Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 21


Isi 21

Ndị Lịmhaị ka ndị Leman busoro agha ma merie—Ndị Lịmhaị wee zute Amọn ma nwee mgbanwe okpukpe-chi—Ha wee gwa Amọn maka epekele ndị Jared iri abụọ na anọ ahụ. Ihe dịka n’afọ 122 ruo 121 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na Lịmhaị na ndị ya laghachịrị n’obodo-ukwu Nifaị, ma malite ibi n’ala ahụ ọzọ n’udo.

2 Ma o wee ruo na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ndị Leman malitere ọzọ inwe mkpalite iwe megide ndị Nifaị, ma ha malitere ịbata n’ime oke-ala nile nke dị gburu-gburu.

3 Ugbua ha anwaghị anwa igbu ha, n’ihi iyi ahụ nke eze ha n̄ụworo nye Lịmhaị; ma na ha ga-eti ha aka na antị, ma gosị ikike n’ebe ha nọ; ma malite itinye bibu-arụ n’azụ ha nile, ma kpụrụ ha dịka ha ga-eme dịka ịnyịnya dara ogbu—

4 E, ihe nile a ka e mere ka e wee mezuo okwu nke Onye-nwe.

5 Ma ugbua mkpagbu nile nke ndị Nifaị dị ukwuu, ma onweghị ụzọ ọbụla nke ha nwere ike iji napụta onwe ha site n’aka ha, n’ihi na ndị Leman agbawo ha rị gburu-gburu n’akụkụ nile.

6 Ma o wee ruo na ndị ahụ malitere ịtamu ntamu nye eze ahụ n’ihi mkpagbu ha nile; ma ha malitere ịchọsike ịga megide ha n’agha. Ma ha kpagbụrụ eze ahụ nke ukwuu site na mkpesa ha nile; ya mere o nyere ha ohere ka ha mee dịka ọchịchọ ha siri dị.

7 Ma ha kpọkọtara onwe ha ọnụ ọzọ, ma yịkwasị uwe agha ha, ma gaba imegide ndị Leman ịchụpụ ha site n’ala ha.

8 Ma o wee ruo na ndị Leman meriri ha, ma chụghachị ha azụ, ma gbuo ọtụtụ n’ime ha.

9 Ma ugbua e nwere nnukwu airu-uju na ịkwa-akwa n’etiti ndị nke Lịmhaị, nwanyị isimkpe n’eru uju maka di ya, nwa nwoke na nwa nwanyị n’eru uju maka nna ha, ma ụmụnne ndị nwoke maka ụmụnne ha ndị nwoke.

10 Ugbua e nwere nnukwu ọtụtụ ndịnyom isimkpe n’ala ahụ, ma ha tisiri mkpu akwa ike site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, n’ihi na nnukwu egwu ndị Leman abịakwasịwo ha.

11 Ma o wee ruo na iti mkpu akwa esepụghị-aka ha nile kpalitere ndị nke fọdụrụ na ndị nke Lịmhaị n’iwe megide ndị Leman; ma ha gara ọzọ ịlụ agha, mana a chụghachirị ha azụ ọzọ, ma tufuo ọtụtụ ihe.

12 E, ha gara ọzọ ọbụna nke ugbọrọ atọ, ma taa ahụhụ n’otu aka ahụ; ma ndị ahụ a na-egbughị laghachịrị ọzọ n’obodo-ukwu nke Nifaị.

13 Ma ha wedatara onwe ha ala ọbụna ruo na ntụ, tinye onwe ha n’okpuru ibu-arọ nke ịbụ-oru, na-etinye onwe ha ka e tie ha ihe otiti na ka esekpụgharịa ha ma n’iru ma n’azụ, ma na-ebo ha ibu-arọ, dịka ọchịchọ nke ndị-iro ha siri dị.

14 Ma ha awedatara onwe ha ala ọbụna n’ime omimi nile nke obi umeala; ma ha tisịrị mkpu akwa ike nye Chineke; e, ọbụna ogologo ụbọchị nile ka ha bekuru Chineke ha akwa ka o wee napụta ha site na mkpagbu ha nile.

15 Ma ugbua Onye-nwe aemeghị ngwa n’ịnụ akwa ha n’ihi ajọọ-omume ha nile; otu o sila dị, Onye-nwe nụrụ akwa ha nile, ma malite ime ka obi ndị Leman dị nro nke mere na ha malitere ibelata ibu-arọ ha nile; ma na Onye-nwe ahụghị na ọ dị mkpa ịnapụta ha site n’ịbụ-oru.

16 Ma o wee ruo na ha malitere ime nke-ọma ntakịrị ntakịrị n’ala ahụ, ma malite ịku mkpụrụ-akụkụ n’uju karịa, ma igwe anụ, ma igwe ehi na ịnyịnya, nke mere na ha ahụsighị anya site n’agụụ.

17 Ugbua e nwere nnukwu ọnụ-ọgụgụ ndị nwanyị, karịa ka e nwere nke ndị nwoke; ya mere eze Lịmhaị nyere iwu na nwoke ọbụla ga aeweta ihe ọnwụnwe ya iji kwado bndị nwanyị isimkpe nile na ụmụ ha, ka ha ghara ịnwụ n’agụụ, ma nke a ka ha mere n’ihi nnukwu nke ọnụ-ọgụgụ ha ndị egbuworọrịị egbu.

18 Ugbua ndị nke Lịmhaị nọkọtara ọnụ n’otu dịka o kwere ha mee, ma chekwaa mkpụrụ-akụkụ ha na igwe anụ ha nile;

19 Ma eze ahụ n’onwe ya atụkwasịghị onwe ya obi n’ofe mgbidi nke obodo-ukwu ahụ, ma ọbụghị na ọ kpọrọ ndị nche ya sobe ya, na-atụ egwu na ya nwere ike site n’ụzọ ọbụla daba n’aka nke ndị Leman.

20 Ma o mere na ndị ya ga-eche ala ahụ nche gburu-gburu, na site n’ụzọ ọbụla ha nwere ike ịkpọrọ ndị nchụ-aja ahụ nile ndị gbabara n’ime ọzara ahụ, ndị zuruworo aụmụada nile nke ndị Leman, na ndị kpataworo ụdị nnukwu mbibi a ka ọ bịakwasị ha.

21 N’ihi na ha chọsịrị ike ịkpọrọ ha ka ha wee taa ha ahụhụ; n’ihi na ha abatawo n’ime ala nke Nifaị n’abalị, ma bupụ mkpụrụ-akụkụ ha na ọtụtụ n’ime ihe ha dị mkpa; ya mere ha zoro na-echebiri ha.

22 Ma o wee ruo na e nweghị kwa nsogbu ọzọ di n’etiti ndị Leman na ndị nke Lịmhaị, ọbụna ruo oge ahụ nke aAmọn na ụmụnne ya nwoke bịara n’ime ala ahụ.

23 Ma eze ahụ ebe ọ nọworọrịị n’ezi nke ọnụ-ụzọ nke obodo-ukwu ahụ, ya na onye-nche ya, chọpụtara Amọn na ụmụnne ya nwoke; ma ebe ọ na-eche na ha bụ ndị nchụ-aja nke Noa ya mere o mere ka a kpọrọ ha, ma kee ha agbụ, ma tụba ha n’ime aụlọ mkpọrọ. Ma a sị na ha bụ ndị nchụ-aja nke Noa ọ gaara eme ka e gbuo ha.

24 Ma mgbe ọ chọpụtara na ha abụghị, kama na ha bụ ụmụnne ya nwoke, ma bịaworọrịị site n’ala nke Zarahemla, o jupụtara na nnukwu ọn̄ụ karịrị akarị.

25 Ugbua eze Lịmhaị ezipụwo, tutu ọbịbịa nke Amọn, antakịrị ọnụ-ọgụgụ mmadụ bịchọ ala nke Zarahemla ahụ; ma na ha enweghị ike ịchọta ya, ma ha furu n’ime ọzara ahụ.

26 Otu o sila dị, ha chọtara otu ala nke ndị mmadụ bitụworọrịị; e, otu ala nke e kpuchitere an’ọkpụkpụ kpọrọ nkụ; e, otu ala nke ndị mmadụ bitụworọrịị na nke e bibiworọrịị; ma ha ebe ha cheworo na ọ bụ ala Zarahemla ahụ, laghachịrị n’ala nke Nifaị, ebe ha ruteworọrịị n’oke-ala nile nke ala ahụ n’erubeghị ọtụtụ ụbọchị tutu ọbịbịa nke Amọn.

27 Ma ha wetara akụkọ-ndekọta tinyere onwe ha, ọbụna akụkọ-ndekọta nke ndị ahụ nke ọkpụkpụ ha, ha chọtaworo; ma a kanyere ya n’elu epekele nile nke ntụ-igwe.

28 Ma ugbua Lịmhaị jupụtakwara ọzọ n’ọn̄ụ n’imụta site n’ọnụ nke Amọn na eze Mosaịa nwere aonyinye sitere na Chineke, nke ga-eme ka o nwe ike ịsụgharị okwu ụdị nkanye ndị ahụ nile; e, ma Amọn kwa n̄ụrịrị ọn̄ụ.

29 Ma na Amọn na ụmụnne ya nwoke jupụtara na mwute n’ihi na ọtụtụ n’ime ụmụnne ha nwoke ka e gbuworọrịị;

30 Ma kwa na eze Noa na ndị nchụ-aja ya e mewo ka ndị ahụ mee oke ọtụtụ mmehie na ajọọ-omume nile megide Chineke; ma ha rukwara uju maka aọnwụ nke Abịnadaị; na kwa maka bọpụpụ nke Alma na ndị nke soro ya wee gaa, ndị hiweworo otu nzukọ-nsọ nke Chineke site n’ume na ike nke Chineke, na okwukwe n’okwu ndị ahụ nke Abịnadaị kwuworo.

31 E, ha ruru uju maka ọpụpụ ha, n’ihi na ha amataghị ebe ha gbalaworo. Ugbua ha gaara ejikọ n’obi-ụtọ sonyere ha, n’ihi na ha n’onwe ha abawọrịị n’ime ọgbụgba-ndụ ha na Chineke ijere ya ozi na idebe iwu-nsọ ya nile.

32 Ma ugbua site n’ọbịbịa nke Amọn, eze Lịmhaị abawo kwarịị n’ime ọgbụgba-ndụ ya na Chineke, na kwa ọtụtụ ndị nke ya, ijere ya ozi ma debe iwu-nsọ ya nile.

33 Ma o wee ruo na eze Lịmhaị na ọtụtụ ndị nke ya chọsịrị ike ka e mee ha baptism; mana e nweghị onye ọbụla n’ala ahụ nke nwere aikike site na Chineke. Ma Amọn jụrụ ime ihe nke a, na-ewere onwe ya dịka nwa-oru na-ekwesighị ekwesi.

34 Ya mere ha ejighi oge ahụ hiwere onwe ha nzukọ-nsọ, na-eche Mụọ nke Onye-nwe. Ugbua ha chọsịrị ike ịdị ọbụna dịka Alma na ụmụnne ya ndị nwoke, ndị nke gbabaworo n’ime ọzara ahụ.

35 Ha chọsịrị ike ka e mee ha baptism dịka ihe aka-ebe na ihe ịgba-ama na ha dị na njikere ijere Chineke ozi jiri obi ha nile; otu o sila dị ha setiri oge ahụ ogologo; ma nkọwasị maka baptism ha ka a ga aakọ ma emesịa.

36 Ma ugbua ọmụmụ-ihe nile nke Amọn na ndị ya, na eze Lịmhaị na ndị ya, bụụrụ ịnapụta onwe ha site n’aka nile nke ndị Leman na site n’ịbụ-oru.