Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 84


Nkeji 84

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 22 na 23 Septemba 1832 (History of the Church, 1:286–295). N’ọnwa nke Septemba, ndị okenye maliteworo ịlọta site na mgbasa ozi-ọma ha nile na steti ndị dị n’ọwụwa anyanwụ na inye nguzi maka ọrụ ha nile. Ọ bụ mgbe ha nọkọtara ọnụ n’oge nke obi-ụtọ a ka a natara ozi nke a. Onye-amụma kpọrọ ya mkpughe n’ọkwa nchụ-aja.

1–5, Jerusalem Ọhụrụ na temple ka a ga-ewu na Missouri; 6–17, Ahịrị nke ọkwa nchụ-aja site na Moses rue n’Adam ka e nyere; 18–25, Ọkwa nchụ-aja nke dị ukwuu karịa ji ọtụghe-ụzọ nke amamihe nke Chineke; 26–32, Ọkwa nchụ-aja nke nta ji ọtụghe-ụzọ nke nkwusa ozi nke ndị mụọ-ozi nile na ozi-ọma nke njikere; 33–44, Ndị mmadụ ga-enwe ndụ ebighi-ebi site n’ịn̄ụ-iyi na ọgbụgba-ndụ nke ọkwa nchụ-aja; 45–53, Mụọ nke Kraịst na agba ama nye ndị mmadụ, ma ụwa dum na-atọgbọ na mmehie; 54–61, Ndị-nsọ nile aghaghị ịgba-ama ihe ndị ahụ nile ha nataworo; 62–76, Ha ga-ekwusa ozi-ọma, ma ihe ịrịba-ama ga-eso; 77–91, Ndị okenye ga-apụ n’ejighi akpa ego ma-ọbụ akpa-njem, ma Onye-nwe ga-elekọta mkpa ha nile; 92–97, Ajọọ ahụhụ nile na ọbụbụ ọnụ nile na-eche ndị nile na-anabataghị ozi-ọma ahụ; 98–102, Abụ ọhụrụ nke mgbapụta nke Zaịọn ka e nyere; 103–110, Ka onye ọbụla guzoro n’ọkwa-ọrụ nke ya ma rụọ ọrụ n’ọkpụkpọ-oku nke ya; 111–120, Ndị odibo nke Onye-nwe ga-ama ọkwa ihe-arụ nke ịtọgboro n’efu nke ụbọchị ikpe azụ nile.

1 Mkpughe nke Jisus Kraịst nye nwa odibo ya Joseph Smith, Nta, na ndị okenye isii, dịka ha jịkọrọ obi ha nile n’otu ma welie olu ha nile n’elu.

2 E, okwu nke Onye-nwe gbasara nzukọ-nsọ ya, e hiwere n’ụbọchị ndị ikpe-azụ maka mwetaghachi nke ndị ya, dịka o kwuworo site n’ọnụ nke ndị-amụma ya, ma, n’ihi mkpọkọta nke ndị-nsọ ya iguzo n’elu Ugwụ Zaịọn, nke ga-abụ obodo-ukwu nke Jerusalem Ọhụrụ.

3 Nke bụ obodo-ukwu nke aga-ewu, malite n’ebe temple ahụ, nke a họpụtara site na mkpisi-aka nke Onye-nwe, n’oke-ala nke ọdịda anyanwụ na Steti nke Missouri, ma doo nsọ site n’aka Joseph Smith, Nta, na ndị ọzọ ndị ihe ha dịịrị Onye-nwe ezi mma.

4 N’ezie nke a bụ okwu nke Onye-nwe, na obodo-ukwu Jerusalem Ọhụrụ ka a ga-ewu site na mgbakọta nke ndị-nsọ, malite n’ebe a, ọbụna ebe nke temple ahụ, temple nke a ga-ewuli n’ọgbọ nke a.

5 N’ihi n’ezie ọgbọ nke a agaghị agabiga ruo mgbe a ga-ewu otu ụlọ nye Onye-nwe, ma otu igwe ojii ga-anọ n’elu ya, igwe ojii nke ga-abụ ọbụna ebube nke Onye-nwe, nke ga-ejupụta n’ime ụlọ ahụ.

6 Ma ụmụ nwoke nile nke Moses, dịka Ọkwa Nchụ-aja Dị Nsọ nke ọ natara n’okpuru aka nke ọgọ ya nwoke, Jetro;

7 Ma Jetro natara ya site n’okpuru aka nke Keleb;

8 Ma Keleb natara ya n’okpuru aka nke Elaihu;

9 Ma Elaihu n’okpuru aka nke Jeremy;

10 Ma Jeremy n’okpuru aka nke Gad;

11 Ma Gad n’okpuru aka nke Esaịas;

12 Ma Esaịas natara ya n’okpuru aka nke Chineke.

13 Esaịas kwa biiri n’ụbọchị nile nke Abraham, ma buru onye a goziri site na ya—

14 Bụ Abraham nke natara ọkwa nchụ-aja ahụ site n’aka Melkizedek, onye natara ya site n’usoro ọmụmụ nke ndị nna ha, ọbụna ruo na Noa;

15 Ma site na Noa ruo Inọk, site na usoro ọmụmụ nke ndị nna ha;

16 Ma site na Inọk ruo na Ebel, onye egburu site n’izuzu mmegide nke nwanne ya nwoke, onye natara ọkwa nchụ-aja site n’iwu-nsọ nke Chineke, site n’aka nke nna ya Adam, onye bụ nwoke nke mbụ—

17 Bụ ọkwa nchụ-aja nke na-agakwa n’iru n’ime nzukọ-nsọ nke Chineke n’ọgbọ nile, ma n’enweghi mmalite nke ụbọchị nile ma-ọbụ ngwụcha nke afọ nile.

18 Ma Onye-nwe nye kwara Erọn na mkpụrụ-afọ nke ya otu ọkwa nchụ-aja, rute n’ọgbọ agbụrụ ha nile, ọkwa nchụ-aja nke na-agakwa n’iru ma na-adịgide ruo mgbe nile ya na ọkwa nchụ-aja nke bụ nke kachasị nsọ n’usoro nke Chineke.

19 Ma ọkwa nchụ-aja nke dị ukwuu karịa nke a na-elekọta ozi-ọma ahụ ma jiri ọtụghe-ụzọ nke ihe omimi nile nke ala-eze, ọbụna ọtụghe-ụzọ nke mmata nke Chineke.

20 Ya mere, n’emume-nsọ nile si na ya, ike ahụ nke ndụ iyi Chineke na-apụta ìhè.

21 Na n’enweghi emume-nsọ nile si na ya, na ikike ahụ nke ọkwa nchụ-aja, ike ahụ nke ndụ-iyi-Chineke agaghị apụta ìhè nye mmadụ n’anụ arụ;

22 N’ihi n’enweghi nke a o nweghị onye pụrụ ịhụ iru nke Chineke, ọbụna Nna, ma dị ndụ.

23 Ugbụ a nke a ka Moses kụziri n’ụzọ dị mfe nghọta nye ụmụ nke Israel n’ime ọzara, ma jiri ịrụsi ọrụ ike chọọ ido ndị nke ya nsọ ka ha wee nwee ike ilekwasị iru nke Chineke;

24 Mana ha mesịrị obi ha nile ike ma ha enweghi ike ịnagide nnọnyere ya; ya mere, Onye-nwe n’iwe ọku ya, n’ihi na iwe ya dị ọkụ megide ha, n̄ụrụ iyi na ha agaghị aba n’izu-ike ya ka ha nọ n’ime ọzara, izu-ike nke bụ uju nke ebube ya.

25 Ya mere, o wepụrụ Moses site n’etiti ha, na kwa Ọkwa Nchụ-aja ahụ Dị Nsọ;

26 Ma ọkwa nchụ-aja nke nta nọgidere, bụ ọkwa nchụ-aja nke ji ọtụghe-ụzọ nke nkwusa-ozi nke ndị mụọ-ozi na ozi-ọma nke njikere;

27 Ozi-ọma nke bụ ozi-ọma nke nchegharị na nke baptism, na nsachapụ nke mmehie nile, na iwu nke iwu-nsọ nile banyere anụ arụ, nke Onye-nwe n’oke iwe ya mere ka ọ nọgide n’ụlọ nke Erọn n’etiti ụmụ nke Israel ruo mgbe Jọn, onye Chineke kulitere, ebe o jupụtara na Mụọ Nsọ site n’afọ nne ya.

28 N’ihi na e mere ya baptism mgbe ọ dịrịị na nwata, ma e chiri ya echichi site n’aka mụọ-ozi nke Chineke n’oge ọ dị abalị asatọ nye n’ike nke a, ichutu ala-eze nke ndị Juu, na ime ka ụzọ nke Onye-nwe guzozie n’iru nke ndị ya, ijikere ha maka ọbịbịa nke Onye-nwe, onye e nyefere ike nile n’ọba aka ya.

29 Ma ọzọ, ọkwa-ọrụ nile nke onye-okenye, na ụkọchukwu bụ mgbakwụnye ndị dị mkpa nye ọkwa nchụ-aja nke dị elu.

30 Ma ọzọ, ọkwa-ọrụ nile nke onye-nkuzi na onye-dikọn bụ mgbakwụnye ndị dị mkpa nke ọkwa nchụ-aja dị nta, bụ ọkwa nchụ-aja nke e nyekwasịrị n’isi Erọn na ụmụ ya ndị nwoke.

31 Ya mere, dịka m kwuru gbasara ụmụ nwoke nke Moses—n’ihi ụmụ nwoke nke Moses na kwa ụmụ nwoke nke Erọn ga-enye onyinye kwesịrị nnabata ma chụọ aja n’ụlọ nke Onye-nwe, bụ ụlọ nke a ga-ewu nye Onye-nwe n’ọgbọ nke a, n’elu ala nsọ dịka m họpụtaworo—

32 Ma ụmụ nwoke nke Moses na nke Erọn ga-ejupụta n’ebube nke Onye-nwe, n’elu Ugwụ nke Zaịọn n’ime ụlọ nke Onye-nwe, Onye unu bụ ụmụ ya; na kwa ọtụtụ ndị m kpọworo ma zipụ ị ga wulite nzukọ-nsọ m.

33 N’ihi na ndị ọbụla nke kwesịrị ntụkwasị obi ruo n’inweta ọkwa nchụ-aja abụọ ndị a nke m kwuworo maka ha, ma n’ibulite ọkpụkpọ-oku ha, ka e doro nsọ site na Mụọ ahụ ruo na mgbanwe nke arụ ha nile.

34 Ha na-abuzị ụmụ ndịkom nke Moses na nke Erọn na mkpụrụ-afọ nke Abraham, na nzukọ-nsọ ahụ na ala-eze, na ndị a họpụtara iche nke Chineke.

35 Na kwa ndị nile ndị nabatara ọkwa nchụ-aja nke a nabatara m, ka Onye-nwe kwuru;

36 N’ihi na onye ahụ nke nabatara ụmụ ọdibo m nabatara m;

37 Ma onye ahụ nke nabatara m nabatara Nna m;

38 Ma onye ahụ nke nabatara Nna m nabatara ala-eze Nna m; ya mere ihe nile Nna m nwere ka a ga-enye ya.

39 Ma nke a bụ dịka ịn̄ụ-iyi na ọgbụgba-ndụ nke ọkwa nchụ-aja ahụ siri dị.

40 Ya mere, ndị ahụ nile ndị nabatara ọkwa nchụ-aja ahụ, nabatara ịn̄ụ-iyi na ọgbụgba-ndụ nke Nna m, nke o nweghị ike imebi, ọbụghị ma e nwere ike imegharị ya.

41 Mana onye ọbụla nke mebiri ọgbụgba-ndụ nke a mgbe ọ nabatasịrị ya, ma mesịa tụgharịa site na ya, agaghị enwe mgbaghara nke mmehie nile n’ụwa nke a ma-ọbụ n’ụwa nke na-abịa.

42 Ma ahụhụ ga-adịrị ha nile ndị n’anataghị ọkwa nchụ-aja nke a nke unu nataworo, nke m na-enyekwasị ugbụ a n’isi unu ndị nọ ebe a taa, site n’olu nke m sitere n’elu-igwe nile; ma ọbụna mụ enyewo usuu nile nke elu-igwe na ndị mụọ-ozi m nile iwu gbasara unu.

43 Ma ugbụ a enye m unu iwu-nsọ ka unu kpachara-anya gbasara onwe unu, inye ezi ịn̄a ntị n’okwu nile nke ndụ ebighi-ebi.

44 N’ihi na unu ga-adị ndụ site n’okwu ọbụla nke sitere n’ọnụ nke Chineke pụta.

45 N’ihi na okwu nke Onye-nwe bụ ezi-okwu, na ihe ọbụla bụ ezi-okwu bụ ìhè ma ihe ọbula bụ ìhè bụ Mụọ, ọbụna Mụọ ahụ nke Jisus Kraịst.

46 Ma Mụọ ahụ na-enye ìhè nye mmadụ ọbụla nke na-abịa n’ime ụwa; ma Mụọ ahụ na-agba ama nye mmadụ ọbụla rute ụwa nile, nke n̄ara ntị n’olu nke Mụọ ahụ.

47 Ma onye ọbụla nke n̄ara ntị n’olu nke Mụọ ahụ na-abịakwute Chineke, ọbụna Nna ahụ.

48 Ma Nna ahụ na-akụziri ya maka ọgbụgba-ndụ ahụ nke o megharịworo ma mesie ike n’elu isi unu, nke e mesịrị ike n’elu isi unu maka onwe unu, ma ọ bụghị maka onwe unu nanị, mana maka n’ihi ụwa dum.

49 Ma ụwa dum tọgbọrọ na mmehie, ma na-asụ ude n’okpuru ọchịchịrị ma n’okpuru ịbụ oru nke mmehie.

50 Ma site na nke a unu ga-amata na ha nọ n’okpuru ịbụ-oru nke mmehie, n’ihi na ha anaghị abịakwute m.

51 N’ihi na onye ọbụla n’anaghị abịakwute m nọ n’okpuru ịbụ-oru nke mmehie.

52 Ma onye ọbụla n’anabataghị olu m, a maghị olu m, ma ọ bụghị kwa nke m.

53 Ma site na nke a unu ga-amata ndị ezi-omume site na ndị ajọọ-mmadụ, ma na, ụwa nile na-asụ-ude n’okpuru mmehie na ọchịchịrị ọbụna ugbụ a.

54 Ma uche unu nile n’oge gara-aga abụwo ihe gbara-ọchịchịrị site n’ekweghị ekwe, ma n’ihi na unu e werewo ka ihe dị mfe ihe nile nke unu nataworo—

55 Bụ ihe-efu na ekweghị ekwe nke wetaworo nzukọ-nsọ dum n’okpuru amamikpe.

56 Ma amamikpe nke a nọ n’isi ụmụ nke Zaịọn, ọbụna ha nile.

57 Ma ha ga-anọgide n’ọkpụrụ amamikpe nke a ruo mgbe ha ga-echegharị ma cheta ọgbụgba-ndụ ọhụrụ, ọbụna Akwụkwọ nke Mọmọn na iwu nsọ nile ndị ochie nke m nyeworo ha, ọbụghị nani ikwu ya, mana ime ya dịka nke ahụ nke m deworo—

58 Ka ha wee nwee ike mịpụta ezi mkpụrụ kwesịrị ala-eze nke Nna ha; ma ọbụghị otu a ọ ka fọdụrụ ihe-otiti na ikpe nke a ga-awụkwasị n’isi ụmụ nke Zaịọn.

59 N’ihi ụmụ nke ala-eze ahụ ha ga-enwe ike ịmerụ ala nsọ nke m? N’ezie, a sị m unu, E e.

60 N’ezie, n’ezie, a sị m unu ndị na-anụ okwu m nile ugbụ a, ndị nke bụ olu m, ngozi na-adịrị unu ma ọbụrụraa na unu na-anabata ihe ndị a nile;

61 N’ihi na a ga m agbaghara unu mmehie nile jiri iwu-nsọ nke a—na unu ga-anọgide sie-ike n’echiche unu nile n’idi-nwayọ na mụọ nke ekpere, n’ịgba ama nye ụwa nile maka ihe ndị ahụ nke m nyeworo unu.

62 Ya mere, gaa nụ n’ime ụwa nile; ma ebe ọbụla unu n’agahị agalite, unu ga-eziga, ka ama ahụ nwe ike ịga site n’unu rute ụwa nile rute ihe nile ekere-eke.

63 Ma dịka m kwuru nye ndị-ozi m, ọbụna otu a ka m na-ekwu nye unu, n’ihi na unu bụ ndị ozi m, ọbụna ndị-isi-nchụ-aja nke Chineke, unu bụ ndị ahụ ndị Nna m nyeworo m; unu bụ ndị enyi m;

64 Ya mere, dịka m kwuru nye ndị-ozi m, a na m ekwu nye unu ọzọ, na mkpụrụ obi ọbụla nke kwenyere n’okwu unu nile, ma eme ya baptism site na mmiri maka nsachapụ nke mmehie nile, ga-anata Mụọ Nsọ ahụ.

65 Ma ihe ịrịba-ama ndị a ga-eso ndị kwere ekwe—

66 N’aha m ha ga-arụ ọtụtụ ọrụ nile dị ebube;

67 N’aha m ha ga-achụpụ ajọọ mụọ nile;

68 N’aha m ha ga-agwọ kwa ndị ọrịa;

69 N’aha m ha ga-emeghee anya nile nke ndị kpuru isi, ma meghee kwa ntị nile nke ndị ntị chiri;

70 Ma ire nke onye ogbu ga-ekwu okwu;

71 Ma ọ bụrụ na onye ọbụla enye ha nsi ọ gaghị emerụ ha arụ;

72 Ma nsi nke agwọ agaghị enwe ike imerụ ha arụ.

73 Mana iwu-nsọ ka m na-enye ha, ka ha ghara ịnyara onwe ha isi maka ihe ndị a, ọbụghị ma-ọbụ ikwụpụta ha n’iru ụwa; n’ihi na ihe ndị a ka e nyere unu maka uru unu na maka nzọpụta.

74 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, ndị ahụ ndị n’ekweghị n’okwu unu nile, ma n’emeghị baptism na mmiri n’aha m maka nsachapụ nke mmehie ha nile, ka ha wee nwee ike ịnata Mụọ Nsọ, ka a ga-ama ịkpe, ma ha agaghị abịa n’ime ala-eze nke Nna m ebe mụ na Nna m nọ.

75 Ma mkpughe nke a nye unu, na iwu-nsọ, dị ire site n’awa nke a n’elu ụwa nile, ma ozi-ọma ahụ bụ maka mmadụ nile ndị n’anatabeghi ya.

76 Mana, n’ezie, a sị m ndị nile ahụ ndị e nyeworo ala-eze—site n’unu ka aghaghị ikwusa ya nye ha, na ha ga-echegharị site n’ajọọ-omume ha nile mgbe gara-aga; n’ihi a ga-ata ha ụta maka ajọọ obi ha nile nke ekweghị ekwe, ma ụmụ nne unu nọ na Zaịọn maka nnupụ-isi ha megide unu n’oge ahụ m zipụrụ unu.

77 Ma ọzọ a sị m unu, ndị enyi m, n’ihi na site ugbua gaa n’iru a ga m na-akpọ unu ndị enyi, ọ dị mkpa na m ga-enye unu iwu-nsọ nke a, na unu ga-abuzi ọbụna dịka ndị enyi m n’ụbọchị nile mgbe m nọnyere ha na-aga njem ikwusa ozi-ọma n’ike m;

78 N’ihi na e gbochiri m ha iji akpa ego ma-ọbụ akpa njem ọbụghị ma-ọbụ iji uwe mkpuchi abụọ.

79 Lee, e zipụrụ unu igosi ezi-okwu nye ndị ụwa, ma onye-ọrụ kwesịrị ụgwọ-ọrụ ya.

80 Ma mmadụ ọbụla nke ga-aga ma kwusaa ozi-ọma nke ala-eze, ma dapụghị n’ịga-n’iru n’ịkwesị-ntụkwasị-obi n’ihe nile, a gaghị ada mba n’uche, ọbụghị ma-ọbụ gbaa ọchịchịrị, ọbụghị ma-ọbụ n’arụ, ụkwụ, ma-ọbụ njikọ; ma otu agịrị-isi ya a gaghị ada n’ala na ahụghị ya; ma ha a gaghị anọ agụụ, ọbụghị ma-ọbụ akpiri ịkpọnkụ.

81 Ya mere, echegbula onwe unu maka echi, maka ihe unu ga-eri, ma-ọbụ ihe unu ga-an̄ụ, ma-ọbụ ihe unu ga-eji ekpuchi arụ.

82 N’ihi, tulee okoko osisi lili nile nke ubi, otu ha si na-eto, ha anaghị arụ ọrụ, ọbụghị ma ha na-ekwe akwa; ma ala-eze nile nke ụwa, n’ebube ha nile, achọghị ha mma dịka otu n’ime ndị a.

83 N’ihi na Nna unu, nke bi n’elu-igwe, maara na unu nwere mkpa nke ihe ndịa a nile.

84 Ya mere, ka echi cheere onwe ya echiche maka ihe nke onwe ya.

85 Ọbụghị ma-ọbụ unu iche echiche tutu oge ahụ ihe unu ga-ekwu; mana kpakodo n’echiche unu nile mgbe nile okwu nile nke ndụ, ma a ga-enye unu ya n’awa ahụ akụkụ ahụ nke a ga-enyefe mmadụ nile.

86 Ya mere, ka a ghara inwe onye ọbụla n’etiti unu, n’ihi na iwu-nsọ nke a bụ nye ndị nile kwesịrị ntụkwasị-obi ndị Chineke kpọrọ n’ime nzukọ-nsọ nye mgbasa ozi ahụ, sịte n’awa nke a, were akpa ego ma-ọbụ akpa-njem, ndị na-apụ ị ga maa ọkwa ozi-ọma nke a nke ala-eze.

87 Lee, e zipụrụ m unu ịkatọ ndị ụwa maka ajọọ-omume ha nile, ma kuziere ha maka ikpe nke ga-abịa.

88 Ma onye ahụ nke nabatara unu, ebe ahụ ka m ga-anọ kwa, n’ihi na a ga m aga n’iru gị. A ga m a nọ n’aka nri gị ma n’aka ekpe gị, ma Mụọ nke m ga-anọ n’obi unu nile, ma ndị mụọ-ozi m ga-anọ gburu-gburu unu ịkwalite unu.

89 Onye ọbụla nabatara unu nabatara m; ma otu onye ahụ ga-enye unu nri, na nye unu uwe, ma nye unu ego.

90 Ma onye ahụ nke ga-enye unu nri, ma-ọbụ nye unu uwe, ma-ọbụ nye unu ego, enweghi otu ọ ga-esi etufu ụgwọ-ọrụ ya.

91 Ma onye ahụ nke n’emeghị ihe ndị a nile abụghị onye na-eso ụzọ m; site na nke a unu ga-amata ndị na-esọ ụzọ m.

92 Onye n’anabataghị unu, pụọ nụ site n’ebe ọ nọ n’onwe unu, ma sachaa ụkwụ unu ọbụna jiri mmiri, ezigbo mmiri, ma-ọbụ n’okpọm ọkụ ma-ọbụ n’oyi, ma gbaa-ama maka ya nye Nna unu nke bi n’elu-igwe, ma alọghachikwala azụ ọzọ bịakwute onye ahụ.

93 Ma n’ime ọnụmara ọbụla ma-ọbụ ọbodọ-ukwu ọbụla unu bara, unu mee otu a.

94 Otu o sila dị; unu chọsie ike ma unu ahapụkwala nke ọbụla; ma ahụhụ ga-adịrị ụlọ ahụ ma-ọbụ ọnụmara ahụ ma-ọbụ obodo-ukwu nke jụrụ ịnabata unu, ma-ọbụ okwu unu nile, ma-ọbụ ịgba-ama unu banyere mụ.

95 Ahụhụ, ka m na-ekwu ọzọ, ga-adịrị ụlọ ahụ, ma-ọbụ ọnụmara ahụ ma-ọbụ obodo-ukwu nke jụrụ ịnabata unu, ma-ọbụ okwu unu nile, ma-ọbụ ịgba-ama unu banyere mụ.

96 N’ihi na mụ, Onye Pụrụ Ime Ihe nile, e bịkwasịwo aka m abụọ n’elu mba nile, ị ti ha ihe-otiti maka ajọọ-omume ha.

97 Ma ajọọ ahụhụ nile ga-agbasa, ma a gaghị ewepụ ha site n’ụwa ruo mgbe m rụsịworo ọrụ nke m, nke a ga-egbu mkpụ mkpụ n’ezi-omume—

98 Ruo mgbe mmadụ nile ga amata m, ndị nọgidere, ọbụna site na nke kachasị nta rute na nke kachasị ukwuu, ma ga-ejupụta na mmata nke Onye-nwe, ma ga-ahụ anya na anya, ma ga-eweli olu ha elu, ma jikọkwa olu ha bụọ abụ ọhụrụ nke a na-asị:

99 Onye-nwe a kpọtawo Zaịọn ọzọ;Onye-nwe agbapụtawo ndị ya Israel,Dịka nhọpụta nke amara siri dị,Nke e nwetara na mmezu site n’okwukweNa Ọgbụgba-ndụ nke ndị nna ha.

100 Onye-nwe a gbapụtawo ndị ya;Ma Setan ka e keworo agbụ ma oge adịkwaghị,Onye-nwe achịkọtawọ ihe nile n’otu.Onye-nwe e zidatawo Zaịọn site n’elu.Onye-nwe akpọlitawo Zaịọn site n’okpuru.

101 Ụwa ahụsiwo anya n’ọrụ ma mipụta ike nile nke ya;Ma ezi-okwu ka ehiweworo n’afọ ya nile;Ma elu-igwe nile egosiwo ya iru ọchị.Ma e yinyewo ya uwe nke ebube nke Chineke ya;N’ihi na ọ na-eguzo n’etiti ndị nke ya.

102 Otuto, na nnukwu ugwu, ma ike, na ume,Bụrụ ihe e nyere Chineke anyị; n’ihi na ọ jupụtara n’ebere,Ikpe ziri ezi, amara na ezi-okwu na udo,Ruo mgbe nile na mgbe nile, Amen.

103 Ma ọzọ, n’ezie, ezie, a sị m unu, ọ dị mkpa na onye ọbụla nke pụrụ ikwusa ozi-ọma mgbe nile na-adigide m, na ọbụrụraa na ha nwere ezi na ụlọ nile, ma, nata ego site n’onyinye, na ha ga-eziga ya nye ha, ma-ọbụ were ya mee ihe maka uru ha, dịka Onye-nwe ga-eduzi ha, n’ihi na otu a ka ọ dị m nnọọ mma.

104 Ma ka ndị nile n’enweghi ezi na ụlọ, ndị na-anata ego, zigara ya onye ụkọchukwu na Zaịọn, ma-ọbụ nye ụkọchukwu na Ohio, ka e wee nwee ike nyefee ya maka iweputa mkpughe nile na ibipụta ya, na kwa ihiwe Zaịọn.

105 Ma ọbụrụ na onye ọbụla ga-enye onye ọbụla n’ime unu uwe mkpuchi ime, ma-ọbụ uwe ntizu, were ndị ochie ma nye ndị ogbenye, ma gaa n’ụzọ gị n’an̄ụrị.

106 Ma ọbụrụ na onye ọbụla n’etiti unu esie ike na Mụọ, ka ọ kpọrọ onye ahụ nke n’adịghị ike, ka o wee nwee ike inweta mbuli muọ n’ịdị nwayọ nile, ka ọ wee nwe ike ịdị kwa ike.

107 Ya mere, unu kpọrọ ndị ahụ ndị e chiri echichi n’ọkwa nchụ-aja nke nta, ma zịpụ ha n’iru unu ị ga mee eyiri-eyi nile, na ịkwado ụzọ, na ije nzukọ e yiri eyi nke unu onwe unu agaghị enwe ike ejezu.

108 Lee, nke a bụ ụzọ nke ndị-ozi m nile, n’ụbọchị nile mgbe ochie, jiri wulite nzukọ-nsọ m nye m.

109 Ya mere, ka onye ọbụla guzoro n’ọkwa-ọrụ nke ya, ma rụọ ọrụ n’ọkpụkpọ-oku nke ya; ma ka isi ghara ịgwa ụkwụ nile na ya enweghi mkpa nke ụkwụ; n’ihi na ma ụkwụ adịghị olee otu arụ ga-eji guzo?

110 Arụ kwa chọrọ akụkụ ọbụla, ka ha nile wee kwalite ibe ha n’ọtụ, ka usoro unu nwee ike ịnọ n’ozuzu oke.

111 Ma lee, ndị-isi-nchụ-aja ga-aga njem, na kwa ndị-okenye, na kwa ndị nchụ-aja dị nta; mana ndị dikọn na ndị nkuzi ka a ga-ahọpụta ilekọta nzukọ-nsọ anya, ị bụrụ ndị mgbasa ozi ga-eguzogide nye nzukọ-nsọ.

112 Ma ụkọchukwu, Newel K. Whitney, kwesị kwara ịga-njem gburu gburu ma n’etiti nzukọ-nsọ nile, na-achọpụta ndị ogbenye ilekọta mkpa ha nile site n’ime ka ndị ọgaranya na kwa ndị mpako dị umeala.

113 O ga-ewekwa onye nnọchi-anya ga-elekọta ma na-arụ ọrụ ya nke anụ arụ dịka o siri tụzie ntụzi aka.

114 Otu osila dị, ka ụkọchukwu gaa n’ime obodo-ukwu New York, na kwa n’obodo ukwu Albany, na kwa n’obodo-ukwu Boston, ma dọọ ndị obodo ukwu ndị ahụ aka na ntị jiri ụda nke ozi-ọma, jiri olu na-adasi ike, maka mbibi na mkpochapụ kpam kpam nke na-eche ha ma ọbụrụ na ha ajụ ịnabata ihe ndị a nile.

115 N’ihi na ọbụrụ na ha ajụ ịnabata ihe ndị a nile oge awa nke ikpe ha dị nso, ma ụlọ ha ka a ga-ahapụrụ ha na mbibi.

116 Ka ọ tụkwasị obi na m ma ọ gaghị enwe mgbagwoju anya; ma agịrị nke isi ya ọbụla a gaghị ada n’ala n’ahụghị ya.

117 Ma n’ezie a sị m unu, ndị odibo m ndị fọdụrụ, unu ga-apụ dịka ọnọdụ unu nile ga-esi kwere n’ime ọkpụkpọ-oku unu di iche iche, rute na nnukwu obodo ukwu nile na ọnụmara nile amara aha ha, na-akatọ ndị ụwa n’ezi-omume maka ajọọ-omume ha na omume-amaghị Chineke ha nile, na akọwa n’ụzọ doro anya ma kwe nghọta ịtọgbọrọ n’efu—nke ihe-arụ n’ụbọchị ndị ikpe-azụ.

118 N’ihi na jiri unu ka Onye-nwe Pụrụ Ime Ihe nile kwuru, a ga m ebibi ala-eze ha nile; a gaghị m akwagharị ụwa nanị, mana elu-igwe nile jupụtara na kpakpando ga-ama jijiji.

119 N’ihi na mụ, Onye-nwe, esetịpụwo aka m itinye n’ezigbo ọrụ ike nile nke elu-igwe; unu enweghi ike ịhụ ya ugbụ a, mana nwa-ntịị oge ma unu ga-ahụ ya, ma mata na m nọ, ma na m ga-abịa ma chịa mụ na ndị nke m.

120 A bụ m Alfa na Omega, mmalite ahụ na ọgwụgwụ ahụ. Amen.