Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 63


Nkeji 63

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, n’ikpe-azụ Ọugọst 1831 (History of the Church, 1:206–211). Onye-amụma, Sidney Rigdon, na Oliver Cowdery abịaruwo na Kirtland na 27 Ọugọst site na ije ha na Missouri. N’ide okwu mmalite nye ndekọta ya nke mkpughe a, Onye-amụma dere, “N’ụbọchị nile ndị a nke mmalite nke Nzukọ-nsọ, e nwere oke nchekasị-arụ inweta okwu nke Onye-nwe nye ihe nile nke metụtara nzọpụta anyị n’ụzọ ọbụla; ma dịka ala nke Zaịọn bụzi ugbụ a ihe nke ụwa kachasị mkpa nke a na-achụso, a jụrụ m Onye-nwe maka ihe ntụzi-aka ọzọ maka mkpọkọta nke Ndị-nsọ, na ịzụta ala, na okwu ndị-ọzọ” (History of the Church, 1:207).

1–6, Ụbọchị nke oke iwe ga-abịakwasị ndị ajọọ-mmadụ; 7–12, Ihe ịrịba-ama nile na-abịa site n’okwukwe; 13–19, Onye ọkwa-iko n’ime obi ga-agọnarị okwukwe ma bụrụ onye a tụnyere n’ime ọdọ ọkụ; 20, Onye kwesịrị ntụkwasị-obi ga-anata ihe nketa n’elu ụwa enwogharịrị; 21, Nkọwasị zuru oke maka ihe nile n’Ugwụ nke Mnwogharị abụbeghi ihe e kpughere; 22–23, Onye nwere nrube-isi ga-anata ihe omimi nile nke ala-eze; 24–31, Ihe-nketa nile n’ime Zaịọn ka aga-azụta; 32–35, Onye-nwe na-enye iwu-ọkụ nile maka agha nile, na kwa ajọọ-mmadụ igbu ajọọ-mmadụ; 36–48, Ndị-nsọ ga-agbakọ na Zaịọn ma weta ego nile iji wulie ya elu; 49–54, Ngọzi nile ka e kweworo ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, na Mbilite n’ọnwụ, ma n’Oge Jisus ga-abịa n’ụwa chịa otu puku afọ; 55–58, Nke a bụ ụbọchị nke ịdọ aka na ntị; 59–66, Aha nke Onye-nwe ka ndị n’enweghi ikike na-ewere mere ihe-efu.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị mmadụ, ma meghee obi unu nile ma chee ntị site n’ebe dị anya; ma nụrụ, unu ndị na-akpọ onwe unu ndị nke Onye-nwe, ma nụrụ nụ okwu nke Onye-nwe na uche ya gbasara unu.

2 E, n’ezie, a sị m, nụrụ nụ okwu ya onye iwe dị ọkụ ya na-emegide ajọọ mmadụ na onye annupụ-isi;

3 Onye chọrọ iwere ọbụna ndị ahụ ọ aga-ewere, ma chekwaa na ndụ ndị ahụ ọ ga-echekwa;

4 Onye na-ewuli-elu mgbe ọ bụ uche ya na mmasị ya; ma na-ebibi mgbe ọ masịrị ya, ma nwee ike ịtụba mkpụrụ-obi n’ala-mụọ.

5 Lee, mụ, Onye-nwe, na-ekwu okwu n’olu m, ma a ga-erubere ya isi;

6 Ya mere, n’ezie a sị m, ka onye ajọọ mmadụ nụrụ, ka onye nnupụ-isi tụọ egwu ma makwa jijiji; ka ndị n’ekweghị-ekwe jide egbugbere ọnụ ha, n’ihi na aụbọchị oke iwe ahụ ga-abịakwute ha dịka oke bifufe-gburugburu, ma anụ arụ nile cga-amata na mụ bụ Chineke.

7 Ma onye ahụ nke na-achọ ihe ịrịba-ama ga-ahụ aihe ịrịba-ama, kama ọ bụghị ruo na nzọpụta.

8 N’ezie, a sị m unu, e nwere ndị nọ n’etiti unu na-achọ ihe ịrịba-ama, ma otu a adịwo ọbụna site na mmalite;

9 Kama, lee, okwukwe a naghị-esi n’ihe ịrịba ama abịa kama ihe ịrịba-ama na eso ndị nke kwere.

10 E, ihe ịrịba-ama na-abịa site an’okwukwe, ọ bụghị site na ọchịchọ nke ndị mmadụ, ma-ọbụ dịka mmasị ha, kama site n’ọchịchọ nke Chineke.

11 E, ihe ịrịba-ama na-abịa site n’okwukwe ruo na ọrụ nile dị ike, n’ihi na ewezuga aokwukwe onweghị onye ga-eme ihe Chineke chọrọ; ma gbasara onye ahụ Chineke were iwe megide ihe ya adịghị amasị ya; ya mere, nye ụdị onye ahụ ọ naghị ezi ihe ịrịba-ama ewezuga bn’oke iwe ruo cn’amamikpe ha.

12 Ya mere, mụ, Onye-nwe enweghi m mmasị nke ndị a n’etiti unu na-achọ ihe ịrịba-ama nile na ihe ebube nile maka okwukwe, ma ọ bụghị n’ihi ọdị mma nke ndị mmadụ ruo n’otuto m.

13 Otu osịla dị, A na m enye ịwụ-nsọ nile, ma ọtụtụ ajụwo iwu-nsọ m nile ma ha erubeghị isi nye ha.

14 E nwere rii n’etiti unu ndị nwoke na ndị nwanyị bụ aọkwa-iko; ụfọdụ n’ime ha esiwo n’ime unu pụọ, ma ndị ọzọ fọdụrụ n’etiti unu ndị a ga-ekpughe ma emesịa.

15 Ka ndị dị otu a kpachara anya ma chegharịa ọsọ-ọsọ ma ọ bụghị otu a ikpe ga-abịakwasị ha dịka ọnya, ma okwu nzuzu ha ga-apụta ìhè, ma ọrụ ha nile ga-esokwa ha n’anya ndị mmadụ.

16 Ma n’ezie a sị m unu, dịka m kwuworo na mbụ, onye ahụ nke alere nwanyị anya ma nwee bagụụ ịkwasị ya iko, ma-ọbụ ọbụrụ na onye ọbụla cakwaa iko n’obi ya, ha agaghị enwe mụọ ahụ, kama ga-agọnarị okwukwe ma ga-enwekwa ụjọ

17 Ya mere, mụ, Onye-nwe, ekwuwo na aonye ụjọ, na onye n’ekweghị-ekwe, na bndị ụgha nile, na onye ọbụla nke na-enwe ịhụnanya cn’ikwu okwu ụgha, na onye na-akwa iko, na onye na-agwọ nsi, ga-enwe oke ha dn’ọdọ-ọkụ ahụ nke na-ere jiri ọkụ na nkume-ọkụ, nke bụ ọnwụ nke eugboro abụọ.

18 N’ezie a sị m, na ha agaghị enweta oke na mbilite n’ọnwu anke mbụ.

19 Ma ugbụ a lee, mụ, Onye-nwe, na-asị unu na unu abụghị andị ikpe-n’amaghị, n’ihi na ihe ndị a nọ n’etiti unu.

20 Otu osila dị, onye ahụ nke anọgịdere n’okwukwe ma mee uche nke m, onye ahụ ga-enwe mmeri ma ga-enweta bihe nketa n’elu ụwa mgbe ụbọchị nke mnwogharị ga-abịa;

21 Mgbe a aga-enwogharị bụwa nke a, ọbụna dịka ihe nlere-anya nke e ziri ndị-ozi m n’elu cugwụ; nke nkọwasi ya n’uju unu enwetabeghi.

22 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, dịka m kwuru na m ga-eme ka unu mata uche m, lee a ga m eme ka unu mata ya, ọ bụghị n’ụzọ iwu-nsọ, n’ihi na ọtụtụ dị bụ ndị n’anaghị ele anya idota iwu-nsọ m nile.

23 Mana nye onye ahụ nke na-edota iwu-nsọ m nile aga m enye aihe omimi nile nke ala-eze m, ma nke ahụ ga-abụ n’ime ya olulu nke mmiri bndụ, nke cna-etulita nye ndụ mgbe nile na-adigide.

24 Ma ugbụ a, lee, nke a bụ uche nke Onye-nwe Chineke unu gbasara ndị-nsọ ya, na ha ga-akpọkọta onwe ha ọnụ n’ala nke Zaịọn, ọ bụghị na ngwa ka a ghara inwe ọgba-aghara nke na-eweta ajọọ ọrịa.

25 Lee, ala nke aZaịọn—mụ, Onye-nwe, ji ya n’aka nke m abụọ;

26 Otu osila dị, mụ Onye-nwe, na-enye aCaesar ihe nile bụ nke Caesar.

27 Ya mere, mụ Onye-nwe chọrọ ka unu zụọ ala ahụ nile, ka unu nwee uru nke ụwa, ka unu nwee ihe nkwado onwunwe n’ụwa, ka a ghara ịkpasu ha iwe.

28 N’ihi na aSetan na-etinye ya n’ime obi ha inwe iwe megide unu, ma ruo na ịkwafu ọbara.

29 Ya mere, ala nke Zaịọn agaghị abụ ihe a ga-enweta ma ọbụghị site n’izụ ya ma-ọbụ site n’ọbara, ma ọ bụghị otu a enweghi ihe nketa dị maka unu.

30 Ma ọ bụrụ site n’izu ya azụ, lee unu bụ ndị a gọziri;

31 Ma ọ bụrụ site n’ọbara, dịka e gbochiri unu ịkwafu ọbara, lee, ndị-iro unu ga-emeso unu, ma unu ga-enweta ihe-otiti site n’obodo-ukwu rute n’obodo-ukwu, ma site n’ụlọ-nzukọ ruo n’ụlọ-nzukọ, ma kama nanị ole na ole ga-eguzo ịnata ihe nketa.

32 Mụ, Onye-nwe, na-ewe iwe megide ndị ajọọ-mmadụ; a na m ejigide Mụọ m ka ọ ghara irute ndị bi n’ime ụwa.

33 An̄ụwo m iyi n’oke iwe m, ma nyeworo iwu ọkụ maka aagha nile n’iru ụwa nile, ma ndị ajọọ-mmadụ ga-egbu ndị ajọọ-mmadụ, ma ụjọ ga-abịakwasị mmadụ ọbụla;

34 Ma kwa andị-nsọ ga-enwe obere ebe mgbapụ; otu osila dị, mụ, Onye-nwe, a nọnyeere m ha, ma a ga m barịdata n’elu-igwe site n’iru Nna m ma jiri cọkụ a na-apụghị imenyụ repịa dndị ajọọ-mmadụ.

35 Ma na lee, nke a abụghị ugbụ a, kama na nso a.

36 Ya mere, n’ihi nke a mụ, Onye-nwe enyewo iwu-ọkụ maka ihe ndia nile n’elu iru nke ụwa, ọ bụ ọchịchọ m na ndị-nsọ ga-agbakọ n’ala nke Zaịọn;

37 Ma ka mmadụ ọbụla were aezi-omume n’aka ya nile ma jiri ikwesi ntụkwasị-obi n’ukwu ya, ma welie bolu nke ịdọ-aka na ntị nye ndị bi n’ụwa; ma kwupụta site n’okwu-ọnụ ma na mgbapụ na cịtogboro n’efu ga-abịakwute ajọọ-mmadụ.

38 Ya mere, ka ndị na-eso-ụzọ m nọ na Kirtland hazie mkpa ha nile nke ụwa nke a, onye ga-ebi n’ubi nkea.

39 Ka nwa odibo m Titus Billings, onye nwe nlekọta ya tutu ugbụ a, repụ ala ahụ, ka ọ wee nwee ike ijikere ije-ije ya na mmalite udummiri ruo n’ala nke Zaịọn, ya na ndị bi n’elu ebe ahụ, ewezuga ndị m ga-edotara onwe m, n’agaghị eje ruo mgbe m ga-enye ha iwu.

40 Ma ka ego nile e nwere ike idota, ọdịghị m mkpa ma ọ dị nta ma-ọbụ karia, ka e zipu ya ruo n’ala nke Zaịọn, nye ndị mụ họpụtaworo ịnata.

41 Lee, mụ, Onye-nwe, ga-enye nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ike nke ọ ga-eji aamata site na Mụọ ndị ga-aga ruo n’ala nke Zaịọn, na ndị n’ime ndị na-eso-ụzọ m ndị ga-anọrọ.

42 Ka nwa odibo m Newel K. Whitney dota ụlọ akụ ya, ma-ọbụ n’okwu ụdị ọzọ, ụlọ-akụ ahụ, otu ọdị nwa mgbe nta.

43 Otu osila dị, ka o nye ego nile o nwere ike inye, ka ezipu ya nye n’ala nke Zaịọn.

44 Lee, ihe ndị a nile dị n’aka ya, ka o mee dịka amamihe ya siri dị.

45 N’ezie a sị m, ka e chie ya echichi, dika onye na-anọchita anya ndị na-eso-ụzọ m ndị ga-anọrọ, ma ka e chie ya echichi baa n’ike a;

46 Ma ugbụ a gaa ngwa ngwa ileta nzukọ-nsọ nile, na-akọwadaru ihe ndị a nile ala nye ha, gị na nwa odibo m Oliver Cowdery. Lee, nke a bụ uche m ịnweta ego nile ọbụna dịka m nyere ntụzi-aka.

47 Onye ahụ akwesịrị ntụkwasị-obi ma nwee ndidi ga-emeri ụwa.

48 Onye ahụ na-ezipu akụ nile ruo n’ala nke Zaịọn ga-anata aihe nketa n’ụwa nke a, ma ọrụ ya nile ga-esokwa ya, ma kwa ụgwọ-ọrụ n’ụwa nke na-abịa.

49 E, ma ngọzi na-adịrị ndị nwụrụ anwụ bụ andị nwụrụ n’ịme Onye-nwe, site ugbụ a gaa n’iru, mgbe Onye-nwe ga-abịa ma ihe ochie nile bga-agabiga, ma ihe nile ga-aghọ ihe ọhụrụ, ha cga-ebili site na ndị nwụrụ anwụ ma ha agaghị danwụ ma emesịa, ma ha ga-enweta ihe nketa n’iru Onye-nwe, n’ime mba ahụ dị nsọ.

50 Ma onye ahụ ga-adị ndụ mgbe Onye-nwe ga-abịa, ma debewo kwa okwukwe ahụ, angọzi ga-adịrị ya, otu osila dị, e nyere ya bịnwụ ọnwụ n’oge nke mmadụ.

51 Ya mere, ụmụ-ntakịrị aga-etolite ruo mgbe ha ga-aka nka; ndị agadi ga-anwụ; kama ha agaghị arahụ-ụra na uzuzu, kama a bga-agbanwe ha n’otu ntabi-anya.

52 Ya mere, n’ihi nke a ka ndị-ozi kwusara mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ nye ụwa.

53 Ihe ndia bụ ihe ndị unu garịrị ele anya ha; ma, n’ikwu n’ụzọ nke Onye-nwe, ha dị ugbụ a an’ọba aka, ma n’oge na-abịa, ọbụna n’ụbọchị ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ.

54 Ma ruo n’oge awa ahụ a ga-enwe aụmụ agbọghọ n’amaghị nwoke ndị nzuzu n’etiti ndị amamihe; ma n’oge awa ahụ ka nkewapụ nke ndị ezi-omume na ndị ajọọ-mmadụ ga-abịazu; ma n’ụbọchị ahụ ka m ga-ezipụ ndị mụọ-ozi m bifopu ndị ajọọ-mmadụ ma tụba ha n’ime ọkụ ana-apụghị imenyụ.

55 Ma ugbụ a lee, n’ezie a sị m unu, mụ, Onye-nwe enweghị mmasị n’ebe nwa odibo m aSidney Rigdon nọ; o bbuliri onwe ya elu n’obi ya, ma nabataghị ndụmọdụ, mana o mere ihe wutere mụọ ahụ;

56 Ya mere aihe-odide ya ka a na-anabataghị n’aka Onye-nwe, ma ọ ga-ede ọzọ; ma ọ bụrụ na Onye-nwe anabataghị ya, lee ọ gaghị kwa eguzo n’ọkwa nke m họpụtaworo ya.

57 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, andị nile chọrọ n’obi ha, n’ịdị nwayọ, bịdọ ndị mmehie aka na ntị nye nchegharị, ka e chie ha echiche baa n’ike a.

58 N’ihi nke a bụ ụbọchị nke ịdọ-aka-na-ntị, ma ọ bụghị ụbọchị nke ọtụtụ okwu. N’ihi na Mụ, Onye-nwe, abụghị onye a na-akwa emu n’ụbọchị ndị ikpeazụ.

59 Lee, e sị m n’elu, ma ike m dị n’okpuru. A bụ m onye kachasị ihe nile, ma dị n’ime ihe nile, ma site n’ihe nile, ma ana-enyochasị ihe nile, ma ụbọchị ahụ na-abịa mgbe ihe nile ga-anọ n’okpuru m.

60 Lee, a bụ m aAlfa na Omega, ọbụna Jisus Kraịst.

61 Ya mere, ka mmadụ nile kpachara anya otu ha si akpọku aaha m n’egbugbere ọnụ ha—

62 N’ihi na lee, n’ezie a sị m, ọtụtụ ka ha dị ndị nọ n’amamikpe nke a, ndị na-eji aha nke Onye-nwe, ma were ya n’ihe efu n’enweghi ikike.

63 Ya mere, ka nzukọ-nsọ chegharịa site na mmehie ha nile, ma mụ, Onye-nwe, ga-enwe ha; ma ọ bụghị otu a a ga-ekewapụ ha.

64 Cheta na nke ahụ sitere n’elu bịa adị nsọ, ma a garịrị-eji ịkpachara anya bkwuo ya, ma site na nduzi nke Mụọ; ma n’ime nke a enweghị amamikpe, ma ị ga-anata Mụọ csite n’ekpere; ya mere, ewezuga nke a amamikpe ga-adịrị.

65 Ka ụmụ odibo m, Joseph Smith, Nta, na Sidney Rigdon, chọọrọ nye ha ebe obibi, dịka a na-akụziri ha site an’ekpere sitere na Mụọ ahụ.

66 Ihe ndị a fọdụrụ ịmeri site na ndidi, ka ụdị nke ahụ nwee ike inweta aebube nke karịrị ma dị kwa barọ nke ebighi-ebi, ma ọ bụghị otu a amamikpe nke dị ukwuu karịa. Amen.