Akwụkwọ nsọ
Jakọb 6


Isi 6

Onye-nwe ga-enweta kwa Israel ọzọ n’ụbọchị ikpe-azụ ndị a—A ga-erepịa ụwa site n’ọkụ—Ndị mmadụ ga esorịrị Kraịst ịgbanarị ọdọ ọkụ na nkume ọkụ ahụ. Ihe dịka n’afọ 544 ruo 421 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua, lee, ụmụnne m nwoke, dịka m gwara unu na a ga m ebu-amụma, lee, nke a bụ amụma m—na ihe nile nke onye-amụma nke a bụ aZinọs kwuru, gbasara ụlọ nke Israel, nke n’ime ya ọ tụnyeere ha osisi olive a zụrụ azụ, ga-emezurịrị n’ezi okwu.

2 Ma ụbọchị ọ ga-edozi aka ya ọzọ nke ugboro abụọ aịnweta ndị ya ọzọ, bụ ụbọchị ahụ, e, ọbụna oge ikpe-azụ, nke bụmụ-oru nile nke Onye-nwe ga-aga n’iru cn’ike ya, dịzụ na ịbecha eubi-vine ya; ma nke ahụ gasịa, fọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa na nso nso.

3 Ma lee ka ngọzi na-adịrị ha bụ ndị rụsịworo ọrụ ike n’ubi-vine Ya; ma ọbụbụ-ọnụ dịịrị ha ndị bụ ndị a ga-achụpụ baa n’ọnọdụ nke onwe ha! Ma ụwa ka a aga-erepịa site n’ọkụ.

4 Ma lee otu obi ebere Onye-nwe ha n’ebe anyị nọ, n’ihi na ọ na-echeta ụlọ nke aIsrael, ma mgbọrọgwụ na ngalaba nile; na ọ na-esetịpụ baka ya abụọ nye ha ogologo ụbọchị nile; na ha bụ cndị ịkpọ-ekwe-nkụ na ndị na-agọ agọ; mana ka na ra bụ ndị na-agaghị imesi obi ha ike ka a ga-zọpụta n’ala-eze nke Chineke.

5 Ya mere, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, a na m arịọ unu n’okwu nke anya udo ka unu chegharịa, ma jiri nzube juru-eju nke obi, ma arapara n’arụ Chineke dịka o siri rapara n’arụ unu. Na n’oge baka ebere ya na-esetịpụ n’ebe unu nọ n’ìhè nke ụbọchị, ghara nụ imesị obi unu ike.

6 E, taa, ọbụrụ na unu ga-anụ olu ya, ghara imesị obi unu ike; n’ihi na maka gịnị ka unu ga aeji-anwụ?

7 N’ihi na lee, mgbe a zụsịworo unu site n’okwu ọma nke Chineke ogologo ụbọchị nile, unu ga-ewepụta mkpụrụ ọjọọ, nke bụ na a aga-egbuturịrị unu ma tụba unu n’ime ọkụ?

8 Lee, unu ga-ajụ okwu nile ndị a? Unu ga-ajụ okwu nile nke ndị-amụma; ma unu ga-ajụ okwu nile nke e kwuworo gbasara Kraịst, mgbe ọtụtụ kwuworo gbasara Ya; ma gọnarị okwu ọma nke Kraịst, na ike nke Chineke, na aonyinye nke Mụọ Nso, ma menyụọ Mụọ Nsọ, ma mee ihe ịkwa-emu nnukwu atụmatụ nke mgbapụta, nke edoziworo nye unu?

9 Unu amataghị na ọbụrụ na unu ga-eme ihe ndị a, na ike nke mgbapụta na mbilite n’ọnwụ ahụ, nke dị n’ime Kraịst, ga-eweta unu ka unu guzoro n’ihere na aọmụma-ikpe di egwu n’iru boche-ikpe nke Chineke?

10 Ma dịka ike nke aikpe-zịrị-ezi, n’ihi na a gaghị agọnarị ikpe-zịrị-ezi, unu ga-apụrịrị gaa n’ime bọdọ ọkụ na nkume ọkụ ahụ, nke ire ọkụ ya na-adịghị ekwe mmenyụ, na nke anwụrụ ọkụ ya na-arịgo elu ruo mgbe nile, nke ọdọ ọkụ na nkume ọkụ ya bụ cahụhụ dagwụgh-agwụ.

11 O mgbe ahụ, ụmunne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, chegharịa nụ, ma banye site an’ọnụ-ụzọ ama dị kwa wara-wara, ma gaa n’iru n’ụzọ nke dị mkpafa, wee ruo mgbe unu ga-enweta ndụ ebighi-ebi.

12 O nwee aamamihe; gịnị ka m nwere ike ikwu ọzọ?

13 Na ngwụcha, ana m asị unu nọdụ mma, wee ruo mgbe m ga-ezute unu n’iru oche-ikpe mmasị nke Chineke, bụ oche-ikpe nke ana-eji oke-egwu na ụjọ na-eti ndị ajọọ-omume ihe. Amen.