Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 24


Isi 24

Amiulọn wee sogbuo Alma na ndị ya—A ga-egbu ha ma ha kpee ekpere—Onye-nwe wee mee ibu-arọ ha nile ka ha dịka ha dị mfe—Ọ napụtara ha site n’ịbụ-oru, ma ha laghachịrị Zarahemla. Ihe dịka n’afọ 145 ruo 120 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na Amiulọn ritara iru-ọma n’anya eze ndị Leman; ya mere, eze ndị Leman kwenyere ya na ụmụnne ya nwoke ka a họpụta ha ibu ndị nkuzi nye ndị ya, e, ọbụna nye ndị ahụ nke nọ n’ala nke Shemlọn, na n’ala nke Shaịlọm, na n’ala nke Amiulọn.

2 N’ihi na ndị Leman enwerewo onwunwe nke ala nile ndị a; ya mere, eze ndị Leman ahụ ahọpụtawo ndị-eze nye ala ndị a nile.

3 Ma ugbua aha nke eze ndị Leman ahụ bụ Leman, ebe a kpọkwasịrị ya aha nna ya; ma ya mere a kpọrọ ya eze Leman. Ma ọ bụụrụ eze nye ọtụtụ ọnụ-ọgụgụ mmadụ.

4 Ma ọ họpụtara ndị nkuzi site n’ime ụmụnne Amiulọn ndị nwoke n’ala nile nke ndị ya nwere; ma otu a asụsụ nke Nifaị malitere ịbụ ihe a na-akụzi n’etiti ndị nke ndị Leman nile.

5 Ma ha bụ ndị na-adị na mma otu onye na ibe ya; otu o sila dị ha amaghị Chineke; ọbụghị ma ụmụnne nwoke Amiulọn ha na-akụziri ha ihe ọbụla gbasara Onye-nwe Chineke ha, ọ bụghị iwu nke Moses; ma-ọbụ ha kuziiri ha okwu nile nke Abịnadaị;

6 Mana ha kuziiri ha na ha ga-edebe akụkọ-ndekọta ha, ma na ha nwere ike ịna-edekọrịta akwụkwọ otu onye na ibe ya.

7 Ma otu a ndị Leman malitere ịbawanye na akụ n’ụba, ma malite ịzụ ahịa otu onye na ibe ya ma na-aghọ ndị ukwu, ma malite ịbụ ndị aghụghọ na ndị amamihe, dịka amamihe nke ụwa, e, ndị dị ezigbo aghụghọ, na-enwe mmasị n’ụdị ajọọ-omume nile na ịpụnara ihe, ewezuga ma-ọbụ n’etiti ụmụnne nke ha ndị nwoke.

8 Ma ugbua o wee ruo na Amiulọn malitere igosi aikike nye Alma na ụmụnne ya ndị nwoke, ma malite isogbu ya, ma mee ka ụmụ ya sogbuo ụmụ ha.

9 N’ihi na Amiulọn matara Alma, na ọ bụwo aotu n’ime ndị nchụ-aja eze, ma na ọ bụ ya bụ onye kwere okwu nile nke Abịnadaị ma a chụpụrụ ya site n’iru eze ahụ, ma ya mere ọ were oke iwe megide ya, n’ihi na ọ nọ n’okpuru eze Leman, Ma na o gosịrị ikike n’ebe ha nọ, ma tinyere ha bọrụ, ma tinyere ha ndị-isi-ọrụ.

10 Ma o wee ruo na mkpagbu ha nile karịrị ukwuu nke mere na ha malitere ibekusi Chineke akwa ike.

11 Ma Amiulọn nyere ha iwu na ha ga-akwụsị ibe akwa ha nile; ma o tinyere ha ndị-nche iche ha, na onye-ọbụla a ga achọta na-akpọ aha Chineke a ga-egbu ya.

12 Ma Alma na ndị ya eweliteghị olu ha elu nye Onye-nwe Chineke ha, mana ha awụpụtara obi ha nile nye ya; ma ọ matara echiche nile nke obi ha nile.

13 Ma o wee ruo na olu nke Onye-nwe bịaruru ha n’ime mkpagbu ha nile, na-asị: Welite isi unu nile ma nwe nkasi-obi dị mma, n’ihi na a ma m maka ọgbụgba-ndụ ahụ nke unu meworo nye m; ma a ga m agba-ndụ mụ na ndị m ma napụta ha site n’ịbụ-oru.

14 Ma a ga kwa m eme ka ibu-arọ nile unu dị mfe nke a tụkwasịworo n’elu ubu unu nile, na ọbụna unu agaghị enwe mmetụta mgbu ha n’elu azụ unu nile, ọbụna mgbe unu nọ n’ịbụ-oru; ma nke a ka m ga-eme ka unu wee guzoro dịka andị aka-ebe nye m ma emesịa, ma na unu ga-amata n’ezie na m, Onye-nwe Chineke, na-eleta ndị m na bmkpagbu ha nile.

15 Ma ugbua o wee ruo na ibu-arọ nile nke atụkwasịrị Alma na ụmụnne ya nwoke ka e mere ka ha dị mfe; e, Onye-nwe mere ka ha agbasie ike ka ha wee bulie bibu-arọ ha nile n’inwere onwe, ma ha nyere onwe ha n’ọn̄ụ ma were cndidi ruo n’ọchịchọ nile nke Onye-nwe.

16 Ma o wee ruo na okwukwe ha dị ọke ukwuu, na ndidi ha, na olu nke Onye-nwe bịakwutere ha ọzọ, na-asị: Nwee ezigbo nkasi-obi, n’ihi na n’echi ya a ga m anapụta unu site n’ịbụ-oru.

17 Ma ọ sịrị Alma: I ga-aga n’iru ndị a, ma a ga m eso gị gaa ma napụta ndị a site an’ịbụ-oru.

18 Ugbua o wee ruo na Alma na ndị ya n’oge abalị chịkọtara igwe-anụ ha nile ọnụ, na kwa ụfọdụ mkpụrụ-akụkụ ha; e, ọbụna n’abalị nile ahụ ka ha na-achịkọta igwe-anụ ha nile ọnụ.

19 Ma n’ụtụtụ Onye-nwe mere ka aụra dị omimi bịakwasị ndị Leman, e, na ndị isi-ọrụ ha nọ n’ụra miri emi.

20 Ma Alma na ndị ya pụrụ baa n’ime ọzara ahụ; ma mgbe ha gaworo njem ụbọchị nile ha rụnyere ụlọ ikwuu ha n’otu ndagwụrụgwụ, ma ha kpọrọ ndagwụrụgwụ ahụ Alma, n’ihi na o duru ha ụzọ n’ime ọzara ahụ.

21 E, ma n’ime ndagwụrụgwụ Alma ahụ ha wụpụtara aekele ha nye Chineke n’ihi na o meworo ha ebere, ma mee ka ibu-arọ ha dị mfe, ma napụtawo ha site n’ịbụ-oru; n’ihi na ha nọrọrịị n’ịbụ-oru, ma ọdịghị onye nwere ike ịnapụta ha ma ọbụghị Onye-nwe Chineke ha.

22 Ma ha nyere Chineke ekele, e, ndị nwoke ha nile na ndị nwanyị ha nile na ụmụ ha nile ndị nwere ike ikwu okwu welitere olu ha nile elu n’otuto nile nke Chineke ha.

23 Ma ugbua Onye-nwe sịrị Alma: Mee ngwa ngwa ma kpọrọ onwe gị na ndị a pụọ site n’ala nke a, n’ihi na ndị Leman etetawo n’ụra ma na-achụ gị; ya mere pụọ site n’ala nke a, ma a ga m akwụsị ndị Leman n’ime ndagwụrụgwụ a ka ha ghara ịbịa karịa n’ebe a n’ịchụ ndị a.

24 Ma o wee ruo na ha pụrụ site na ndagwụrụgwụ ahụ, ma were njem ha baa n’ime ọzara ahụ.

25 Ma mgbe ha nọworo n’ime ọzara ahụ ụbọchị iri na abụọ ha bịaruru n’ala nke Zarahemla; ma eze Mosaịa nabatakwara ha n’ọn̄ụ.