Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 14


Isi 14

Aịsaịa wee kwuo dịka Mesaịa—Mweda-ala Mesaịa ahụ na ahụhụ nile ka a kọwasịworo—Ọ wee mee mkpụrụ-obi ya ihe ịchụ-aja nke mmehie ma na-arịọrọ ndị mmehie arịrịọ—Tulee Aịsaịa 53. Ihe dịka n’afọ 148 tutu amụọ Kraịst.

1 E, ọbụna ọbụghị Aịsaịa siri: Onye kwereworo akụkọ anyị, ma onye ka e kpugheere ogwe-aka nke Onye-nwe?

2 N’ihi na ọ ga-etolite n’iru ya dịka osisi dị nro, na dịka mgbọrọgwụ sitere n’ala kpọrọ nkụ; o nweghị ụdị ma-ọbụ mma-ile-anya; ma mgbe anyị ga-ahụ ya ọdịghị mma ile anya nke ga-eme ka anyị chọọ ya.

3 Eledara ya anya ma ndị mmadụ jụrụ ya ajụ; otu nwoke nke jupụtara na mwute, na ịkwa-arịrị amarawo ya arụ; ma anyị zoro dịka o siri dị iru anyị nile site n’ebe ọ nọ; eledara ya anya, ma anyị akpọghị ya mmadụ.

4 N’ezie o aburuwo barịrị anyị nile, ma buru mwute anyị nile; ma na anyị weere ya dịka onye e meriri emeri, onye Chineke tiri otiti-ihe, ma kpagbuo ya.

5 Mana e merụrụ ya arụ n’ihi anjehie anyị nile, e tirụrụ ya arụ n’ihi ajọọ-omume anyị nile; ịta nnukwu ahụhụ nke udo anyị dị n’isi ya, ma n’ihi ụfụ arụ ya a bgwọwo anyị.

6 Anyị nile, dịka aatụrụ, akpafuwo; anyị atụgharịwo onye ọbụla n’ụzọ nke onwe ya, ma Onye-nwe atụkwasịwo n’elu onwe ya ajọọ-omume nile nke anyị nile.

7 A chịrị ya ọchịchị-aka-ike, ma e nyere ya mkpagbu, mana a sagheghị ọnụ ya; a kpọtara ya dịka bnwa-atụrụ jee n’ụlọ ogbugbu, ma dịka atụrụ n’iru ndị na-akpụcha ya ajị, dara ogbu, ya mere ọ sagheghị ọnụ ya.

8 A kpọpụtara ya site n’ụlọ-mkpọrọ na site n’ikpe-ikpe; ma onye ga-ekwupụta ọgbọ ya? N’ihi na e kewapụrụ ya site n’ala nke ndị dị ndụ; n’ihi njehie nile nke ndị m ka e jiri tigbuo ya.

9 Ma o mere ili ya ya na ndị ajọọ-omume, ma ya na andị ọgaranya n’ọnwụ ya; n’ihi na o mebeghị bnjọ ọbụla, ọbụghị ma o nwere aghụghọ ọbụla dị n’ọnụ ya.

10 Mana ọ masịrị Onye-nwe itirụ ya arụ; o tinyewo ya na mwute; mgbe ị ga-eme mkpụrụ-obi ya ihe nchụ-aja maka mmehie ọ ga-ahụ amkpụrụ-afọ ya, ọ ga-agbatị ụbọchị ya nile ogologo, ma mmasị nke Onye-nwe ga-eme nke-ọma n’aka ya.

11 Ọ ga-ahụ nrụsi-ọrụ-ike nke mkpụrụ-obi ya, ma ọ ga-enwe afọ-ojuju; site n’ọmụma ya ka nwa-oru m na-eme ezi-omume ga-ekpepụta ọtụtụ; n’ihi na ọ aga-eburu ajọọ-omume ha nile.

12 Ya mere a ga m ekenye ya oke ya na ndị dị ukwuu, ma ọ ga-eke ngwo-ngwo agha ahụ ya na ndị siri ike; n’ihi na ọ wụpụtawo mkpụrụ-obi ya ruo ọnwụ; ma a gụnyere ya na ndị njehie; ma o buuru mmehie nke ọtụtụ, ma arịọọrọ ndị njehie arịrịọ.