Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 55


Nkeji 55

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye William W. Phelps, na Kirtland, Ohio, Jun 1831 (History of the Church, 1:184–186). William W. Phelps, onye-mbipụta akwụkwọ, na ezi na n’ụlọ ya ka bịarutere na Kirtland, ma Onye-amụma jụrụ Onye-nwe banyere ya.

1–3, W. W. Phelps ka a kpọrọ ma họpụta ka e mee ya baptism, na ka e chie ya echichi onye okenye, ma ka o kwusaa ozi-ọma; 4, Ọ ga kwa ede akwụkwọ maka ụmụ-ntakịrị nọ n’ụlọ akwụkwọ nile nke Nzukọ-nsọ; 5–6, Ọ ga-eje kwa Missouri nke ga-abụ mpaghara nke ọrụ ya.

1 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru nye gị, nwa odibo m William, e, ọbụna Onye-nwe aụwa nile, gị, ka a kpọrọ ma họpụta; ma mgbe e mesịrị gị bbaptism site na mmiri, nke ọbụrụ na i mee ya jiri anya gị lekwasị nanị n’otuto m, i ga-enwe nsachapụ nke mmehie gị nile na nnabata nke Mụọ Nsọ site n’ịbịkwasị caka abụọ n’isi;

2 Ma mgbe ahụ a ga-echi gị echichi site n’aka nke nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ka ị bụrụ onye okenye nye nzukọ-nsọ nke a, ikwusa nchegharị na ansachapụ nke mmehie nile site n’ụzọ nke baptism n’aha nke Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.

3 Ma n’onye ọbụla ị ga-ebịkwasị aka gị n’isi, ọbụrụ na ha nwere mụọ nke nchegharị n’iru m, ị ga-enwe ike inye ha Mụọ Nsọ.

4 Ma ọzọ, a ga-echi gị echichi ka i nyere nwa odibo m Oliver Cowdery aka ịrụ-ọrụ nke mbipụta akwụkwọ, na nke ịhọpụta ma ide aakwụkwọ maka ụlọ akwụkwọ n’ime nzukọ-nsọ a, ka ụmụ-ntakịrị kwa nwe ike ịnata nkuzi n’iru m dịka o siri masị m.

5 Ma ọzọ, n’ezie a sị m gị, n’ihi nke a ị ga-aga njem gị, gị na ụmụ odibo m Joseph Smith, Nta, na Sidney Rigdon, ka e ahiwe gị n’ala nke ihe-nketa gị ịrụ ọrụ a.

6 Ma ọzọ, ka nwa odibo m Joseph Coe gaa kwa njem ya, ya na ha. Nke fọdụrụ ka a ga-eme ka ị mata ma e mesịa, ọbụna dịka m siri chọọ. Amen.