Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 22


Isi 22

E mere atụmatụ nile maka ndị ahụ ịgbapụ site n’ịbụ-oru ndị Leman—Ndị Leman ka e mere ka mmanya na-egbu ha—Ndị ahụ gbapụrụ, lagachị Zarahemla, ma ghọọ ndị nọ n’okpuru ọchịchị nke Eze Mosaịa. Ihe dịka n’afọ 121 ruo 120 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na Amọn na eze Lịmhaị malitere ịkparịta ụka ha na ndị ahụ otu ha ga-esi napụta onwe ha site n’ịbụ-oru; ma ọbụna ha mere na ndị ahụ nile ga-akpọkọta onwe ha ọnụ; ma nke a ka ha mere ka ha wee nweta olu ndị ahụ gbasara ihe ahụ.

2 Ma o wee ruo na ha enweghị ike ịchọta ụzọ ịnapụta onwe ha site n’ịbụ-oru, ma ọbụghị ịkpọrọ ụmụ nwanyị na ụmụ ha, na igwe-anụ ha nile, na igwe-anụmanụ ha nile, na ụlọ ikwuu ha nile, ma pụọ baa n’ime ọzara ahụ; n’ihi na ndị Leman ebe ha dị imerime n’ọnụ-ọgụgụ, okweghị omume na ndị nke Lịmhaị nwere ike ilụso ha ọgụ, na-eche ịnapụta onwe ha site n’ịbụ-oru na mma agha.

3 Ugbua o wee ruo na Gịdiọn gabara ma guzoro n’iru eze ahụ, ma sị ya: Ugbua O eze, ị n̄awo ntị n’okwu m ruo ugbua ọtụtụ oge mgbe anyị na-enwerịị esem-okwu anyị na ụmụnne anyị nwoke, ndị Leman.

4 Ma ugbua O eze, ọ bụrụ na ị hụtabeghị m ịbụ-oru na-abaghị uru, ma-ọbụ ọ bụrụ na ruo ugbua igewo ntị n’okwu m nile n’ụdị ọbụla, ma ha abaworo gị uru, ọbụna otu ahụ a chọrọ m ka i gee ntị n’okwu m nile n’oge nke a, ma a ga m abụ oru gị ma napụta ndị a site n’ịbụ-oru.

5 Ma eze ahụ kwere ya ka o kwuo okwu. Ma Gịdiọn sịrị ya:

6 Lee ebe ngafe azụ ahụ, site n’azụ mgbidi ahụ, n’akụkụ azụ nke obodo-ukwu ahụ. Ndị Leman, ma-ọbụ ndị nche nile nke ndị Leman, n’abalị e mere ka mmanya na-egbu ha; ya mere ka anyị zipụ ịma-ọkwa n’etiti ndị a nile ka ha chịkọta ọnụ igwe-anụ na igwe-anụmanụ ha, ka ha wee chịba ha n’ime ọzara ahụ n’abalị.

7 Ma m ga-aga dịka iwu gị siri dị ma kwụọ ụtụ mmanya nke ikpe-azụ nye ndị Leman, ma mmanya ga-egbu ha; ma anyị ga-agafe site n’ebe ngafe nzuzo dị n’aka ekpe nke ebe izu-ike ha mgbe mmanya ga na-egbu ha na ụra.

8 Otu a anyị ga-apụ anyị na ndị nwanyị anyị na ụmụ anyị, igwe-anụ anyị, na igwe-anụmanụ anyị baa n’ime ọzara ahụ; ma anyị ga-aga njem gburu-gburu ala nke Shaịlọm ahụ.

9 Ma o wee ruo na eze ahụ n̄ara ntị n’okwu nile nke Gịdiọn.

10 Ma eze Lịmhaị mere na ndị ya ga-achịkọta igwe-anụ ha ọnụ; ma o zigara ụtụ mmanya ahụ nye ndị Leman; ma o zigakwara mmanya ọzọ, dịka ihe-onyinye nye ha; ma ha n̄ụrụ na akwụghị ụgwọ site na mmanya nke eze Lịmhaị zigaara ha.

11 Ma o wee ruo na ndị nke eze Lịmhaị pụrụ n’abalị baa n’ime ọzara ahụ ha na igwe-anụ ha na igwe-anụmanụ nile, ma ha gara gburu-gburu ala nke Shaịlọm n’ime ọzara ahụ, ma rọjie ụzọ-ije ha chee iru n’ala nke Zarahemla ahụ, ebe onye-ndu ha bụ Amọn na ụmụnne ya nwoke.

12 Ma ha ewerewọrịị ọla-edo ha nile, na ọla-ọcha, na ihe nile dị ha mkpa, nke ha nwere ike-ibu, na kwa ihe oriri ha tinyere ha, baa n’ime ọzara ahụ; ma ha chụsoro njem ha.

13 Ma mgbe ha nọworo ọtụtụ ụbọchị n’ime ọzara ahụ ha bịaruru n’ala nke Zarahemla ahụ, ma soro ndị Mosaịa, ma ghọọ ndị nọ n’okpuru ọchịchị ya.

14 Ma o wee ruo na Mosaịa nabatara ha n’ọn̄ụ; ma ọ nabatakwara aakụkọ-ndekọta ahụ nile, na kwa bakụkọ-ndekọta ahụ nke ndị nke Lịmhaị chọpụtaworọrịị.

15 Ma ugbua o wee ruo mgbe ndị Leman chọpụtaworo na ndị nke Lịmhaị apụwọrịị site n’ala ahụ n’abalị, na ha zigara ndị-agha n’ime ọzara ahụ ịchụ ha;

16 Ma mgbe ha chụworo ha ọsọ ụbọchị abụọ, ha enweghị ike ọzọ iso okporo-ụzọ ha nile; ya mere ha furu n’ime ọzara ahụ.