Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 13


Isi 13

E chedoro Abịnadaị site n’ike dị nsọ—O wee kuzie Iwu Iri nile—Nzọpụta anaghị abịa site n’iwu nke Moses nanị—Chineke n’onwe Ya ga-achụ aja mgbaghara mmehie ma gbapụta ndị Ya. Ihe dịka n’afọ 148 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua mgbe eze ahụ nụworo okwu ndị a nile, ọ gwara ndị nchụ-aja ya: Kpọpụnụ nwoke nke a, ma gbuo ya; n’ihi na ọ bụ gịnị ka anyị nwere iji ya mee, n’ihi na ọ bụ onye-ara.

2 Ma ha bilitere ma gbalịa imetụ aka ha nile n’arụ ya; mana o guzogidere ha, ma sị ha:

3 E metụla m aka, n’ihi na Chineke ga-eti unu ihe otiti ma ọbụrụ na unu emetụ aka unu nile n’arụ m, n’ihi na ezibeghị m ozi ahụ nke Onye-nwe zitara m izi; ọbụghị ma m agwawo unu ihe ahụ unu arịọrọ ka m kwuo; ya mere, Chineke agaghị ekwe na a ga-ebibi m n’oge dị ugbua.

4 Mana a ga m emezurịrị iwu-nsọ nile ndị nke Chineke nyeworo m; ma n’ihi na a gwawo m unu ezi-okwu unu na-ewere m iwe. Ma ọzọ, n’ihi na e kwuwo m okwu nke Chineke unu ekpewo m ikpe na m bụ onye-ara.

5 Ugbua o wee ruo na mgbe Abịnadaị kwuworo okwu ndị a nile na ndị nke eze Noa anwaghị anwa imetụ aka ha nile n’arụ ya, n’ihi na Mụọ nke Onye-nwe nọ n’arụ ya; ma iru ya anwuru n’ìhè karịrị akarị, ọbụna dịka nke Moses nwuru mgbe ọ nọ n’ugwu Saịnaị, mgbe ọ na-ekwu okwu ya na Onye-nwe.

6 Ma o kwuru okwu an’ike na ikike sitere na Chineke, ma o gara n’iru n’okwu ya nile, na-asị:

7 Unu ahụwo na unu enweghị ike igbu m, ya mere e zichawo m ozi m. E, ma a hụrụ m na o agbuwara unu ruo n’obi unu nile n’ihi na a gwara m unu ezi-okwu gbasara ajọọ-omume unu nile.

8 E, ma okwu m nile mejupụtara unu n’ebube na ịtụ-n’anya, na tinyere iwe.

9 Mana e zichala m ozi m; ma mgbe ahụ ọ dịghị kwa mkpa ebe m na-aga, ma ọbụrụ na a zọpụtawo m.

10 Mana ihe ole ndị a ka m gwara unu, ihe unu jiri m mee, mgbe nke a gasịrị, ga-adị ka aụdị na onyinyo nke ihe ndị nke ga-abịa.

11 Ma ugbua a na m agụrụ unu nke fọdụrụ an’iwu-nsọ nile nke Chineke, n’ihi na a hụrụ m na e deghị ha n’obi unu nile; A hụrụ m na unu amụwo ma kuzie ajọọ-omume n’oge kachasị na ndụ unu nile.

12 Ma ugbua, unu cheta na m sịrị unu: Unu agaghị emere onwe unu arụsị ọbụla a pịrị-apị, ma-ọbụ oyiyi nke ihe ọbụla nke dị n’elu-igwe n’elu ma-ọbụ nke ihe nile dị n’ụwa n’okpuru ya, ma-ọbụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa.

13 Ma ọzọ: Unu agaghị akpọ-isi-ala nye ha, ma-ọbụ jeere ha ozi; n’ihi na mụ bụ Onye-nwe Chineke gị a bụ m Chineke ekworo, na-eleta ajọọ-omume nke ndị nna n’arụ ụmụ ha, ruo n’ọgbọ nke atọ na nke anọ nke ndị na-akpọ m asị;

14 Ma na-emere ọtụtụ puku ebere nke ndị na-ahụ m n’anya ma na-edebe iwu-nsọ m nile.

15 Unu agaghị ewere aha Onye-nwe Chineke unu n’ihe efu; n’ihi na Onye-nwe agaghị agụ ya onye-ikpe-na-amaghị nke na-ewere aha ya n’ihe efu.

16 Cheta aụbọchị izu-ike, idebe ya nsọ.

17 Ụbọchị isii ka unu ga-arụ ọrụ, ma mee ọrụ unu nile;

18 Ma na ụbọchị nke asaa, ụbọchị izu-ike nke Onye-nwe Chineke gị, Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla, gị, ma-ọbụ nwa gị nwoke, ma-ọbụ nwa gị nwanyị, oru gị nwoke, ma-ọbụ oru-gị-nwanyị, ma-ọbụ igwe ehi gị, ma-ọbụ ọbịa gị nke nọ n’ime ọnụ-ụzọ ama gị nile.

19 N’ihi na an’ụbọchị isii Onye-nwe kere elu-igwe na ụwa, ma osimiri, ma ihe nile dị n’ime ha; ya mere Onye-nwe gọziri ụbọchị-izu-ike, ma doo ya nsọ.

20 aSọpụrụ nna gị na nne gị, ka ụbọchị gị nile wee dị ogologo n’elu ala ahụ nke Onye-nwe Chineke gị na-enye gị.

21 Ị gaghị aegbu mmadụ.

22 Ị gaghị aakwa iko. Ị gaghị bezu ori.

23 Ị gaghị aagba ama ụgha megide onye-agbata-obi gị.

24 Ị gaghị enwe aanya-ukwu n’ụlọ onye-agbata-obi gị, Ị gaghị enwe anya-ukwu n’arụ nwunye onye-agbata-obi gị, ma-ọbụ oru ya nwoke, ma-ọbụ oru ya nwanyị, ma-ọbụ oke ehi ya, ma-ọbụ anụ dịka ịnyịnya ya, ma-ọbụ ihe ọbụla nke bụ nke onye-agbata-obi gị.

25 Ma o wee ruo na mgbe Abịnadaị bịaworo na ngwụcha nke okwu ndị a nile na ọ sịrị ha: Unu akụziworo ndị a na ha ga-achọsike ime ihe nile ndị a ka ha wee debe iwu-nsọ ndị a nile?

26 A sị m unu, E-e; n’ihi na ọbụrụ na unu emewo ya, Onye-nwe agaraghị eme ka m bịarute ma buo-amụma ọjọọ gbasara ndị a.

27 Ma ugbua unu asịwo na nzọpụta na-abịa site n’iwu nke Moses. A sị m unu na ọ dị mkpa na unu ga-edebe aiwu nke Moses ugbua; mana a sị m unu, na oge ahụ ga-abịa mgbe ọ bna-agaghị adị kwa mkpa idebe iwu nke Moses.

28 Ma nke ka nke, a sị m unu, na anzọpụta anaghị abịa site bn’iwu ahụ nanị, ma asịna ọbụghị maka caja mgbaghara mmehie ahụ, nke Chineke n’onwe Ya ga-achụ maka mmehie nile na ajọọ-omume nile nke ndị ya, na ha agaghị agbanarị ịlarịrị n’iyi, na-agbanyeghị iwu nke Moses.

29 Ma ugbua a sị m unu na ọ dịịrị mkpa na a ga-enwe iwu e nyere ụmụ Israel, e, ọbụna aiwu siri ezigbo ike; n’ihi na ha bụụrụ ndị na-akpọ-ekwe-nkụ, na-eme ajọọ-omume bọsọ-ọsọ, ma na-eji nwayọ echeta Onye-nwe Chineke ha;

30 Ya mere o nwere aiwu e nyere ha, e, iwu nke ime ihe nile na nke bemume-nsọ nile, iwu nke ha ga cna-edebesi-ike site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, idebe ha na ncheta nke Chineke na ọrụ ha n’ebe ọ nọ.

31 Mana lee, a sị m unu, na ihe nile ndị a bụ aoyiyi nke ihe nile ga-abịa.

32 Ma ugbua, ha ghọtara iwu ahụ? A sị m unu, E-e, ha nile aghọtaghị iwu ahụ; ma nke a n’ihi isi-ike nke obi ha nile; n’ihi na ha aghọtaghị na o nweghị onye ọbụla a ga-azọpụta ama ọbụghị na o sitere na mgbapụta nke Chineke.

33 N’ihi na lee, Moses obughị amụma nye ha gbasara ọbịbịa nke Mesaịa ahụ, ma na Chineke ga-agbapụta ndị ya? E, ma ọbụna andị-amụma nile ndị buworo amụma site na mgbe ụwa malitere—ha ekwubeghị karịa ma-ọbụ nke ka ntakịrị gbasara ihe ndị a?

34 Ha ekwubeghị na aChineke n’onwe ya ga-arịdata n’etiti ụmụ nke mmadụ, ma wekwasị onwe ya ụdị nke mmadụ, ma gaa n’ịrụ n’ike dị ukwuu n’elu iru nke ụwa?

35 E, ma ha asịbeghị kwa na ọ ga-eweta ambilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ma na, ya, n’onwe ya, ka a ga-emegide ma kpagbuo?