Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 88


Nkeji 88

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma na Kirtland, Ohio, 27 Disemba, 1832 (History of the Church, 1:302–312). A kpọrọ ya site n’aka Onye-amụma dịka “akwụkwọ olive” aghọtara site n’Osisi nke Paradaịs, ozi udo nke Onye-nwe nyere anyị“ (History of the Church, 1:316). Ọ na-egosipụta site n’akụkọ-ndekọta nile na akụkụ ụfọdụ sitere na mkpughe nke a bụ ndị a natara na 27 ma na 28 Disemba 1832 ma na 3 Jenuarị 1833.

1–5, Ndị-nsọ kwesịrị ntụkwasị-obi na-anabata Onye nkasi-obi ahụ, nke bụ nkwa ahụ nke ndụ ebighi-ebi; 6–13, Ihe nile ka a na-atụziri aka ma chịa site n’ìhè nke Kraịst; 14–16, Mbilite n’Ọnwụ na-abịa site na Mgbapụta ahụ; 17–31, Nrube-isi n’iwu nke ala-eze selestịal, ala-eze terrestrial, ma-ọbụ ala-eze telestial na-akwado ndị mmadụ maka-ala-eze ndị ahụ dị iche iche na ebube ha nile; 32–35, Ndị ahụ nke chọrọ ị nọ n’ime mmehie na-anọgide kwa n’iru-inyi; 36–41, A na-achị ala-eze nile site n’iwu; 42–45, Chineke enyewo iwu ebe ihe nile dị; 46–50, Mmadụ ga-aghọta ọbụna Chineke; 51–61, Ilu ahụ nke nwoke onye zipuru ndị odibo ya n’ime ubi ya ma bịa ileta ha n’otu n’otu; 62–73, Bịaruo nso n’ebe Onye-nwe nọ, ma ị ga-ahụ iru ya; 74–80, Doo nu onwe unu nsọ ma kụziere nụ onye ọbụla na ibe ya ozizi nile nke ala-eze ahụ; 81–85, Onye ọbụla nke a dọworo aka na ntị kwesịrị ịdọ onye-agbata obi ya aka na-ntị; 86–94, Ihe ịrịba ama nile, ọgba-aghara nile nke ihe e kere eke nile, na ndị mụọ-ozi na-akwado ụzọ ọbịbịa maka ọbịbịa nke Onye-nwe; 95–102, Opi nile nke ndị mụọ-ozi na-akpọpụta ndị nwụrụ anwụ n’usoro ha; 103–116, Opi nile nke ndị mụọ-ozi na-ama ọkwa mwetaghachi ahụ nke ozi-ọma, ọdịda nke Babịlọn, na, agha ahụ nke Chineke ukwu; 117–126, Chọọ mmụta, hiwe otu ụlọ nke Chineke (otu temple), ma jiri ihe nkekọ afo-ọma yikwasị onwe unu; 127–141, Usoro nke Ụlọ Akwụkwọ nke Ndị-amụma ka e gosiri, tinyere emume-nsọ nke ịsa ụkwụ abụọ.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu ndị kpọkọtaworo onwe unu ọnụ ịnata uche ya gbasara unu:

2 Lee, nke a dị mmasị nye, Onye-nwe unu, ma ndị mụọ-ozi ana-an̄ụrị maka unu; bonyinye nke ekpere unu nile abịaruwo na ntị nke Onye-nwe nke cSabaot, ma e dekọtara ya dn’akwụkwọ nke aha ndị nke e doro nsọ, ọbụna ha ndị nke ụwa selestịal ahụ.

3 Ya mere, a na m eziputara unu ugbụ a aOnye-nkasị-obi ọzọ, ọbụna nye unu ndị enyi m, ka ọ wee nọrọ n’ime obi unu nile, ọbụna bMụọ Nsọ nke ekwere na-nkwa; Onye-nkasị-obi nke ọzọ ahụ m kwere na-nkwa nye ndị na-eso ụzọ m, dịka e dekọtara ya n’ime ọgbụgba-ama nke Jọn.

4 Onye-nkasị-obi nke a bụ nkwa nke m kwere unu nke ndụ aebighi-ebi ọbụna bebube ahụ nke ala-eze nke selestịal;

5 Ebube nke bụ nke nzukọ-nsọ nke Onye e aBuru Ụzọ mụọ, ọbụna nke Chineke, onye kachasị nsọ, site na Jisus Kraịst Ọkpara ya—

6 aOnye ahụ nke rigoro n’elu, dịka kwa ọ brịdara n’okpuru ihe nile, nke mere na o cmatasịrị ihe nile, ka ọ wee nọrọ n’ihe nile ma site n’ihe nile, dìhè ahụ nke ezi-okwu;

7 Ezi-okwu nke na-enwu enwu. Nke a bụ aìhè nke Kraịst. Dịka kwa ọ nọ n’ime anyanwụ, ma ìhè ahụ nke anyanwụ, na ike ahụ nke si na ya nke eji bmee ya.

8 Dịka kwa ọ nọ n’ime ọnwa, ma bụrụ ìhè nke ọnwa ahụ, na ike ahụ nke si na ya nke eji mee ya;

9 Dịka kwa ìhè nke, kpakpando nile, na ike ahụ nke si na ha nke eji mee ha;

10 Na ụwa kwa, na ike ahụ nke si na ya, ọbụna ụwa ahụ nke unu aguzoro n’elu ya.

11 Ma ìhè ahụ nke na-enwu, nke na-enye unu ìhè, bụ site na ya onye na-enye anya unu ihe, nke bụ otu ìhè ahụ nke na-akpọlite anghọta unu nile;

12 Bụ aìhè nke na-apụta site n’iru nke Chineke bimejupụta mbara ukwu nile nke ohere—

13 Ị̀hè ahụ nke dị an’ihe nile, nke na-enye ihe nile bndụ, nke bụ ciwu nke e sitere na ya na-achị ihe nile, ọbụna ike nke Chineke onye nọ ọdụ n’elu n’oche-eze ya, onye nọ n’obi nke ebighi-ebi, onye nọ n’etiti ihe nile.

14 Ugbụ a, n’ezie a sị m unu, na site na amgbapụta ahụ nke e mere maka unu ka eji weta na mmezu mbilite n’ọnwụ site na ndị nwụrụ anwụ.

15 Ma amụọ ahụ na barụ bụ cmkpụrụ-obi nke mmadụ.

16 Ma ambilite n’onwu site na ndị nwụrụ anwụ bụ mgbapụta nke mkpụrụ-obi.

17 Ma mgbapụta nke mkpụrụ-obi bụ site na ya onye na-akpọlite ihe nile, onye n’ime obi ya ka o nyere iwu-ọkụ na andị ogbenye na bndị dị umeala nke cụwa ga-eketa ya.

18 Ya mere, o kwesịrị ma dịrị mkpa na e dọrọ ya nsọ site n’ajọọ-omume nile, ka e wee kwado ya maka ebube nke ala-eze aselestịal;

19 N’ihi na mgbe o mezuworo ihe eji kee ya, a ga-ekpukwasị ya okpu-eze aebube, ọbụna jiri ịnọ n’iru nke Chineke Nna ahụ;

20 Ka arụ nile ndị ahụ bụ nke ala-eze selestịal anwere ya ruo mgbe nile na mgbe nile, n’ihi na, site bn’ebum n’obi nke a ka e ji mee ma kee kwa ya, na site n’ebum n’obi nke a ka e ji cdoo ha nsọ.

21 Ma ndị ahụ ndị a n’edoghi nsọ site n’iwu nke m nyeworo unu, ọbụna iwu nke Kraịst, ahaghị iketa ala-eze ọzọ, ọbụna nke ala-eze terrestrial ahụ, ma-ọbụ nke ala-eze telestial ahụ.

22 N’ihi na onye ahụ nke n’enweghi ike idebe aiwu ahụ nke ala-eze selestịal enweghi ike idebe ebube nke selestịal.

23 Ma onye ahụ nke n’enweghi ike idebe iwu ahụ nke ala-eze terrestrial enweghi ike idebe ebube nke aterrestrial.

24 Ma onye ahụ nke n’enweghi ike idebe iwu ahụ nke ala-eze telestial enweghi ike idebe ebube nke atelestial; ya mere o kwesighi iketa ala-eze nke ebube. Ya mere ọ haghị ịnọgide n’otu ala-eze nke n’abụghị ala-eze nke ebube.

25 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, na aụwa na-edebe iwu nke ala-eze selestịal, n’ihi ọ na-emejupụta ntụ ahụ ihe eji kee ya, ma ọ naghị ejehie iwu ahụ—

26 Ya mere, a aga-edo ya nsọ; e, n’agbanyeghị na ọ bga-anwụ, a ga-akpọlite kwa ya ọzọ, ma ga-edebe ike ahụ nke a ga-esi na ya kpọlite ya, ma cndị ezi-omume dga-eketa ya.

27 N’ihi n’agbanyeghị na ha ga-anwụ, ha aga-ebilite ọzọ, arụ bnke mụọ.

28 Ndị ahụ nke nwere mụọ nke ala-eze selestịal ga-anata otu arụ ahụ nke bụụrụ arụ ụdị-okike; ọbụna unu ga-enweta arụ unu nile, ma aebube unu ga-abụ ebube ahụ site na nke eji bkpọlite arụ unu nile.

29 Unu ndị a ga-akpọlite site n’otu akụkụ nke aebube nke ala-eze bselestịal mgbe ahụ ga-anata nke ụdị ya, ọbụna n’ụjụ ya.

30 Ma ha ndị a ga-akpọlite site n’otu akụkụ nke ebube nke ala-eze aterrestrial ga-anata mgbe ahụ nke ụdị ya, ọbụna n’uju ya.

31 Ma kwa ha ndị a ga-akpọlite site n’otu akụkụ nke ebube nke ala-eze atelestial mgbe ahụ ga-anata nke ụdị ya, ọbụna n’ụjụ ya.

32 Ma ha ndị ga-afọdụ ka a aga-akpọlite kwa; otu o sila dị, ha ga alaghachi kwa ọzọ n’ebe nke ha, inwe ọn̄ụ n’ime nke ahụ ha nwere bmmasị ịnata, n’ihi ha enweghi mmasị n’inwe ọn̄ụ n’ime nke ha kwesịrị ịnata.

33 N’ihi na uru gịnị ka ọ baara mmadụ ọbụrụ na e nyere ya onyinye, ma o nataghị onyinye ahụ? Lee, o naghị an̄ụrị ọn̄ụ n’ihe ahụ nke e nyere ya, ọbụghị ma ọ ga-an̄ụrị ọn̄ụ n’ime ya bụ onye ahụ nke bụ onye na-enye onyinye ahụ.

34 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, nke ahụ nke e ji iwu na-achị bụ kwa nke ịwụ na-echekwa ma na-eme ka o zụọ-oke ma ana-edokwa nsọ site n’otu ihe ahụ.

35 Nke ahụ nke ana-emebi iwu ma n’anaghị erube isi n’iwu, mana na-achọ ịbụ iwu nye onwe ya, ma chọkwa ịnọgide na mmehie, ma nọkwasịrị n’ime mmehie, enweghi ike ido ya nsọ site n’ịwụ, ọbụghị ma-ọbụ site bn’ebere, cikpe ziri-ezi, ma-ọbụ ikpe. Ya mere, ha ka ga-anọgide dn’iru inyi.

36 Ala-eze nile nwere iwu e nyere ya;

37 Ma e nwere ọtụtụ aala-eze nile, n’ihi na onweghị ohere ọbụla nke n’enweghi ala-eze dị na ya; ma enweghi ala-eze nke n’enweghi ohere dị na ya, ma-ọbụ ala eze di ukwuu karịa ma-ọbụ dị ala karịa.

38 Ma nye ala-eze nke ọbụla e nyere aiwu; ma nye iwu ọbụla e nwere ụfọdụ oke nile kwa na ọnọdụ nile.

39 Mmadụ nile ndị n’edebeghị aọnọdụ ndị ahụ nile abụghị ndị bikpe n’amaghị.

40 N’ihi na aakọn’uche na-arapara n’akọn’uche; bamamihe na-anabata amamihe; cezi-okwu na-amakụ ezi-okwu; dezi-omume na-ahụ ezi-omume n’anya; eìhè na-arapara n’ìhè; febere na-enwe ọmiko n’ebere ma na-anabata nke ya; ikpe ziri-ezi na-aga n’iru n’ụzọ nke ya ma na-anabata nke ya; ikpe na-agafe n’iru ya bụ onye nọ ọdụ n’elu n’oche-eze ma na-achị ma na-etinye ihe nile e kpebiri n’ọrụ.

41 aghọtara ihe nile, ma ihe nile nọ n’iru ya, ma ihe nile nọ gburu-gburu ya; ma ọ karịrị ihe nile, ma n’ime ihe nile, ma site n’ihe nile, ma nọ gburu gburu ihe nile; ma ihe nile bụ site na ya, ma nke ya, ọbụna Chineke, ruo mgbe nile na mgbe nile.

42 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, o nyewo iwu nye ihe nile, nke ha sitere na ya na-agagharị an’oge ha nile ma na mgbe ha nile;

43 Ma ụzọ-njem ha ka a hụbara ama, ọbụna ụzọ-njem nile nke elu-igwe nile na ụwa, nke gụnyere ụwa na ụwa ndị ọzọ nile.

44 Ma ha na-enyeritara onwe ha aìhè n’oge ha nile ma na mgbe ha nile, na nkeji ha nile, n’awa ha nile, n’ụbọchị ha nile, n’izu-ụka ha nile, n’ọnwa ha nile, n’afọ ha nile—ihe ndị a bụ botu afọ nye Chineke, mana ọ bụghị nye mmadụ.

45 Ụwa na-eji nku ya nile na-atụgharị, ma aanyanwụ na-enye ìhè ya n’ehihie, ma ọnwa na-enye ìhè nke ya n’abalị, ma kpakpando nile kwa na-enye ìhè ha, dịka ha na-eji nku ha nile na-atụgharị n’ebube ha, n’etiti nke bike nke Chineke.

46 O lee ihe m ga-eji tụnyere ala-eze ndia nile ka unu wee nwee nghọta?

47 Lee, ndị a nile bụ ala-eze nile, ma onye ọbụla onye hụworo nke ọbụla ma-ọbụ nke kachasị-nta n’ime ndị a aahụwo Chineke mgbe ọ na-aga n’ụdị eze na ike ya.

48 A sị m unu, ọ hụwo ya; otu o sila dị, ya onye bịakwutere ndị anke ya ka a na-aghọtaghị.

49 aỊ̀hè ahụ na-enwu n’ọchịchịrị ma ọchịchịrị ahụ eji-deghi ya; otu o sila dị ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe unu bga-aghọta ọbụna Chineke, ebe a ga-akpọlite unu n’ime ya ma site na ya.

50 Mgbe ahụ ka unu ga-amata na unu ahụwo m, na a bụ m, ma na a bụ m ezi ìhè ahụ nke dị n’ime unu, ma na unu nọ n’ime m; ma ọbụghị otu a unu agaghị anọgide.

51 Lee, a ga m atụnyere ala-eze nile ndia nye otu nwoke nke nwere ubi, ma ya ezipu ụmụ odibo ya n’ime ubi ahụ ka ha gwuo ala n’ubi ahụ.

52 Ma ọ wee sị onye nke mbụ: Gaa gị ma ruọ ọrụ n’ubi ahụ, ma n’awa nke mbụ a ga m abịakwụte gị, ma ị ga-ahụta ọn̄ụ nke mbara ịrụ m.

53 Ma ọ wee sị onye nke abụọ: Gaa kwa gị n’ime ubi ahụ, ma n’awa nke abụọ a ga m abịa leta gị jiri ọn̄ụ nke mbara iru m.

54 Na kwa nye onye nke atọ, na-asị: a ga m abịa leta gị;

55 Ma nye onye nke anọ, ma otu a gaa n’iru ruo na onye nke iri-na abụọ.

56 Ma onye-nwe nke ubi ahụ gara nọnyere onye nke mbụ n’awa nke mbụ, ma nọnyere ya n’awa ahụ nile, ma eme juputara n’ọn̄ụ maka ìhè nke mbara iru nke onye-nwe ya.

57 Ma mgbe ahụ o wezugara onwe ya site n’onye nke mbụ ahụ ka o wee nwe ike ileta onye nke abụọ kwa, na nke atọ, na nke anọ, ma otu a gaa n’iru rute n’onye nke iri na abụọ.

58 Ma site otu a ha nile natara ìhè ahụ nke mbara iru nke onye-nwe ha, onye ọbụla n’awa nke ya, ma n’oge nke ya, ma na mgbe nke ya—

59 Malite na onye mbụ, na site otu a ruo n’onye nke aikpe azụ, na site n’onye nke ikpeazụ rute n’onye nke mbụ, ma site n’onye nke mbụ rute n’onye nke ikpe-azụ;

60 Onye ọbụla n’usoro nke ya, rue mgbe awa nke ya gasịrị, ọbụna dịka onye-nwe ya nyeworo ya n’iwu, ka onye-nwe ya wee nwee otuto n’ime ya, ma ya n’ime onye-nwe ya, ka ha nile wee nwee otuto.

61 Ya mere, nye ilu nke a ka m ga-eji tụnyere ala-eze nile ndị ahụ, na andị bi na ha—ala-eze ọbụla n’awa nke ya, ma n’oge nke ya, na mgbe nke ya, ọbụna dịka ịwụ-ọku ahụ nke Chineke meworo siri dị.

62 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, andị enyi m, a hapụ m okwu ndia nye unu ka unu bchee ha n’obi unu nile, jiri iwu-nsọ nke a nke m na-enye unu, na unu cga-akpọku m mgbe m nọ nso—

63 aBịaruo nụ m nso ma a ga m abịaru unu nso; jiri ịrụsi ọrụ ike bchọọ m ma unu ga-cachọta m; rịọ, ma unu ga-anata; kụọ aka, ma a ga-emeghere unu.

64 Ihe ọbụla unu arịọrọ Nna n’aha m a ga-enye unu ya, nke bkwesiri ekwesi maka unu;

65 Ma ọbụrụ na unu arịọ ihe ọbụla ana-ekwesịghị ekwesi maka unu ọ ga-atụgharị bụrụ bamamikpe nye unu.

66 Lee, nke ahụ unu nụrụ dịka aolu ahụ nke otu onye na-eti mkpu n’ime ọzara—n’ime ọzara, maka unu enweghị ike ihụ ya—olu m, maka olu m bụ bMụọ; Mụọ m bụ ezi-okwu; cezi-okwu na-anọgide ma o nweghị ọgwụgwụ; ma ọ dịrị n’ime unu ọ ga-anọgide.

67 Ma ọbụrụ na anya unu elekwasị ananị bn’otuto nke m, arụ unu nile ga-ejupụta na ìhè, ma a gaghị enwe ọchịchịrị n’ime unu; ma arụ nile ahụ jupụtara n’ìhè cga-aghọta ihe nile.

68 Ya mere, adoo nu onwe unu nsọ ka bechiche nile nke unu na-abụzi nanị nye Chineke, ma ụbọchị nile ahụ ga-abịa mgbe unu cga-ahụ ya; n’ihi na ọ ga-ekpughe iru ya nye unu, ma ọ ga-abụ n’oge nke ya, ma n’ụzọ nke ya, ma dịka ọchịchọ nke ya siri dị.

69 Cheta nkwa nke ukwu na nke ikpe azụ nke m kwere nye unu; tufuo nu echiche aefu nile nke unu na oke bịchị ọchị nke unu ebe dị anya.

70 Chere nụ, chere nụ n’ebe a, ma kpọọ ọgbakọ ofufe ime mụọ, ọbụna nke ndị ahụ bụ ndị-ọrụ mbụ ahụ nke ala-eze ikpeazụ nkea.

71 Ma ka ndị ahụ nke ha adọworo aka na ntị na njem ha kpọkuo Onye-nwe ma tụgharịa uche n’idọ aka na ntị ahụ n’ime obi ha nile bụ nke ha nataworo, maka nwa oge nta.

72 Lee, ma hụrụ, a ga m elekọta igwe atụrụ nile nke unu, ma ga-akpọlite ndị okenye ma zigara ha.

73 Lee, a ga m eme ka ọrụ m ga ọsọ ọsọ n’oge ya.

74 Ma a ga m enye unu, ndị bụ andị-ọrụ mbụ ahụ nke ala-eze nke ikpe azụ, iwu-nsọ ka unu kpọkọta onwe unu ọnụ, ma hazie onwe unu, ma kwadobe onwe unu, ma bdoo onwe unu nsọ; e, sachaa obi unu nile, ma mee nu ka aka unu na ụkwụ unu dị cọcha n’iru m, ka m wee mee ka unu dị dọcha;

75 Ka m wee nwee ike ịgba-ama nye aNna unu, na Chineke unu, na Chineke m, na unu dị ọcha site n’ọbara nke ajọọ ọgbọ nke a; ka m wee mejupụta nkwa nke a, nkwa ụkwu na nke ikpe azụ nke a, nke m meworo nye unu, mgbe m chọrọ.

76 Ọzọ, e nye m unu iwu-nsọ ka unu gaa n’iru an’ekpere ma bn’ibu-ọnụ site n’oge ugbua gaa n’iru.

77 Ma, e nye m unu iwu-nsọ na unu aga-akuzi otu onye nye ibe ya, bozizi ahụ nke ala-eze.

78 Jiri nụ ịrụsi ọrụ ike kuzie ihe ma aamara nke m ga-anọnyere unu, ka e wee bkuziere unu n’ụzọ zuru oke karịa n’atụtụ, n’ụkpụrụ, n’ozizi, n’iwu nke ozi-ọma, n’ihe nile nke metụtara ala-eze nke Chineke, nke dị mkpa maka unu ịghọta;

79 Maka ihe nile nke dị an’elu-igwe ma n’ụwa, ma n’ọkpụrụ ụwa; ihe nile dịwororị, ihe nile ndị dị adị, ihe nile ndị n’ahaghị ịbịa na mmezu nso nso a; ihe nile ndị dị n’ụlọ, ihe nile ndị dị na mba; bagha nile ndị ahụ na mgbagwọ-ju-anya nile nke mba nile, na ikpe nile nke dị n’elu ala; na ọmụma-ihe nke mba nile na ala-eze nile—

80 Ka unu wee nwee ike nọrọ na njikere n’ihe nile mgbe m ga-ezipu unu ọzọ imejupụta ọkpụkpọ-oku nke m kpọworo unu, na mgbasa ozi nke m nyeworo unu ikike ime.

81 Lee, e zipuru m unu aịgba-ama ma dọọ kwa ndị mmadụ aka-na-ntị, ma ọ kwesịrị ka onye ọbụla adọworo aka-na-ntị bdọọ kwa onye agbata-obi ya aka-na-ntị.

82 Ya mere, ha a gaghị enwe ihe eji agbanarị ụta, ma mmehie nile ha nọkwa n’isi ha nile.

83 Onye ahụ nke achọrọ m bn’oge ga-achọta m, ma a gaghị ahapụ ya.

84 Ya mere, chere nụ, ma rụsie-ọrụ ike ka unu wee nwee ike izu-oke n’ime ije-ozị unu ị ga n’etiti andị Jentaịlụ maka nke ikpeazụ ya, ka ha ra bụ ndị ọnụ nke Onye-nwe ga-akpọ, bikechi iwu ahụ ma rachie ịgba-ama, ma ijikere ndị-nsọ maka awa nke ikpe nke n’aga ịbịa;

85 Ka mkpụrụ-obi ha wee nwe ike ịgbanarị ịwe-ọkụ nke Chineke, ihe arụ ahụ na-akpata aịtọgbọrọ n’efu nke na-echere ndị ajọọ-omume, ma n’ime uwa nke a ma n’ime ụwa nke na-abịa. N’ezie a sị m unu, ka ndị ahụ n’abụghị ndị okenye nke mbụ nọgide n’ubi vine ahụ rue mgbe ọnụ nke Onye-nwe bga-akpọ ha, n’ihi na oge nke ha erubeghị; uwe nsọ ha nile adịghị cọcha site n’ọbara nke ọgbọ nke a.

86 Nọgide nụ na antọhapụ nke e mere ka unu bnwere onwe unu; unu cetinyekwala onwe unu na dmmehie, mana kwee ka aka unu dị eọcha, rue mgbe Onye-nwe ga-abịa.

87 N’ihi na ọ gaghị eru otutu ụbọchị n’iru ma aụwa bga-ama jijiji ma na-atụgharị́ gaa n’iru ma tụgharịa gaa n’azụ ka onye n̄ubigara mmanya oke; ma canyanwụ ga-ezo iru ya, ma jụ inye ìhè; ma ọnwa ga-emikpu n’ime dọbara; ma ekpakpando nile ga-adị n’oke iwe, ma na-atụdasị onwe ha n’ala dịka mkpụrụ fig na-adatu site n’elu osisi fig.

88 Ma mgbe unu gbasịrị ama ka iwe-ọku na ọnụma ga-abịa dakwasị ndị ahụ.

89 N’ihi na mgbe unu gbasịrị-ama ka ịgba-ama nke si an’ala-ọma jijiji ga-abịa, nke ga-ebute isu-ude n’etiti ya, ma ndị mmadụ ga-ada n’ala ma ha agaghị enwe ike iguzoro.

90 Na kwa ịgba-ama nke aolu nke egbe-elu-igwe nile ga-abịa, na olu nke amụma mmiri nile, na olu nke ebili mmiri nile, ma olu nke ufufe mmiri nile na-ebuli onwe ha karịa oke ha nile.

91 Ma ihe nile ga-adị an’ọgba-aghara; ma n’ezie, mkpụrụ-obi ndị mmadụ ga-akwụsị ọrụ; n’ihi na ụjọ ga-adakwasị mmadụ nile.

92 Ma andị mụọ-ozi ga-efegharị n’etiti elu-igwe, na-eti n’olu ike, na-afụ opi nke Chineke, na-asị: Kwadoo nụ kwadoo nu, o ndị bi n’ụwa; n’ihi na ikpe ahụ nke Chineke anyị abịawo. Lee, ma hụrụ, bOnye na-alụ nwunye na-abịa; gaa nụ izute ya.

93 Ma otu mgbe ahụ aoke ihe ịrịba-ama ga-apụta n’elu-igwe, ma mmadụ nile ga-ahụkọ ya ọnụ.

94 Ma mụọ-ozi ọzọ ga-afụ opi ya, na-asị: aNzukọ-nsọ bukwu ahụ, cnne nke ihe-arụ nile, nke mere mba nile jiri n̄ụọ mmanya nke ọnụma nke dịkwa-iko ya, nke na-esogbu ndị-nsọ nke Chineke, nke kwafuru ọbara ha—ya onye nọ n’elu ọtụtụ mmiri, ma n’elu ala nile nke osimiri—lee, ọ bụ ya bụ eata nile nke ụwa; ekekọtara ya n’ukwu n’ukwu; e mere ka agbụ ya nile sie ike, onweghị onye pụrụ ịtọpụ ha; ya mere, ọ nọkwa na njikere ka feree ya ọkụ. Ma ọ ga-afụ opi ya ma n’ogologo oge ma n’ịdasi ike, ma mba nile ga-anụ ya.

95 Ma a ga-enwe aịda-juu n’elu-igwe n’ohere oge nke otu ọkara awa; ma ngwa-ngwa nkea mesịrị ka akwa-mkpuchi nke elu-igwe ga-agbasa, dịka bakwụkwọ afụkọtara afụkọta na-esi agbasa mgbe afụkọtachara ya, ma ciru nke Onye-nwe, ka a ga-ekpughepụ;

96 Ma ndị-nsọ ndị nọ n’elu ụwa, ndị dị ndụ, ka a ga-enwogharị ma aebulie ha elu izute ya.

97 Ma ndị daworo n’ụra n’ili ha aga-apụta, n’ihi na a ga-emeghe ili ha nile; ma ha kwa ka a ga-ebuli elu izute ya n’etiti nke ogidi nke elu igwe—

98 Ha bụ nke Kraịst, amkpụrụ mbụ nile ahụ, ha ndị ahụ ga-arịda mbụ ha na ya, na ndị ahụ nke nọ n’ụwa n’ime ili ha nile, ndị bụ ndị ebuliri elu mbụ izute ya; ma ihe a nile site n’olu nke ụda nke opi nke mụọ-ozị nke Chineke.

99 Ma mgbe nke a gasịrị mụọ-ozi ọzọ ga-afụ opi, nke bụ opi nke abụọ; ma mgbe ahụ ka a ga-enwe mgbapụta nke ndị nke Kraịst n’ọbịbịa ya; ndị natawọrọ oke nke ha an’ụlọ nkpọrọ ahụ nke a kwadooro ha, ka ha wee nwee ike ịnata ozi-ọma ahụ, ma e bkpee ha ikpe dịka ndị mmadụ n’anụ arụ.

100 Ma ọzọ, opi ọzọ ga-ada, nke bụ opi nke atọ; ma mgbe ahụ ka amụọ nile nke ndị mmadụ ga-abịa ndị a ga-ekpe ikpe, ma a chọta ha n’okpụrụ bamamikpe;

101 Ma ndị a bụ ndị fọdụrụ na andị nwụrụ anwụ; ma ha agaghị adị ndụ ọzọ rue ọgwụgwụ nke botu puku afọ ahụ, ọbụghị ma-ọbụ ọzọ, rue mgbe ụwa ga-agwụ.

102 Ma opi ọzọ ga-ada, nke bụ opi nke anọ, na-asi: A na-achọta ha n’etiti ndị ahụ ga-afọdụ rue na nnukwu ụbọchị ikpe-azụ ahụ, ọbụna nke ọgwụgwụ, ndị ga-anọgide kwa an’iru inyi.

103 Ma opi ọzọ ga-ada, nke bụ opi nke ise, nke bụ mụọ-ozi nke ise onye nyefere ozi-ọma amgbe nile na-adigide—na-efefe site n’etiti nke elu-igwe, rute mba nile, ebo nile, ire nile, na ndị mmadụ nile;

104 Ma nke a ga-abụ ụda nke opi ya, na-asị mmadụ nile, ma n’elu-igwe ma n’ime ụwa, ma ndị nọ n’okpuru ụwa—n’ihi na ntị aọbụla ga-anụ ya, ma ikpere ọbụla ga-begburu, ma ire ọbụla ga-ekwupụta, mgbe ha ga na-anụ ụda nke opi ahụ, na-asị: cTụọ egwu Chineke, ma nye ya otuto onye nọ n’oche-eze, ruo mgbe nile na mgbe nile; n’ihi na awa ahụ nke ikpe ya abịawo.

105 Ma ọzọ, mụọ-ozi ọzọ ga-afụ opi ya, nke bụ mụọ-ozi nke isii na-asị: Ọ adawo bụ onye mere ka mba nile n̄ụọ mmanya nke oke-iwe nke ịkwa-iko ya; ọ dawo, ọ dawo!

106 Ma ọzọ, mụọ-ozi ọzọ ga-afụ opi ya, nke bụ mụọ-ozi nke asaa, na-asi: Ọ gwụwo; ọ gwụwo! aNwa-atụrụ ahụ nke Chineke bemeriwo ma czọda igwe na-akụ mmanya nanị ya, ọbụna igwe na-akụ mmanya nke ịdị-egwu nke iwe-ọku nke Chineke Pụrụ Ime Ihe nile.

107 Ma mgbe ahụ ka a ga-eji ebube na ike ya kpube ndị mụọ-ozi nile n’isi, ma andị-nsọ nile ga-ejupụta bn’ebube ya, ma nata cihe-nketa ha ma e mee ha dịha-otu ya na ha.

108 Ma mgbe ahụ ka mụọ-ozi nke mbụ ga-afụ opi ya na ntị nile nke ndị dị ndụ, ma akpughee omume nzuzo nile nke ndị mmadụ, na oke ọrụ nile nke Chineke n’ime puku afọ bnke mbụ nile.

109 Ma mgbe ahụ ka mụọ-ozi nke abụọ ga-afụ opi ya, ma kpughee omume nzụzọ nile nke mmadụ, na echiche nile na ebum-n’obi nile nke obi ha, na oke ọrụ nile nke Chineke n’ime puku afọ nke abụọ nile—

110 Ma si otu a gaa n’iru, rue mgbe mụọ-ozi nke asaa ga-afụ opi ya; ma o ga-eguzo n’elu ala ma n’elu osimiri, ma n̄ụa iyi n’aha nke ya onye ahụ nọ ọdụ n’elu oche-eze, ma aoge agaghị adịkwa; na a ga-eke bSetan, agbụ, agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ ekwensu, ma a gaghị atọghapụ ya ruo ihe dịka otu cpuku afọ.

111 Ma mgbe ahụ a aga-atọghapụ ya nwa-oge-nta, ka ọ kpọkọta ndị agha ya nile.

112 Ma aMaikael, mụọ-ozi nke asaa ahụ, ọbụna onye-isi-mụọ-ozi ahụ, ga-akpọkọta ndị agha nile nke ya, ọbụna usuu nile nke elu-igwe.

113 Ma ekwensu ga-akpọkọta ndị agha ya nile; ọbụna usuu nile nke ala-mụọ, ma ha ga-apụta ịlụ agha megide Maikael na ndị agha ya nile.

114 Ma mgbe ahụ ka aagha nke Chineke ukwu ga-abịa; ma ekwensu ahụ na ndị agha ya ka a ga-achụpụ baa n’ebe ọnọdụ ha, ka ha ghara inwe ike megide ndị-nsọ ọzọ ma ọlị.

115 N’ihi na Maikael ga-alụ agha ha nile, ma ga-emeri ya onye ana-achọ oche-eze nke onye ahụ nke nọ ọdụ n’elu oche-eze, ọbụna Nwa-atụrụ ahụ.

116 Nke a bụ ebube nke Chineke, na ndị aedoro-nsọ; ma ha agaghị kwa ahụ bọnwụ ọzọ.

117 Ya mere, n’ezie a sị m unu, andị enyi m, kpọọ nụ ọgbakọ ofufe ime mụọ unu, dịka m nyere unu n’iwu.

118 Ma dịka ọbụghị mmadụ nile nwere okwukwe, jiri nụ ịrụsi ọrụ ike chọọ ma akuzirịtara nu ihe otu onye nye ibe ya okwu nile nke bamamihe; e, chọọ nu site cn’akwụkwọ nile kachasị mma, okwu nile nke amamihe; chọọ mmụta, ọbụna site n’ịmụ ihe na kwa site n’okwukwe.

119 Hazie nụ onwe unu; kwadoo ihe nile dị mkpa; ma hiwe otu aụlọ, ọbụna ụlọ nke ekpere, ụlọ nke obubu ọnụ, ụlọ nke okwukwe, ụlọ nke mmụta, ụlọ nke ebube, ụlọ nke usoro, ụlọ nke Chineke;

120 Ka mbata unu nile wee nwee ike bụrụ n’aha nke Onye-nwe; ka ọpụpụ unu nile wee nwee ike bụrụ n’aha nke Onye-nwe; ka ekele unu nile wee nwee ike bụrụ n’aha nke Onye-nwe, jiri aka achiliri elu nye Onye Kachasị elu.

121 Ya mere, akwụsị ire bịrị bịrị nile, site bn’ịchị ọchị nile, site n’ọchịchọ ndụ nile nke canụ arụ, site na dmpakọ unu nile na ime-ihe ka ihe efu nile, na site n’omume n’ihe ọjọọ unu nile.

122 Họpụta n’etiti unu onye nkuzi, ma ka mmadụ nile ghara ịbụ ndị nkwuchita ọnụ n’otu mgbe; mana ka otu onye kwuo n’otu oge ma ka mmadụ nile gee ntị n’okwu ya nile, ka mgbe mmadụ nile kwusiworo ka mmadụ nile nwee nkwalite nke mụọ site na mmadụ nile, ma ka mmadụ nile nwee ohere ahata-aha.

123 Hụ na unu ana-ahụrịta onwe unu n’anya; kwusị inwe banya ukwu; mụta ikerịtara ihe unu nwere otu onye nye ibe ya dịka ozi-ọma chọrọ.

124 Kwụsị ịnọ an’efu; kwụsị ịnọ na-adịghị ọcha; kwụsị bịchọ iri mpe otu onye n’ibe ya; kwụsị ịrahụ ụra karịa ka o kwesịrị; laba n’akwa unu n’oge, ka ike ghara ịgwụ unu; bilie n’oge ka arụ unu nile na echiche unu nwee ike ọhụrụ.

125 Ma kachasị ihe nile, jiri ihe nkekọ nke afọ-ọma yikwasị onwe unu aihe nkekọ nke afọma, dịka esi eyi uwe nwụda, nke bụ ihe nkekọ nke ozuzu-oke na budo.

126 aKpee ekpere oge nile, ka unu ghara ịda mba, rue mgbe m bga-abịa. Lee, ma hụrụ, a ga m abịa ọsọ-ọsọ, ma nabata unu nye onwe m. Amen.

127 Ma ọzọ, usoro nke ụlọ ahụ nke a kwadoro maka otu ndị-isi nduzi nke aụlọ akwụkwọ nke ndị-amụma, nke e hiwere maka ndụmọdụ ha n’ihe nile nke dị mkpa maka ha, ọbụna maka bndị-ọrụ nile nke nzukọ-nsọ, ma-ọbụ n’okwu ndị ọzọ, ndị ahụ a kpọrọ n’ije-ozị nke nzukọ-nsọ, malite na ndị-isi-nchụ-aja ọbụna gbada rute na ndị dịkọn—

128 Ma nke a ga-abụ ụsọrọ nke ụlọ nke otu ndị-isi nduzi nke ụlọ akwụkwọ ahụ: Onye nke a họpụtara ka ọ bụrụ onye-isi nduzi, ma-ọbụ onye nkuzi, ka a ga-ahụ ebe o guzoro n’ebe ya, n’ụlọ ahụ nke a ga-akwadobe maka ya.

129 Ya mere, ọ ga-abụ onye mbụ n’ụlọ nke Chineke, n’ebe ahụ ndị ọgbakọ nọ n’ime ụlọ ga-anụ okwu ya nile na mkpachapụ-anya ma na nghọta nke ọma, na-abụghị n’olu ike.

130 Ma mgbe o ga-abata n’ime ụlọ nke Chineke, n’ihi na o kwesịrị ịbụ onye mbụ n’ụlọ ahụ—lee, nke a mara mma, ka o wee bụrụ ihe atụ—

131 Ka o anyefee onwe ya n’ekpere site n’igbusa ikpere ya abụọ n’iru Chineke, dịka ihe aka ebe ma-ọbụ ncheta nke ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide.

132 Ma mgbe onye-ọzọ ga-abịa mgbe ọ bịasịrị, ka onye nkuzi ahụ bilie, ma, jiri aka abụọ achiliri elu nye elu-igwe, e, ọbụna iru-n’iru, kelee nwanne ya nwoke ma-ọbụ ụmụnna ya jirị okwu ndia:

133 Ị bụ nwanne nwoke ka-ọbụ ụmụnna nwoke? Ekele m unu n’aha nke Onye-nwe Jisus Kraịst, dịka ihe aka-ebe ma-ọbụ ncheta nke ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide, n’ime ọgbụgba-ndụ nke m ji na-anabata unu na ammekọrịta, na mkpebi nke a tụsịrị ike, akwaa-akwụrụ, n’enweghi mgbanwe, ị bụ enyi unu na bnwanne nwoke site n’amara nke Chineke n’ihe nkekọ nile nke ịhụn’anya, ịga-ije n’ime iwu-nsọ nile nke Chineke n’enweghị-ịta ụta, ntụpọ, n’inye ekele, ruo mgbe nile na mgbe nile. Amen.

134 Ma onye ahụ ahụtara n’ekwesighi ekwesị nke ekele nke a agaghị enwe ọnọdụ n’etiti unu n’ihi na unu agaghị-ekwe ka o amerụọ ụlọ m.

135 Ma onye nke na-abata ma kwesị ntụkwasị-obi n’iru m, ma bụrụ nwanne-nwoke, ma-ọbụ ọbụrụ na ha bụ ụmụnna nwoke, ha ga-ekele onye-isi nduzi ma-ọbụ onye-nkuzi site n’ijiri aka abụọ achiliri elu, nye elu-igwe, jiri otu ekpere ahụ na ọgbụgba-ndụ, ma-ọbụ site n’ịsị Amen, n’aka-ebe nke otu ihe ahụ.

136 Lee, n’ezie, a sị m unu, nke a bụ ihe nlere-anya nye unu maka ekele nke otu onye nye ibe ya n’ime ụlọ nke Chineke, n’ime ụlọ akwụkwọ nke ndị-amụma.

137 Ma a na-akpọ unu ime nke a site n’ekpere n’inye ekele, dịka Mụọ ahụ ga-enye ike ọnụ-okwu n’ime ihe nile unu na-eme n’ime ụlọ nke Onye-nwe, n’ụlọ akwụkwọ nke ndị amụma, ka o wee bụrụ ebe-mgbaba, otu ụlọ ofufe nke Mụọ Nsọ ruo na ankwalite mụọ nke unu.

138 Ma unu a gaghị anabata onye ọbụla n’etiti unu n’ime ụlọ-akwụkwọ nke a ewezuga ma aka ya ọdịkwa ọcha site an’ọbara nke ọgbọ nke a;

139 Ma a ga-anabata ya sita n’emume-nso nke aịsacha-ụkwụ abụọ, n’ihi na maka nke a ka eji hiwe emume-nsọ nke ịsacha-ụkwụ abụọ.

140 Ma ọzọ, emume-nsọ ahụ nke ịsacha ụkwụ abụọ ga-abụ nke onye-isi nduzi, ma-ọbụ onye okenye nọ n’isi nke nzukọ-nsọ ga-ahazi.

141 A ga-amalite ya site n’ekpere; ma mgbe a anatasịrị achịcha na mmanya, ọ ga-ekechi onwe ya dịka usoro bihe-nlere anya nke e nyere n’isi nke iri na atọ nke ọgbụgba-ama nke Jọn banyere m. Amen.