụ ekpere ya nile ma zaa ha, ma buru ụzọ na njem ha n’ime ọzara ahụ.

14 Ma ụmụnne ya nwoke weere ya oke iwe n’ihi na ha aaghọtaghị mmeso nile nke Onye-nwe, ha wekwara boke iwe megide ya n’elu mmiri nile ahụ n’ihi na ha mechisiri obi ha ike megide Onye-nwe.

15 Ma ọzọ, ha wesoro ya oke iwe mgbe ha ruteworo n’ala e kwere na nkwa, n’ihi na ha sịrị na ọ wepụwo aọchịchị nke ndị ahụ site n’aka ha nile; ma ha chọrọ igbu ya.

16 Ma ọzọ, ha weere ya oke iwe n’ihi na ọ hapụrụ baa n’ime ozara ahụ dịka Onye-nwe siri nye ya iwu, ma were aakụkọ-ndekọta nile nke a kanyere n’elu epekele nke bras ahụ, n’ihi na ha sịrị na o bzuru ha ori.

17 Ma otu a ha akụziworo ụmụ ha na ha kwesịrị ịkpọ ha asị, ma na ha kwesịrị igbu ha, ma na ha kwesịrị izu na ịpụnara ha ihe, ma mee ihe nile ha nwere ike ibibi ha; ya mere ha nwere nkpọrọ m asị ebighi-ebi n’ebe ụmụ Nifaị nọ.

18 N’ihi otu ihe nke a ka eze Leman, site n’aghụghọ ya, na nka-aghụghọ okwu ụgha, na nkwa ọma ya nile, ghọgburu m, na m kpọlitaworo ndị m nke a n’ime ala nke a, ka ha wee bibie ha; e, ma anyị atawo ahụhụ ọtụtụ afọ ndị a nile n’ala ahụ.

19 Ma ugbua mụ, Zinịf, mgbe m kọsịworo ihe nile ndị a nye ndị m gbasara ndị Leman, a kpalitere m ha ibu agha jiri ike ha, na-itinye okwukwe ha n’Onye-nwe, ya mere, anyị lụsoro ha agha, n’iru na iru.

20 Ma o wee ruo na anyị chụpụrụ ha ọzọ site n’ala anyị, ma anyị gburu ha site na nnukwu ogbugbu, ọbụna rue ọtụtụ ọnụ ọgụgụ nke na anyị agụghị ha ọnụ.

21 Ma o wee ruo na anyị laghachịrị ọzọ n’ala nke onwe anyị, ma ndị m malitere ọzọ ilekọta igwe-anụ ha nile, na ịkọ ala ha.

22 Ma ugbua mụ, ebe m kaworo nka, nyefere ala-eze ahụ n’aka otu n’ime ụmụ m nwoke; ya mere, agaghị m ekwu karịa otu a. Ma ka Onye-nwe gọzie ndị m. Amen.