Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 25


Isi 25

Ndị agbụrụ nke Miulek bi na Zarahemla wee ghọọ ndị Nifaị—Ha matara maka ndị Alma na maka ndị Zinịf—Alma wee mee Lịmhaị baptism na ndị ya nile—Mosaịa wee nye Alma ikike ịhazi Nzukọ-nsọ nke Chineke. Ihe dịka n’afọ 120 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua eze Mosaịa mere ka a kpọkọta ndị ahụ nile ọnụ.

2 Ugbua enweghị ọtụtụ ụmụ nke Nifaị, ma-ọbụ ọtụtụ ndị bụ agbụrụ nke Nifaị, dịka e nwere na andị nke Zarahemla, onye bụ agbụrụ nke bMiulek, na ndị nke soro ya bịa n’ime ọzara ahụ.

3 Ma e nweghị ọtụtụ ndị nke Nifaị na ndị nke Zarahemla dịka e nwere na ndị nke Leman; e, ha adịghị ọkara otu ahụ n’ọnụ-ọgụgụ.

4 Ma ugbua ndị nke Nifaị nile ka akpọkọtara ọnụ, na kwa ndị nke Zarahemla nile, ma ha ka akpọkọtara ọnụ n’òtù abụọ.

5 Ma o wee ruo na Mosaịa gụrụ, ma mee ka a gụọ akụkọ-ndekọta nile nke Zinịf nye ndị ya; e, ọ gụrụ akụkọ-ndekọta nile nke ndị Zinịf, site n’oge ha hapụrụ ala nke Zarahemla ruo mgbe ha laghachịrị ọzọ.

6 Ma ọ gụkwara nkọwasị nke Alma na ụmụnne ya nwoke, na mkpagbu ha nile, site n’oge ha hapụrụ ala nke Zarahemla ruo oge ha laghachịrị ọzọ.

7 Ma ugbua, mgbe Mosaịa bịaworo na ngwụcha nke ịgụpụta akụkọ-ndekọta nile ndị ahụ, ndị ya ndị nọdụrụ n’ala ahụ jupụtara n’ịtụ-n’anya na obi an̄ụrị.

8 N’ihi na ha amaghị ihe ha ga-eche; n’ihi na mgbe ha hụrụ ndị ahụ a napụtaworo asite n’ịbụ-oru ha jupụtara na oke ọn̄ụ karịrị akarị.

9 Ma ọzọ, mgbe ha chetara maka ụmụnne ha nwoke ndị nke ndị Leman gbuworo ha jupụtara na mwute, ma ọbụna gbaa ọtụtụ anya-mmiri nke mwute.

10 Ma ọzọ, mgbe ha chetara maka ịdị mma Chineke nke mgbe ahụ, na ike ya n’ịnapụta Alma na ụmụnne ya nwoke site n’aka ndị Leman na nke ịbụ-oru, ha welitere olu ha nile ma nye Chineke ekele.

11 Ma ọzọ, mgbe ha chetara maka ndị Leman ndị, bụ ụmụnne ha nwoke, maka ọnọdụ mmehie na mmerụ ha nọ, ha jupụtara na aihe mgbu na nnukwu mgbu nke obi maka ọdịmma nke bmkpụrụ-obi ha nile.

12 Ma o wee ruo na ndị bụ ụmụ nke Amiulọn na ụmụnne ya nwoke, ndị kpọrọworo ụmụ ada nke ndị Leman ka ha bụrụ ndị nwunye ha, nwere obi ọjọọ na akparama agwa nke ndị nna ha, ma a gaghị akpọkwa ha aha ndị nna ha ọzọ, ya mere ha wekwasịrị onwe ha aha nke Nifaị, ka e wee kpọọ ha ụmụ Nifaị ma gụnye ha n’etiti ndị ahụ a kpọrọ ndị Nifaị.

13 Ma ugbua ndị nke Zarahemla nile ka aa gụnyere na ndị Nifaị, ma nke a n’ihi na ala-eze ahụ adịghị onye enyefeworo ya n’aka, ọdịghị ndị ọzọ ma ọbụghị ndị ahụ bụ agbụrụ nke Nifaị.

14 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Mosaịa bịaworo na ngwụcha nke ikwu okwu na ịgụpụtara ndị ahụ ihe, ọ chọsịrị ike na Alma ga kwa agwa ndị ahụ okwu.

15 Ma Alma gwara ha okwu, mgbe ha gbakọtara ọnụ na nnukwu òtù nile, ma ọ gara site n’otu òtù ruo nke ọzọ, na-ekwusara ndị ahụ okwu nchegharị na okwukwe n’Onye-nwe.

16 Ma ọ gbara ndị nke Lịmhaị na ụmụnne ha nwoke ume, ndị nile ahụ a napụtaworo site n’ịbụ-oru, ka ha wee cheta na ọ bụ Onye-nwe napụtara ha.

17 Ma o wee ruo na mgbe Alma kuziworo ndị ahụ ọtụtụ ihe, ma bịawo na ngwụcha nke ịgwa ha okwu, na eze Lịmhaị chọsịrị ike na a ga-eme ya baptism; ma ndị ya nile chọsịrị ike na a ga-eme kwa ha baptism.

18 Ya mere, Alma gabara n’ime mmiri ahụ ma amee ha baptism; e, o mere ha baptism n’ụdị ahụ o jiri mee ụmụnne ya nwoke n’ime bmmiri nile nke Mọmọn; e, ma ka ha ra bụ ndị o mere baptism bụụrụ nke nzukọ-nsọ nke Chineke; ma nke a n’ihi okwukwe ha n’okwu nile nke Alma.

19 Ma o wee ruo na eze Mosaịa kwenyere Alma ka o wee wuo ụlọ-nzukọ gburu-gburu ala Zarahemla nile; ma nye ya aike ichi ndị nchụ-aja na ndị nkuzi nile echichi nye ụlọ nzukọ-nsọ ọbụla.

20 Ugbua nke a ka e mere n’ihi na e nwere ọtụtụ mmadụ nke mere na ha nile agaghị ekwe nchịkọta n’aka otu onye nkuzi; ọbụghị ma ha nile ga-anụ okwu Chineke n’ime otu ọgbakọ.

21 Ya mere ha kpọkọtara onwe ha ọnụ n’òtù dị iche iche, a na-akpọ nzukọ-nsọ nile; nzukọ-nsọ ọbụla nwere ndị nchụ-aja ha na ndị nkuzi ha, na onye nchụ-aja ọbụla na-ekwusa okwu ahụ dịka otu esị kuziere ya site n’ọnụ nke Alma.

22 Ma otu a, na-agbanyeghị na e nwere ọtụtụ nzukọ-nsọ ha nile bụ otu anzukọ-nsọ, e, ọbụna nzukọ-nsọ nke Chineke; n’ihi na ọdịghị ihe ọbụla e kwusara n’ime nzukọ-nsọ nile ahụ ma ọbụghị nchegharị na okwukwe n’ime Chineke.

23 Ma ugbua e nwere nzukọ-nsọ asaa n’ala nke Zarahemla. Ma o wee ruo na ndị ọbụla nke chọrọ ibukwasị onwe ha aaha nke Kraịst, ma-ọbụ nke Chineke, ha sonyere nzukọ-nsọ nile nke Chineke;

24 Ma a kpọrọ ha andị nke Chineke. Ma Onye-nwe wụpụtara ha Mụọ ya, ma a gọziri ha, ma ha mere nke-ọma n’ala ahụ.