Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 9


Akụkọ-ndekọta nke Zinịf—Nkọwasị maka ndị ya, site n’oge ha hapụrụ ala nke Zarahemla ruo oge nke anapụtara ha site n’aka ndị Leman.

Mejupụtara isi 9 ruo isi 22 e tinyekọtara.

Isi 9

Zinịf wee duru otu lgwe mmadụ site na Zarahemla inweta ala nke Lihaị-Nifaị—Eze ndị Leman nyere ha ikike iketa ala ahụ—Enwere ọgụ dara n’etiti ndị Leman na ndị nke Zinịf. Ihe dịka n’afọ 200 ruo 187 tutu amụọ Kraịst.

1 Mu, Zinịf, ebe a kụziworo m n’asụsụ nile nke ndị Nifaị, na ebe m mataworo maka aala nke Nifaị, ma-ọbụ maka ala nke nketa mbụ nna anyị ha, ma ebe edupụworo m dịka onye onyota-ọgba-ama n’etiti ndị Leman ka m wee nyopụta ndị-agha ha nile, ka ndị-agha anyị nwe ike bịakwasị ha ma bibie ha—ma na mgbe m hụrụ ihe ahụ dị mma n’etiti ha a chọsịrị m ike na ha agaghị abụ ndị ebibiri.

2 Ya mere, a dọrọ m ndọrọ ndọrọ mụ na ụmụnne m nwoke n’ime ọzara n’ihi na a chọrọ m ka onye-ọchịchị anyị nweta nkwekọrịta anyị na ha; ma na ebe ọbụ onye dị ike na nwoke agụụ-ọbara na-agụ o nyere iwu ka egbuo m; ma na a zopụtara m site na nkwafu nke nnukwu ọbara; n’ihi na nna lụrụ ọgụ megide nna, na nwanne nwoke megide nwanne nwoke, ruo mgbe e bibiri ọnụ ọgụgụ nke karịrị na ndị-agha anyị n’ime ọzara ahụ; ma anyị laghachiri, ndị n’ime anyị nke a hapụrụ, ruo ala nke Zarahemla, ịkọwa akụkọ ahụ nye ndị nwunye ha na ụmụ ha.

3 Ma na-agbanyeghị, ebe m nwere oke ọnụnụ ọkụ n’obi iketa ala nke nna anyị ha ahụ, chịkọtara ndị nile ndị nwere ọchịchọ ịgbago inweta ala ahụ, ma malite ọzọ na njem anyị n’ime ọzara ahụ ịgbago ruo ala ahụ; ma na etiri anyị otiti ihe site n’ụnwụ na ajọọ mkpagbu nile; n’ihi na anyị ejighi ike na-icheta Onye-nwe Chineke anyị.

4 Otu o sila dị, mgbe ọtụtụ ụbọchị gafeworo na mwagharị anyị n’ime ọzara ahụ anyị rụnyere ụlọ-ịkwuu anyị n’ebe ahụ e gburu ụmụnne anyị nwoke, nke dị nso n’ala nke nna anyị ha.

5 Ma o wee ruo na a gara m ọzọ kpọrọ ndị nwoke m anọ baa n’ime obodo-ukwu ahụ, baa gakwuru eze ahụ, ka m wee mata ọnọdụ-obi eze ahụ, na ka m mata ma m nwere ike ibanye mụ na ndị m ma nwere ala ahụ n’udo.

6 Ma a gabara m gakwuru eze ahụ, ma mụ na ya gbara-ndụ na m nwere ike-inwere ala ahụ nke ndị Lihaị-Nifaị, na ala ahụ nke Shaịlọm.

7 Ma o nyekwara iwu ka ndị ya pụọ site n’ala ahụ, ma mụ na ndị m bara n’ime ala ahụ ka anyị wee nwere ya.

8 Ma anyị malitere iwu ụlọ nile, na iruzi mgbidi nke obodo-ukwu ahụ, e, ọbụna mgbidi nile ahụ nke obodo-ukwu Lihaị-Nifaị, na obodo-ukwu nke Shaịlọm.

9 Ma anyị malitere ịkọ ala ahụ, e, ọbụna jiri ụdị mkpụrụ-akụkụ nile n’ụdị dị iche-iche, jiri ọtụtụ mkpụrụ ọka, na nke wit, na nke bali, ma tinyere neas, ma tinyere sheum, ma tinyere mkpụrụ-akụkụ nke osisi nile n’ụdị dị iche iche; ma anyị malitere ibawanye na ime nke ọma n’ala ahụ.

10 Ugbua ọbụ aghụghọ na oke akọ nke eze Leman, aiweta ndị m n’ime ịbụ-oru, ka o nyepụrụ ala ahụ ka anyị wee nwere ya.

11 Ya mere o wee ruo, na mgbe anyị biworo n’ala ahụ afọ iri na abụọ na eze Leman malitere inwe obi ịlọ mmiri adịghị ama-ama ndị m ga-agbasi-ike n’ala ahụ, ruo na ha enweghị ike ịka ha ike ma weta ha n’ime ịbụ-oru.

12 Ugbua ha bụ andị ume-ngwụ na ndị n’ekpere arụsị; ya mere ha chọsịrị ike iweta anyị n’ime ịbụ-oru, ka ha wee bie ndụ dị elu site n’ọrụ nile nke aka anyị; e, ka ha wee meere onwe ha oriri n’elu igwe-anụ nke ubi anyị nile.

13 Ya mere o wee ruo na eze Leman malitere ịkpalite ndị ya ka ha see okwu ha na ndị m; ya mere a malitere inwe agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile n’ala ahụ.

14 N’ihi na, n’ime afọ nke iri na atọ nke ọchịchị m n’ala nke Nifaị, na mpụta na ndịda-ndịda nke ala ahụ nke Shaịlọm, mgbe ndị m n’agba-mmiri na-enye igwe anụ ha nri, na ịkọ ala ha nile, imerime igwe ndị Leman bịakwasịrị ha ma malite igbu ha, na iwepụ igwe-anụ ha, na ọka nke ubi ha nile.

15 E, ma o wee ruo na ha gbalagara, ka ha ra bụ ndị a na-achụfeghị, ọbụna garuo n’ime obodo-ukwu ahụ nke Nifaị, ma kpọkụo m maka nchekwa.

16 Ma o wee ruo na m nyere ha ngwa-ọgụ site n’ụta na site n’arọ, site na mma-agha, na site na mma-agha rọrọ-arọ, na site na nkụ-nkụ, na site n’ébè, na site na ụdị ngwa-ọgụ nile dị iche-iche anyị nwere ike imepụta, ma mụ na ndị m gara n’iru megide ndị Leman n’ilụ agha.

17 E, n’ike nke Onye-nwe ka anyị gara n’iru n’ịlụ agha megide ndị Leman; n’ihi na mụ na ndị m bere akwa dị ukwuu nye Onye-nwe ka o wee napụta anyị site n’aka nile nke ndị iro anyị, n’ihi na e metere anyị n’ụra ruo na ncheta nke nnapụta nke ndị nna anyị ha.

18 Ma Chineke anụrụ akwa anyị nile ma zaa ekpere anyị nile; ma anyị gara n’iru n’ike ya: e, anyị gara n’iru megide ndị Leman, ma n’ime otu ụbọchị na otu abalị anyị gburu puku atọ na iri anọ na atọ; anyị gburu ha ọbụna ruo mgbe anyị chụpụworo ha site n’ala anyị.

19 Ma mụ, n’onwe m, n’aka nke m, nyere aka lie ndị ha nwụrụ anwụ. Ma lee, na nnukwu mwute na akwa arịrị anyị, narị abụọ na iri asaa na iteghete n’ime ụmụnne anyị nwoke ka e gburu.