Akwụkwọ nsọ
Alma 42


Isi 42

Ịnwụ anwụ bụ oge mnwale inyere mmadụ aka ichegharị ma jeere Chineke ozi—Ọdịda ahụ wetara ọnwụ nke arụ na nke mụọ nye mmadụ nile—Mgbapụta na-abịa site na nchegharị—Chineke n’onwe ya na-achụ aja mgbaghara mmehie nile nke ụwa—Ebere bụ maka ndị chegharịrị—Ndị ọzọ nile nọ n’okpuru ikpe zịrị-ezi nke Chineke—Ebere na-abịa n’ihi Aja mgbaghara mmehie ahụ—Nanị ndị nwere ezigbo nchegharị ka a ga-azọpụta. Ihe dịka n’afọ 74 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, nwa m nwoke, a hụrụ m na enwere ihe ole na ole ọzọ nke na-esogbu echiche gị, nke ị na-enweghị ike ịghọta—Nke bụ gbasara aikpe ziri-ezi nke Chineke na ntaram-ahụhụ nke onye-mmehie ahụ; n’ihi na ị na-anwa n’iche na ọ bụ ihe n’ezighị-ezi na a ga-enyefe onye-mmehie n’ọnọdụ nke nhuju-anya.

2 Ugbua lee, nwa m nwoke, a ga m akọwara gị ihe nke a. N’ihi na lee, mgbe Onye-nwe Chineke azipụchara ndị nne na nna mbụ anyị site n’ogige nke bIden, ịkọ ala, site n’ebe nke ewetara ha—E, o sepụtara nwoke ahụ, ma o debere na nsọtụ ọwụwa-anyanwụ nke ogige nke Iden ahụ, ccherubim, na mma agha nke ire-ọkụ nke na-atụgharị uzọ nile, ichekwa dosisi nke ndụ ahụ—

3 Ugbua, anyị hụrụ na mmadụ ahụ adịworị ka Chineke, na-amata ihe ọma na ihe ọjọọ; ma ka ọ ghara iwepụta aka ya, ma were kwa site n’osisi nke ndụ ahụ, ma rie ma dị ndụ ruo mgbe nile, Onye-nwe Chineke debere cherubim na mma-agha nke ire-ọkụ, ka ọ ghara iketa-oke site na mkpụrụ-osisi ahụ—

4 Ma otu a anyị hụrụ, na enwere oge enyere mmadụ ichegharị, e, aoge-mnwale, oge ichegharị ma jeere Chineke ozi.

5 N’ihi na lee, ọbụrụ na Adam wepụtararịị aka ya otu mgbe ahụ, ma rachatụworịị site na osisi nke ndụ ahụ, ọ gaara adị-ndụ ruo mgbe nile, dịka okwu Chineke siri dị, na-enweghị oghere maka nchegharị; e, na kwa okwu Chineke gaara abụ ihe efu, ma nnukwu atụmatụ nke nzọpụta ahụ gaara abụ ihe akwụsịrị akwụsị.

6 Mana lee, akara ya aka nye mmadụ aịnwụ—ya mere, ebe ebepụrụ ha site n’osisi nke ndụ ahụ a ga-ebepụkwa ha site n’elu iru nke ụwa—ma mmadụ ghọrọ onye furu-efu ruo mgbe nile, e, ha ghọrọ bmmadụ dara ada.

7 Ma ugbua, ị hụwo site na nke a na nne na nna anyị mbụ aebepụrụ ha ma n’arụ ma na mụọ site n’iru nke Onye-nwe; ma otu a anyị hụrụ na ha ghọrọ ndị nọ n’okpuru iso ihe ha n’onwe ha bchọrọ.

8 Ugbua lee, ọdịghị mkpa na a ga-akpọtaghachị mmadụ site n’ọnwụ nke arụ nke a, n’ihi na nke ahụ ga-ebibi nnukwu aatụmatụ nke inwe an̄ụrị.

9 Ya mere, ebe ọbụ na mkpụrụ-obi enweghị-ike ịnwụ anwụ, ma aọdịda ahụ ewetaworo mmadụ nile ọnwụ nke mụọ na kwa nke arụ, nke ahụ bụ, ebepụrụ ha site n’iru nke Onye-nwe, ọ dịrịị mkpa na aga-akpọtaghachị mmadụ site n’ọnwụ nke mụọ nke a.

10 Ya mere, ebe ha ghọworo nke aanụ-arụ, nke mmetụta, na-eso ekwensu, site bn’okike, cọnọdụ-mnwale nke a ghọrọ ọnọdụ maka ha ịkwado; ọ ghọrọ ọnọdụ njikere.

11 Ma ugbua cheta, nwa m nwoke, ọbụrụ na ọbụghị maka atụmatụ nke mgbapụta, (idebe ya n’akụkụ) ngwa-ngwa ha nwụrụ mkpụrụ-obi ha nile ga-anọ na anhuju-anya, ebe ebepụrụ ha site n’ebe Onye-nwe nọ.

12 Ma ugbua, enweghị ụzọ a ga-esi kpọtaghachị ndị mmadụ site n’ọnọdụ ọdịda nke a, nke mmadụ wetaworo nye onwe ya n’ihi erubeghị-isi nke onwe ya;

13 Ya mere, dịka ikpe ziri-ezi siri dị, agaraghị ewebata aatụmatụ nke mgbapụta ahụ, nanị n’ọnọdụ nile nke bnchegharị nke ndị mmadụ n’ọnọdụ mnwale nke a, e, ọnọdụ nkwadobe nke a; n’ihi na ma ọbụghị n’ihi ọnọdụ ndị a, ebere enweghị ike imalite ma ọbụghị na ọ ga-ebibi ọrụ nke ikpe-ziri-ezi. Ugbua ọrụ nke ikpe ziri-ezi ahụ agaraghị enwe ike ibibi ya; ọbụrụ otu ahụ, Chineke cga-akwụsị ịbụ Chineke.

14 Ma otu a anyị hụrụ na mmadụ nile aadawo, ma ha nọọrọ n’ime njidesike nke bikpe-ziri-ezi; e, ikpe ziri-ezi nke Chineke, nke nyefere ha ruo mgbe nile ka ebepụ ha site n’ebe ọ nọ.

15 Ma ugbua, agaraghị ewebata atụmatụ nke ebere ma ọbụghị na aga achụ aja-nzọpụta; ya mere Chineke n’onwe ya ana-achụ maka aja mgbaghara mmehie nile nke ụwa, iwebata atụmatụ nke bebere, imeju ọchịchọ nile nke cikpe ziri-ezi, ka Chineke wee bụrụ onye dzuru-oke, Chineke ikpe ziri-ezi, na kwa Chineke nke ebere.

16 Ugbua, nchegharị enweghị ike ịbịakwute ndị mmadụ ma ọbụghị na enwere ntaram-ahụhụ, nke dị kwa aebighi-ebi dịka ndụ nke mkpụrụ-obi ahụ ga-adị, anyapadoro chee-iru megide atụmatụ nke an̄ụrị, nke dị kwa ebighi-ebi ka ndụ nke mkpụrụ-obi ahụ.

17 Ugbua, olee otu mmadụ ga-esi chegharịa ma ọbụghị na o amehiere? Olee otu ọ ga-esi mee mmehie ma ọbụrụ na enweghị biwu? Olee otu a ga-esi nwee iwu ma ọbụghị na enwere ntaram-ahụhụ?

18 Ugbua, enwere ntaram-ahụhụ a nyapadoro, na iwu ziri-ezi e nyere, nke na-eweta mwute nke amụọ nye mmadụ.

19 Ugbua, ọbụrụ na enweghị iwu e nyere—ọbụrụ na mmadụ agburu mmadụ ọ ga-anwụ—ọ ga-atụ egwu na ya ga-anwụ ma ọbụrụ na ya gbuo mmadụ?

20 Na kwa, ọbụrụ na enweghị iwu e nyere megide mmehie ndị mmadụ agaghị atụ-egwu ime mmehie.

21 Ma ọbụrụ na aenweghị iwu e nyere, ọbụrụ na ndị mmadụ mehiere gịnị ka ikpe ziri-ezi ga-eme, ma-ọbụ ebere n’onwe ya, n’ihi na ha agaghị enwe ihe njide aka n’arụ ihe ahụ e kere-eke?

22 Mana enwere iwu enyere, na ntaram-ahụhụ anyapadoro, na anchegharị e nyere; bụ nchegharị, nke ebere na-ejide aka; ma ọdịghị otu a, ikpe ziri-ezi ga-ejide ihe ahụ e kere eke aka ma mee ihe e kpebiri n’iwu ahụ, ma iwu ahụ na-akwagide ntaram-ahụhụ ahụ; ọbụrụ na ọdịghị otu ahụ, ọrụ nile nke ikpe ziri-ezi a ga-ebibi ha, ma Chineke ga-akwụsị ịbụ Chineke.

23 Mana Chineke akwụsịghị ịbụ Chineke, ma aebere na-anabata onye chegharịrị, ma ebere na-abịa n’ihi baja mgbaghara mmehie ahụ; ma aja mgbaghara mmehie ahụ na-eweta na mmezu cmbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ; ma mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dna-eweghachi ndị mmadụ n’iru nke Chineke; ma otu a ana-eweghachi ha n’ebe ọ nọ, ka e ekpee ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, dịka iwu ahụ na ikpe ziri-ezi siri dị.

24 N’ihi na lee, ikpe ziri-ezi ga-eji ihe nile kwesịrị-ime rụọ ọrụ, na kwa ebere na-ejide ihe nile bụ nke ya aka; ma otu a, ọdịghị onye ọzọ ma-ọbụghị ndị chegharịrị n’ezie ka a ga-azọpụta.

25 Gịnị, i chere na ebere nwere ike izu aikpe ziri-ezi ori? Asị m gị, E-e; ọbụghị ma otu nke ntakịrị. Ọbụrụ otu a, Chineke ga-akwụsị ịbụ Chineke.

26 Ma otu a Chineke na-ewebata nnukwu na aebum-n’obi ebighi-ebi ya, nke a kwadoro bsite na ntọ-ala nke ụwa. Ma otu a ka nzọpụta si na-abịa na mgbapụta nke ndị mmadụ, na kwa mbibi ha na nhuju-anya ha.

27 Ya mere, O nwa m nwoke, aonye ọbụla nke chọrọ ịbịa nwere ike ịbịa ma keta-oke site na mmiri nile nke ndụ na akwụghị ụgwọ; ma onye ọbụla na-achọghị ịbịa anaghị amanye onye ahụ ịbịa; mana n’ụbọchị ikpe-azụ ahụ a bga-akwụghachi ya dịka cọrụ ya nile siri dị.

28 Ọbụrụ na ọ chọwo ime aihe ọjọọ, ma o chegharịghị n’ụbọchị ya nile, lee, ihe ọjọọ ka a ga-emeso ya, dịka nkwụghachị-ụgwọ nke Chineke siri dị.

29 Ma ugbua, nwa m nwoke, achọrọ m ka ị mee ka ihe ndị a ghara isogbu gị ọzọ, ma nanị mee ka mmehie gị nile na-esogbu gị, na nsogbu ahụ nke ga ewedata gị ruo nchegharị.

30 O nwa m nwoke, a chọrọ m ka ị ghara ịgọnarị ikpe ziri-ezi nke Chineke ọzọ. Achọkwala ka iwepụ onwe gị n’ụta n’ihe kachasị ntakịrị n’ihi mmehie gị nile, site n’ịgọnarị ikpe ziri-ezi nke Chineke; kama kwee ka ikpe ziri-ezi nke Chineke, na ebere ya, na ogologo-ntachi-obi ya nwee ọchịchị n’uju n’ime obi gị; ma kwee ka o wedata gị n’uzuzu an’umeala.

31 Ma ugbua, O nwa m nwoke, akpọrọ gị site na Chineke ikwusa okwu ahụ nye ndị a. Ma ugbua, nwa m nwoke, gaara onwe gị, kwupụta okwu ahụ n’ezi-okwu na anya-udo, ka i wee nwe ike ịkpọta mkpụrụ-obi nile na nchegharị, ka nnukwu atụmatụ nke ebere wee nwee ihe njide aka n’arụ ha. Ma ka Chineke kwenyere gị ọbụna dịka okwu m nile siri dị. Amen.