Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 93


Nkeji 93

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 6 Mee 1833 (History of the Church, 1:343–346).

1–5, Mmadụ nile ndị kwesịrị-ntụkwasị-obi ga-ahụ Onye-nwe; 6–18, John gbara-ama na Nwa nke Chineke gara site n’amara rue n’amara rue mgbe ọ natara uju nke ebube nke Nna; 19–20, Ndị kwesịrị ntụkwasị-obi, na-aga site n’amara rue n’amara, ga kwa anata site n’uju nke ya; 21–22, Ndị ahụ a mụrụ site na Kraịst bụ Nzukọ-nsọ nke Onye e Burụ Uzọ mụọ; 23–28, Kraịst natara uju nke ezi-okwu nile, ma mmadụ site na nrube-isi ga-enwe ike ime otu ahụ; 29–32, Mmadụ na Chineke nọ na mmalite; 33–35, Ihe nile e jiri mee ihe na-adị ruo mgbe ebighi-ebi, ma mmadụ ga-enwe ike ịnata uju nke ọn̄ụ na Mbilite n’ọnwụ; 36–37, Ebube nke Chineke bụ akọn’uche; 38–40, Ụmụ-ntakịrị a daghị iwu n’iru Chineke n’ihi mgbapụta ahụ nke Kraịst; 41–53, Ụmụ nna ndị nwoke ndị na-edu nzukọ-nsọ ka e nyere iwu ka ha dozie ezi na ụlọ ha n’usoro.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru: Ọ ga-eru na mkpụrụ-obi ọbụla nke hapụrụ mmehie ya nile ma bịakwute m, ma na-akpọku aha m, ma na-erube kwa isi n’olu m, ma na-edebe kwa iwu-nsọ m nile, ga-ahụ iru m ma mata na a bụ m;

2 Ma na a bụ m ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ nile na-abịa n’ime ụwa ìhè;

3 Ma na a nọ m n’ime Nna, ma na Nna nọ kwa n’ime m, na mụ na Nna bụ ọtụ—

4 Nna n’ihi na o nyere m site n’uju ya, ma Ọkpara n’ihi na a nọrọ m n’ime ụwa ma mee anụ arụ ụlọ-ụka nke m, ma biri n’etiti ụmụ nke mmadụ.

5 A nọrọ m n’ime ụwa ma na-anata site na Nna m, ma ọrụ nke ya nile ka e gosipụtara n’ụzọ dị mfe ịghọta.

6 Ma Jọn hụrụ ma gbaa ama nke uju nke ebube m, na uju nke ama nke Jọn ga-abụ ihe a ga-ekpughe ma e mesịa.

7 Ma ọ gbara ama, na-asị: A hụrụ m ebube ya, na ọ nọọrọ na mmalite, tụtụ ụwa a nọrọ;

8 Ya mere, na mmalite Okwu ahụ dị, n’ihi na ọ bụ ya bụkwa Okwu ahụ, ọbụna onye-ozi ahụ nke nzọpụta—

9 Ị̀hè ahụ na Onye-mgbapụta nke ụwa; Mụọ ahụ nke ezi-okwu, onye bịara n’ime ụwa, n’ihi na ọ bụ ya kere ụwa, ma n’ime ya ka ndụ nke ndị mmadụ na ìhè nke ndị mmadụ dị.

10 Ụwa nile bụ ya kere ha; mmadụ nile bụ ya kere ha; ihe nile ka e kere site n’aka ya, ma site na ya, ma siri na ya.

11 Ma mụ, Jọn, na-agba ama na a hụrụ m ebube ya, dịka ebube nke Onye Nna Mụrụ Nanị Ya, jupụtara n’amara ma n’ezi-okwu, ọbụna Mụọ nke ezi-okwu nke bịara ma biri n’anụ arụ, ma biri n’etiti anyị.

12 Ma mụ, Jọn hụrụ na ọ nataghị n’uju ya na mbụ, mana ọ natara amara maka amara;

13 Ma ọ nataghi site n’uju ya na mbụ, mana ọ nọgidere site n’amara ruo n’amara, ruo mgbe ọ natara uju ya.

14 Ma site otu a ka a kpọrọ ya Ọkpara nke Chineke, n’ihi na ọ natagh n’uju ya na mbụ.

15 Ma mụ Jọn, na-agba ama, ma lee, elu-igwe nile ka e meghere, ma Mụọ Nsọ rịdatara n’elu ya n’ụdị nke nduri ma nọrọ n’elu ya, ma olu dara site n’elu-igwe na-asị: Nke a bụ Ọkpara nke m hụrụ n’anya.

16 Ma mụ Jọn na-agba ama na ọ natara uju nke ebube nke Nna ahụ;

17 Ma ọ natara ike nile, ma n’elu igwe ma n’ụwa, ma ebube ahụ nke Nna nọnyere ya, n’ihi na ọ nọ kwa n’ime ya.

18 Ma ọ ga-eru, na ọ bụrụ na i kwesị ntụkwasị obi ị ga-anata uju nke ndepụta nke Jọn.

19 E nye m unu okwu ndia nile ka unu wee nwee ike ghọta ma mata otu kwesịrị iji fee-ofufe, ma mata ihe ị na-efe ofufe, ka i nwee ike ịbịakwute Nna n’aha m, ma n’ozuzu oge nke m nata uju nke ya.

20 N’ihi na ọ bụrụ na unu edebe iwu-nsọ m nile unu ga-anata uju nke ya, ma nata otuto n’ime m dịka m n’ime Nna; ya mere, a sị m unu, unu ga-anata amara n’ihi amara.

21 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, a nọ m na mmalite mụ na Nna, ma a bụ m Onye e Buru Ụzọ mụọ;

22 Ma ndị nile ahụ nke amụrụ site na m bụ ndị-nketa nke ebube otu-ụdi ahụ, ma bụrụ nzukọ-nsọ nke Onye e Burụ Ụzọ mụọ.

23 Unu nọ kwarịị na mmalite unu na Nna; nke ahụ nke bụ Mụọ, ọbụna Mụọ ahụ nke ezi-okwu;

24 Ma ezi-okwu bụ mmata nke ihe nile dịka ha dị, ma ka ha dịịrị, ma dịka ha ga-adị n’oge na-abịa;

25 Ma ihe ọbụla dị elu karịa ma-ọbụ dị-ala karịa nke a bụ mụọ nke ajọọ onye ahụ onye bụ onye ụgha site na mmalite.

26 Mụọ ahụ nke ezi-okwu bụ nke Chineke. A bụ m Mụọ nke ezi-okwu, ma Jọn gbara ama maka m, na-asị: Ọ natara uju nke ezi-okwu, e, ọbụna ezi-okwu nile;

27 Ma onweghị onye na-anata uju ewezuga ma ọ na-edebe iwu-nsọ ya nile.

28 Onye ahụ nke na-edebe iwu-nsọ ya nile na-anata ezi-okwu na ìhè, ruo mgbe ọ natara otuto site n’ezi-okwu ma mazue ihe nile.

29 Mmadụ nọkwarịị na mmalite ya na Chineke. Akọn’uche, ma-ọbụ ìhè nke ezi-okwu a bụghi ihe e kere-eke ma-ọbụ mee, ọbụghị ma-ọbụ n’ọ ga a bụ.

30 Ezi-okwu nile nwere onwe ha n’oghere ahụ nke Chineke dotara ya, ị rụ ọrụ maka onwe ya, dịka akọn’uche nile kwa; ma ọbụghị otu a onweghị ndụ dị.

31 Lee, nkea bụ ohere ịhọrọ nke mmadụ, ma nke a bụ amamikpe nke mmadụ, n’ihi na nke ahụ dị site na mmalite bụ nke egosipụtara n’ụzọ dị mfe ịghọta nye ha, ma ha anataghị ìhè ahụ.

32 Ma mmadụ ọbụla nke mụọ ya n’anabataghị ìhè ahụ nọ n’okpuru amamikpe.

33 N’ihi na mmadụ bụ mụọ. Ihe nile e jiri mee ihe na-adị ruo mgbe ebighi-ebi, ma mụọ na ihe nile ejiri mee ihe, jikọrọ n’enweghi nkewa, na-anata uju nke ọn̄ụ;

34 Ma mgbe e kewapụrụ, mmadụ enweghi ike ịnata uju nke ọn̄ụ.

35 Ihe nile e jiri mee ihe bụ ụlọ-ụka nke Chineke; e, mmadụ bụ ụlọ-ụka nke Chineke, ọbụna temple nile; ma temple ọbụla nke e merụrụ, Chineke ga-ebibi temple ahụ.

36 Ebube ahụ nke Chineke bụ akọn’uche, ma-ọbụ n’okwu ọzọ, ìhè na ezi-okwu.

37 Ìhè na ezi-okwu na-agbanarị ajọọ-onye ahụ.

38 Mụọ ọbụla nke mmadụ nọ n’enweghi ụta na mmalite; ma Chineke mgbe ọ gbapụtasịrị mmadụ site na ọdịda ahụ, ndị mmadụ bụrụ kwa ọzọ, n’ụdị nwata ha, n’enweghi ụta n’iru Chineke.

39 Ma ajọọ onye ahụ bịara ma werekwa ìhè na ezi-okwu ahụ, site na nnupụ-isi, sitere n’aka ụmụ nke mmadụ, na maka omenala nke ndị nna ha.

40 Mana e nyewo m unu iwu ka unu zụlite ụmụ unu na ìhè ma n’ezi-okwu.

41 Mana n’ezie a sị m gị, nwa odibo m Frederick G. Williams, ị nogidewo n’okpuru amamikpe nkea;

42 I kụzirighị ụmụ gị ìhè na ezi-okwu, dịka iwu-nsọ nile siri dị; ma ajọọ onye ahụ nwere ike, dịka ugbụ a, megide gị, ma nke a bụ ihe kpatara nsogbu gị nile.

43 Ma ugbụ a iwu-nsọ ka m na-enye gị—ọbụrụraa na a ga-anapụta gị ị ga-edozi n’usoro ụlọ nke gị, n’ihi na ọtụtụ ihe dị nke n’ezighị-ezi n’ụlọ gị.

44 N’ezie, a sị m nwa odibo m Sidney Rigdon, na n’ụfọdụ ihe na o debeghị iwu-nsọ nile gbasara ụmụ ya; ya mere, buru ụzọ dozie ụlọ gị n’usoro.

45 N’ezie, a sị m nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ma-ọbụ n’okwu ndị ọzọ, a ga m akpọ unu ndị enyi, n’ihi na unu bụ ndị enyi m, na unu ga-enwe ihe nketa unu na m—

46 A kpọrọ m unu ndị odibo maka ndị ụwa, ma unu bụ ndị odibo ha n’ihi m—

47 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m nye Joseph Smith, Nta—I debebeghi iwu-nsọ nile ahụ, ma kwesịrị iguzoro nara ịba-mba n’iru Onye-nwe;

48 Ezi na ụlọ gị kwesịrị ichegharị ma hapụ ụfọdụ ihe, ma n̄aa ezi ntị karịa nye okwu gị nile, ma-ọbụ ewezuga ha site n’ọnọdụ ha.

49 Ihe m na-ekwu nye otu onye ka m na-ekwu nye mmadụ nile; kpee ekpere oge nile ma-ọbụghị otua ajọọ-onye ahụ ga-enwe ike n’ime gị, ma wepụ gị site n’ọnọdụ gị.

50 Nwa odibo m Newel K. Whitney kwa, onye ụkọchukwu nke nzukọ-nsọ m, kwesịrị ka ataa ya ahụhụ, ma dozie n’usoro ezi na ụlọ ya, ma hụ na ha rụsiri ọrụ ike karịa ma nwee mmetụta n’ụlọ, ma na-ekpe ekpere oge nile, ma-ọbụ a ga-ewepụ ha site n’ọnọdụ ha.

51 Ugbụ a, a sị m unu, ndị enyi m, ka nwa odibo m Sidney Rigdon gawa na njem ya, ma mee ngwa ngwa, na kwa maa ọkwa afọ nke nnabata nke Onye-nwe n’anara mmadụ nke ọma, na ozi-ọma nke nzọpụta, dịka m ga-enye ya nkwuwa okwu; ma site n’ekpere nke okwukwe unu jiri otu nkwekọrịta a ga m akwado ya.

52 Ma ka ụmụ odibo m Joseph Smith, Nta, na Frederick G. Williams mee kwa ngwa ngwa ma a ga-enye ha ọbụna dịka ekpere nke okwukwe siri dị; ma ọbụrụraa na unu edebe okwu m nile unu agaghị enwe mgbagwọ-ju-anya n’ụwa nke a, ọbụghị ma-ọbụ n’ụwa nke na-abia.

53 Ma, n’ezie a sị m unu, na ọ bụ uche m ka ị mee ngwa ngwa n’ịtụgharị asụsụ akwụkwọ-nsọ m nile, na inweta mmata nke akụkọ, na maka mba nile, na ala-eze nile, na iwu nile nke Chineke na mmadụ, ma ihe nile nke a maka nzọpụta ahụ nke Zaịọn. Amen.