Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 68


Nkeji 68

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma na Hiram, Ohio, Novemba 1831, site n’arịrọ nke Orson Hyde, Luke S. Johnson, Lyman E. Johnson, na William E. McLellin (History of the Church, 1:227–229). N’agbanyeghị na e nyere mkpughe nke a na nzaghachi ekpere ka echiche nke Onye-nwe bụrụ ihe pụtara ihe gbasara ndị okenye a kpọrọ aha, ọtụtụ ihe dị n’ime ya metụtara Nzukọ-nsọ nile n’ozuzu.

1–5, Okwu nile nke ndị okenye mgbe Mụọ Nsọ kwalitere ha bụ akwụkwọ-nsọ; 6–12, Ndị okenye ga-ekwusa ozi-ọma ma mee baptism, ma ihe ịrịba-ama nile ga-eso ndị kwere-ekwe n’ezie; 13–24, Nwa mbụ n’etiti ụmụ ndị nwoke nke Erọn nwere ike ịrụ ọrụ dịka Ụkọchukwu Nduzi (nke bụ, jide ọtụghe-ụzọ nile nke otu ndị-isi nduzi dịka ụkọchukwu) n’okpuru ntuzi-aka nke Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ; 25–28, Ndị nne na nna ka e nyere iwu ikụzi ozi-ọma nye ụmụ ha; 29–35, Ndị-nsọ ga-edebe Ụbọchị izu-ike, rụsie ọrụ ike, ma kpee ekpere.

1 Nwa odibo m, Orson Hyde, ka a kpọrọ site n’echichi ya ikwupụta ozi-ọma mgbe nile na-adigide, site na aMụọ nke Chineke dị ndụ, site na ndị mmadụ rue ndị mmadụ, ma site n’ala rue n’ala, n’ọgbakọ nile nke ndị ajọọ-mmadụ, n’ụlọ-nzukọ ha nile na-atụgharị uche ma na-akọwadaru ala akwụkwọ-nsọ nile nye ha.

2 Ma, lee, ma hụrụ, nke a bụ ihe nlere-anya nye ndị nile echiri echichi baa n’ọkwa nchụ-aja nke a, ndị a họpụtara ozi ha nye ha ịgagharị—

3 Ma nkea bụ ihe nlere-anya nye ha, na ha aga-ekwu dịka Mụọ Nsọ kwalitere ha.

4 Ma ihe ọbụla ha ga-ekwu mgbe ha nwere nkwalite nke aMụọ Nsọ ga-abụ akwụkwọ nsọ, ga-abụ echiche nke Onye-nwe, ga-abụ uche nke Onye-nwe, ga-abụ okwu nke Onye-nwe, ga-abụ olu Onye-nwe, na bike nke Chineke rue na nzọpụta.

5 Lee, nke a bụ nkwa nke Onye-nwe nye unu, o unu ndị odibo m.

6 Ya mere, nọrọ nụ n’ezigbo ọn̄ụ, ma atụla aụjọ, n’ihi na mụ Onye-nwe nọnyere unu, ma ga-eguzogide unu; ma unu ga-agba ama maka m, ọbụna Jisus Kraịst na a bụ m Ọkpara nke Chineke dị ndu, na a bụụrụ m, na a bụ m, ma na a ga m abịa.

7 Nke a bụ okwu nke Onye-nwe nye unu, nwa odibo m aOrson Hyde, na kwa nwa odibo m Luke Johnson, ma nye nwa odibo m Lyman Johnson, ma kwa nye nwa odibo m William E. McLellin, ma nye ndị okenye nile kwesịrị ntụkwasị-obi nke nzukọ-nsọ m—

8 aGaa nụ n’ime ụwa nile, bkwusaa ozi-ọma nye ihe ọbụla e ckere eke na-arụ ọrụ dn’ikike nke m nyeworo unu, ena-eme baptism n’aha nke Nna, na nke ọkpara na nke Mụọ Nsọ.

9 Ma aonye ahụ nke kwere na nke e mere baptism ga-abu onye a bzọpụtara, ma onye nke n’ekweghị ga-abụ onye a cmara ikpe.

10 Ma onye ahụ nke kwere ka a ga-eji aihe ịrịba-ama na-eso gọzie, ọbuna dịka e deworo ya.

11 Ma nye unu a ga-enye ị mata aihe ịrịba-ama nile nke oge nile, ma ihe ịrịba-ama nile nke ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ.

12 Ma nye ka ha ra bụ ndị Nna ga-agbara ama, unu ka a ga-enye ike aịrachikọta ha na ndụ ebighi-ebi. Amen.

13 Ma ugbụ a, gbasara ihe ndị ọzọ ahụ tụnyere ọgbụgba-ndụ nile na iwu-nsọ nile, ha bụ ndị a—

14 N’ebe ahụ ọ fọdụrụ n’ọdịnịru, n’oge akaraaka nke Onye-nwe, andị ụkọchukwu ndị ọzọ a ga-edopụ iche nye nzukọ-nsọ ije ozi ọbụna dịka nke mbụ;

15 Ya mere ha ga-abu andị-isi-nchụ-aja ndị tozuru oke, ma a ga-enye ha ọkwa site n’aka bOtu Ndị-isi Nduzi Mbụ nke Ọkwa Nchụ-aja nke Mekizedek, nanị ma ha bụ ndị agbụrụ nke cErọn.

16 Ma ọbụrụ na ha bụ ndị agbụrụ nke aErọn ha nwere oke ruru ha iwu kwadoro ị nọ n’otu-ndị ụkọchukwu, ma ọbụrụ na ha bụ ndị mbụ amụrụ n’ime ụmụ nwoke nke Erọn.

17 N’ihi na onye mbụ amụrụ nwere oke ruru ya ịnọ n’otu ndị-isi nduzi n’elu ọkwa nchụ-aja nke a, ma aọtụghe-ụzọ nile ma-ọbụ ikike nke otu ihe ahụ.

18 Onweghị onye nwere oke ruru ya iwu kwadoro n’ọkwa-ọrụ a, ijide ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja nke a, nanị ma-ọbụ onye agbụrụ na aonye mbụ a mụrụ n’agbụrụ nke Erọn.

19 Mana, dịka aonye isi nchụ-aja nke Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek nwere ikike ịrụ ọrụ n’ọkwa-ọrụ nile ndị dị nta karịa; o nwere ike ịrụ ọrụ n’ọkwa-ọrụ nke bụkọchukwu mgbe a n’enweghi onye agbụrụ nke Erọn nke a ga-ahụ, ma ọbụrụ na a akpọrọ ya ma dopụ ya iche ma chie ya echichi nye ike nke a, n’usoro ntuzi-aka nke Otu Ndị-isi Nduzi Mbu nke Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek.

20 Ma onye agbụrụ nke Erọn, kwa, garịrị abụ onye Otu Ndị-isi nduzi nke a họpụtara, ma hụta ntozu oke ya; ma atee mmanụ, ma bchie echichi n’usoro ntuzi-aka nke Otu Ndị-isi nduzi nke a, ma ọbụghị otu a ha abụghị ndị ikike iwu kwadoro ịrụ ọrụ n’ọkwa nchụ-aja ha.

21 Mana, site n’ihi ịwu ọkụ gbasara oke nke ruru ha nke ọkwa nchụ-aja ahụ iridata site na nna rue na nwa, ha nwere ike ịso ka e tee ha mmanụ ha ọbụru na mgbe obụla ha nwere ike ịkọzi agbụrụ ha, ma-ọbụ ịchọpụta ezi okwu ya site na mkpughe sitere n’aka Onye-nwe n’usoro ntuzi-aka nke Otu Ndị-isi nduzi nke ekwuworo na mbụ.

22 Ma ọzọ, onweghị onye ụkọchukwu ma-ọbụ onye isi nchụ-aja a ga-edopụ-iche maka ije-ozị a nke a ga-ekpe-ikpe ma-ọbụ maa-ikpe maka imebi iwu obụla, ewezuga n’iru aOtu Ndị-isi Nduzi Mbụ nke nzukọ-nsọ;

23 Ma ọbụrụ ra na a chọpụta na ikpe mara ya n’iru Otu Ndị-isi nduzi nke a, site n’ịgba-ama a n’enweghi ike ị gọpụ, ọ ga-abụ onye ikpe mara;

24 Ma ọbụrụ na o chegharịa a aga-agbaghara ya, dịka ọgbụgba-ndụ nile na iwu-nsọ nile nke nzukọ-nsọ siri dị.

25 Ma ọzọ, ọbụrụ ra na andị nne na nna nwere ụmụ na Zaịọn, ma-ọbụ n’ime bstek ndị nke ya ọbụla nke ahaziri ahazi, nke cn’akụzighi ha ịghọta ozizi nke nchegharị, okwukwe n’ime Kraịst Ọkpara nke Chineke dị ndụ, na baptism ma onyinye nke Mụọ Nsọ site na mbịkwasị aka n’isi, mgbe ha nọrọ afọ dasatọ, emmehie ahụ ga-anọ n’isi ndị nne na nna ahụ.

26 N’ihi na nke a ga-abu iwu nye ndị nile bi na aZaịọn, ma-ọbụ n’ime stek ya ọbụla ndị a haziri.

27 Ma ụmụ ha ka a ga-eme abaptism maka bnsachapụ nke mmehie ha nile mgbe ha nọrọ afọ casatọ, ma nata mbịkwasị aka n’isi.

28 Ma ha ga kwa akụziri ụmụ ha aikpe-ekpere, na igazi ije n’iru Onye-nwe.

29 Ma ndị nile bi na Zaịọn ga-kwa edebe aỤbọchị izu-ike i do ya nsọ.

30 Ma ndị nile bi na Zaịọn ga-kwa echeta ọrụ ha nile, ọbụrụra na a họpụtara ha ịrụ ọrụ, n’ikwesị ntụkwasị obi nile, n’ihi na onye ahụ nọ n’efu ka a ga-echeta n’irụ Onye-nwe.

31 Ugbụ a, mụ, Onye-nwe enweghi m mmasị n’ebe ndị bi na Zaịọn nọ n’ihi na e nwere ndị nọ an’efu n’etiti ha; ma ụmụ ha nọ kwa na-eto bn’ajọọ-omume; ha canaghị-achọsike akụ na ụba nile nke mgbe ebighi-ebi, mana anya ha nile jupụtara n’oke anya-ukwu.

32 Ihe ndị a ekwesịghị ịdị, ma a garịrị ewezuga ha site n’etiti unu; ya mere, ka nwa odibo m Oliver Cowdery buru okwu ndịa rute n’ala nke Zaịọn.

33 Ma otu iwu-nsọ ka m na-enye ha—ka onye n’edebeghị aekpere ya nile n’iru Onye-nwe n’oge ya, ka e bcheta kwa ya n iru onye-ikpe nke ndị m.

34 aOkwu ndị a nile bụ ezi-okwu ma kwesị ntụkwasị obi; ya mere, ejehie kwala na ha, ma-ọbụ bwepụ na ha.

35 Lee, a bụ m aAlfa na Omega, ma a na m babịa ọsọ-ọsọ. Amen.