Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 76


Nkeji 76

Ọ́hụ̀ e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Sidney Rigdon, na Hiram, Ohio, 16 Februarị 1832 (History of the Church, 1:245–252). Mgbe o na-ede okwu mmalite nke ndekọta ọ́hụ̀ a Onye-amụma dere “Mgbe m lọghachiri site n’ọgbakọ Amherst, a malitekwara m ntụgharị-asụsụ nke Akwụkwọ-nsọ nile. Site n’ọtụtụ mkpughe nile nke m nataworo, o doro anya na ọtụtụ akụkọ dị mkpa gbasara mgbapụta nke mmadụ, ka e wepụrụ na Bible, ma-ọbụ na o furu tutu a chikọta ya. Ọ gbara ama nke onwe ya, site n’ezi okwu nile ndị a hapụrụ, na ọbụrụ na Chineke na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ-ọrụ ya nile dika ihe ndị e mere na arụ siri dị, ebe ahụ bụ ‘Elu-igwe’, dịka akwadoro ya ịbụ ụlọ ebe-obibi ebighi-ebi nke Ndị-nsọ, garịrị ịgụnye ala-eze karịrị otu. Maka nke a,…dịka a na-atụgharị Ozi-ọma nke Jọn Onye-nsọ, mụ onwe m na Okenye Rigdon hụrụ ọ́hụ̀ nke a na-eso”. (History of the Church, 1:245), Ọ bụ mgbe Onye-amụma tụgharịsịworo Jọn 5:29 ka e nyere ọ́hụ̀ nke a.

1–4, Onye-nwe bụ Chineke; 5–10, Ihe-omimi nile nke ala-eze ga-abụ nke ekpughere nye ndị kwesịrị ntụkwasị-obi; 11–17, Mmadụ nile ga-apụta na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi-omume ma-ọbụ ndị ajọọ-omume; 18–24, Ndị bi n’ọtụtụ ụwa bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị Chineke mụrụ site n’ịchụ-aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst; 25–29, Otu mụọ-ozi nke Chineke dapụrụ ma bụrụ ekwensu; 30–49, Ụmụ nke mbibi ga-ata ahụhụ nke ọmụma ikpe ebighi-ebi, ndị ọzọ nile ga-enweta ogo nzere nke nzọpụta; 50–70, Ebube ahụ na ụgwọ-ọrụ nke ndị e buliri elu n’ala-eze selestịal ka a kọwara; 71–80, Ndị ahụ ga-eketa ala-eze nke terrestrial nile ka a kọwara; 81–113,Ogo nke ebube nile nke ndị nọ na telestial, terrestrial, na selestịal ka a kọwara; 114–119, Ndị nile kwesịrị ntụkwasị-obị ga-enwe ike ịhụ ma ghọta ihe-omimi nile nke ala-eze nke Chineke site n’ike nke Mụọ Nsọ.

1 Nụrụ, O unu elu-igwe nile, ma chee ntị, O ụwa, ma n̄urịa nụ unu ndị nile bi ebe ahụ n’ihi na Onye-nwe bụ Chineke, ma ewezuga ya ọ dịghị Onye-nzọpụta ọzọ.

2 Ukwuu ka amamihe ya dị, ịtụ n’anya ka ụzọ ya nile dị, ma ogo nke omume ya nile onweghị onye nwere ike ịchọpụta.

3 Nzube ya nile enweghi mgbochi, ọbụghị ma onwere onye nwere ike ịkwụsị aka ya.

4 Site mgbe ebighi-ebi ruo mgbe ebighi-ebi ọ bụ otu ihe ahụ, ma afọ ya nile adịghị ada.

5 N’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru—Mụ, Onye-nwe, e nwere m obi ebere na amara nye ndị na-atụ egwu m, ma na-enwe mmasị ịkwanyere ndị na-efe m ofufe n’ezi omume ma n’ezi-okwu ùgwù ruo n’ọgwụgwụ oge.

6 Ukwuu ka ụgwọ-ọrụ ha ga-adị ma ebighi-ebi ka ebube ha ga-adị kwa.

7 Ma ha ka m ga-ekpughere ihe-omimi nile, e, ihe-omimi nzuzo nile nke ala-eze m site n’ụbọchị ochie nile, ma maka oge nile nke ga-abịa, ka m ga-egosi ha ị dị mma nke ọchịchọ m gbasara ihe nile metụtara ala-eze m.

8 E, ọbụna ihe ebube nile nke mgbe ebighi-ebi ka ha ga-amata, ma ihe nile ga-abịa ka m ga-egosi ha, ọbụna ihe nile nke ọtụtụ ọgbọ.

9 Ma ka amamihe ha ga-adị ukwuu, ma nghọta ha ga-eru n’elu-igwe; ma n’iru ha amamihe nke ndị maara ihe ga-ala n’iyi, na nghọta nke ndị na-akpachapụ-anya ga-abụ ihe efu.

10 N’ihi na site na Mụọ m ka m ga-agba ama nye ha, ma site n’ike m ka m ga-eme ka ha mata ihe nzuzo nile nke ọchịchọ m—e, ọbụna ihe ndị ahụ anya n’ahụtụbeghi, ma-ọbụ ntị nụtụbeghị, ma-ọbụ batatụbeghị n’ime obi nke mmadụ.

11 Anyị, Joseph Smith, Nta, na Sidney Rigdon, ebe anyị nọ n’ime Mụọ ka ọnwa Februarị gbara mkpuru ụbọchị iri na isii, n’afọ nke Onye-nwe anyị otu pụkụ, narị asatọ, na iri atọ na abụọ—

12 Site n’ike nke Mụọ e mepere anya anyị nile ma nghọta anyị nile ka a kpalitere, ka anyị wee hụ ma ghọta ihe nile nke Chineke—

13 Ọbụna ihe ndị ahụ malitere n’isi mbụ tutu ụwa adị, ndị nke Nna chiworo echichi site n’otu Ọkpara ọ Mụrụ Nani ya, onye nke dabere n’obi nke Nna ya, obụna site na mmalite;

14 Onye ahụ anyị na-agba ama ya; ma ama nke anyị na-agba bụ uju nke ozi-ọma nke Jisus Kraịst, onye bụ Ọkpara, onye anyị hụrụ na onye anyị na ya kparịtara ụka na ọ́hụ̀ nke elu-igwe ahụ.

15 N’ihi na dịka anyị na-arụ ọrụ ntugharị asụsụ ahụ, nke Onye-nwe họpụtaworo anyị, anyị bịaruru n’ama okwu nke iri abụọ na iteghete nke isi ise nke Jọn, nke e nyere anyị otu a—

16 N’ikwu maka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, gbasara ndị ahụ ndị nke ga-anụ olu nke Ọkpara nke Mmadụ:

17 Ma ga-apụta; ndị ahụ ndị nke mere ezi-ihe, na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi-omume; na ndị ahụ ndị nke mere ihe-ọjọọ, na mbilite n’ọnwụ nke ndị ajọọ-omume.

18 Ugbụ a nke a mere ka ọ tụ anyị n’anya, n’ihi na e nyere anyị ya site na Mụọ.

19 Ma dịka anyị nọ na-atụgharị uche n’ihe ndị a, Onye-nwe metụrụ anya ime mụọ nke nghọta anyị aka, ma e mepere ha, ma ebube nke Onye-nwe mụkwasiri gburu gburu.

20 Ma anyị hụrụ ebube nke Ọkpara ahụ, nọ n’aka nri nke Nna, ma uju ya ka anyị natara;

21 Ma hụ ndị mụọ-ozi dị nsọ, ma ha ndị e doro nsọ n’iru oche-eze ya, na-akpọ isi-ala nye Chineke, na Nwa-atụrụ ahụ, ndị nke na-akpọrọ ya isi ala ruo mgbe nile na mgbe nile.

22 Ma ugbụ a, mgbe e nyesịworo ọtụtụ ama nke e nyeworo maka ya, nke a bụ ọgbụgba-ama ahụ, nke ikpe azu n’ime ha nile, nke anyị na-enye maka ya: Na ọ dị ndụ!

23 N’ihi na anyị hụrụ ya, ọbụna n’aka nri nke Chineke; ma anyị nụrụ olu na-agba ama na ọ bụ Onye ahụ Amụrụ Nanị ya nke Nna—

24 Na site n’aka ya, ma site na ya, ma na ya, ụwa nile ahụ dị, ma e kere ha, ma ndị bi n’ebe ahụ bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị a mụrụ nye Chineke.

25 Ma nke a ka anyị hụkwara, ma na-agba ama, na otu mụọ-ozi nke Chineke onye nke nọ n’ikike n’iru nke Chineke, onye nupuru isi megide Ọkpara nke a Mụrụ Nanị ya onye Nna hụrụ n’anya na onye dabere n’obi nke Nna, ka a chụdatara site n’iru nke Chineke na Ọkpara,

26 Ma a kpọrọ ya Onye-ịla n’iyi, n’ihi na elu-igwe nile kwara akwa maka ya—a kpọrọ ya Lusifa, nwa chi ọbụbọ.

27 Ma anyị hụrụ, ma lee, ọ dawo! ọ dawọ, ọbụna nwa nke chi ọbụbọ!

28 Ma dịka anyị ka nọ n’ime mụọ, Onye-nwe nyere anyị iwu ka anyị dee ọ́hụ̀ ahụ; n’ihi na anyị hụrụ Setan agwọ ochie ahụ, ọbụna ekwensu ahụ, onye nupuru isi megide Chineke, chọọ iwere ala-eze nke Chineke anyị na Kraịst ya—

29 Ya mere, ọ na-ebu agha megide ndị-nsọ nke Chineke, na-agbabichi ha gburu gburu.

30 Ma anyị hụrụ ọ́hụ̀ nke ahụhụ nile nke ndị ahụ ndị ọ lụsoro agha ma merie, n’ihi na otu a ka olu Onye-nwe dara nye anyị:

31 Otu a ka Onye-nwe kwuru gbasara ndị ahụ ndị maara ike m, ma e meworo ndị ketara-oke na ya, nyefee onwe ha site n’ike nke ekwensu ka e merie ha, na ị gọnarị ezi-okwu ahụ ma jụ ike m—

32 Ha bụ ndị bụ ụmụ nwoke nke ịla n’iyi, ndị m na-ekwu maka ha na ọ gara aka ha mma na a mụghị ha amụ;

33 N’ihi na ha bụ abọ nile nke oke-iwe ndị a mara ikpe nke ịta-ahụhụ nke oke-iwe nke Chineke, ha na ekwensu na ndị mụọ-ozi ya na mgbe ebighi-ebi;

34 Gbasara ndị m kwuworo na ha enweghi mgbaghara n’ụwa nke a ma-ọbụ n’ụwa nke ga-abịa—

35 Ebe ha gọnarịworo Mụọ Nsọ mgbe ha natasịworo ya, ebe ha gọnarịworo Ọkpara nke a Mụrụ Nanị ya nke Nna, ebe ha kpọgideworo ya n’obe nye onwe ha ma debe kwa ya n’ọnọdụ ihere n’iru ọha.

36 Ndị a bụ ndị nke ga-adaba n’ime ọdọ ọkụ na nkume ọku, ha na ekwensu na ndị mụọ-ozi ya—

37 Na nanị ndị ọnwụ nke ugboro abụọ ga-enwe ike ọbụla n’arụ ha;

38 E, n’ezie, ndị nanị ha n’agaghị enwe mgbapụta n’oge akara-aka nke Onye-nwe mgbe ha tachara ahụhụ nile nke oke-iwe ya.

39 N’ihi na ndị ọzọ nile ka a ga-akpọlite site na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, site na mmeri na ebube nke Nwa-atụrụ, onye e gburu, onye nọ n’adabere n’obi Nna tutu e kee ụwa nile.

40 Ma nke a bụ ozi-ọma ahụ, ozi ọma, nke olu ahụ nke sitere n’elu-igwe gbara ama nye anyị—

41 Na ọ bịara n’ime ụwa, ọbụna Jisus ka a kpọgbuo ya maka ụwa, na iburu mmehie nke ụwa, na ido ụwa nsọ, na ịsacha ya site n’ajọọ-omume ya nile;

42 Na site na ya e nwere ike ịzọpụta mmadụ nile ndị Nna tinyere n’ike ya ma kee site na ya;

43 Ndị na-eto Nna, na-azọpụta aka-ọrụ nile nke aka ya, ewezuga ụmụ nke mbibi ndị na-agọnarị Ọkpara ahụ mgbe Nna kpughesiworo ya nye ha.

44 Ya mere, ọ na-azọpụta mmadụ nile ewezuga ha—ha ga-aga baa na ntaram-ahụhụ mgbe nile na-adigide, nke bụ ntaram-ahụhụ agwụgh-agwụ, ịchị-achị ha na ekwensu na ndị mụọ-ozi ya na mgbe ebighi-ebi, ebe ikpuru ha n’adịghị anwụ, ma ọdọ ọkụ ya adịghị anyụ anyụ, nke bụ ịta ahụhụ ha.

45 Ma nsọtụ ya ebe ahụ, ọbụghị ma ebe ọbụ, ma-ọbụ ntaram-ahụhụ ha, onweghị mmadụ ọbụla maara;

46 Ọ bụghị ma e kpughere ya, ọbụghị ma ọ dị, ọbụghị ma n’aga ekpughe ya nye mmadụ, ewezuga ndị nke e mere ndị nketa oke ebe ahụ.

47 Otu osila dị, mụ, Onye-nwe, na-egosi ya site n’ọ́hụ̀ nye ọtụtụ, mana otu mgbe ahụ ekpuchie kwa ya ọzọ;

48 Ya mere, ọgwụgwụ ya, mbara ya, ogo ya, omimi ya, na nhuju anya n’ebe ahụ, ha aghọtaghị, ma ọbụghị dị onye ọbụla ewezuga ndị ahụ ndị a họpụtara nye amamikpe nke a.

49 Ma anyị nụrụ olu ahụ na-asị: Dee ọ́hụ̀ ahụ, n’ihi na lee, nke a bụ ọgwụgwụ nke ọ́hụ̀ nke ahụhụ nile nke ndị n’amaghị Chineke.

50 Ma ọzọ anyị na-agba ama—n’ihi na anyị hụrụ ma nụrụ, ma nke a bụ ọgbụgba-ama nke ozi-ọma nke Kraịst gbasara ha ndị ga-apụta na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi-omume—

51 Ha bụ ndị natara ọgbụgba-ama nke Jisus, ma kwere n’aha ya ma emee ha baptism n’usoro dị ka nke olili ya, ebe a na-eli ha n’ime mmiri n’aha ya, ma nke a dịka iwu-nsọ nke o nyeworo siri dị—

52 Na site n’idebe iwu-nsọ nile na-enwe ike isa ha ma sapụ ha site na mmehie ha nile, ma nata mụọ nso site n’ibịkwasị aka nile nke onye ahụ e chiri echichi ma arachiri nye n’ike nke a;

53 Ma ndị na-emeri site n’okwukwe, ma bụrụ ndị a rachiri site na Mụọ Nsọ nke nkwa nke Nna na-ezitara ndị nile ahụ bụ ndị ezi-omume na ezi-okwu.

54 Ọ bụ ha ndị bụ nzukọ-nsọ nke Onye e Buru Uzọ mụọ.

55 Ọ bụ ha bụ ndị Nna tinyere ihe nile n’aka ha—

56 Ọ bụ ha bụ ndị nchụ-aja na ndị-eze, ndị nataworo site n’uju ya, ma site n’ebube ya.

57 Ma bụrụ ndị nchụ-aja nke Onye Kachasị Elu, dịka usoro Melkizedek siri dị, nke bụ dịka usoro nke Inok siri dị, nke bụ dịka usoro nke Ọkpara a Mụrụ Nanị ya siri dị.

58 Ya mere, dịka e deworo ya, ha bụ chi nile, ọbụna ụmụ nke Chineke

59 Ya mere, ihe nile bụ nke ha, ma-ọbụ ndụ ma-ọbụ ọnwụ, ma-ọbụ ihe nile dị ugbụ a, ma-ọbụ ihe ga-adị, ihe nile bụ nke ha ma ha bụ ndị nke Kraịst, ma Kraịst bụ nke Chineke.

60 Ma ha ga-emeri ihe nile.

61 Ya mere, ka onye ọbụla anyala-isi n’ime mmadụ, mana kama ka ọ nyaa isi n’ime Chineke, onye ga-emeri ndị-iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya.

62 Ndị a ga-anọ n’iru nke Chineke na Kraịst ya ruo mgbe nile na mgbe nile.

63 Ndị a bụ ha ndị ọ ga-akpọta bịa, mgbe ọ ga-abịa n’igwe-ojii nile nke elu-igwe ịchị ndị nke ya n’ụwa.

64 Ndị a bụ ha ndị ga-enwe oke na mbilite n’ọnwụ nke mbụ.

65 Ndị a bụ ha ndị ga-apụta na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi-omume.

66 Ndị a bụ ha ndị bịarutaworo n’Ugwụ Zaịọn, ma rute n’obodo nke Chineke dị ndụ, ebe elu-igwe ahụ, ebe kachasị dị nsọ.

67 Ndị a bụ ha ndị bịakwutaworo imerime ndị mụọ-ozi a napụghị ịgụta ọnụ, rue n’ọgbakọ zuru ọha nile na nzukọ-nsọ nke Inọk, na nke Onye e Burụ Uzọ mụọ.

68 Ndị a bụ ha ndị e deworo aha ha n’elu-igwe, ebe Chineke na Kraịst bụ ndị ikpe mmadụ nile.

69 Ndị a bụ ha ndị ezi-omume ndị e meworo ka ha zuo-oke site na Jisus onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ, onye chụrụ-aja mgbaghara mmehie nke a zuru oke site n’ịkwafu ọbara nke ya.

70 Ndị a bụ ha ndị arụ ha bụ nke selestịal, ndị ebube ha bụ nke anyanwụ, ọbụna ebube nke Chineke, nke kachasị elu, onye ụdị ebube anyanwụ ahụ nke mbara elu ka e deworo na ọ dịka ya.

71 Ma ọzọ, anyị hụrụ ụwa nke terrestrial, ma lee ma hụrụ, ndị a bụ ha ndị ahụ bụ nke terrestrial, ndị ebube ha dị iche site na nke nzukọ-nsọ nke Onye e Buru Uzọ mụọ, ndị nke nataworo uju nke Nna, ọbụna dịka nke ọnwa siri dị iche site na nke anyanwụ na mbara elu.

72 Lee, ndị a bụ ha ndị nwụrụ mgbe a n’edebeghị iwu;

73 Ma kwa ndị bụ mụọ nile nke mmadụ e dotara n’ụlọ nkpọrọ, ndị nke Ọkpara letara, ma kwusaara ozi-ọma nye ha, ka e wee kpee ha ikpe dịka ndị mmadụ n’anụ arụ;

74 Ndị n’anataghị ọgbụgba-ama nke Jisus n’anụ arụ, mana mesịa nata ya.

75 Ndị a bụ ha ndị a na-enye nsọpụrụ nke ụwa, ndị kpuru-isi site n’aka aghụghọ nke mmadụ.

76 Ndị a bụ ha ndị na-anata site n’ebube ya ma ọbụghị n’uju ya.

77 Ndị a bụ ha ndị na-anata site n’iru nke Ọkpara, mana ọbụghị n’uju nke Nna.

78 Ya mere, ha nwere arụ nile nke terrestrial, ma ọbụghị arụ nile nke selestịal, ma dị iche n’ebube dịka ọnwa siri dị iche site n’anyanwụ.

79 Ndị a bụ ha ndị n’esighi-ike na ọgbụgba-ama nke Jisus; ya mere, ha anataghị okpu-eze ahụ nke ala-eze nke Chineke anyị.

80 Ma ugbụ a nke a bụ ọgwụgwụ nke ọ́hụ̀ ahụ nke anyị hụrụ nke terrestrial, nke Onye-nwe nyere anyị iwu ide mgbe anyị ka nọ na Mụọ.

81 Ma ọzọ, anyị hụrụ ebube nke telestial, ebube nke bụ nke dị nta, ọbụna dịka ebube nke kpakpando nile siri dị iche site n’ebube nke ọnwa na mbara elu.

82 Ndịa bụ ha ndị n’anataghị ozi-ọma nke Kraịst, ọbụghị ọgbụgba-ama nke Jisus.

83 Ndị a bụ ha ndị n’anaghị agọnarị Mụọ Nsọ.

84 Ndị a bụ ha ndị a na-akwaba n’ala mụọ.

85 Ndị a bụ ha ndị a n’agaghị agbapụta site n’aka nke ekwensu ruo na mbilite n’ọnwụ nke ikpe-azụ, ruo mgbe Onye-nwe, obụna Kraịst Nwa-atụrụ ahụ, rusịworo ọrụ ya.

86 Ndị a bụ ha ndị n’anaghị anata site n’uju ya n’ime ụwa ebighi-ebi, mana site na Mụọ Nsọ site n’ije-ozị nke terrestrial;

87 Ma terrestrial ahụ site n’ije-ozị nke selestịal.

88 Na kwa telestial ahụ na-anata ya site na nleba anya nke ndị mụọ-ozi ndị a họpụtara ije-ọzi maka ha, ma-ọbụ ndị a họpụtara ịbụ mụọ ndị na-eje ozi maka ha, n’ihi na ha ga-abụ ndị nketa nke nzọpụta.

89 Ma otu a anyị hụrụ, n’ọ́hụ̀ nke elu-igwe ahụ ebube nke Ala-eze terrestrial nke karịsịrị nghọta nile;

90 Ma onweghị onye maara ya ewezuga onye ahụ Chineke kpugheere ya.

91 Ma otu a anyị hụrụ ebube nke terrestrial nke kachasị n’ihe nile ebube nke terrestrial, obụna n’ebube, ma ike, ma n’ume, ma ebe ọchịchị.

92 Ma otu anyị hụrụ ebube nke selestịal ahụ, nke kachasị n’ihe nile—ebe Chineke, ọbụna Nna ahụ, na-achị n’elu oche-eze ya ruo mgbe nile na mgbe nile;

93 N’iru oche-eze ya ihe nile ga-akpọ isi ala na nkwanye ùgwù, umeala, ma na-enye ya otuto ruo mgbe nile na mgbe nile.

94 Ndị ahụ ndị bi n’iru ya bụ nzukọ-nsọ nke Onye e Buru Uzọ muọ; ma ha na-ahụ dịka esi ahụ ha; ma mata dịka esi mara ha, ebe ha nataworo site n’uju na ya site n’amara ya;

95 Ma ọ na-eme ha ịhara-otu n’ike, ma n’ume, ma n’ebe-ọchịchị.

96 Ma ebube nke selestịal bụ otu, ọbụna dịka ebube nke anyanwụ siri bụrụ otu.

97 Ma ebube nke terrestrial bụ otu, ọbụna dịka ebube nke ọnwa siri bụrụ otu.

98 Ma ebube nke telestial bụ otu, ọbụna dịka ebube nke kpakpando nile siri bụrụ otu; n’ihi na dịka otu kpakpando siri dị iche site na kpakpando ọzọ n’ebube, obụna otu a ka otu siri dị iche site na nke ọzọ n’ebube n’ime ụwa telestial;

99 N’ihi na ndị a bụ ha ndị bụ nke Pọl, na nke Apọlos, na kwa Sifas.

100 Ndị a bụ ha ndị na-asị na ha bụ ụfọdụ nke otu onye na ụfọdụ nke onye ọzọ—ụfọdụ nke Kraịst ma ụfọdụ nke Jọn, ma ụfọdụ nke Moses, ma ụfọdụ nke Elaias, ma ụfọdụ nke Esaịas, ma ụfọdụ nke Aịsaịa, ma ụfọdụ nke Inọk;

101 Mana ha anataghị ozi-ọma, ọbụghị ma-ọbụ ọgbụgba-ama nke Jisus, ọbụghị ma-ọbụ nke ndị-amụma, ọbụghị ma-ọbụ ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide.

102 Nke ikpe-azụ, ndị a nile bụ ha ndị a n’agaghị ekpọkọta ha na ndị nsọ, ka e welikọọ ha nye nzukọ-nsọ nke Onye e Buru Uzọ mụọ, ma nabata ha n’igwe ojii.

103 Ndia bụ ndị ahụ bụ ndị ụgha, na ndị na-agwọ nsi, ndị ọkwa-iko, na ndị akwụnakwụna na onye ọbụla na-ahụ ụgha n’anya ma na-atụ asi.

104 Ndị a bụ ha ndị na-ata ahụhụ iwe-ọkụ nke Chineke n’ụwa.

105 Ndị a bụ ha ndị na-ata ahụhụ ịbọ-obo nke ọkụ ebighi-ebi.

106 Ndị a bụ ha ndị a chụdatara n’ala mụọ ma na-ata ahụhụ iwe-ọkụ nke Chineke Pụrụ Ime Ihe nile, ruo ozuzu oge nile akara aka, mgbe Kraịst debesiworo ndị iro ya nile n’okpụrụ ụkwụ ya abụọ, ma ga-emejupụtawo ọrụ ya;

107 Mgbe ọ ga-anapụta ala-eze ahụ, ma chee ya n’iru Nna, n’enweghị ntụpọ, na-asị: E meriwo m ma zọdawo ụkwụ igwe ịkụ mmanya ahụ n’anị m, ọbụna igwe ịkụ mmanya nke dị egwu nke iwe-ọkụ nke Chineke Pụrụ Ime Ihe nile.

108 Mgbe ahụ ka a ga-ekpube ya okpu-eze nke ebube ya, ịnọdụ n’oche-eze na ike ya ịchị ruo mgbe nile na mgbe nile.

109 Ma lee, ma hụrụ, anyị hụrụ ebube ahụ na ndị nile bi n’ụwa telestial, na ha enweghi ngụta dịka kpakpando nile dị na mbara nke elu-igwe, ma-ọbụ dịka aja dị n’ikpere mmiri;

110 Ma nụ olu nke Onye-nwe na-asi: Ndị a nile ga-ehulata ikpere, na ire nile ga-ekwupụta nye ya onye na-anọ n’oche-eze ahụ ruo mgbe nile na mgbe nile;

111 N’ihi na a ga-ekpe ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, ma onye ọbụla ga-anata dịka ọrụ ya nile siri dị, ebe-ọchịchị ya, n’ime ụlọ nile nke a kwadoro;

112 Ma ha ga-abụ ndị odibọ nke Onye Kachasị Elu; mana ebe Chineke na Kraịst bị ha agaghị enwe ike ịbịa, ụwa nile enweghị nsọtụ.

113 Nke a bụ ọgwụgwụ nke ọ́hụ̀ ahụ nke anyị hụrụ, nke e nyere anyị iwu ide mgbe anyị ka nọ na mụọ.

114 Mana nnukwu na ịtụ n’anya ka ọrụ nile nke Onye-nwe dị, ma ihe omimi nile nke ala-eze ya nke o gosiri anyị, nke karịrị nghọta n’ebube, ma n’ike, ma n’ebe-ọchịchị;

115 Nke o nyere anyị iwu ka anyị edela mgbe anyị ka nọ na Mụọ, ma n’ezigh ezi n’iwu mmadụ ikwu ya;

116 Obụghị ma mmadụ o nwere ike imeka a mata ha, n’ihi a ga-ahụ ha ma ghọta kwa ha nanị site n’ike nke Mụọ Nsọ, nke Chineke n’enyekwasị ndị ahụ nke hụrụ ya n’anya, ma doo onwe ha nsọ n’iru ya;

117 Ndị ọ na-enye ohere nke ịhụ ma ịmata n’onwe ha;

118 Na site n’ike na ngosipụta nke Mụọ ahụ dịka a nọ n’anụ arụ, ha ga-enwe ike ịnagide ịnọ n’iru ya n’ụwa nke ebube;

119 Ma ka enye Chineke na Nwa-atụrụ ahụ otuto, na nsọpụrụ, na ebe-ọchịchị, ruo mgbe nile na mgbe nile. Amen.