Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 11


Isi 11

Eze Noa wee na-achị n’ajọọ-omume—Ọ na-an̄ụrị n’ime ibi ndụ ọgba-aghara ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya nile—Abịnadaị wee na-ebu-amụma na ndị ahụ a ga-eweba ha n’ime ịbụ-oru—Ndụ ya ka Eze Noa na-achọ. Ihe dịka n’afọ 160 ruo 150 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na Zinịf nyefere ala-eze ahụ n’aka Noa, otu n’ime ụmụ ya nwoke; ya mere Noa malitere ịchị n’ọnọdụ ya; ma ọ gaghị ije n’ụzọ nile nke nna ya.

2 N’ihi na lee, o debeghị iwu-nsọ nile nke Chineke, ma ọ gara ije n’ọchịchọ nke obi ya onwe ya. Ma o nwere ọtụtụ ndị nwunye na andị iko. Ma o bmere ka ndị ya mee mmehie, ma mee ihe ahụ rụrụ arụ n’anya nke Onye-nwe. E, ma ha gbara cakwụnakwụna nile na ụdị ajọọ-omume nile dị iche-iche.

3 Ma o kere ụtụ nke otu ụzọ n’ụzọ ise nke ihe nile ha nwere, otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọla-edo ha na nke ọla ọcha ha, na otu ụzọ n’ụzọ ise nke azịff ha, na nke ọla-kọpa ha, na nke ọla bras ha na nke igwe ha, na otu ụzọ n’ụzọ ise nke anụ ha nile gbara abụba; na kwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke akụkụ-ubi ha nile.

4 Ma ihe nile a ka o weere iji kwado onwe ya, na ndị nwunye ya nile na ndị iko ya; na kwa ndị nchụ-aja ya, na ndị nwunye ha na ndị iko ha; otu a ọ gbanwewo ihe omume nile nke ala-eze ahụ.

5 N’ihi na o wedawo ndị nchụ-aja nile nke edoworo-nsọ site na aka nna ya, ma doo ndị ọhụrụ nsọ n’ọnọdụ ha, ụdị ndị buliri onwe ha elu na mpako nke obi ha nile.

6 E, ma otu a a kwadoro ha n’ume-ngwu ha, ma n’ife arụsị ha, na n’ịgba akwụnakwụna ha nile, site n’ụtụ nile nke eze Noa bokwasịworo ndị ya; otu a ka ndị ahụ siri rụọ ọrụ karịa ịkwado ajọọ-ihe.

7 E, ma ha ghọkwara ndị-n’efe-arụsị, n’ihi na a ghọgburu ha site n’ihe efu na okwu otuto n’esighị n’obi nile nke eze ahụ na ndị nchụ-aja nile; n’ihi na ha na-agwa ha ọtụtụ ihe n’esighị n’obi pụta.

8 Ma o wee ruo na eze Noa wuru ọtụtụ ụlọ dị mma ile anya ma saa mbara; ma ọ chọrọ ha mma site n’ọmarịcha ọrụ nke osisi, na nke ụdị ihe oke ọnụ-ahịa nile dị iche-iche, nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke igwe, na nke ọla-bras, na nke zịff, na nke ọla-kọpa.

9 Ma o wukwara onwe ya obi-eze sara mbara, na oche-eze n’etiti ya, nke ha nile bụụrụ nke ọmarịcha osisi ma e jiri ọla-edo na ọla-ọcha chọọ ya mma na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụ ahịa.

10 Ma o mekwara ka ndị-ọrụ ya na-arụ ụdị ọmarịcha ọrụ nile dị iche-iche n’arụ nile nke ime mgbidi nile, nke temple ahụ, nke ọmarịcha osisi, na nke ọla kọpa, na nke ọla bras.

11 Ma oche nile ndị e debere iche maka ndị isi nchụ-aja nile, ndị nke dị elu karịa oche ndị nke ọzọ nile, ka ọ chọrọ mma jiri ọla-edo na-enweghị ntụpọ; ma o mere ka e wuo ihe mkpuchi n’iru ha, ka ha wee debe arụ ha nile na aka ha abụọ n’elu ya mgbe ha ga-ekwu okwu ụgha na okwu efu nile nye ndị ya.

12 Ma o wee ruo na o wuru aụlọ-elu tọwa na nso temple ahụ; e, ụlọ-elu tọwa dị ezigbo elu, ọbụna dị elu nke na o nwere ike iguzoro n’elu ya ma huzuo ala nke Shaịlọm, na kwa ala nke Shemlọn, nke ndị nwe ya bụ ndị Leman; ma o nwere ike ilezu anya ọbụna ruo ala nile gbara gburu-gburu.

13 Ma o wee ruo na o mere ka e wuo ọtụtụ ụlọ n’ala Shaịlọm; ma o mere ka e wuo nnukwu ụlọ-elu tọwa n’elu ugwu elu-elu nke ala Shaịlọm ahụ, nke bụworo rị ebe nchekwa maka ụmụ nke Nifaị n’oge ha gbapụrụ site n’ala ahụ, ma otu a ka o mere akụ na ụba nke o nwetara site n’ụtụ nke ndị ya ahụ.

14 Ma o wee ruo na ọ tụkwasịrị obi ya n’elu akụ na ụba ya, ma o mefuru oge ya n’ibi ndụ ịla n’iyi ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya; ma otu a ka ndị nchụ-aja ya nile tụfuru oge ha ha na ndị akwụnakwụna.

15 Ma o wee ruo na ọ kụrụ osisi-vine gburu-gburu n’ala ahụ; ma o wuru igwe-na-apa-mmanya nile, ma mepụta mmanya n’uju ya; ma ya mere ọ ghọrọ aonye-oke-ọn̄ụ-mmanya, na kwa ndị ya.

16 Ma o wee ruo na ndị Leman malitere ịbatakwute ndị ya, na ntakịrị ọnụ-ọgụgụ, na igbu ha n’ime ubi ha nile, na mgbe ha na-azụ igwe-anụ ha.

17 Ma eze Noa zipụrụ ndị-nche gburu-gburu ala ahụ ịchụpụ ha; ma na e zipụghị ọnụ-ọgụgụ zuru ezu, ma ndị Leman bịakwasịrị ha ma gbuo ha, ma chụpụ ọtụtụ igwe-anụ ha site n’ala ahụ; otu a ndị Leman malitere ibibi ha, na iwere ịkpọ-asị ha wụkwasị ha.

18 Ma o wee ruo na eze Noa zigara ndị-agha ya ibuso ha agha, ma ha chụghachịrị ha azụ, ma-ọbụ ha chụghachịrị ha azụ na nwa oge; ya mere, ha laghachịrị na-an̄ụrị ọn̄ụ na mgwo-mgwo ha kwatara n’agha.

19 Ma ugbua, n’ihi nnukwu mmeri nke a ha buliri onwe ha elu na mpako nke obi ha nile; ha aturu ọnụ, n’ihi ikike nke onwe ha, na-asị na iri ise ha ga-eguzogide ọtụtụ puku ndị Leman—ma otu a ka ha turu ọnụ, ma nwee mmasị n’ọbara, na ịkwafu ọbara nke ụmụnne ha nwoke, ma nke a n’ihi ajọọ-omume nke eze ha na ndị nchụ-aja ha nile.

20 Ma o wee ruo na o nwere otu nwoke n’etiti ha nke aha ya bụ aAbịnadaị; ma ọ gagharịrị n’etiti ha, ma malite ibu amụma, na-asị: Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru, ma otu a ka o nyeworo m n’iwu, na-asị, Gagharịa, ma kwuoro ndị a, otu a ka Onye-nwe kwuru—ahụhụ dịrị ndị a, n’ihi na a hụwo m ihe arụ ha nile, na ajọọ-omume ha, na akwunakwuna ha nile; ma ma-ọbụghị na ha chegharịrị a ga m eleta ha n’iwe m.

21 Ma ma-ọbụghị na ha chegharịrị ma tụgharịa n’ebe Onye-nwe Chineke ha nọ, lee, aga m enyefe ha n’aka nke ndị iro ha; e, ma ha ka a ga-ewebata n’ime aịbụ-oru; ma a ga-akpagbu ha site n’aka nke ndị iro ha.

22 Ma ọ ga-eru na ha ga-amata na m bụ Onye-nwe Chineke ha, ma na m bụ aChineke ekworo na-eleta ajọọ-omume nile nke ndị m.

23 Ma ọ ga-eru na ma ọbụghị na ndị a chegharịrị ma tụgharịa n’ebe Onye-nwe Chineke ha nọ, a ga-ewebata ha n’ime ịbụ-oru; ma ọdịghị onye ga-anapụta ha, ma ọbụghị Onye-nwe ahụ Chineke nke Pụrụ Ime Ihe nile.

24 E, ma ọ ga-eru na mgbe ha ga-ebeku m akwa, a ga m aeji nwayọ nụ akwa ha nile; e, ma a ga m ekwe ka ndị iro ha tigbuo ha.

25 Ma ma ọbụghị na ha chegharịrị n’akwa mkpe na ntụ, ma bekusie Onye-nwe Chineke ha akwa ike, aa gaghị m anụ ekpere ha nile, ọbụghị ma m ga-anapụta ha site na mkpagbu ha nile, ma otu a ka Onye-nwe kwuru, ma otu a ka o nyeworo m n’iwu.

26 Ugbua o wee ruo na mgbe Abịnadaị gwaworo ha okwu ndị a ha were oke iwe megide ya, ma chọọ iwepụ ndụ ya; ma Onye-nwe napụtara ya site n’aka ha nile.

27 Ugbua mgbe eze Noa nụworo maka okwu nile nke Abịnadaị gwaworo ndị obodo ahụ, o wekwara oke iwe; ma ọ sịrị: Onye bụ Abịnadaị, na a ga-ekpe mụ na ndị m ikpe site n’aka ya, ma aọbụ onye bụ Onye-nwe, nke ga-ewetakwasị ndị m ụdị nnukwu mkpagbu dị otu a?

28 Enye m gị iwu ịkpọta Abịnadaị n’ebe a, ka m wee gbuo ya, n’ihi na o kwuwo ihe ndị a nile ka o wee kpalite ndị m n’iwe otu na ibe ya, na ịpalite esem-okwu n’etiti ndị m; ya mere a ga m egbu ya.

29 Ugbua anya ndị ahụ akpuru isi; ya mere ha bkechịrị obi ha megide okwu nile nke Abịnadaị, ma ha chọrọ site n’oge ahụ gaa n’iru ijide ya. Ma eze Noa kechịrị obi ya ike megide okwu nke Onye-nwe, ma o chegharịghị site na ajọọ-omume ya nile.