Akwụkwọ nsọ
Alma 12


Isi 12

Alma wee dọọ ndọrọ-ndọrọ ya na Ziezrọm—Ihe omimi nile nke Chineke ka a ga-enye nanị ndị nwere okwukwe—Ndị mmadụ ka a ga-ekpe ikpe site n’echiche ha nile, okwukwe nile, okwu nile, na ọrụ nile—Ndị ajọọ omume ka a ga-ata ahụhụ ọnwụ nke mụọ—Ndụ arụ a n’anwụ-anwụ bụ ọnọdụ mnwale—Atụmatụ nke mgbapụta na-eweta Mbilite n’Ọnwụ ahụ ma, site n’okwukwe, nsachapụ nke mmehie nile—Ndị chegharịrị nwere oke n’ebere site n’Ọkpara a Mụrụ Nanị Ya. Ihe dịka n’afọ 82 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua Alma, ebe ọ hụrụ na okwu nile nke Amiulek edewo Ziezrọm jụụ, n’ihi na ọ hụrụ na Amiulek ejidewo ya an’ikwu okwu ụgha ya na ighọ aghụghọ ibibi ya, ma ebe ọ hụrụ na ọ malitere ịma jijiji n’okpuru buche zuru oke maka ikpe ọmụma ya, o meghere ọn̄ụ ya ma malite ịgwa ya okwu, na imesi okwu nile nke Amiulek ike, na ịkọwa ihe nile ndị dị n’ebe anya na-anaghị eru, ma-ọbụ isaghee akwụkwọ-nsọ nile karịa nke ahụ Amiulek meworo.

2 Ugbua okwu nile nke Alma gwara Ziezrọm ka ndị nọ gburu-gburu nụrụ; n’ihi na igwe-mmadụ ahụ dị nnukwu, o kwuru okwu nʼụdị di otu a:

3 Ugbua Ziezrọm, ebe a hụrụ na e nwetawo gị n’ikwu okwu ụgha na ịghọ aghụghọ, n’ihi na ikwughị okwu ụgha nye ndị mmadụ nanị mana ikwuwo okwu ụgha nye Chineke; n’ihi na lee, ọ matara aechiche gị nile, ma Ị na-ahụ na echiche gị nile e mere ka anyị mata ha site na Mụọ ya;

4 Ma Ị na-ahụ na anyị matara na atụmatụ gị bụ atụmatụ dị ezigbo aghụghọ, dịka aghụghọ nke ekwensu ahụ, maka ikwu okwu ụgha na ịghogbu ndị a ka Ị nwe ike dunye ha imegide anyị, ịkpọ anyị aha ọjọọ ma chụpụ anyị—

5 Ugbua nke a bụ atụmatụ nke aonye iro gị, ma o gosịwo ike ya na gị. Ugbua ọ dị m ka asị na Ị ga-echeta na ihe m na-agwa gị a na m agwa mmadụ nile.

6 Ma lee asị m unu nile na nke a bụụrụ ọnya nke onye iro ahụ, nke ọ tọworo ijide ndị a, ka o wee weta unu n’ime ịnọ n’okpuru ya, ka o wee jiri aụdọ-igwe ya nile kegide unu, ka o wee keda unu ruo mbibi mgbe nile na-adigide, dịka ike nke ndọkpụ n’agha ya siri dị.

7 Ugbua mgbe Alma kwuworo okwu ndị a, Ziezrọm malitere ịma jijiji karịchaa, n’ihi na e mere ka o kwenye karịa akarịa maka ike nke Chineke; ma e mekwara ka o kwenye na Alma na Amiulek matara maka ya, n’ihi na e mere ka o kwenye na ha matara echiche nile na ebum-n’obi nile nke obi ya; n’ihi na e nyere ha ike ka ha wee mata maka ihe ndị a nile dịka mụọ nke ibu-amụma siri dị.

8 Ma Ziezrọm malitere ịjụtasị ha ike, ka o wee mata ihe karịa gbasara ala-eze nke Chineke. Ma ọ sịrị Alma: Gịnị ka nke a pụtara nke Amiulek kwuworo gbasara mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, na mmadụ nile ga-ebịlite site n’ọnwụ, ma ndị omume zịrị-ezi ma ndị omume n’ezighị-ezi, ma a ga-akpọta ha iguzoro n’iru Chineke ka e kpee ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị?

9 Ma ugbua Alma malitere ịkọwadaru ihe ndị a nile ala nye ya, na-asị: E nyere ya ọtụtụ ịmata aihe omimi nile nke Chineke; otu osila dị e debere ha n’okpuru iwu siri ike na ha agaghị enye bma ọbụghị dịka akụkụ okwu ya ahụ nke ọ na-enye ụmụ nke mmadụ, dịka ịn̄a ntị na mgbalị nke ha nyere ya siri dị.

10 Ma ya mere, onye nke aga-emesi obi ya ike, onye ahụ ga-anata bakụkụ ka nta nke okwu ahụ; ma onye nke cna-agaghị emesi obi ya ike, ya ka e dnyeworo akụkụ okwu ahụ nke karịrị, ruo mgbe e nyere ya ịmata ihe omimi nile nke Chineke ruo mgbe ọ matazuru ha.

11 Ma ndị ahụ ga-emesi obi ha ike, ha ka e nyere aakụkụ ka ntakịrị nke okwu ahụ ruo mgbe na bọdịghị ihe ha ga-amata gbasara ihe omimi ya nile; ma mgbe ahụ ekwensu ga-akpọrọ ha na ndọkpụ n’agha, ma duru ha n’ọchịchọ ya gbada ruo mbibi. Ugbua nke a bụ ihe cụdọ-igwe nile nke dala mụọ pụtara.

12 Ma Amiulek ekwuwo otu ọ dị mfe nghọta gbasara aọnwụ, na inwe nkulite site n’ọnọdụ ịnwụ anwụ a ruo n’ọnọdụ nke anwụghị anwụ, na ịkpọta n’iru oche-ikpe nke Chineke, ka e bkpee anyị ikpe dịka ọrụ anyị nile siri dị.

13 Mgbe ahụ ọbụrụ na emesịwo obi anyị nile ike, e, ọbụrụ na anyị emesịwo obi anyị nile ike megide okwu ahụ, nke mere na a hubeghị ya n’ime anyị, mgbe ahụ ka ọnọdụ anyị ga-adị egwụ, n’ihi na mgbe ahụ anyị ga-enwe amam-ikpe.

14 N’ihi na aokwu anyị nile ga-ama anyị ikpe, e, ọrụ anyị nile ga-ama anyị ikpe; agaghị enweta anyị n’enweghị ntụpọ; ma echiche anyị nile ga kwa ama anyị ikpe; ma n’ọnọdụ a dị egwụ anyị agaghị a nwa a nwa ilelite anya lee Chineke anyị; ma anyị ga- enwe obi-ụtọ ma ọbụrụ na anyị nwere ike inye nkume nile na bugwu ukwu nile iwu ịdakwasị anyị cizo anyị site nʼiru ya.

15 Mana nke a enweghị ike ịdị; anyị ga-abịarurịrị ma guzoro n’iru ya n’otuto ya, na n’ike ya, ma n’ume ya, ụdị-eze, na ọchịchị, ma nakwere-ezi-okwu an’ihere mgbe nile na-adigide anyị na bikpe ya nile zịrị ezi; na o ziri ezi n’ọrụ ya nile, ma na ọ na-emere ụmụ nke mmadụ ebere, ma na ọ nwere ike nile ịzọpụta mmadụ nile ndị kwere n’aha Ya ma na-amịta mkpụrụ na-egosị nchegharị.

16 Ma ugbua, asị m unu mgbe ahụ ka otu ọnwụ ga-abịa, ọbụna aọnwụ nke ugboro abụọ, nke bụ ọnwụ nke mụọ; mgbe ahụ bụ oge nke onye ọbụla nwụrụ n’ime mmehie ya nile, dịka bn’ọnwụ nke arụ, cga-anwụ kwa ọnwụ nke mụọ; e, ọ ga-anwụ dịka nye ihe nile gbasara ezi-omume.

17 Mgbe ahụ bụ oge nke ntaram-ahụhụ ha nile ga-abụ dịka aọdọ ọkụ na nkume ọkụ, nke ire ọkụ ya na-arịgoro n’elu ruo mgbe nile na mgbe nile; ma mgbe ahụ bụ oge nke a ga-eke ha ụdọ-igwe gbada ruo mbibi mgbe nile na-adigide, dịka ike na ndọkpụ n’agha nke Setan siri dị, ya ebe o debeworo ha n’okpuru ya dịka ọchịchọ ya siri dị.

18 Mgbe ahụ, asị m gị, ha ga-adị ka aenwebeghị mgbapụta e mere; n’ihi na agaghị agbapụta ha dịka ikpe-ziri ezi nke Chineke siri dị; ma ha enweghị ike bịnwụ, ebe ha hụrụ na enweghị kwa ire ure.

19 Ugbua o wee ruo na mgbe Alma bịaworo na ngwụcha nke ikwu-okwu ndị a nile, ndị ahụ malitere inwe ịtụ-n’anya karịa;

20 Mana e nwere otu Antiọna, onye bụ onye-isi-ọchịchị n’etiti ha, bịalitere ma sị ya: Gịnị bụ nke a ị kwuworo, na mmadụ ga-ebilite site na ndị nwụrụ-anwụ ma a gbanwe ya site an’ọnọdụ na-anwụ anwụ a baa n’ọnọdụ anwụghị anwụ, nke mere na mkpụrụ-obi agaghị anwụkwa ọzọ?

21 Gịnị ka akwụkwọ-nsọ na-egosị, nke sịrị na Chineke debere acherubim na mma-agha ire ọkụ n’ọwụwa-anyanwụ nke ubi nke bIden ahụ, adịghị ama-ama nne na nna mbụ anyị ibanye ma rachaa mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ahụ, ma dị ndụ ruo mgbe nile? Ma otu a anyị hụrụ na-enweghị ohere ga-ekwe-mee na ha ga-ebi ruo mgbe ebighi-ebi.

22 Ugbua Alma sịrị ya: Nke a bụ ihe nke m na-achọ ịkọwa. Ugbua anyị hụrụ na Adam adara site n’ịracha site na bmkpụrụ-osisi a sị erila, dịka okwu Chineke siri dị; ma otu a anyị hụrụ, na site n’ọdịda ya, mmadụ nile ghọrọ cndị furu-efu na ndị dara ada.

23 Ma ugbua lee, asị m gị na ọbụrụ na o kwere Adam mee aịracha mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ahụ n’oge ahụ, agaraghị enwe ọnwụ, ma okwu ahụ gara abụ ihe efu, na-mee Chineke onye okwu ụgha, n’ihi na ọ sịrị: bỌbụrụ na i rie ị ga-anwụrịrị.

24 Ma anyị na-ahụ na aọnwụ na-abịakwasị ndị mmadụ, e, ọnwụ ahụ nke Amiulek kwuworo maka ya, nke bụ ọnwụ nke arụ; otu o sila dị e nwere ohere e nyere bmmadụ n’ime nke o nwere ike ichegharị; ya mere ndụ a ghọrọ ọnọdụ mnwale; oge cịkwado izute Chineke; oge ịkwado maka ọnọdụ agwụgh-agwụ ahụ nke anyị kwuworo maka ya, nke bụ mgbe mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ gasịworo.

25 Ugbua a sị na ọbụghị maka aatụmatụ nke mgbapụta, nke a tọrọ site na ntọ-ala nke ụwa, a garaghị enwe bmbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ; mana e nwere atụmatụ nke mgbapụta a tọrọ, nke ga-eweta mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, nke e kwuworo maka ya.

26 Ma ugbua lee, ọbụrụ na o kwere mee na nne na nna mbụ anyị nwere ike ịga nʼiru ma rachaa mkpụrụ sitere an’osisi nke ndụ ha gaara anọ n’ọnọdụ ịhụju-anya ruo mgbe nile, na-enweghị ọnọdụ nkwadobe; ma otu a batụmatụ nke mgbapụta gaara abụ ihe n’enweghị isi, ma okwu nke Chineke gaara abụ ihe efu, na-enweghị ihe na-eso ya.

27 Mana lee, ọ dịghị otu ahụ; mana a ahọpụtara ya nye ndị mmadụ na ha ga-anwụrịrị; ma mgbe ọnwụ gasịrị, ha ga-abịarịrị bikpe-ikpe, ọbụna otu ikpe ikpe ahụ nke anyị kwuworo maka ya, nke bụ nsọtụ ahụ.

28 Ma mgbe Chineke họpụtaworo na ihe ndị a nile ga-abịakwute mmadụ, lee, mgbe ahụ ọ hụrụ na ọ dị mkpa na mmadụ ga-amata gbasara ihe nile ndị ahụ ọ họpụtaworo nye ha;

29 Ya mere o zigara andị mụọ-ozi ịkparịta-ụka ya na ha, ndị mere ndị mmadụ ịhụ otuto ya.

30 Ma ha malitere site n’oge ahụ gaa n’iru ịkpọku aha ya; ya mere Chineke akparịtara ụka ya na ndị mmadụ, ma mee ka ha mata batụmatụ nke mgbapụta, nke a kwadoworo site na cntọ-ala nke ụwa; ma nke a o mere ka ha mata dịka okwukwe ha siri dị na nchegharị na ọrụ ha nile dị nsọ.

31 Ya mere, o nyere ndị mmadụ aiwu-nsọ nile, ha ebe ha jehieworo biwu-nsọ mbụ nile ndị gbasara ihe ndị bụ nke arụ, na ịghọ dịka chi, cna-amata mma site na njọ, na-edebe onwe ha n’ọnọdụ dime ihe, ma-ọbụ ịbụ ndị e debere n’ọnọdụ ime ihe dịka ọchịchọ ha nile na mmasị ha nile siri dị, ma ha ga-eme ihe ọjọọ ma-ọbụ ime ihe ọma—

32 Ya mere Chineke nyere ha iwu-nsọ nile, mgbe o ameworo ka ha mata atụmatụ nke mgbapụta, ka ha ghara ime ihe ọjọọ, ahụhụ nke dị ya bụụrụ bọnwụ nke ugboro abụọ, nke bụ ọnwụ mgbe nile na-adigide maka ihe nile gbasara ezi-omume; n’ihi na n’ụdị a, atụmatụ nke mgbapụta agaghị enwe ike, n’ihi na ọrụ nile nke cikpe zịrị ezi a gaghị enwe ike ibibi ya, dịka ịdị mma kachasị-elu nke Chineke siri dị.

33 Mana Chineke kpọrọ ndị mmadụ, n’aha Ọkpara ya, (nke a ebe ọ bụ atụmatụ nke mgbapụta nke a tọrọ) na-asị: Ọbụrụ na unu ga-echegharị ma ghara imesi obi unu ike, mgbe ahụ ka m ga-emere unu ebere, site n’Ọkpara m M mụrụ Nanị Ya;

34 Ya mere, onye ọbụla chegharịrị, na n’emesighị obi ya ike, ọ ga-enwe oke an’ebere site n’Ọkpara m M mụrụ Nanị Ya, ruo na bnsachapụ nke mmehie ya nile; ma ndị a ga-aba n’ime cizu-ike m.

35 Ma onye ọbụla ga-emesi obi ya ike ma ga-eme ajọọ-omume, lee, a n̄ụọ m iyi n’ime iwe ọkụ m na ọ gaghị aba n’ime izu-ike m.

36 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, lee asị m unu, na ọbụrụ na unu ga-emesi obi unu ike unu agaghị aba n’ime izu-ike nke Onye-nwe; ya mere ajọọ-omume unu na-akpasu ya iwe nke mere na o na-ezidatara unu iwe ọkụ ya dịka na amkpasu iwe mbụ ahụ, e, dịka okwu ya siri dị na mkpasu iwe ikpe-azụ ahụ na kwa nke mbụ, wee ruo na bmbibi mgbe nile na-adigide nke mkpụrụ-obi unu nile; ya mere, dịka okwu ya siri dị, wee ruo n’ọnwụ ikpe-azụ ahụ, na kwa nke mbụ.

37 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, ebe m hụrụ na anyị matara ihe ndị a nile, ma ha bụ ezi-okwu, ka anyị chegharịa, ma ghara imesi obi anyị ike, ka anyị ghara aịkpasu Onye-nwe Chineke anyị iwe ịdọdatara onwe anyị iwe ọkụ ya n’ime iwu-nsọ nke abụọ ya nile ndị a nke o nyeworo anyị; mana ka anyị baa n’ime bizu-ike nke Chineke, nke a kwadoro dịka okwu ya siri dị.