Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 51


Nkeji 51

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Thompson, Ohio, Mee 1831 (History of the Church, 1:173–174). N’oge ugbụ a Ndị-nsọ nile nọ na-efe obi site na steti ndị dị n’ọwụwa anyanwụ malitere irute Ohio, ma o wee dị mkpa ka e mee nhazi nile doro anya maka obibi ha. Dịka ọrụ nke a metụtara ọkwa-ọrụ nke ụkọchukwu, Ụkọchukwu Edward Partridge chọrọ ndụmọdụ n’okwu a, ma Onye-amụma jụrụ Onye-nwe ajụjụ.

1–8, Edward Partridge ka a họpụtara ihazi ọkwa ọrụ nile na arịa nile; 9–12, Ndị-nsọ nile ga-eme ihe n’ịkwụwa aka ọtọ ma na-anata ahata-aha; 13–15, Ha ga-enwe ụlọ-akụ nke onye ụkọchukwu ma ga-ahazi arịa nile dịka iwu nke Onye-nwe siri dị; 16–20, Ohio ga-abụ ebe mgbakọta nke nwa-oge.

1 N̄aa mụ nti, ka Onye-nwe Chineke gị kwuru, ma a ga m ekwuru nwa odibo m aEdward Partridge, ma nye ya ntụzi-aka nile; n’ihi na ọ dị mkpa ka o nweta ntụzi-aka otu ọ ga-esi ahazi ndị mmadụ nke a.

2 N’ihi na ọ dị mkpa na a haziri ha dịka aiwu m nile siri dị; ma ọbụghị otu a, ha ka a ga-ebepụ.

3 Ya mere, ka nwa odibo m Edward Partridge, na ndị ọ họpụtaworo, ndị ihe ha dị m ezi mma, họpụtara ndị mmadụ a oke ha, onye ọbụla ahara otu dịka ezi na ụlọ ya ha, dịka ọnọdụ na ọchịchọ ya nile na bmkpa nile ya siri dị.

4 Ma ka nwa odibo m Edward Partridge, mgbe ọ ga-ahọpụtara nwoke ọbụla oke ya, nye ya akwụkwọ ikike ga-akwado oke ya nye ya, na ọ ga-ejide ya, ọbụna nke a ruuru ya na ihe-nketa nke a n’ime nzukọ-nsọ, ruo mgbe o jehiere ma agụnyeghị kwa ya na onye tozuru oke site n’olu nke nzukọ-nsọ, dịka iwu nile na aọgbụgba-ndụ nile nke nzukọ-nsọ siri dị ịbụ onye-otu nzukọ-nsọ.

5 Ma ọbụrụ na ọ ga-ejehie ma a gụghị kwa ya onye kwesịrị ekwesị ịbụ onye-otu nzukọ-nsọ, ọ gaghị enwe ike iweghachi oke ahụ ọ nyefesiworo nye ụkọchukwu maka ndị ogbenye na-ndị nwere mkpa nke nzukọ-nsọ m; ya mere, ọ gaghị ejide onyinye ahụ, mana ọ ga-enwere nanị oke nke ahụ e nyere ya akwụkwọ-ikike.

6 Ma otu a ihe nile ka a ga-emezu, adịka biwu nile nke ala siri dị.

7 Ma ka ihe ndị ahụ bụ nke ndị-nkea bụrụkwa nke a họpụtara nye ha.

8 Ma aego nke a hapụrụ nye ndị mmadụ a—ka ha nwee onye-nlekọta a họpụtara nye ndị a, iji bego zụpụta nri na uwe dịka ọchịchọ nile nke ndị a siri dị.

9 Ma ka onye ọbụla bụrụ onye na-eme ihe an’ịkwụwa aka ọtọ, ma nwee ihe ahata-aha, ka unu bụrụ botu, ọbụna dịka m nyeworo unu iwu.

10 Ma ka nke ahụ bụ nke ndị a ghara ịbụ ihe a ga-eji nye andị nzukọ ọzọ.

11 Ya mere, ọ bụrụ na nzụkọ ọzọ ga-anata ego nke nzukọ-nsọ nke a, ka ha kwụghachi nzukọ-nsọ nke a dịka ha kwekọrịtara.

12 Ma nke a ka a ga-eme site n’aka ụkọchukwu ma-ọbụ onye-nlekọta, nke a ga-ahọpụta site an’olu nke nzukọ-nsọ.

13 Ma ọzọ, ka ụkọchukwu họpụta otu aụlọ-akụ nye nzụkọ nsọ nke a; ma ka ihe nile ma n’ego ma na nri; nke karịrị ihe ha bchọrọ maka ndị a, bụrụ ihe edebere n’aka nke ụkọchukwu.

14 Ma ka o debe nye onwe ya, maka mkpa nile nke onwe ya na nke ezi na ụlọ ya, dika a ga-ewere ya n’ọrụ ịrụ n’ọrụ nke a.

15 Ma otu a ka m nyere ndị mmadụ a ohere ihazi onwe ha dịka aiwu m nile siri dị.

16 Ma e doo m ala anke a nsọ nye ha maka nwa oge nta, ruo mgbe Mụ, Onye-nwe ga-arọpụtara ha ụzọ ọzọ, ma nye ha iwu isite n’ebe a gaa;

17 Ma awa ahụ na ụbọchị ahụ bụ nke a na-enyeghị ha, ya mere ka ha rụọ ọrụ n’ala nke a dịka ọtụtụ afọ, ma nke a ga-atụgharị bụrụ ha ihe ọma.

18 Lee, nke a ga-abụ aihe-ima-atụ nye nwa odibo m Edward Partridge, n’ebe ndị ọzọ nile, n’ime nzukọ-nsọ nile.

19 Ma onye ọbụla nke a chọpụtara kwesịrị ntụkwasị-obi, onye ziri ezi, na aonye-ọrụ nwere amamihe ga-abanye, n’ime bọn̄ụ nke Onye-nwe ya ma ga-eketa ndụ ebighi-ebi.

20 N’ezie, a sị m unu, a bụ m Jisus Kraịst, onye ana-abịa ọsọ-ọsọ, bn’awa unu n’echeghi. Ọ bụna otu a. Amen.