Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 59


Nkeji 59

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Zaịọn, Ógbè Jackson, Missouri, 7 Ọugọst 1831 (History of the Church, 1:196–201). Tutu ndekọta ya nke mkpughe nke a, Onye-amụma dere n’ụzọ nkọwa maka ala nke Zaịọn, ebe ndị mmadụ gbakọtara mgbe ahụ. E doro ala ahụ nsọ, dịka Onye-nwe tụziworo-aka, ma ebe e nwere maka temple n’ọdị n’iru ka a gọziri. Onye-nwe na-eme iwu-nsọ ndị a nke ka nke ka ọ gbasa, Ndị-nsọ nile nọ na Zaịọn.

1–4, Ndị-nsọ kwesịrị ntụkwasị-obi na Zaịọn ka a ga-agọzi; 5–8, Ha ga-enwe ịhụ n’anya ma jeere Onye-nwe ozi ma debe iwu-nsọ ya nile; 9–19, Site n’idebe ụbọchị nke Onye-nwe nsọ, Ndị-nsọ ka a ga-agọzi n’ihe nke arụ na ihe nke mụọ; 20–24, Ndị ezi-omume ka e kwere nkwa udo n’ụwa nke a na ndụ ebighi-ebi n’ụwa nke na-abịa.

1 Lee, ngọzi, ka Onye-nwe kwuru, ga-adịrị ndị ahụ bịaworo n’ala nke a jiri aanya lekwasị nanị n’otuto m, dịka iwu-nsọ m nile siri dị.

2 N’ihi na ndị ahụ nke dị ndụ aga-eketa ụwa, ma ndị ahụ nke bnwụrụ ga-ezu-ike site n’ọrụ ha nile, ma ọrụ ha nile ga-eso ha; ma ha ga-anata cokpu-eze dn’ebe-obibi nile nke Nna m, nke m doziworo maka ha.

3 E, ngọzi na-adịrị ha ndị ụkwụ ha na-eguzo n’ala nke Zaịọn, ndị rubeworo isi n’ozi-ọma m; n’ihi na ha ga-anata dịka ụgwọ-ọrụ ha ihe ọma nile nke ụwa, ma ọ ga-ewepụta an’ume ya.

4 Ma ha ka a ga-ekpukwasị ngọzi nile, sịtere n’elu, e, ma jiri iwu-nsọ nile ọbụghị ole na ole, na jiri amkpughe nile n’oge nke ha—ndị bnwere okwukwe na cirụsi ọrụ ike n’iru m.

5 Ya mere, e nye m ha iwu-nsọ, na-asị otu a: Unu aga-ahụ Onye-nwe Chineke unu n’anya jiri bọbị unu nile, jiri ike gị nile, uche, na ume; ma n’aha nke Jisus Kraịst ị ga cna-ejere ya ozi.

6 Unu ga-ahụ aonye agbata-obi unu n’anya dịka onwe unu. Unu bezula ori, ma-ọbụ cịkwa iko, ma-ọbụ dịgbụ mmadụ, ma-ọbụ mee ihe ọbụla yiri ya.

7 Unu aga-ekele Onye-nwe Chineke unu n’ihe nile.

8 Unu ga-achụ aaja nye Onye-nwe Chineke unu bn’ezi-omume, ọbụna nke obi tiwara etiwa na mụọ cnke nchegharị.

9 Ma ka unu wee nwee ike n’uju debe onwe unu an’enweghi ntụpọ site n’ụwa, unu ga-aga n’ụlọ ekpere ma sonye n’oriri-nsọ nile n’ụbọchị bnsọ m;

10 N’ihi na n’ezie nke a bụ ụbọchị a họpụtara nye unu izu-ike site n’ọrụ unu nile, ka unu afee ofufe unu nile nye Onye Kachasị Elu.

11 Otu o sila dị nkwa unu nile ka unu ga-enye n’ezi-omume n’ụbọchị nile ma n’oge nile;

12 Mana cheta na nke a, n’ụbọchị nke Onye-nwe ka unu ga-enye aonyinye unu nile na oriri-nsọ nile nye Onye Kachasị Elu, bna-ekwụpụta mmehie unu nile nye ụmụnna unu, ma n’irụ Onye-nwe.

13 Ma n’ụbọchị nke a ị gaghị eme ihe ọbula ọzọ nanị ka akwadobe nri gị n’otu obi ka aibu ọnụ gị zuo oke, ma-ọbụ, asugharịa ya, ka bọn̄ụ gị wee ju eju.

14 N’ezie, nke a bụ obubu-ọnụ na ekpere, ma-ọbụ asụgharịa ya, inwe an̄ụrị na ekpere.

15 Ma ọbụrụraa na unu eme ihe ndị a nile jiri aịtụ mmamma, jiri bobi cụtọ na mgbasa iru nile, na abụghị n’oke dịchị ọchị, n’ihi na nke a bụ mmehie, mana n’obi dị ụtọ na mgbasa irụ—

16 N’ezie a sị m, na ọbụrụraa na unu mee nke a, uju nile nke ụwa bụ nke unu, anụ-ọhịa nile ma anụ-ufe nile nke ikuku, na nke ahụ na-arị-elu osisi nile ma na-aga ije n’elu ala;

17 E, ma ahịhịa ọhịa, na ihe ọma nile nke na-esite n’uwa, ma-ọbụ maka nri ma-ọbụ maka uwe, ma-ọbụ maka ụlọ nile, ma-ọbụ maka ọba nile, ma-ọbụ maka ubi mkpụrụ-osisi nile, ma-ọbụ maka oru ubi nile, ma-ọbụ maka ubi vine nile;

18 E, ihe nile na-apụta site an’ala, n’oge ya nile, ka e mere n’ihi maka uru na kwa iji mee ihe nke mmadụ, ha abụọ iji mee ka anya hụ ihe ọma na iji mee ka obi dị ụtọ;

19 E, maka nri na maka uwe, maka idetu-ire na maka isi, iji gbaa arụ ume na iji tutee mkpụrụ-obi.

20 Ma ọ masịrị Chineke na o nyeworo mmadụ ihe ndị a nile; n’ihi na otu a ka e jiri kee ha ka e were ha, mee ihe n’ụzọ ziri-ezi, ọbụghị karịa, ma-ọbụ ịpụnarị n’ike.

21 Ma onweghị ihe mmadụ ji aemehie Chineke, ma ọbụ, onweghị onye ọ na-akpalite iwe-ọkụ ya imegide, m’ọbụghị ndị ahụ ndị na-anaghị bekwupụta aka-ọrụ ya n’ihe nile, ma na-anaghị erube-isi n’iwu-nsọ ya nile.

22 Lee, nke a bụ dịka iwu na ndị-amụma nile siri dị, ya mere, enyela m nsogbu ọzọ gbasara okwu nke a.

23 Mana mụta nụ na onye ahụ na-arụ ọrụ nke aezi-omume ga-anata bụgwọ-ọrụ ya, ọbụna cudo n’ime ụwa nke a na dndụ ebighi-ebi n’ụwa nke na-abịa.

24 Mụ, Onye-nwe, ekwuwo ya, ma Mụọ agbawo ama. Amen.