Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 45


Nkeji 45

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Nzukọ-nsọ, na Kirtland, Ohio, 7 Maach 1831 (History of the Church, 1:158–163). Dịka okwu mmalite ya nye ndekọta nke mkpughe nke a, Onye-amụma dere na “n’oge ugbu a na ndụ nke Nzukọ-nsọ…ọtụtụ mkpesa ụgha…na akụkọ nzuzu, ka e bipụtara…ma gbasasịa,…iji gbochie ndị mmadụ site n’ịbịa inyọcha ọrụ ahụ, ma-ọbụ ịnabata okwukwe a.… Mana n’ọn̄ụ nke Ndị-nsọ nile,…a natara m nke a na-eso” (History of the Church, 1:158).

1–5, Kraịst bụ onye-nkwuchita-ọnụ anyị n’ebe Nna nọ; 6–10, Ozi-ọma bụ onye-ozi iji mezie ụzọ tụtụ Onye-nwe; 11–15, Inọk na ụmụnne ya ka Onye-nwe nabatara nye onwe ya; 16–23, Kraịst kpughere ihe ịrịba-ama nile nke ọbịbịa ya dịka e nyere ya n’Ugwụ nke Olive; 24–38, Ozi-ọma ka a ga-ewetaghachi, oge nile nke ndị Jentaịlụ ga-emezu, ma ọrịa ịtọgbọrọ n’efu ga-ezu ala nile; 39–47, Ihe iriba-ama nile, ihe ebube nile na Mbilite n’ọnwụ ga-ebute ụzọ nke Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ; 48–53, Kraịst ga-eguzoro n’Ugwụ nke Olive, ma ndị Juu ga-ahụ apa nile nke dị n’aka ya ma n’ụkwụ ya; 54–59, Onye-nwe ga-achị n’oge Otu puku afọ ahụ; 60–62, Onye-amụma ka e nyere ntuzi-aka ịmalite ntụgharị asụsụ nke Testament Ọhụrụ, nke a ga-esi na ya mata ozi ndị dị mkpa; 63–75, Ndị-nsọ ka e nyere iwu ka ha gbakọọ ma wuo Jerusalem Ọhụrụ, ebe ndị mmadụ nile sitere na mba nile ga-abịa.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị nke anzukọ-nsọ m, ndị e nyeworo bala-eze; n̄aa nụ ntị ma nụrụ nke onye ahụ tọrọ ntọ-ala nke ụwa, onye cmere elu-igwe nile na usuu nile nke ihe dị na ya, na onye esitere n’aka ya mee ihe nile dị ndụ, ma na-ejegharị ma na-adị.

2 Ma ọzọ a sị m, n̄aa ntị n’olu m, ka aọnwụ ghara ịbịakwute gị; bn’oge awa mgbe ị n’echeghi na ọkọchị ga-agafe, ma cowuwe ihe ụbị agwụsịa, ma mkpụrụ-obi unu nile enwetaghị nzọpụta.

3 Gee ntị nye ya onye bụ aonye-nkwuchita ọnụ n’ebe Nna nọ, onye na-arịọtara unu n’iru ya—

4 Na-asị: Nna, lee aahụhụ nile na ọnwụ nke onye ahụ n’enweghị bmmehie o mere, onye ị nwere ezi mmasị n’ime ya; lee ọbara nke Ọkpara gị nke a kwafụrụ, ọbara nke ya onye ahụ ị nyeworo ka e nye gị cebube;

5 Ya mere, Nna, gbaghara umunne m ndị a ndị akwere n’aha m, ka ha wee bịakwute m ma nweta bndụ mgbe nile na-adịgide.

6 N̄aa ntị, O unu ndị nke nzukọ-nsọ m, na unu ndị okenye gekọta ntị, ma nụrụ olu m ugbua a na-akpọ ya ataa, ma ghara imesi-obi unu nile ike;

7 N’ihi na, n’ezie a sị m unu na a bụ m aAlfa na Omega, mmalite ahụ na ọgwụgwụ, ìhè ahụ na ndụ nke ụwa—bìhè na-amụke n’ọchịchịrị ma ọchịchịrị ahụ ejideghịkwa ya:

8 A bịakwutere m ndị nke m, ma ndị nke m anabataghị m; mana ka ha ra bụ ndị nabatara m ka m nyere aike ịrụ ọtụtụ bọrụ-ebube, na ịbịa bụrụ cụmụ nwoke nke Chineke; ma ọbụna nye ha ndị nke dkweere n’aha m ka m nyere ike ịnata endụ ebighi-ebi.

9 Ma ọbụna otu a, e zipụwo m aọgbụgba-ndụ bmgbe nile na-adigide m n’ime ụwa ka ọ bụrụ ìhè nye ụwa, na ka ọ bụrụ cihe nlere-anya nye ndị nke m, na maka dndị Jentaịlụ ị chọ ya, na ka ọ bụrụ eonye-ozi n’iru m, iji mezie ụzọ n’iru m.

10 Ya mere, bịa nụ na ya, ma mụ na ya onye ahụ nke na-abịa anyị ga-atụgharị uche dịka mụ na ndị mmadụ n’ụbọchị nile mgbe ochie, ma a ga m egosi unu echiche m nke asiri ike.

11 Ya mere, n̄akọta nụ ntị ma ka m gosi unu ọbụna amamihe nke m—amamihe nke onye ahụ unu sị na ọ bụ Chineke nke aỊnọk, na ụmụnne ya,

12 Ndị e akewapụrụ site n’ụwa ma a nabatara m ha nye onwe m—bobodo-ukwu nke m dokwara ruo mgbe ụbọchị nke ezi-omume ga-abịa—ụbọchị nke ndị mmadụ dị nsọ nile chọrọ, ma ha achọtaghị ya n’ihi ajọọ-omume na ihe arụ nile;

13 Ma kwupụta na ha bụ andị ọbịa na ndị njem ebe dị nsọ n’elu ụwa;

14 Mana nwetara ankwa na ha ga-achọ ya ma hụ ya n’anụ arụ ha;

15 Ya mere, n̄aa ntị ma mụ na gị ga-atụgharị uche, ma a ga m ekwuru gị okwu ma buo amụma, dịka m bụrụ nye ndị mmadụ n’ụbọchị nile mgbe ochie.

16 Ma a ga m egosi ya ebe ọ ga-ekwe nghọta dịka m agosịrị ya ndị na-eso ụzọ m dịka m guzoro n’iru ha n’anụ arụ, ma kwuo okwu nye ha, na-asị: Dịka unu juworo m gbasara bihe ịrịba ama nile nke ọbịbịa m, n’ụbọchị ahụ mgbe m ga-abịa n’ebube m n’ime-igwe ojii nile nke elu-igwe, imezu nkwa nile nke m meworo nye ndị nna unu nile,

17 N’ihi na unu leworo ogologo oge nke aanọghị nke bmụọ unu nile n’ime arụ unu dịka ịbụ oru, a ga m egosi unu otu ụbọchị nke mgbapụta ga-esi bịa, na kwa cmwetaghachi nke Israel a dgbasasịrị.

18 Ma ugbụ a unu na-ele temple nke a nke nọ na Jerusalem, nke unu na-akpọ ụlọ nke Chineke, ma ndị-iro unu na-asị na ụlọ a agaghị ada ma-ọlị.

19 Mana, n’ezie a sị m unu, na ịtọgbọrọ n’efu ga-abịakwasị ọgbọ nke a dịka onye ori n’abalị, ma ndị a ka a ga-ebibi ma gbasasịa n’etiti mba nile.

20 Ma temple nke a unu na-ahụ ugbu a ka a ga-akutu n’ala nke ga-eme na onweghị okwute ga-anọ n’elu ibe ya.

21 Ma ọ ga-eru, na ọgbọ nke a nke ndị Juu agaghị agafe ruo mgbe itọgbọ n’efu nile nke m kwuworo nye unu gbasara ha ga-emezu.

22 Unu na-asị na unu matara na aọgwụgwụ nke ụwa na-abịa; unu na-asịkwa na unu matara na elu-igwe nile na ụwa ga-agabiga;

23 Ma na nke a, unu kwuru n’ezie, n’ihi na otu a ka ọ dị; mana ihe ndia nke m kwuru nye unu agaghị agafe ruo mgbe ha nile ga-emezu.

24 Ma nke a ka m gwaworo unu gbasara Jerusalem; na mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa, ka ndị fọdụrụ aga-agbasasị n’etiti mba nile;

25 Mana ha ka a aga-ekpokọta ọzọ; mana ha ga-anọgide ruo mgbe oge nile nke bndị Jentaịlụ ga-emezu.

26 Ma n’ụbọchị aahụ ka a ga-anụ maka bagha nile na asịrị nile nke agha, ma ụwa nile ga-ejupụta n’ọgba-aghara, ma obi nile nke ndị mmadụ cga-akwụsị ha n’égwù, ma ha ga-asị na Kraịst dna-anọ ọdọ dị-anya n’ọbịbịa ya ruo n’ọgwụgwụ nke ụwa.

27 Ma ịhụ n’anya nke ndị mmadụ ga-ajụ kwa oyi, ma ajọọ-omume ga-ejupụtakwa.

28 Na mgbe oge nke andị Jentaịlụ ga-abịarụ, bìhè ga-ezipụta n’etiti ha bụ ndị nọ n’ọchịchịrị, ma ọ ga-abụ uju nke ozi-ọma m;

29 Mana ha anaghị aanabata ya; n’ihi na ha ahụghị ìhè ahụ, ma ha na-atụgharịpụ bobi ha nile site n’ebe m nọ n’ihi cozizi nile nke ndị mmadụ.

30 Ma n’ime ọgbọ ahụ ka oge nile nke ndị Jentaịlụ ga-emezu.

31 Ma a ga-enwe ndị mmadụ ga-eguzoro n’ọgbọ ahụ, ndị n’agaghị agafe ruo mgbe ha ga-ahụ amkpagbu karịrị-akarị; n’ihi ọrịa-ịtọgbọrọ n’efu ga-ezu ala nile.

32 Mana ndị na-eso ụzọ m nile aga-eguzoro n’ebe nsọ nile, ma agaghị akwagharị ha; mana n’etiti ndị ajọọ-mmadụ, ndị mmadụ ga-ewelite olu ha elu ma bbụọ Chineke ọnụ ma nwụọ.

33 Ma a ga-enwe kwa aala ọma-jijiji n’ebe nile di iche-iche, ma nnukwu ịtọgbọrọ n’efu nile; mana ndị mmadụ ga-emesi obi ha ike megide m, ma ha ga-ewelite bmma agha, otu onye megide ibe ya, ma ha ga-egbu otu onye na ibe ya.

34 Ma ugbụ a, mgbe mụ Onye-nwe kwuworo okwu ndị a nye ndị na-eso ụzọ m, ha nwere nsogbu.

35 Ma a sịrị m ha: Unu enwela ansogbu, n’ihi na, mgbe ihe ndịa nile ga-eru, unu ga-amata na nkwa nile nke ekweworo nye unu ga-emezu.

36 Na mgbe ìhè ahụ ga-ebido igosipụta, ọ ga-adị ha ka akụkọ-ilu nke m ga-egosi unu—

37 Unu lee anya ma lee aosisi fig nile, ma unu ji anya unu na-ahụ ha, ma unu na-asị na mgbe ha bidoro ịpụta, ma akwụkwọ ndụ ya nile ka dị nro, na mbido ọkọchị dị nso ugbu a n’aka;

38 Ọbụna otu a ka ọ ga-adị n’ụbọchị ahụ mgbe ha ga-ahụ ihe ndị a nile, mgbe ahụ ka ha ga-amata na awa ahụ dịkwa nso.

39 Ma ọ ga-eru na onye ana-atụ m ụjọ ma ga bna-elepụ anya maka nnukwu cụbọchị nke Onye-nwe ga-abịa, ọbụna maka dihe ịrịba-ama nile nke ọbịbịa ahụ nke eỌkpara nke Mmadụ.

40 Ma ha ga-ahụ ihe ịrịba-ama nile na ihe iju-anya nile, n’ihi na ha ka a ga-ezipụta n’elu-igwe nile n’elu, ma n’ime ụwa n’okpuru.

41 Ma ha ga-ahụ ọbara, na aọkụ, na uzu nke anwụrụ ọkụ.

42 Ma tutu ụbọchị nke Onye-nwe abịa, anyanwụ ga-agba aọchịchịrị, ma ọnwa ga-agbanwe ghọọ ọbara, ma kpakpando nile ga-ada site n’elu-igwe.

43 Ma ndị fọdụrụ ka a ga-ekpokọta n’ebe a;

44 Ma mgbe ahụ ha ga-achọ m, ma, lee, a ga m abịa; ma ha ga-ahụ m n’igwe-ojii nile nke elu-igwe, na-e yikwasị ike na nnukwu aebube; na ndị mụọ-ozi nile dị nsọ; ma onye na-anaghị bele-anya m ka a ga-ebepu.

45 Mana tutu ogwe-aka nke Onye-nwe ga-ada, mụọ-ozi ga-afụ aopi ya, ma ndị nsọ nile ndị daworo n’ụra bga-apụta izute m cn’igwe-ojii.

46 Ya mere, ọbụrụ na unu rahụworo ụra unu an’udo, ngọzi ga-adịrị unu; n’ihi na dịka unu na-ahụ m ugbụ a ma mata na a bụ m, ọbụna otu a ka unu bga-abịkwute m ma mkpụrụ-obi unu cga-adị ndụ, ma mgbapụta unu ga-ezu oke; ma ndị-nsọ nile ga-apụta site n’akụkụ anọ nile nke ụwa.

47 Mgbe ahụ ka aogwe-aka nke Onye-nwe ga-ada n’elu mba nile.

48 Ma mgbe ahụ ka Onye-nwe ga-esetịpụ ụkwụ ya n’elu augwụ a, ma ọ ga-ekewa abụọ, ma ụwa bga-ama jijiji, ma maa ririri n’iru ma n’azụ, ma elu-igwe nile cga-emekwa mkpọtụ.

49 Ma Onye-nwe ga-ekwu okwu n’olu ya, ma nsọtụ nile nke ụwa ga-anụ ya, ma mba nile nke ụwa aga-eru-uju, ma ha ndị chịworo-ọchị ga-ahụ nzuzu ha.

50 Ma ọdachị ga-abịakwasị onye na-akwa emu, ma onye n’eleda anya ka a ga-erepịa; ma ha ndị na-ele anya maka ajọọ-omume ka a ga-egbutu ma tụba n’ịme ọkụ.

51 Ma mgbe ahụ ka andị Juu bga-elekwasị m anya ma sị: Gịnị bụ mmeru-arụ nile ndị a dị n’aka gị ma n’ụkwụ gị?

52 Mgbe ahụ ka ha ga-amata na a bụ m Onye-nwe; n’ihi na a ga m asị ha: Mmeru-arụ nile ndị a bụ mmeru-arụ ndị eji ameruo m arụ n’ụlọ ndị enyi m. A bụ m onye ahụ eweliri-elu. A bụ m Jisus nke bakpọgburu n’obe. A bụ m Ọkpara nke Chineke.

53 Na mgbe ahụ ka ha aga-akwa akwa n’ihi ajọọ-omume ha nile; mgbe ahụ ka ha ga-akwa-akwa arịrị n’ihi na ha nyere beze ha mkpagbu.

54 Ma mgbe ahụ ka mba nile ana-ekweghị ekwe ga-enwe mgbapụta, ma ndị na-amaghị iwu obụla ga-enwe òkè na bmbilite n’ọnwụ nke mbụ; ma ọ ga-enwe cnnagide maka ha.

55 Ma aSetan ka a bga-eke agbụ, ka ọ ghara inwe ọnọdụ n’obi nile nke ụmụ nke mmadụ.

56 Ma an’ụbọchị ahụ, mgbe m ga-abịa n’ebube m, ka a ga-emezu akụkọ-ilu ahụ nke m kwuru gbasara bụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke.

57 N’ihi na ndị ahụ maara ihe ma nabatawokwa aezi-okwu ahụ, ma werewokwa Mụọ Nsọ dịka bonye-ndu ha, ma ceduhieghi kwa ha—n’ezie a sị m unu, agaghị egbutu ha ma tụba ha n’ime dọkụ mana ha ga-anọ n’ụbọchị ahụ.

58 Ma a ga-enyefe ha aụwa dịka ihe bnketa; na ha ga-amụba ma gbasie ike, ma ụmụ ha cga-etọpụta n’enweghi mmehie ruo na dnzọpụta.

59 N’ihi na Onye-nwe ga-anọ an’etiti ha, ma ebube ya ga-anọgide ha, ma ọ ga-abụ eze ha na bonye na-enye iwu ha.

60 Ma ugbụ a, lee, a si m gị, a gaghị enye gị ịmata karịa gbasara isi okwu a, ruo mgbe a ga-atụgharị asụsụ aTestament Ọhụrụ ma n’ime ya ihe ndị a nile ka aga-eme ka ha pụta ìhè;

61 Ya mere e nye m gị ka ị tụgharịa asụsụ ya, ka ị wee nwee ike dị na njikere maka ihe ndị na-abịa.

62 N’ihi na n’ezie a sị m unu na nnukwu ihe nile na-eche unu;

63 Unu na-anụ maka aagha nile n’ala ndị ọzọ; mana, lee, a sị m unu, ha adịwo nso, ọbụna n’ọnụ ụzọ unu nile, na ọbụghị kwa ọtụtụ afọ site ugbụ a unu ga-anụ maka agha nile n’ala nile nke unu.

64 Ya mere mụ, Onye-nwe, ekwuwo, gbakọọ nụ pụta site n’ala ndị aọwụwa anyanwụ nile, gbakọta nụ onwe unu ọnụ ndị okenye nke nzukọ-nsọ m; gaa nụ n’ime mba ọdịda anyanwụ nile, kpọkuo nụ ndị bi ebe ahụ ka ha chegharịa, ma ọbụrụraa na ha echegharịa, wulite nụ nzukọ-nsọ nile nye m.

65 Na jiri otu obi na otu echiche, kpakọta nụ akụ na ụba unu ka unu wee azụta ihe nketa nke a ga-emesị họpụtara unu.

66 Ma a ga-akpọ ya aJerusalem Ọhụrụ ahụ, bala nke cudo, obodo-ukwu nke dmgbaba, ebe nchekwa nke ndị-nsọ nile nke Chineke nke Kachasị Elu;

67 Ma aebube nke Onye-nwe ga-anọ n’ebe ahụ, na ịdị-egwu nke Onye-nwe ga-kwa anọ n’ebe ahụ, nke ọ ga-abụ na ajọọ-mmadụ agaghị abịarute na ya, na a ga-akpọ ya Zaịọn.

68 Ma ọ ga-eru n’etiti ndị ajọọ-mmadụ, na onye ọbụla n’agaghị ewelite mma agha ya megide onye agbata-obi ya aghaghị ịgba ọsọ gbalaga na Zaịọn maka nchekwa.

69 Ma a aga-agbakọta na ya site na mba nile dị n’okpuru elu-igwe; ma ọ ga-abụ nanị ndị n’agaghị anọ n’agha otu megide ibe ya.

70 Ma a ga-ekwu ya n’etiti ndị ajọọ-mmadụ: Ka anyị ghara ịlụ agha megide Zaịọn, n’ihi na ndị bi na Zaịọn dị egwu; ya mere anyị agaghị e nwe ike iguzoro.

71 Ma ọ ga-erụ na ndị ezi-omume ka a ga-akpọkọta site n’etiti mba nile, ma ha ga-abịa na Zaịọn, na-ekwe ukwe nile nke ọn̄ụ mgbe nile na-adigide.

72 Ma ugbụ a a sị m unu, debe nụ ihe ndị a ka ha ghara ịpụ jee mba ndị-ọzọ n’elu ụwa ruo mgbe ọ masịrị m, ka unu wee nwe ike ịrụcha ọrụ nke a n’anya ndị mmadụ, ma n’anya nke ndị iro unu, ka ha ghara ịmata ọrụ unu ruo mgbe unu rụchara ihe ahụ m nyere unu n’iwu;

73 Ka mgbe ha ga-amata ya, ka ha wee tụlee ihe ndị a.

74 N’ihi na mgbe Onye-nwe ga-apụta, ọ ga-adị aegwu nye ha, ka ụjọ wee jide ha, na ha ga-eguzo ebe dị anya ma maa jijiji.

75 Ma mba nile ga-adị n’ụjọ n’ihi ịdị egwu nke Onye-nwe, na ike nke ume ya. Ọbụna otu a. Amen.