Akwụkwọ nsọ
Alma 5


Okwu nile nke Alma, Onye Isi Nchụ-aja dịka usoro nsọ nke Chineke siri dị, zigara ndị ahụ n’obodo-ukwu ha nile na ọnụmara ha nile nʼakụkụ nile ala ahụ.

Mejupụtara isi 5.

Isi 5

Irite nzọpụta, ndị mmadụ ga-echegharịrị ma debe iwu-nsọ nile, bụrụ ndị a mụrụ ọzọ, sachaa uwe ha nile site n’ọbara nke Kraịst, dị umeala ma wezuga onwe ha site na mpako na ntaji anya, ma na-arụ ọrụ nile nke ezi-omume—Ezi onye-ọzụzụ atụrụ na-akpọ ndị ya—Ndị nke na-arụ ajọọ-ọrụ bụ ụmụ nke ekwensu—Alma wee gbaa ama maka ezi-okwu nke ozizi ya ma nye ndị mmadụ iwu ka ha chegharịa—Aha nile nke ndị ezi-omume ka a ga-ede n’akwụkwọ nke ndụ. Ihe dịka n’afọ 83 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua o wee ruo na Alma malitere ikwu okwu nke Chineke nye ndị ahụ, mbụ n’ala nke Zarahemla, ma site n’ebe ahụ gazuo ala ahụ nile.

2 Ma ndị a bụ okwu nile ndị ọ gwara ndị ahụ n’ime ụlọ nzukọ-nsọ nke e wuru n’obodo-ukwu nke Zarahemla, dịka akụkọ-ndekata nke ya siri dị, na-asị:

3 Mụ, Alma, ebe e doworo m nsọ site na nna m, Alma, ịbụ onye isi nchụ-aja na nzukọ-nsọ nke Chineke, ya ebe o nwere ike na ikike sitere na Chineke ime ihe ndị a, lee, asị m unu na ọ malitere ihiwe ụlọ nzukọ-nsọ n’ala ahụ nke dị n’oke-ala nile nke Nifaị; e, ala ahụ nke a kpọrọ ala nke Mọmọn; e, ma o mere ụmụnne ya baptism na mmiri nile nke Mọmọn.

4 Ma lee, asị m unu, a napụtara ha site n’aka nile nke ndị eze Noa, site n’ebere na ike nke Chineke.

5 Ma lee, mgbe nke a gasịrị, a kpọbatara ha n’ịbụ-oru site n’aka nile nke ndị Leman n’ime ọzara ahụ; e, asị m unu, ha nọ na ndọkpụ n’agha, ma ọzọ Onye-nwe napụtara ha site n’ịbụ-oru site n’ike nke okwu ya; ma a kpọtara anyị n’ime ala nke a, ma n’ebe a anyị malitere ihiwe nzukọ-nsọ nke Chineke nʼakụkụ nile ala nke a kwa.

6 Ma ugbua lee, asị m unu, ụmụnne m nwoke, unu ndị bụ nke nzukọ-nsọ a, unu edotawo na ncheta zuru oke ndọkpụ n’agha nke ndị nna unu? E, ma unu edotawo na ncheta zuru oke ebere ya na ogologo-ahụhụ n’ebe ha nọ? Ma nke ka nke, unu edotawo na ncheta zuru oke na ọ napụtawo mkpụrụ-obi ha nile site n’ala mụọ?

7 Lee, ọ gbanwere obi ha nile; e, ọ kpọtere ha site n’ụra miri emi, ma ha tetara nye Chineke. Lee, ha nọ n’etiti ọchịchịrị; otu o sila dị, mkpụrụ-obi ha nile ka a mụnyere ọkụ site n’ìhè nke okwu mgbe nile na-adigide; e, e jiri agbụ nile nke ọnwụ, na ụdọ igwe nile nke ala mụọ gbaa ha gburu-gburu, ma mbibi mgbe nile na-adigide dị na-eche ha.

8 Ma ugbua ana m aju unu, ụmụnne m nwoke, ebibiri ha? Lee, asị m unu, E-e, ebibighị ha.

9 Ma ọzọ ana m ajụ, etijiri agbụ nile nke ọnwụ, na ụdọ-igwe nile nke ala mụọ nke gbara ha gburu-gburu, a tọpụrụ ha? Asị m unu, E, a tọpụrụ ha, ma mkpụrụ-obi ha gbasara mbara, ma ha bụrụ abụ mgbapụta ịhụ-n’anya. Ma asị m unu na a zọpụtara ha.

10 Ma ugbua ana m ajụ unu n’ụdị ọnọdụ gịnị ka e jiri zọpụta ha? E, olee mgbakwasị-ụkwụ ha nwere inwe olile-anya maka nzọpụta? Gịnị bụ ihe kpatara ntọpụ ha site n’agbụ nile nke ọnwụ, e, na kwa ụdọ-igwe nile nke ala mụọ?

11 Lee, enwere m ike ịgwa unu—nna m Alma o kweghị n’okwu nile nke e kwuru site n’ọnụ Abịnadaị? Ma ọ bụghị onye-amụma dị nsọ? O kwughị okwu nile nke Chineke, ma nna m Alma kwere ha?

12 Ma dịka okwukwe ya e nwere nnukwu mgbanwe e mere n’obi ya. Lee asị m unu na nke a nile bụ ezi-okwu.

13 Ma lee, o kwusara okwu ahụ nye ndị nna unu, ma nnukwu mgbanwe ka e mekwara n’obi ha nile, ma ha wedatara onwe ha ala ma tinye ntụkwasị-obi ha na Chineke nke ezi-okwu ahụ dị ndụ. Ma lee ha nwere okwukwe ruo na ngwucha ahụ; ya mere a zopụtara ha.

14 Ma ugbua lee, ana m ajụ unu, ụmụnne m nke nzukọ-nsọ ahụ, unu abụrụwo ndị amụrụ n’ime mụọ nke Chineke? Unu anatawo onyinyo ya na mbara iru unu? Unu enwetawo nnukwu mgbanwe a n’obi unu nile?

15 Unu na-enwe okwukwe na mgbapụta nke ya onye kere unu? Unu na-enwe olile anya jiri anya nke okwukwe, ma hụ arụ na-anwụ anwụ ekulitere na anwụghị-anwụ, na ire-ure a ekulitere n’ereghị-ure, iguzọro n’iru Chineke ka ekpe ya ikpe dịka omume nile nke e meworo n’arụ na-anwụ anwụ siri dị?

16 Asị m unu, unu nwere ike ịtụgharị uche nye onwe unu na unu na-anụ olu nke Onye-nwe, na-asị unu, n’ụbọchị ahụ: Bịakwute m unu ndị a gọziri-agọzi, n’ihi na lee, ọrụ nile nke unu abụwo ọrụ nile nke ezi-omume nʼelu iru nke ụwa ahụ?

17 Ma-ọbụ unu na-atụgharị uche nye onwe unu na unu nwere ike ịgwa Onye-nwe okwu ụgha n’ụbọchị ahụ, ma sị—Onye-nwe ọrụ anyị nile abụwo rịị ọrụ ezi-omume n’elu iru nke ụwa ahụ—ma na ọ ga-azọpụta unu?

18 Ma-ọbụ n’ụzọ ọzọ, unu nwere ike ịtụgharị uche hụ onwe unu ka akpọpụtara n’ịrụ oche-ikpe nke Chineke jiri mkpụrụ-obi nile unu jupụtara na amamikpe na mwute, ebe unu nwere ncheta nke ọmụma-ikpe unu nile, e, ncheta zuru-oke nke ajọọ-omume unu e, ncheta na unu emeruwo iwu-nsọ nile nke Chineke?

19 Asị m unu, unu nwere ike ilekwasị Chineke anya n’ụbọchị ahụ jiri obi n’enweghị ntụpọ na aka dị ọcha? Asị m unu, unu nwere ike ileli anya elu, nwere onyinyo nke Chineke akanyere n’elu mbara iru unu?

20 Asị m unu, unu nwere ike iche maka ịbụ ndị a zọpụtara mgbe unu ranyeworo onwe unu ịghọ ndị nọ n’okpuru ekwensu?

21 Asị m unu, unu ga-amata n’ụbọchị ahụ na enweghị ike ịzọpụta unu; n’ihi na ọdịghị onye ọbụla a-ga-azọpụta ma ọbụghị na uwe ya nile ka a sachapụrụ ọcha; e, uwe ya nile ka a ga-edebe ọcha n’enweghị ntụpọ ruo mgbe a sachara ha site na ntụpọ nile, site n’ọbara nke onye ahụ nke nna anyị ha kwuworo maka ya, onye ga-abịa ịgbapụta ndị ya site na mmehie ha nile.

22 Ma ugbua a na m arịọ unu, ụmụnne m nwoke, olee otụ ọ ga-adị onye ọbụla n’ime unu, ma ọbụrụ na unu ga-eguzoro n’iru oche-ikpe nke Chineke, nwere uwe unu nile ọbara metọrọ na ụdị iru inyi nile? Lee, gịnị ka ihe ndị a ga-agba-ama megide unu?

23 Lee ha agaghị agba-ama na unu bụ ndị ogbu mmadụ, e, na kwa na unu bu ndị-ikpe mara n’ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche?

24 Lee, ụmụnne m nwoke, unu chere na ụdị onye ahụ nwere ike inweta ebe ọ ga-anọdụ ọdụ n’ala-eze nke Chineke, ya na Abraham, ya na Aịsak, na ya na Jekọb, na kwa ndị-amụma nile dị nsọ, ndị asachaworo uwe ha nile ma ha enweghị mmetọ, enweghị ntụpọ ma dị ọcha?

25 Asị m unu, E-e; ma ọbụghị na unu mere Onye-okike anyị onye-okwu ụgha site na mmalite, ma-ọbụ were dịka na ọ bụ onye okwu ụgha site na mmalite, unu enweghị ike iwere dịka na ụdị ahụ nwere ike inwe ọnọdụ n’ala-eze nke elu-igwe; mana a ga-achụpụ ha n’ihi na ha bụ ụmụ nke ala-eze nke ekwensu ahụ.

26 Ma ugbua lee, asị m unu, ụmụnne m nwoke, ọbụrụ na unu enwetawo mgbanwe nke obi, ma ọbụrụ na unu enwewo mmetụ ịbụ abụ mgbapụta ịhụ-n’anya, aga m ajụ, unu nwere ike inwe mmetụ dị otu ahụ ugbua?

27 Unu agawo ije, debe onwe unu n’enweghị ụta n’iru Chineke? Unu nwere ike ịkwu, ọbụrụ na akpọrọ unu ịnwụ n’oge a, n’ime onwe unu, na unu adịwo umeala zuru oke? Na uwe unu nile ka asachaworo ma mee ka ha dị ọcha site n’ọbara nke Kraịst, onye ga-abịa ịgbapụta ndị ya site na mmehie ha nile?

28 Lee, unu eyipụwo mpako? Asị m unu, ọbụrụ na unu eyipụbeghị unu adịghị na njikere izute Chineke. Lee unu ga-ejikere ọsọ-ọsọ; n’ihi na ala-eze nke elu-igwe na-abịa ọsọ-ọsọ, ma ụdị onye ahụ enweghị ndụ ebighi-ebi.

29 Lee, asị m, o nwere otu n’etiti unu onye n’eyipụbeghị ntaji anya? Asị m unu na ụdị onye ahụ anọghị na njikere; ma ọ dị m ka o jikere ọsọ-ọsọ, n’ihi na oge awa ahụ abịawo nso, ma ọ mataghị mgbe oge ahụ ga-abịa; n’ihi na ụdị onye ahụ agaghị achọta ya onye-ikpe na-amaghị.

30 Ma ọzọ asị m unu, o nwere otu n’etiti unu nke na akwa nwanne ya nwoke emu, ma-ọbụ nke na-akwakọtara ya nsogbu nile?

31 Ahụhụ na-adịrị ụdị onye ahụ, n’ihi na ọ nọghị na njikere, ma oge ahụ dị nso na ọ ga-echegharịrị ma-ọbụ a gaghị enwe ike ịzọpụta ya!

32 E, ọbụna ahụhụ na-adịrị unu nile na-eme ajọọ-omume; chegharịa, chegharịa, n’ihi na Onye-nwe Chineke ekwuwo ya!

33 Lee, ọ na-ezipụ ịkpọ oku nye mmadụ nile, n’ihi na aka ebere nile ka esetịpụrụ n’ebe ha nọ, ma ọ na-asị: chegharịa, ma aga m anabata unu.

34 E, ọ na-asị: Biakwute m ma unu ga-aracha site na mkpụrụ nke osisi nke ndụ; e, unu ga-eri ma n̄ụọ site n’achịcha na mmiri nile nke ndụ na akwụghị ụgwọ.

35 E, bịakwute m ma were ọrụ nile nke ezị-omume bịa, ma a gaghị egbutu unu ma tụba unu n’ime ọkụ—

36 N’ihi na lee, oge ahụ adịwo nso mgbe onye ọbụla nke na-amịpụtaghị mkpụrụ ọma, ma-ọbụ onye ọbụla nke na-anaghị arụ ọrụ nke ezi-omume, onye ahụ nwere ihe kpatara ọ ga-eji kwaa arịrị ma ruo uju.

37 O unu ndị na-arụ ọrụ ajọọ-omume; unu ndị na-afuli elu n’ime ihe efu nile nke ụwa, unu ndị kwupụtaworo na unu amatawo ụzọ nile nke ezi-omume otu o sila dị unu ejehiewo, dịka atụrụ na-enweghị onye-ọzụzụ atụrụ, akpọwo unu ma ka na-akpọ unu, mana unu agaghị an̄a ntị n’olu ya!

38 Lee, asị m unu, na onye-ọzụzụ atụrụ ọma ahụ na-akpọ unu; e, ma n’aha nke ya ọ na-akpọ unu, nke bụ aha nke Kraịst; ma ọbụrụ na unu agaghị an̄a ntị n’olu nke onye-ọzụzụ-atụrụ ọma ahụ, ruo n’aha ahụ nke a kpọrọ unu, lee, unu abụghị atụrụ nke onye-ọzụzụ atụrụ ọma ahụ.

39 Ma ugbua ọbụrụ na unu abụghị atụrụ nke onye-ọzụzụ-atụrụ-ọma ahụ, ọbụ igwe nke onye ka unu bụ? Lee, asị m unu, na ekwensu ahụ bụ onye-ọzụzụ atụrụ unu, ma unu bụ nke otu ya; ma ugbua, onye ga-agọnarị nke a? Lee, asị m unu, onye ọbụla nke na-agọnarị nke a bụ onye okwu-ụgha na nwa nke ekwensu.

40 N’ihi na asị m unu na ihe ọbụla dị mma sitere na Chineke bịa, ma ihe ọbụla dị njọ sitere na ekwensu bịa.

41 Ya mere, ọbụrụ na nwoke na-amipụta ọrụ ọma nile ọ na-an̄a ntị n’olu nke onye-ọzụzụ atụrụ ọma ahụ, ma ọ na-eso ya; mana onye ọbụla nke na-amipụta ajọọ ọrụ nile, onye ahụ na-aghọ nwa nke ekwensu, n’ihi na ọ na-an̄a ntị n’ọlụ ya, ma na-eso ya.

42 Ma onye ọbụla nke na-eme nke a ga-anatarịrị ụgwọ-ọrụ nile n’aka ya; ya mere, maka ụgwọ-ọrụ ya nile ọ na-anata ọnwụ, dịka n’ihe nile gbasara ebe ezi-omume dị, ebe ha nwụrụ anwụ n’ebe ọrụ ọma nile dị.

43 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, ọ dị m ka asị na unu ga-anụ olu m, n’ihi na a na m ekwu n’ume nke mkpụrụ-obi m; n’ihi na lee, a gwawo m unu okwu dị mfe nghọta nke ga-eme ka unu ghara imehie, ma-ọbụ ekwuwo m dịka iwu-nsọ nile nke Chineke siri dị.

44 N’ihi na a kpọrọ m ka m kwuo n’ụdị a, dịka usoro nsọ nke Chineke siri dị, nke dị n’ime Kraịst Jisus; e, enyere m iwu ka m guzoro ma gbaa ama nye ndị a ihe nile ndị e kwuworo site na ndị nna anyị gbasara ihe nile ndị ga-abịa.

45 Ma nke a abụghị ihe nile. Unu echeghị na m matara maka ihe ndị a na onwe m? Lee, a na m agbara unu ama na ama m na ihe ndị a m gwaworo unu maka ha bụ ezi-okwu. Ma olee otu unu siri chee na m matara maka ha ịbụ ihe ga-eme eme?

46 Lee, asị m unu e mere ka m mata ha site na Mụọ Nsọ nke Chineke. Lee, ebuwo m ọnụ ma kpee ekpere ọtụtụ ụbọchị ka m wee mata ihe ndị a n’onwe m. Ma ugbua a matara m n’onwe m na ha bụ ezi-okwu; n’ihi na Onye-nwe Chineke egosịpụtawo m ha site na Mụọ Nsọ Ya; ma nke a bụ mụọ nke mkpughe nke dị n’ime m.

47 Ma nke ka nke, asị m unu na ekpughewo ya otu a nye m, na okwu nile ndị nna anyị ha kwuworo bụ ezi-okwu, ọbụna otu a dịka mụọ nke ibu-amụma nke dị n’ime m siri dị, nke bụ kwa site na ngosipụta nke Mụọ nke Chineke.

48 Asị m unu, na ama m n’onwe m na ihe ọbụla m ga-agwa unu, gbasara ihe nke ga-abịa abịa, bụ ezi-okwu; ma asị m unu, na a ma m na Jisus Kraịst ga-abịa, e, ọkpara ahụ, Onye Nna mụtara nanị Ya, jupụtara na amara, na ebere, na ezi-okwu. Ma lee, ọbụ ya na-abịa ibupụ mmehie nile nke ụwa, e, mmehie nile nke onye ọbụla nke guzosịrị-ike nʼikwere n’aha ya.

49 Ma ugbua asị m unu, na nke a bụ usoro nke e siri kpọọ m, e, ikwusara ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, e, na onye ọbụla nke bi n’ala ahụ; e, ikwusara ndị nile, ma ndị okenye ma ụmụaka ma ndị oru ma ndị nwe onwe ha; e, asị m unu ndị kara nka, na kwa ndị okorọbịa, na ọgbọ ndị n’ebilite ebilite; e, ibeku ha na ha ga-echegharịrị ma bụrụ ndị a mụrụ ọzọ.

50 E, otu a ka Mụọ ahụ kwuru: Chegharịa, unu nsọtụ nile nke ụwa, n’ihi na ala-eze nke elu-igwe na-abịa nso ọsọ-ọsọ; e, nwa nke Chineke na-abịa n’ebube ya, n’ike ya, ụdị eze, ike, na ọchịchị. E, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, asị m unu, na Mụọ ahụ sịrị: Lee ebube nke Eze nke ụwa nile, na kwa Eze nke elu-igwe ga-amụwapụta na nso-nso n’etiti ụmụ nke mmadụ.

51 Ma kwa Mụọ ahụ sịrị m, e, ọ kpọkuru m n’olu ike, na-asị: Gaa n’ịrụ ma sị ndị a—chegharịa, n’ihi ma ọbụghị ma unu chegharịrị unu enweghị ike iketa ala-eze nke elu-igwe.

52 Ma ọzọ asị m unu, Mụọ ahụ sịrị: Lee, edebere onye-ike na mgbọrọgwụ osisi ahụ, ya mere osisi ọbụla nke na-amịtaghị mkpụrụ-ọma a ga egbutu ya ma tụba ya n’ime ọkụ, e, ọkụ nke n’enweghị ike irecha erecha, ọbụna ọkụ na-agaghị enwe ike imenyụ emenyụ. Lee, ma cheta, Onye-Nsọ ahụ ekwuwo ya.

53 Ma ugbua ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, asị m unu, unu ga-enwe ike nagide okwu ndị a; e, unu nwere ike debe n’akụkụ ihe ndị a, ma zọgide Onye-Nsọ ahụ n’okpuru ụkwụ unu; e, unu nwere ike ibuli onwe unu elu na mpako nke obi unu nile, e, unu ga-anọsirịrị ike n’iyi uwe oke ọnụ ahịa na itinye obi unu nile n’ihe efu nile nke ụwa, na akụ n’ụba unu nile?

54 E, unu ga-anọgide n’iche na unu ka mma otu karịa ibe ya; e, unu ga-anọgide n’isogbu ụmụnne unu nwoke, ndị wedatara onwe ha ala ma na-aga ije n’usoro nsọ nke Chineke, site na nke akpọbataworo ha n’ime nzukọ-nsọ a, ebe e doworo ha nsọ site na Mụọ Nsọ ahụ, ma ha na-ewepụta ọrụ nile ndị na-egosị nchegharị—

55 E, ma unu ga-anọgịde n’ịtụgharị azụ unu nile nye ndị ogbenye, na ndị nọ na mkpa, na nʼijịchi ihe unu nwere site n’irute ha?

56 Ma n’ikpeazụ, unu nile ndị ga-anọgide n’ime ajọọ-omume unu, asị m unu na ndị a bụ ndị a ga-egbutu ma tụba n’ime ọkụ ma ọbụghị ma ha mere ọsọ-ọsọ chegharịa.

57 Ma ugbua asị m unu, unu nile ndị chọsịrị ike isoro olu nke onye-ọzụzụ-atụrụ-ọma ahụ, pụta nụ site n’etiti ndị ajọọ mmadụ, ma nọdụ nụ iche, ma ebịtụla ihe ha nile na-adịghị ọcha aka; ma lee, aha ha nile ka a ga-ehichapụ nke ga-eme na agaghị agụnye ndị ajọọ-mmadụ n’aha nke ndị ezi-omume, ka e wee mezuo okwu nke Chineke, nke sịrị: Aha nile nke ndị ajọọ-omume agaghị agwakọta ha na aha nile nke ndị m;

58 N’ihi na aha nile nke ndị ezi-omume a ga-ede ha n’ime akwụkwọ nke ndụ, ma-ọbụ ha ka m ga-enye nketa n’aka nri m. Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, gịnị ka unu nwere ikwu megide nke a? Asị m unu, ọbụrụ na unu kwuo okwu megide ya, ọdịghị ihe ọ mere, n’ihi na okwu nke Chineke a ga-emezurịrị ya.

59 N’ihi na o lee onye-ọzụzụ atụrụ nọ n’etiti unu nwere ọtụtụ atụrụ na-adịghị eche ha nche, ka nkịta-ọhịa ghara ibanye ma richapụ igwe atụrụ ya? Ma lee, ọbụrụ na nkịta-ọhịa banye n’igwe atụrụ ya ọdịghị achụpụ ha? E, ma n’ikpe-azụ, ọbụrụ na o nwere ike, ọ ga-ebibi ya.

60 Ma ugbua asị m unu na onye-ọzụzụ atụrụ ọma ahụ na-akpọ unu; ma ọbụrụ na unu ga-an̄a ntị n’olu ya ọ ga-akpọbata unu n’igwe ya, ma unu bụ atụrụ ya; ma ọ na-enye unu iwu ka unu ghara ikwe nkịta-ọhịa ndogbu ịbata n’etiti unu, ka a ghara ibibi unu.

61 Ma ugbua mụ, Alma, na-enye unu iwu n’asụsụ nke onye ahụ nyeworo m iwu, ka unu jisie ike na-eme okwu nile nke m gwaworo unu.

62 Ana m ekwu okwu n’ụdị iwu nye unu ndị bụ nke nzukọ-nsọ ahụ; ma nye ndị na-abụghị nke nzukọ-nsọ ahụ a na m ekwu n’ụdị ịkpọ oku, na-asị: Bịa ma ka e mee unu baptism ruo na nchegharị, ka unu kwa wee bụrụ ndị ga-eso keta oke nʼịracha mkpụrụ osisi nke ndụ ahụ.