Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 19


Nkeji 19

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith, na Manchester, New York, Maach 1830 (History of the Church, 1: 72–74). N’ime akụkọ ya, Onye-amụma kọwara ya dịka “iwu-nsọ nke Chineke ma ọbụghị nke mmadụ, nye Martin Harris, nke e nyere ya site n’aka nke onye dị ebighi-ebi” (History of the Church, 1:72).

1–3, Kraịst nwere ike nile; 4–5, Mmadụ nile garịrị echegharị ma-ọbụ taa ahụhụ; 6–12, Ntaram ahụhụ mgbe ebighi-ebi bụ ntaram ahụhụ Chineke; 13–20, Kraịst tara ahụhụ maka mmadụ nile, ka ha ghara ịta ahụhụ ma ọbụrụ na ha echegharịa; 21–28, Kwusaa ozi-ọma nke nchegharị; 29–41, Kwupụta ozi ọma nile.

1 Mụ onwe m bụ Alfa na Omega, Kraịst Onye-nwe; e, a bụ m Onye ahụ, mmalite na ọgwụgwụ, Onye-mgbapụta nke ụwa.

2 Mu, ebe m mezuru, ma rụchaa uche ya Onye nke m bụ nke ya ọbụna Nna ahụ, gbasara mụ—ebe m mesịworo nke a ka m wee doo ihe nile n’okpuru m—

3 Idota ike nile, ọbụna ruo na mbibi nke Setan na ọrụ ya nile n’ọgwụgwụ nke ụwa, ma oke ụbọchị ikpe-azụ nke ikpe, nke m ga-ewetara ndị nile bi na ya, na-ekpe onye obula ikpe dịka ọrụ ya na omume ya nile nke o mere.

4 Ma n’ezie onye ọbụla garịrị echegharị ma-ọbụ taa ahụhụ, n’ihi mụ, Chineke, abụ m agwụgh-agwụ.

5 Ya mere, a naghị m ewepụ site n’ikpe nile nke m kpere, kama ahụhụ ga-aga n’iru, ịkwa-akwa, ịkwa arịrị na ịta ikikere eze, e, nye ndị ahụ a chọtara n’aka ekpe m.

6 Otu osila dị, e deghi ya na-agaghị enwe ọgwụgwụ nke ịta-ahụhụ a, kama e dere ya ịta ahụhụ agwụgh-agwụ.

7 Ọzọ, e dere ya ọmụma ikpe ọkụ ala-mụọ ebighi-ebi; ya mere o doro anya karịa akwụkwọ-nsọ ndị ọzọ, ka o nwee ike ịrụ-ọrụ n’obi nile nke ụmụ ndị mmadụ, ihe nile n’ihi otuto nke aha m.

8 Ya mere, a ga m akọwara unu ihe omimi nke a; n’ihi na o kwesịrị ka unu mata ọbụna dịka ndị-ozi m.

9 A na m ekwuru unu bụ ndị ahọpụtara n’ihe nke a, ọbụna dịka otu, ka unu wee banye n’ezumike m.

10 N’ihi na, lee, ihe omimi nke ndụ iyi-Chineke, oke ịdị ukwuu ọ dị! N’ihi na, lee, a bụ m agwụgh-agwụ, ma ntaram-ahụhụ nke e nyere site n’aka m bụ ntaram-ahụhụ agwụgh-agwụ, n’ihi na Agwụgh-agwụ bụ aha nke m. Ya mere—

11 Ntaram-ahụhụ ebighi-ebi bụ ntaram-ahụhụ nke Chineke.

12 Ntaram-ahụhụ agwụgh-agwụ bụ ntaram-ahụhụ nke Chineke.

13 Ya mere, e nye m gị iwu ka i chegharịa, ma debe iwu-nsọ nile nke ị natara site n’aka odibo m Joseph Smith, Nta, n’aha m;

14 Ma ọ bụ site n’ike nke pụrụ ime ihe nile ka ị nataworo ha:

15 Ya mere e nye m gị iwu ka ị chegharịa—chegharia, m’ọbụghị otua etie m gị ihe site na ndele nke ọnụ m, ma site n’oke iwe m, ma site n’iwe m, ma ahụhụ gị nile siri ike—isi-ike nke ị maghị, oke ịmamma ya ị maghị, e, isi-ike nke nnagide ya ị maghị.

16 N’ihi na lee, mụ, Chineke, tara ahụhụ ihe ndia nile n’ihi mmadụ nile, ka ha ghara ịta ahụhụ m’ọbụrụ na ha ga-echegharị;

17 Mana ọbụrụ na ha agaghị echegharị ha garịrị ata-ahụhụ ọbụna dịka m;

18 Ahụhụ nke mere ka mụ onwe m, ọbụna Chineke, onye kachasị elu, maa jijiji n’ihi mgbu, ma gbaa ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla, ma taa ahụhụ ma arụ ma na mụọ—ma chọọ ka m ghara ịn̄ụ n’iko ilu, ma wee laa azụ.

19 Otu osila dị, otuto dịrị Nna, a n̄ụrụ m ma mesịa njikere m nile nye ụmụ nke mmadụ

20 Ya mere, e nye m gị iwu ọzọ ichegharị, m’ọbụghị otua a ga m eme gị ịdị obi umeala sịte n’ike m nke pụrụ ime ihe nile; ma ka i kwupụta mmehie gị nile, m’ọbụghị otua ị ga-enwe ntaram-ahụhụ ndị a nke m kwuworo, nke n’ime nke kachasị ntakịrị ha, e ọbụna n’ogo a nke kachasị ntakịrị ị detuworo ire oge ahụ m wezugara Mụọ m.

21 Ma e nye m gị iwu ka i ghara ikwusa ihe ọzọ m’ọbụghị nchegharị, ma egosikwala ụwa ihe ndị a nile rue mgbe ọ bụ amamihe n’ime m.

22 N’ihi ha apụghị ịnagide anụ ugbụ a, kama mmiri-ara ka ha pụrụ ịnata; ya mere, ha agaghị ama ihe ndịa, m’ọbụghị otu a ha alaa n’iyi.

23 Mụta ihe gbasara m, ma gee ntị n’ọkwụ m nile; jee-ije n’ịdị nwayọ nke Mụọ m, ma ị ga-enwe udo n’ime m.

24 A bụ m Jisus Kraịst; a bịara m site n’uche nke Nna, ma a na m eme uche ya.

25 Ma ọzọ, e nye m gị iwu ka gị enwela anya-ukwu n’ebe nwunye onye agbata-obi gị nọ; ma-ọbụ chọọ ndụ nke onye agbata-obi gị.

26 Ma ọzọ, e nye m gị iwu ka ị ghara inwe anya-ukwu n’ebe akụ gị nọ, kama nye ya n’efu maka mbipụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn, nke nwere ezi-okwu na okwu nke Chineke—

27 Nke bụ okwu m nye ndị Jentaịlụ, na nso-nso a ka o nwee ike gakwute ndị Ju, ndị ahụ ndị Leman bụ nke fọdụrụ, ka ha nwee ike kwere n’ozi-ọma, ma hapụ ile-anya Mesaịa ga-abịa onye bịasiwoworịị.

28 Ma ọzọ, e nye m gị iwu na ị ga na-ekpe puta ekpere n’ọlu-okwu gị na kwa n’obi gị; e, n’iru ụwa ma na nzuzo, n’iru ọha nakwa mgbe nanị gị nọ.

29 ga-ekwụpụta ozi ọma nile, e, mee ka a nụ ya n’elu ugwu nile, ma n’elu n’ebe ọbụla dị elu, ma n’etiti ndị ọbụla nke a ga-ekwe ka ị hụ.

30 Ma ị ga-eme ya n’obi dị umeala, na-enwe ntụkwasị-obi na m, n’ekwughị megide ndị nkwutọ.

31 Maka ụkpụrụ nile i gaghị ekwu, kama ị ga-ekwupụta nchegharị na okwukwe n’Onye-nzọpụta, na nsachapụ nke mmehie nile site n’ime baptism, na site n’ọkụ, e, ọbụna Mụọ Nsọ.

32 Lee, nke a bụ iwu-nsọ ukwu na nke ikpeazụ nke m ga-enye gị gbasara okwu a; n’ihi na nke a ga-ezuru gị n’ije gị kwa ụbọchị, ọbụna rue ọgwụgwụ nke ndụ gị.

33 Ma nhuju-anya ka ị ga-anata m’ọbụrụ na i jighi ndụmọdụ nile ndịa kpọrọ ihe, e, ọbụna mbibi nke onwe gị na akụ gị nile;

34 Nyee akụkụ akụ gị, e, ọbụna akụkụ nke ala gị nile, ma ihe nile ewezuga nke iji-akwado ezi na ụlọ gị.

35 Kwụọ ụgwọ i kwetara ịkwụ onye-mbipụta akwụkwọ. Tọghapụ onwe gị site n’ibu-oru.

36 Hapụ ụlọ gị na ebe-obibi gị, ewezuga mgbe ị chọrọ ịhụ ezi na ụlọ gị

37 Ma kwuo ọbụghị na nzuzo nye mmadụ nile; e, kwusaa, gbaa ume, kwupụta ezi-okwu, ọbụna n’olu na-adasi-ike, n’olu an̄ụrị, na-eti—Hosanna, Hosanna, ngọzi na-adịrị aha nke Onye-nwe Chineke.

38 Kpee-ekpere oge nile, m ga-awụpụta Mụọ m n’elu gị, ma ngọzi gị nile ga-adị ukwuu—e, ọbụna karịa ma ọbụrụ na inweta akụ nile nke ụwa ma ire-ure ebe nile oruru.

39 Lee, i nwere ike ịgụ nke a n’an̄ụrịghị ọn̄ụ ma welite obi gị elu n’obi-ụtọ?

40 Ma-ọbụ i nwere ike ịgbagharị ọsọ ogologo oge karịa dịka onye-odudu kpuru-isi?

41 Ma-ọbụ ị nwere ike inwe umeala ma dịkwa nwayọ, ma jie onwe gị n’ụzọ onye maara ihe n’iru m? E, bịakwute m Onye-nzọpụta gị. Amen.