Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 42


Nkeji 42

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma na Kirtland, Ohio, 9 Februarị 1831 (History of the Church, 1:148–154). A natara ya n’iru ndị okenye iri na abụọ ma na nmezu nke nkwa nke Onye-nwe kwere mgbe gara-aga na a ga-enye “iwu” ahụ na Ohio (lee nkeji 38:32). Onye-amụma kọwara mkpughe nke a dịka nke “jikọtara iwu nke Nzukọ-nsọ” (History of the Church, 1:148).

1–10, Ndị okenye ka a kpọrọ izisa ozi-ọma, mee ndị gbanwere baptism, ma wulie Nzukọ-nsọ elu; 11–12, Ahaghị ịkpọ ha ma chiekwa ha echichi ma ha ga-akụzi ụkpụrụ nile nke ozi-ọma nke a hụrụ n’ime akwụkwọ-nsọ nile; 13–17, Ha ga-akụzị ma buo-amụma site n’ike nke Mụọ; 18–29, Ndị-nsọ nile ka e nyere iwu egbula mmadụ, e zula ori, e kwula okwu ụgha, enwela ọchịchọ nke anụ arụ, akwala iko, ma-ọbụ kwuo ihe ọjọọ megide ndị-ọzọ; 30–39, Iwu nile na-achị nnyefechasị arịa nile ka e zipụtara; 40–42, Mpako na ịnọ-na nkịtị ka a katọrọ; 43–52, Ndị ọrịa ka a ga-agwọ site n’ibịakwasị onye ọrịa aka n’isi ma jiri mmanụ agọziri agọzị kpee-ekpere ma site na okwukwe; 53–60, Akwụkwọ-nsọ nile, ga-achị Nzukọ-nsọ ma a ga-ekwupụta ya nye ụwa nile; 61–69, Ogige nke Jerusalem ọhụrụ na ihe omimi nile nke ala-eze ka a ga-ekpughe; 70–73, Aria nile ndị enyefechasịrị ga-abụ ndị a ga-eji kwado ndị-ọrụ nke Nzukọ-nsọ; 74–93, Iwu nile na-achị mmekọrịta nwoke na nwanyị, ịkwa iko, igbu mmadụ, izu ori, na nkwupụta nke mmehie nile ka e zipụtara.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị okenye nke nzukọ-nsọ m, ndị gbakọtaworo ọnụ n’aha m, ọbụna Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị-ndụ, Onye-nzọpụta nke ụwa; ọbụrụra na unu kwere n’aha m ma na-edebe iwu-nsọ m nile.

2 Ọzọ a sị m unu, n̄aa ntị ma n̄ụrụ ma rube-isi an’iwu nke m ga-enye unu.

3 N’ihi na n’ezie a sị m, dịka unu gbakọtaworo onwe unu ọnụ dịka aiwu-nsọ ahụ m nyere unu siri dị, ma nwee nkwekọrịta bbanyere otu ihe nke a, ma rịọwokwa Nna n’aha m, ọbụna otu a unu ga-anata.

4 Lee, n’ezie a sị m unu, e nye m unu iwu-nsọ nke mbụ nke a, na unu ga-aga n’aha m, onye ọbụla n’ime unu, ewezuga ndị odibo m Joseph Smith, Nta, na Sidney Rigdon.

5 Ma e nye m ha otu iwu-nsọ na ha ga-apụ nwa-oge nta, ma a ga-enye ya site n’ike nke aMụọ mgbe ha ga-alọghachi.

6 Ma unu ga-apụ site n’ike nke Mụọ m, na-ezisa ozi-ọma m, aabụọ abụọ, n’aha m, na-ewelite olu unu nile dịka jiri olu nke opi, na-ekwusa okwu m dịka ndị mụọ-ozi nke Chineke.

7 Ma unu ga-apụ jiri mmiri na-eme baptism, na-ekwụ: Chegharịa nụ, chegharịa nu, n’ihi na ala-eze nke elu-igwe dị kwa nso.

8 Ma site n’ebe a unu ga-aga n’ime mpaghara nile nke ọdịda anyanwụ; ma ọbụrụra na unu ga-ahụ ha bụ ndị ga-anabata unu unu ga-ewuli Nzukọ-nsọ m na mpaghara ọbụla—

9 Tutu ruo mgbe oge ahụ ga-eru mgbe a ga-ekpụghe ya nye unu site n’elu, mgbe aobodo-ukwu nke Jerusalem bỌhụrụ ga-adị na njikere, ka unu nwee ike cgbakọta n’otu, ka unu wee bụrụkwa dndị m ma a ga m abụ kwa Chineke unu.

10 Ma ọzọ, a sị m unu, na nwa odibo m aEdward Partridge ga-anọ n’ọkwa-ọrụ nke ahụ m họpụtaworo ya. Ma ọ ga-eru, na ọbụrụ na ọ jehie, bonye ọzọ ka a ga-ahọpụta n’ọnọdụ ya. Ọbụna otu a. Amen.

11 Ọzọ a sị m unu, na agaghị enye ya onye ọbụla ịpụ aịzịsa ozi-ọma, ma-ọbụ iwulite nzukọ-nsọ m elu, m’ọbụghị ma onye e bchiri echichi site n’aka onye nwere cikike, ma nzukọ-nsọ matara na onye ahụ nwere ikike ma na e chiziwo ya echichi site n’aka nke ndị-isi nke Nzukọ-nsọ.

12 Ma ọzọ, andị okenye, ndị nchụ-aja na ndị-nkụzi nke nzukọ-nsọ a bga-akuzi ụkpụrụ nile nke ozi-ọma m, nke dị n’ime cBible na dAkwụkwọ nke Mọmọn, n’ime nke e nwere uju nke eozi-ọma.

13 Ma ha ga-edebe ọgbụgba-ndụ nile na ndepụta nile nke nzukọ-nsọ ime ha, ma ndị a ga-abụ nkuzi ha nile, dịka Mụọ ga-enye ha nduzi.

14 Ma Mụọ ahụ ka a ga-enye unu site an’ekpere nke okwukwe; ma ọbụrụ na unu anataghị bMụọ ahụ, unu agaghị akuzi ihe.

15 Ma ihe ndị a nile ka unu ga-edebe ma mee dịka m nyeworo n’iwu gbasara nkuzi unu, ruo mgbe a ga-enye uju nke aakwụkwọ-nsọ m nile.

16 Ma dịka unu ga-ewelite olu unu nile elu site n’ike nke aOnye-nkasị-obi, unu ga-ekwu ma buo amụma otu o si masị m;

17 N’ihi na, lee, Onye-nkasị-obi ahụ mazuru ihe nile, ma na-agba ama maka Nna na maka Ọkpara.

18 Ma ugbụ a, lee, a na m ekwuru nzukọ-nsọ. gị aegbula mmadụ; ma onye bgburu mmadụ agaghị enwe mgbaghara n’ụwa nke a, ma-ọbụ n’ụwa nke na-abịa.

19 Ma ọzọ, a sị m, unu egbula mmadụ; mana onye ahụ nke gburu mmadụ aga-anwụ.

20 Unu ezula aori; ma onye ahụ nke zuru ori na-agaghị echegharị ka a ga-achụpụ.

21 Unu ekwula aokwu ụgha; onye nke kwuru okwu ụgha ma na-agaghị echegharị ka a ga-achụpụ.

22 Unu aga-ahụ nwunye unu n’anya jiri obi gị nile, ma bga-rapara n’arụ ya ma enweghi onye ọzọ.

23 Ma onye ahụ nke na-ele nwanyị anya ka aagụụ ya wee gụọ ya ga-agọnarị okwukwe ahụ, na ọ gaghị enwe Mụọ ahụ; ma ọbụrụ na o chegharịghị, a ga-achụpụ ya.

24 Unu akwala aiko; na onye ahụ nke kwara iko, ma echegharịghị, ka a ga-achụpụ.

25 Mana onye ahụ nke kwara iko ma jiri obi ya nile achegharịa, ma hapụ ya, ma kwụsị ime ya ọzọ, unu bga-agbaghara ya.

26 Mana ọbụrụ na o mee ya aọzọ, a gaghị agbaghara ya, mana a ga-achụpụ ya.

27 Unu aekwula ihe ọjọọ gbasara onye agbata-obi unu, ma-ọbụ merụọ ya arụ ọbụla.

28 Unu matara n’iwu m nile gbasara ihe ndia ka e nyere n’ime akwụkwọ-nsọ m nile; onye nke mere mmehie ma ghara ichegharị ka a aga-achụpụ.

29 Ọbụrụ na unu ahụrụ m n’anya, unu bga-ejere m ozi ma cdebe iwu-nsọ m nile.

30 Ma lee, unu ga-echeta andị ogbenye, ma bnyefechasịa arịa unu nile maka cnkwado ha nke ahụ i nwere inye ha, jiri ọgbụgba-ndụ na akwụkwọ-ikike iwu nke n’agaghị emebi.

31 Ma ọbụrụ ra na unu aenye ihe-onwunwe unu nye bndị ogbenye, unu ga-eme ya nye m; ma a ga-edota ha n’iru cụkọchukwu nke nzukọ-nsọ m na ndị ndụmọdụ ya, ndị okenye abụọ ma-ọbụ ndị nchụ-aja dị elu, dịka nke ọ ga-ahọpụta ma-ọbụ nke ọ họpụtaworo ma ddopu-iche maka ebum n’obi ahụ.

32 Ma ọ ga-eru, na mgbe e dotachara ha n’iru ụkọchukwu nke nzukọ-nsọ m, na mgbe ọ natachaworo ọgbụgba-ama ndị a gbasara annyefechasị nke arịa nile nke nzukọ-nsọ m, na enweghi ike iwere ha site na nzukọ-nsọ, na nkwekọrịta nke iwu-nsọ m nile, onye ọbụla ka a ga-eme ka ọ bnwee ngụzi nye m, conye-ozi n’ebe arịa nke ya dị, ma-ọbụ nke ahụ nke ọ nataworo site na nnyefechasị, dịka nke ga-ezuru ya onwe ya na dezi na ụlọ ya.

33 Ma ọzọ, ọbụrụ na a ga-enwe arịa nile n’aka nke nzukọ-nsọ, ma-ọbụ ndị mmadụ ọbụla nọ na ya, karia nke a chọrọ maka nkwado ha mgbe e mesịrị nnyefechasị nke mbụ a, nke bụ nke afọdụrụ a ga-enyefechasị n’aka ụkọchukwu a ga-edebe ya iji lekọta ndị n’enweghi, site n’oge ruo n’oge, ka mmadụ ọbụla nwere mkpa nweta enye-maka ga-ezu ma nata dịka mkpa ya siri dị.

34 Ya mere, nke fọdụrụ ka a ga-edota n’ụlọ akụ m, eji elekọta ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, dịka a ga-ahọpụta site n’aka otu kansụl dị elu nke nzukọ-nsọ, na ụkọchukwu na kansụl ya;

35 Ma n’ihi ebum n’obi nke ịzụta ala nile n’ihi uru ọha nke nzukọ-nsọ, na iwu ụlọ nile nke ofufe, na ịwulite nke aJerusalem Ọhụrụ ahụ nke a ga-ekpughe ma emesịa—

36 Ka ndị ọgbụgba-ndụ nke m wee nwee ike izukọ ọnụ n’ụbọchị ahụ mgbe m aga-abịa na btemple m. Ma nke a ka m ga-eme maka nzọpụta nke ndị m.

37 Ma ọ ga-eru, na onye nke mere mmehie ma n’echegharịghị ka a aga-achụpụ site na nzukọ-nsọ, ma a gaghị-anataghachi ọzọ ihe nke ahụ o bnyefechasịworo maka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nke nzukọ-nsọ m, ma-ọbụ n’asụsụ ọzọ, nye m—

38 N’ihi na ọbụrụ ra na unu aeme ya nye ndị nke, kachasị nta n’ime ndịa, unu mere ya nye m.

39 N’ihi na ọ ga-eru, na nke ahụ nke m kwuru site n’ọnụ ndị-amụma nile ga-emezu; n’ihi na a ga m enyefechasị akụ na ụba nile nke ndị na-anabata ozi-ọma m n’etiti ndị Jentaịlụ nye ndị ogbenye nke ndị m ndị sitere n’ụlọ nke Israel.

40 Ma ọzọ, ị gaghị enwe ampakọ n’ime obi gị; ka buwe gị nile bụrụ nke dị n’oke, ma ka ịma-mma ha bụrụ ịma-mma nke ọrụ nke aka gị abụọ.

41 Ma ka e mee ihe nile n’ịdị ọcha n’iru m.

42 Ị gaghị anọ ankịtị; n’ihi na onye ahụ nọ na nkiti agaghị eri achịcha ma-ọbụ yiri uwe nile nke onye-ọrụ.

43 Ma onye ọbụla n’ime unu dị an’ọrịa, ma n’enweghi okwukwe ka a gwọọ ya, mana kwere, ka a ga-ejiri obi-nro nile zụọ, jiri ahịhịa nile na nri dị nro, ma nke a na-abụghị site n’aka nke onye-iro.

44 Ma ndị okenye nke nzukọ-nsọ, abụọ ma-ọbụ karịa, ka a ga-akpọ, ma ha ga-ekpe ekpere maka ma bịakwasị aaka abụọ n’isi ha n’aha m; ma ọbụrụ na ha nwụọ ha bna-anwụ nye m, ma ọbụrụ na ha dị-ndụ ha ga-adị ndụ nye m.

45 Unu aga-ebikọta ọnụ bn’ịhụ n’anya, nke mere na unu cga-akwa akwa maka nfunarị nke ndị nwụrụ anwụ, ma nke ka nke n’ihi ndị n’enweghi dolile anya nke mbilite n’ọnwụ nke ebube.

46 Ma ọ ga-eru na ndị nwụrụ n’ime m agaghị edetụ aọnwụ ire, n’ihi na ọ ga-adị bụtọ nye ha;

47 Ma ndị n’anwụghị n’ime m, ahụhụ ga-adịrị ha, n’ihi na ọnwụ ha ga-adị ilu.

48 Ma ọzọ, ọ ga-erụ na onye ahụ nke nwere aokwukwe n’ime m na a bga-agwọ ya, ma a chọpụtaghị ya nye ọnwụ, a ga-agwọ ya.

49 Ya onye nwere okwukwe ịhụ ụzọ ga-ahụ ụzọ.

50 Ya onye nwere okwukwe ịnụ ihe ga-anụ ihe.

51 Onye ngwọrọ nke nwere okwukwe iwụli ga-awụli

52 Ma ha ndị n’enweghi okwukwe ime ihe ndia, mana kwere n’ime m, nwere ike ahụ ịbụrụ aụmụ m nwoke; ma ọbụrụraa na ha emebighi iwu m nile unu bga-eburu adịghị-ike ha nile.

53 Unu ga-eguzo n’ọnọdụ aọkwa ọrụ unu.

54 Unu agaghị ewere uwe nwanne unu nwoke; unu ga-akwụ ụgwọ ihe ahụ unu ga-anata site n’aka nwanne unu nwoke.

55 Ma ọbụrụ na unu anwetara karịa nke unu chọrọ maka nkwado nke unu, unu ga-enye ya n’ime bụlọ-akụ m, ka e mee ihe nile dịka nke ahụ m kwuworo siri dị.

56 Unu ga-arịọ, ma aakwụkwọ-nsọ m nile ka a ga-enye dịka m họpụtaworo, ma ha ka a bga-edokwa na nchekwa;

57 Ma ọ dị mkpa na unu ga-agba nkịtị gbasara ha, ma n’akuzighị ha rụọ mgbe unu nataworo ha n’uju.

58 Ma enye m unu iwu-nsọ na mgbe ahụ unu ga-akuzi ha nye ndị nile; n’ihi na a ga-akuzi ha nye amba nile, ebo nile, asụsụ nile na mmadụ nile.

59 Unu ga-ewere ihe nile nke unu nataworo, nke e nyeworo unu n’akwụkwọ-nsọ m nile dịka iwu, ka ọ bụrụ iwu m nke ga-achị nzukọ-nsọ m;

60 Ma onye ahụ nke amere dịka ihe ndị a nile siri dị ka a ga-azọpụta, ma onye ahụ nke n’emeghị ha ga-enwe bọmụma-ikpe m’ọbụrụ na ọ gaa n’iru.

61 Ọbụrụ na unu ga-arịọ, unu ga-anata amkpughe n’elu mkpughe, bọmụma-ihe n’elu ọmụma-ihe, ka unu wee mata cihe-omimi nile na dihe-udo nile—nke ahụ na-eweta eọn̄ụ, nke ahụ na-eweta ndụ ebighi-ebi.

62 Unu ga-arịọ, ma a ga-ekpụghe ya nye unu n’oge nke m a kara aka ebe a ga-ewu aJerusalem Ọhụrụ ahụ.

63 Ma lee, o ga-eru na a ga-ezipụ ndị odibo m rute n’ọwụwa anyanwụ na rute n’ọdịda anyanwụ, rute n’elu elu na kwa rute na ndịda.

64 Ma ọbụna ugbụ a, ka onye ahụ nke na-aga n’ọwụwa anyanwụ kụziere ndị a ga-agbanwe ka ha gbalaga an’ọdịda anyanwụ, ma nke a n’ihi nke ahụ na-abịa n’uwa, na ihe bntụgwa nzuzọ nile.

65 Lee, unu ga-edebe ihe ndị a nile, ma ukwuu ka ụgwọ-ọrụ unu ga-adị; n’ihi na e nyere unu ya ịmata ihe omimi nile nke ala-eze ahụ, mana enyeghị ya ụwa nile imata.

66 Unu ga-edebe iwu nile nke unu natara ma kwesị ntụkwasị obi.

67 Ma unu ga-anata aọgbụgba-ndụ nile nke nzukọ-nsọ ma emesịa, dịka nke ga-ezu ihiwe unu, ma n’ebe a ma n’ime Jereusalem Ọhụrụ.

68 Ya mere, onye ọbụla n’ime unu n’enweghi aamamihe, ka ọ rịọ n’aka m, ma a ga m enye ya n’obi ọma m n’ataghị ya ụta.

69 Welite nụ obi unu elu ma n̄ụrịa, n’ihi na nye unu ka aala-eze, ma-ọbụ n’asụsụ ọzọ, bọtụghe ụzọ nile nke nzukọ-nsọ ka e nyeworo. Ọbụna otu a, Amen.

70 Ndị anchụ-aja nile na bndị nkụzi nile ga-enwe cozi dịịrị ha, ọbụna dịka ndị-otu nile.

71 Na ndị okenye ma-ọbụ ndị-isi-nchụ-aja ndị a họpụtara inyere ụkọchukwu aka dịka ndị ndụmọdụ n’ihe nile, ga-enwe nkwado maka ezi na ụlọ ha site n’arịa nile ndị ahụ e anyefesịrị n’aka ụkọchukwu, n’ihi ọdị nma nke ndị ogbenye, na ebum n’obi ndị ọzọ, dịka e kwuworo ya na mbụ;

72 Ma ọbụ, ha ga-anata ụgwọ ziri ezi maka ozi ha nile, ma-ọbụ n’ije-ozị ma-ọbụ n’ụzọ ọzọ, dịka e si chee kachasị nma, ma-ọbụ nke ndị ndụmọdụ na ụkọchukwu kpebiri.

73 Ma ụkọchukwu, kwa, ga-anata nkwado ya, ma-ọbụ nanị ụgwọ ziri ezi maka ije-ozị ya nile n’ime nzukọ-nsọ.

74 Lee, n’ezie a sị m unu, na ndị ọbụla n’ime unu, ndị chụpụworo nwunye ha n’ihi aịkwa iko, ma-ọbụ n’asụsụ ọzọ, ọbụrụ na ha ga agba-ama n’iru unu n’iwedata ala nile nke obi na nke a bụ ihe mere, unu agaghị achụpụ ha site n’etiti unu;

75 Mana ọbụrụ na unu achọpụta na ndị ọbụla ahapụwo nwunye ha maka aịkwa iko, ma ha onwe ha bụ ndị mejọrọ, ma ndị nwunye ha dịkwa ndụ, a bga-achụpụ ha site n’ime unu.

76 Ma ọzọ, a sị m unu, na unu ga-anọ ana-nche ma kpachara-anya, jiri nnyocha nile, ka unu ghara ịnabata onye ọbụla dị otu a n’etiti unu ma ọbụrụ na ha alụwo nwunye;

77 Ma ọbụrụ na ha alụbeghị nwunye, ha ga-echegharị site na mmehie ha nile m’ọbụghị ya unu agaghị anabata ha.

78 Ma ọzọ, onye ọbụla nke sonyere na nzukọ-nsọ a nke Kraịst, ga-echeta idebe iwu-nsọ nile na ọgbụgba-ndụ nile nke nzukọ-nsọ.

79 Ma ọ ga-erụ, na ọbụrụ na ndị ọbụla n’ime unu aegbuo mmadụ, a ga-enyefe ha ma meso ha dịka iwu nile nke ala siri dị; n’ihi na chetakwa na onweghị mgbaghara; ma a ga-ekpebi ya dịka iwu nile nke ala siri dị.

80 Ma ọbụrụ na nwoke ọbụla ma-ọbụ nwanyị ọbụla akwaa ikọ, nwoke ma-ọbụ nwanyị ahụ ka aga ekpe-ikpe n’iru ndị okenye abụọ nke nzukọ-nsọ ma-ọbụ karịa, ma mkpụrụ-okwu ọbụla ka a ga-ehiwe megide ya site n’ọnụ ndị-aka-ebe abụọ nke nzukọ-nsọ, ma ọbụghị site na nke ndị iro; mana ọbụrụ na e nwere karịa ndị-aka-ebe abụọ ọ dị nma karịa.

81 Mana onye ahụ ka a ga-ama ikpe site n’ọnụ ndị-aka-ebe abụọ; ma ndị okenye ahụ ga-ewepụta okwu a n’iru nzukọ-nsọ, ma nzukọ-nsọ ga-eweli aka ha nile megide ya bụ nwoke ma-ọbụ nwanyị, ka e wee meso ha dịka iwu nke Chineke siri dị.

82 Ma ọbụrụ na ọ ga-ekwe mee, ọ dị mkpa na ụkọchukwu ga-anọrọ kwa ya.

83 Ma otu a ka unu ga-eme n’okwu nile nke ga-abịa n’iru unu.

84 Ma ọbụrụ na nwoke ma-ọbụ nwanyị apụnarị mmadụ ihe, a ga-enyefe ya n’aka iwu nke ala ahụ.

85 Ma ọbụrụ na nwoke ma-ọbụ nwanyị e azuo ori, a ga-enyefe ya n’aka iwu nke ala ahụ.

86 Ma ọbụrụ na nwoke ma-ọbụ nwanyị ekwuo aokwu-ụgha, a ga-enyefe ya n’aka iwu nke ala ahụ.

87 Ma ọbụrụ na nwoke ma-ọbụ nwanyị emee ihe-ọjọọ ọbụla, a ga-enyefe ya n’aka iwu, ọbụna nke ahụ nke Chineke.

88 Ma ọbụrụ na anwanne unu nwoke ma-ọbụ nwanne-nwanyị bemejọọ unu, unu ga-akpọrọ ya, unu na ya nanị; ma ọbụrụ na o ckwupụta mmehie, unu ga-eme udo.

89 Ma ọbụrụ na ya bụ nwoke ma-ọbụ nwanyị ekwupụtaghị mmehie, unu ga-enyefe ya na nzukọ-nsọ, ọbụghị nye ndị-otu nile, kama nye ndị okenye. Ma a ga-eme ya na ọgbakọ, ma nke a abụghị n’iru ndị ụwa.

90 Ma ọbụrụ na nwanne unu nwoke ma-ọbụ nwanne-nwanyị emejọọ ọtụtụ ndị mmadụ, a ga-ata ya aahụhụ n’irụ ọtụtụ mmadụ.

91 Ma ọbụrụ na onye ọbụla emehie n’iru ọha, a ga-abara ya mba n’iru ọha, ka ihere wee mee ya. Ma ọbụrụ na ya bụ nwoke ma-ọbụ nwanyị ekwupụtaghị mmehie, a ga-enyefe ya n’aka iwu nke Chineke.

92 Ọbụrụ na onye ọbụla emehie na nzuzo, a ga-abara ya bụ nwoke ma-ọbụ nwanyị mba na nzuzo, ka o nwe ike nwee ohere-ọma ikwupụta na nzuzo nye onye ahụ nke o mehiere, na nye Chineke, ka nzukọ-nsọ wee ghara ikwu okwu ọjọọ banyere ya.

93 Ma otu a ka unu ga-esi na edu n’ihe nile.