Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 16


Isi 16

Chineke na-agbapụta ndị mmadụ site n’ọnọdụ ofufu na ọdịda ha—Ndị nọ n’anụ-arụ n’anọgide dịka ọdịghị mgbapụta dị—Kraịst na-eweta na mmezu mbilite n’ọnwụ ruo ndụ agwụgh-agwụ ma-ọbụ ọmụma-ikpe agwụgh-agwụ. Ihe dịka n’afọ 148 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, o wee ruo na mgbe Abịnadaị kwuworo okwu ndị a o setịpụrụ aka ya ma sị: Oge ga-abịa mgbe ndị nile ga-ahụ anzọpụta nke Onye-nwe ahụ; mgbe mba nile, ebo, asụsụ, na ndị mmadụ ga-ahụ anya na anya ma bga-ekwupụta n’iru Chineke na ikpe ya nile zịrị ezi.

2 Ma mgbe ahụ ka a aga-achụpụ ndị ajọọ-omume nile, ma ha ga-enwe ihe ga-akpatara ha iti-mkpu, na bịkwa-akwa, na ịkwa-arịrị, na ịta ikikere-eze; ma nke a n’ihi na ha ekweghị ịn̄a-ntị n’olu nke Onye-nwe; ya mere Onye-nwe agaghị agbapụta ha.

3 N’ihi na ha bụ nke aanụ arụ na-eso ekwensu, ma bekwensu ahụ nwere ike n’aru ha; e, ọbụna agwọ ochie ahụ nke cghọgburu nne na nna mbụ anyị, nke bụ ihe kpatara dọdịda ha, nke mere mmadụ nile jiri ghọọ nke anụ-arụ; nke mmetụta, ndị na-eso ekwensu, ena-ama ihe ọjọọ site n’ihe-ọma, na-ewere onwe ha nye ekwensu ahụ.

4 Otu a mmadụ nile afuru efu, ma lee, ha gararịị efu n’enweghị nsọtụ ma ọbụghị na Chineke gbapụtara ndị ya site n’ọnọdụ ofufu na ọdịda ha.

5 Ma cheta na Onye nke na anọgide n’ọnọdụ aanụ arụ nke onwe ya, ma gaa n’iru n’ụzọ nile nke mmehie na nnupụ-isi megide Chineke, ga-anọgide n’ọnọdụ ọdịda ya ma ekwensu ahụ nwere ike nile n’arụ ya. Ya mere, ọ nọ dịka a ga-asị na enweghị bmgbapụta e mere, ebe ọ bụ onye-iro nye Chineke; na kwa ekwensu bụ onye-iro nye Chineke.

6 Ma ugbua ọbụrụ na Kraịst abịaghị n’ime ụwa, na-ekwu maka ihe ndị ga-abịa adịka a ga-asị na ha abịawọrịị, a garaghị enwe mgbapụta.

7 Ma ọbụrụ na Kraịst esịghị na ndị nwụrụ-anwụ bilie, ma-ọbụ dobisie agbụ nile nke ọnwụ ka ili ghara inwe mmeri, ma na ọnwụ ekwesịghị inwe aihe ọgbụgba, agaraghị enwe mbilite n’ọnwụ.

8 Mana e nwere ambilite n’ọnwụ, ya mere ili enweghị mmeri, ma ihe ọgbụgba nke bọnwụ ka e loro n’ime Kraịst.

9 Ọ bụ aìhè ahụ na ndụ ahụ nke ụwa; e, ìhè nke agwụgh-agwụ, nke na-enweghị ike ime ka o jie oji; e, na kwa ndụ nke agwụgh-agwụ, ka a ghara inwe ọnwụ ọzọ.

10 Ọbụna arụ a na-anwụ-anwụ ga-eyịkwasị aanwụghị-anwụ, ma ire ure a ga eyịkwasị ereghi ere, ma a ga-eweta ya ka o bguzoro n’iru oche-ikpe nke Chineke, ka o ckpee ya ikpe dịka ọrụ ha nile ma ha dị mma ma-ọbụ ma ha dị njọ—

11 Ọbụrụ na ha dị mma, ruo na mbilite n’ọnwụ nke andụ agwụgh-agwụ na an̄ụrị; na-ọbụrụ na ha di njọ, ruo na mbilite n’ọnwụ nke bamam-ikpe agwụgh-agwụ, ebe e nyefere ya ekwensu ahụ, onye debeworo ha n’okpuru ya, nke bụ ọmụma-ikpe—

12 Ebe ha gaworo dịka uche na ọchịchọ nke anụ-arụ onwe ha, ebe na-enwebeghị mgbe ha kpọkụru Onye-nwe n’oge e setịpụrụ aka nke aebere nile n’ebe ha nọ; n’ihi na e setịpụrụ aka ebere nile n’ebe ha nọ, ma ha anabataghị; ha, ebe a dọrọ ha aka na ntị maka ajọọ-omume ha nile ma na ha enweghị ike iwezuga onwe ha site na ha; ma e nyere ha iwu ichegharị ma na ha enweghị ike ichegharị.

13 Ma ugbua, o kwesịghị ka unu maa-jijiji ma chegharịa site na mmehie unu nile, ma cheta na nanị n’ime na site na Kraịst ka unu ga-enwe nzọpụta?

14 Ya mere ọbụrụ na unu na-akụzi aiwu nke Moses, kuzie kwa na ọ bụ onyinyo nke ihe ndị ahụ nke ga-abịa—

15 Kuziere ha na mgbapụta na-abịa site na Kraịst Onye-nwe, onye bụ aNna nke Ebighi-ebi ahụ. Amen.