Nkeji 35
Mkpughe e nyere Joseph Smith onye-amụma na Sidney Rigdon, na ma-ọbụ n’akụkụ Fayette, New York, Disemba 1830 (History of the Church, 1:128–131). N’oge a, onye-amụma nọ n’ọrụ ụbọchị nile n’ime ntụgharị nke Bible. Ntụgharị a malitere na ngwa dịka Jun 1830, ma Oliver Cowdery na John Whitmer arụwo rịị ọrụ dịka ndị ode-akwụkwọ. Ebe a kpọworo ha n’ọrụ ndị ọzọ, akpọrọ Sidney Rigdon site n’inye ọkwa nke dị nsọ ịrụ ọrụ dịka onye ode-akwụkwọ nye Onye-amụma n’ọrụ a(lee ama-okwu 20). Dịka okwu mmalite nye ndekọta ya nke mkpughe a Onye-amụma dere: “Na Disemba Sidney Rigdon biara (site na Ohio) ị jụ site n’ọnụ Onye-nwe, ya na Edward Partridge so kwa bia.… Ntakịrị oge mgbe umunna abụọ ndia rutere, nke a ka Onye-nwe kwuru” (History of the Church, 1:128).
1–2, Otu ndị mmadụ ga-eji enwe ịke ịbụrụ ụmụ nke Chineke; 3–7, Sidney Rigdon ka akpọrọ ime baptism na inyefe Mụọ Nsọ; 8–12, Ihe iriba-ama nile na ọrụ-ebube nile ka a na-arụ na-eme site na okwukwe; 13–16, Umu odibo Onye-nwe ga-ahọcha mba nile site n’ike nke Mụọ; 17–19, Joseph Smith ji ọtụghe ụzọ nile nke ihe omimi nile; 20–21, Ndị ahọpụtara ga-anọ ruo ụbọchị Onye-nwe ga-abịa; 22–27, Israel ga-enwe nzọpụta.
1 Gee nti, n’olu Onye-nwe Chineke unu, ọbụna Alfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ, onye ụzọ ya na-adị otu-gburu-gburu ebighi-ebi, di otu a taa dịka ụnyahụ, ma ruo mgbe nile.
2 Abụ m Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke, onye a kpọgburu n’ihi mmehie nile nke ụwa, ọbụna ka ha ra bu ndị kwere n’aha m, ka ha nwe ike ịbụ ụmụ ndịkom nke Chineke, ọbụna otu n’ime m dịka mụ bụ otu n’ime Nna, dịka Nna bụ otu n’ime m, ka anyị bụrụ otu.
3 Lee, n’ezie, n’ezie, a sị m nwa odibo m Sidney e lewo m gị-anya na ọrụ gị nile. Anụwo m ekpere gị nile, ma kwado gị maka ọrụ nke karịrị.
4 Ị bụ onye agọziri, n’ihi na ị ga-eme ọtụtụ nnukwu ihe. Lee ezipụwo gị, ọbụna dịka Jọn, ka idozie ụzọ n’iru m, ma tutu Elaịja nke ga-abịa, ma ị mataghi-kwa ya.
5 I mewo baptism site na mmiri maka nchegharị, kama ha a nataghị kwa Mụọ Nsọ.
6 Kama ugbụ a a na-enye gị iwu-nsọ, na ị ga-eme baptism site na mmiri, ma ha ga-anata Mụọ Nsọ site n’ịbịkwasị aka n’isi, ọbụna dịka ndị ozi mgbe ochie.
7 Ma ọ ga-eru a ga-enwe nnukwu ọrụ n’ala, ọbụna n’etiti ndị Jentaịlụ, n’ihi na enweghị-uche ha na ihe arụ ha nile gapụtasi ìhè n’anya mmadụ nile.
8 N’ihi na a bụ m Chineke, ma ogwe aka m adịghị mkpụmkpụ, ma a ga m ezi ọrụ ebube nile, ihe iriba-ama nile na ihe iju-anya nile, nye mmadụ nile ndị kwere n’aha m.
9 Ma onye ọbụla ga-arịọ ya n’aha m n’okwukwe, ha ga-achụpụ ekwensu nile; ha ga-agwọ ndị ọrịa ha ga-eme ka onye-isi nata ịhụ-ụzọ, ka onye ntị chiri nụ ihe, ma onye ogbu ka ha kwuo-okwu, ma ndị ngwọrọ na-eje ije.
10 Ma oge na-abịa ọsọ-ọsọ mgbe a ga-egosi pụta nnukwu ihe nile nye ụmụ nke ndị mmadụ;
11 Kama ma enweghi okwukwe onweghị ihe a ga-egosi pụta ma-ọbụghị ntọgbọrọ n’efu nile nye Babịlọn, otu nke ahụ nke mereworo mba nile a n̄ụọ mmanya nke ọnụma nke ịkwa-iko ya.
12 Ma onweghị ndị na-eme ihe ọma ma ọbụghị ndị dị na njikere ị nabata uju nke ozi-ọma m, nke m zipụworo nye ọgbọ nke a.
13 Ya mere, a kpọlitere m ihe ndị n’adịghị ike nke ụwa, ndị n’enweghi oke mmụta ma a na-eleda-anya, ka ha họchaa mba nile site n’ike Mụọ m;
14 Ma ogwe-aka ha ga-abụ nke m, ma a ga m abụ ihe ize-mgbọ na ntụchi ya; ma a ga m eke ha ihe-okike ukwu ha, ma ha ga-alụ ọgụ dịka nwoke maka m; ma ndị iro ha nile ga-anọkwa n’okpuru ụkwụ ha; a ga m ekwe ka mma agha daa n’ihi ha, ma site n’ọkụ nke oke-iwe m ka m ga-echekwa ha.
15 Ma onye ogbenye na onye di nwayọ ga-enwe ozi-ọma e kwusara nye ha, ma ha ga na-elepụ anya n’ihi oge nke ọbịbịa m, n’ihi na ọdịkwa nso–
16 Ma ha ga-amụta ilu nke osisi fig, n’ihi ọbụna ugbu a ọkọchị adịwo nso.
17 Ma e zipụwo m uju nke ozi-ọma m, site n’aka nwa odibo m Joseph; ma n’adịghịke ka m gọzịworo ya.
18 Ma e nyewo m ya ọtụghe-ụzọ nile nke ihe omimi nke ihe nile nke a rachiworo, ọbụna ihe nile nọ site na ntọ-ala nke ụwa, ma ihe nile ndị ga-abịa site n’ugbu a ruo oge ọbịbịa m, ọbụrụ na ọ nọgide n’ime m, na ma ọbụghị, onye ọzọ ka m ga-edochi n’ọnọdụ ya.
19 Ya mere, lekọta ya ka okwukwe gị ghara ịda, ma a ga-enye ya site na Onye-nkasị-obi, Mụọ Nsọ, nke mazuru ihe nile.
20 Ma e nye m gị iwu-nsọ—na gị ga n’edere ya ihe; ma akwụkwọ nsọ nile ka a ga-enye, ọbụna dịka ha dị n’obi m, ruo na nzọpụta nke ndị nke m ahọpụtara;
21 N’ihi ha ga-anụ olu m, ma hụkwa mụ, ma ha-agaghị arahụ ụra, ma ha ga-anọ ruo ụbọchị ọbịbịa m, n’ihi a ga-asacha ha, ọbụna dịka m dị ọcha.
22 Ma ugbụ a a sị m gị, nọgide ya, ma ọ ga-eje ije ya gị na ya; a hapụkwala ya, ma n’ezie, ihe ndị a nile ga-emezu.
23 Ma mgbe ọbụna unu anaghi ede, lee, a ga-enye ya ike ibu-amụma; ma ị ga-ekwusa ozi-ọma m ma kpọkuo ndị-amụma-nsọ iji-gosi okwu ya nile, dịka a ga-enye ha ya.
24 Debe iwu-nsọ nile na ọgbụgba-ndu nile nke e ji kekọọ unu; ma a ga m eme ka elu-igwe nile ma jijiji n’ihi ọdịnma unu, ma Setan ga-ama jijiji ma Zaịọn ga-an̄ụrị n’elu-ugwụ nile ma baa ụba;
25 Ma a ga-azọpụta Israel mgbe oge nke m zuru; ma site na ọtụghe-ụzọ ndị m nyeworo ka-aga-edu ha, ma ha-agaghị kwa enwe mgbogwoju-anya ma ọlị.
26 Welite obi unu nile elu na n̄ụrịa, mgbapụta unu na-erute nso.
27 Egwu atụla unu, igwe-anụ nta, ala-eze ahụ bụ nke unu ruo mgbe m ga-abịa. Lee a na m abịa ọsọ-ọsọ. Ọbụna otu a. Amen.