Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 1


Akwụkwọ nke Mosaịa

Isi 1

Eze Benjamịn wee kuziere ụmụ ya asụsụ na amụma nile nke ndị nna ha—Okpukpe-chi na mmepe-anya ha ka e chekwaworo n’ihi ihe akụkọ-ndekọta nile e debere n’epekele nile dị iche iche—Mosaịa ka a họpụtara dịka eze ma nye ọrụ ilekọta ihe akụkọ-ndekọta nile na ihe ndị ọzọ nile. Ihe dịka n’afọ 130 ruo 124 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua e nweghị kwa ndọrọ-ndọrọ ọzọ an’ala nile nke Zarahemla, n’etiti ndị nile bụ ndị nke eze Benjamịn, nke mere na eze Benjamịn nwere udo esepụghị aka ụbọchị nile nke fọdụrụ ya.

2 Ma o wee ruo na o nwere ụmụ-nwoke atọ; ma ọ kpọrọ aha ha Mosaịa, na Hilorụm, na Hilaman. Ma o mere ka e wee akụziere ha ihe bn’asụsụ nile nke nna ya ha, na site na nke a ha ga-aghọ ndị nwere nghọta; ma na ha ga-amata gbasara amụma nile nke e kwuworo site n’ọnụ nile nke ndị nna ha, nke e nyere ha site n’aka nke Onye-nwe.

3 Ma ọ kuzịkwara ha gbasara ihe akụkọ-ndekọta nile ndị a kanyere n’elu epekele nile nke bras, na-asị: Ụmụ m nwoke, ọ dị m ka asị na unu ga-echeta na asị na ọbụghị maka aepekele ndị a, ndị nwere ihe akụkọ-ndekọta nile ndị a na iwu-nsọ ndị a, anyị ga-atawọrịị ahụhụ bna-amaghị ama, ọbụna n’oge ugbua, na-amataghị ihe omimi nile nke Chineke.

4 N’ihi na o kweghị omume na nna anyị, Lihaị, gaara enwe ike icheta ihe nile ndị a, ịkụziri ha ụmụ ya, ma ọbụghị na e nwere enye m-aka nke epekele ndị a; n’ihi na ya, ebe a kuziworo ya an’asụsụ nke ndị Ijipt, ya mere o nwere ike ịgụpụta ihe nkanye ndị a, ma kuziere ha ụmụ ya, nke bụ na site na ya ha ga-akụziri ha ụmụ ha, ma site otu a mezuo iwu-nsọ nile nke Chineke, ọbụna gbada ruo oge ugbua.

5 A sị m unu, ụmụ m nwoke, asị na ọbụghị maka ihe ndị a, nke e debeworo ma achekwaa site n’aka nke Chineke, ka anyị nwe ike bgụọ ma ghọta maka cihe omimi ya nile, ma jide iwu-nsọ ya nile oge nile n’iru anya anyị, na ọbụna nna anyị ha gaara ala azụ n’ekweghị ekwe, ma anyị gaara adị ka ụmụnne anyị nwoke, ndị Leman, ndị n’enweghị ihe ha matara gbasara ihe ndị a, ma ọbụna anaghị ekwere ha mgbe a kụziri ha ya, n’ihi domenala nile nke ndị nna ha, ndị n’ezighị ezi.

6 O ụmụ m nwoke, ọ ga-adị m mma ma asị na unu ga-echeta na okwu ndị a bụ ezi-okwu, na kwa na ihe akụkọ-ndekọta nile ndị a bụ aezi-okwu. Ma lee, epekele ndị nke Nifaị kwa, nke ihe dị n’ime ha bụ akụkọ-ndekọta na okwu nile nke ndị nna anyị ha site n’oge ha hapụrụ Jerusalem ruo ugbua, ma ha bụ ezi-okwu; ma anyị nwere ike ịmata maka ịbụ ezi-okwu ha n’ihi na anyị nwere ha n’iru anya anyị.

7 Ma ugbua, ụmụ m nwoke, ọ ga-adị m mma ka unu na-echeta aịchọsị ha ike, ka unu wee nweta uru na ya; ma ọ ga-adị m mma ka unu bna-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke, ka unu wee cmee nke ọma n’ala ahụ dịka dnkwa nile ahụ nke Onye-nwe kwere ndị nna anyị ha.

8 Ma ọtụtụ ihe ndị ọzọ ka eze Benjamịn kụziri ụmụ ya ndị nwoke, ndị a na-edeghị n’ime akwụkwọ a.

9 Ma o wee ruo na mgbe eze Benjamịn ruru na ngwụcha nke ịkụziri ụmụ ya nwoke ihe, na ọ kara nka, ma ọ hụrụ na n’oge na-adịghị anya na ya ga-agarịrị ụzọ nke ụwa nile; ya mere, o chere ya ihe dị mkpa na ya ga-enyefe ala-eze ahụ n’aka otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke.

10 Ya mere, o mere ka a kpọta Mosaịa n’iru ya, ma ndị a bụ okwu ndị ọ gwara ya, na-asị: Nwa m nwoke, ọ ga-adị m mma ka ị mee nkwupụta n’ala a nile n’etiti ndị a nile, ma-ọbụ andị Zarahemla, na ndị nke Mosaịa ndị bi n’ala ahụ, na site na ya a ga-akpọkọta ha ọnụ; n’ihi na echi ya a ga m ekwupụtara ndị nke m a site n’ọnụ nke m na ị bụ beze na onye-ọchịchị nye ndị a, nke Onye-nwe Chineke anyị nyeworo anyị.

11 Ma nke ka nke, a ga m enye ndị a aaha, na site na ya ha ga-adị iche karịa ndị nile nke Onye-nwe Chineke kpọpụtaworo site n’ala Jerusalem; ma nke a ka m na-eme n’ihi na ha abụrụwọrịị ndị na-arụsi ọrụ ike n’idebe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe.

12 Ma a ga m enye ha aha nke a na-enweghị ike ehichapụ, ma ọbụghị site na anjehie.

13 E, ma nke ka nke asị m gị, na ọbụrụ na ndị a Onye-nwe gosịworo iru ọma dị elu ga-adaba n’ime anjehie, ma ghọọ ndị ajọọ-omume na ndị na-akwa iko, na Onye-nwe ga-enyefe ha, na site otu a ha ghọọ ndị bna-adịghị ike dịka ụmụnne ha nwoke; ma ọ gaghị cechekwa ha ọzọ site n’ike ya na-enweghị atụ ma dị ịtụ n’anya, dịka o siworo tutu ruo ugbua chekwaa ndị nna anyị ha.

14 N’ihi na a sị m unu, na ọbụrụ na o setịpughịrịị aka ya n’ichekwa ndị nna anyị ha, ha gaara adabarịrị n’aka nke ndị Leman, ma ghọọ ndị ejiri chụọ aja nke ịkpọ-asị ha.

15 Ma o wee ruo na mgbe eze Benjamịn bịaworo na ngwụcha nke ikwu okwu ndị a nye nwa ya nwoke, na o nyere ya ikike gbasara ihe nile a na-eme n’ala-eze ahụ.

16 Ma nke ka nke, o nyekwara ya ikike gbasara ihe akụkọ-ndekọta nile ndị a kanyere n’elu aepekele nke bras; na kwa epekele nke Nifaị; na kwa, bmma agha nke Leban, na cbol ahụ ma-ọbụ nduzi-ụzọ ahụ, nke duru nna anyị ha gafee ọzara ahụ, nke e doziri site n’aka nke Onye-nwe na site na ya a ga-edu ha, onye ọbụla dịka mmata na ịrụsi ọrụ ike nke ha nyere ya siri dị.

17 Ya mere, otu ha bụrịị ndị na-enweghị okwukwe ha emeghị nke ọma ọbụghị ma ha gara n’iru na njem ha, mana a achụghachịrị ha azụ, ma nweta enweghị mmasị nke Chineke nye onwe ha; ma ya mere a pịara ha ihe ọpịpịa nke ụnwụ na nnukwu mkpagbu, ịkwalite ha na ncheta nke ọrụ ha.

18 Ma ugbua, o wee ruo na Mosaịa gara ma mee dịka nna ya nyeworo ya iwu, ma kwupụtara ndị nile ahụ nọ n’ala nke Zarahemla na site na nke ahụ ha ga-akpọkọta onwe ha ọnụ, ịgalite ruo na temple, ịnụ okwu ndị nke nna ya ga-agwa ha.