Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 6


Isi 6

Eze Benjamịn wee dekọta aha nile nke ndị ahụ ma họpụta ndị nchụ-aja ịkụziri ha—Mosaịa wee chịa dịka eze ezi-omume. Ihe dịka n’afọ 124 ruo 121 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, eze Benjamịn chere na ọ dị mkpa, mgbe ọ gwasịworo ndị ahụ okwu, ka o awere aha nile nke ndị ahụ baworo n’ime ọgbụgba-ndụ ha na Chineke idebe iwu-nsọ ya nile.

2 Ma o wee ruo na enweghị otu mkpụrụ-obi, e wezuga ụmụ-ntakịrị, bụ ndị banyeworo n’ime ọgbụgba-ndụ ma bukwasịwo onwe ha aha nke Kraịst.

3 Ma ọzọ, o wee ruo na mgbe eze Benjamịn bịaworo na ngwụcha nke ihe ndị a nile, ma doworịị nwa ya nwoke aMosaịa nsọ ịbụ onye-ọchịchị na eze nke ndị ya, ma o nyewo ya rịị nkụzi nile gbasara ala-eze ahụ, na kwa bhọpụtawo ndị nchụ-aja cikuziri ndị ahụ, na site na ya ha ga-anụ ma mata iwu nile nke Chineke, na ịkpalite ha na ncheta nke dọn̄ụn̄ụ-iyi ahụ nke ha meworo, ọ gbasara igwe-mmadụ ahụ, ma ha laghachịrị, onye ọbụla, dịka ezi na ụlọ ha siri dị, n’ụlọ nile nke onwe ha.

4 Ma aMosaịa malitere ịchị n’ọnọdụ nna ya. Ma o malitere ịchị n’afọ nke iri atọ ya, nke mere ha nile, ihe dịka narị afọ anọ na iri asaa na isii site bn’oge nke Lihaị hapụrụ Jerusalem.

5 Ma eze Benjamịn dịịrị ndụ afọ atọ, ma ọ nwụrụ.

6 Ma o wee ruo na eze Mosaịa gara ije n’ụzọ nile nke Onye-nwe, ma ọ chọpụtara ikpe ya nile na usoro-iwu ya nile, ma debe iwu-nsọ ya nile n’ihe nile ọbụla o nyere ya n’iwu.

7 Ma eze Mosaịa mere ndị nke ya ka ha na-akọ ala. Ma ya kwa, n’onwe ya, kọrọ ala, na site na ya ọ agaghị abụ ibu-arọ nye ndị ya, ka o mee dịka ihe nke nna ya meworo n’ihe nile. Ma enweghị ndọrọ-ndọrọ n’etiti ndị ya nile ruo afọ atọ.