Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 136


Nkeji 136

Okwu ahụ na uche obi nke Onye-nwe e nyere site n’aka Onye-isi nduzi Brigham Young, na Winter Quarters, ebe izu-ike nke Israel, mba Ọmaha, n’akụkụ ọdịda anyanwụ Osimiri Missouri nke dị nso Council Bluffs, Iowa (Journal History of the Church [Akụkọ Ndepụta Akwụkwọ Ọgụgụ nke Nzukọ-nsọ], 14 Jenuarị 1847).

1–16, Otu esi ehiwe ebe izu-ike nke Israel n’ihi njem mpaghara ọdịda anyanwụ ka a kọwara; 17–27, Ndị-nsọ nile ka-enyere iwu nsọ ka ha bie ndụ n’ogo nile nke ozi-ọma; 28–33, Ndị-nsọ nile kwesịrị ịgụ abụ, gbaa egwu, kpee ekpere, na mụta amamihe; 34–42, Ndị amụma nile ka a na-egbu ka e wee nye ha ùgwù, na ndị ajọọ mmadụ ka a mara ikpe.

1 Okwu ahụ na Uche obi nke Onye-nwe, gbasara Ebe izu-ike nke Israel n’ịzọ njem ha nile ruo mpaghara Ọdịda anyanwụ.

2 Ka ndị mmadụ nile nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-ikpeazụ a, na ndị so ha n’ịzọ njem, bụrụ ndị a haziri n’ọgbakọ nile, jiri ọgbụgba-ndụ na-ikwe nkwa idobe iwu nsọ nile na iwu nile e dere-ede nke Onye-nwe Chineke anyị.

3 Ka ọgbakọ ndị a nile bụrụ ndị a haziri n’okpuru ndị ọchị-agha nke narị nile, ndị ọchị-agha nke iri ise nile, na ndị ọchị-agha nke iri nile, ebe onye-isi nduzi na ndị ndụmọdụ ya abụọ ga-anọ n’isi ha, n’okpuru nduzi nke Ndị-ozi Iri na Abụọ ahụ.

4 Na nke a ga-abụ ọgbụgba-ndụ anyị—na anyị ga-eje ije n’ime emume-nsọ nile nke Onye-nwe.

5 Ka ọgbakọ ọbụla nwetara onwe ha ìgwè inyinya nile, ụgbọ ala nile, ihe nnweta nile, ihe mkpuchi arụ, na ihe ndị ọzọ nile dị mkpa otu ha nwere ike n’ihi ya bụ njem.

6 Mgbe a hazichara ọgbakọ nile, ka ha gaa site na-ndọgbu n’ọrụ ha ị kwado n’ihi ndị ahụ bụ ndị ga-anọgide.

7 Ka ọgbakọ ọbụla, tinyere ndị ọchị-agha ha nile na ndị-isi nduzi ha nile kpebie mmadụ ole ga-aga na mmalite udummiri na-abia, mgbe ahụ họpụta iche ọnụ-ọgụgụ zuru oke ndị nwoke tozuru etozu na ndị nka ọrụ na-eme ihe dị iche iche ebe ọ ga-ezu, ka ha chịrị ịnyịnya, mkpụrụ akụkụ ubi nile na ngwa ọrụ ubi, wee gawa dịka ndị bu ụzọ ị kwado maka itinye ihe akụkụ ubi nile nke mmalite udu mmiri.

8 Ka ọgbakọ ọbụla buru arịa ha e kere eke otu ha ga-enwe ike na-akpọrọ ndị ogbenye, ndị nwanyị nile di ha nwụrụ anwụ, ndị na-enweghi nna, na ezi na ụlọ nile nke ndị ahụ gara agha, ka akwa nile nke nwanyị di ya nwụrụ na ndị na-enweghi nna ghara irute na ntị nke Onye-nwe imegide ndị nke ya.

9 Ka ọgbakọ ọbụla kwado ụlọ nile, na ala ubi nile, iji rụpụta mkpụrụ ihe ubi n’ihi ndị ahụ ga-afọ n’azụ n’oge nke a; na nke a bụ uche obi nke Onye-nwe gbasara ndị ya.

10 Ka onye ọbụla were ike nile nke na-esi n’ime ya arụ ọrụ na arịa ya iji kpọpụ ndị a kpọga ha n’ebe ahụ ebe Onye-nwe ga-edowe stek nke Zaịọn.

11 Na ọbụrụ na unu emee nke a, jiri obi dị ọcha, n’ime ikwesị ntụkwasị obi nile, a ga-agọzi unu; unu ga-abụ ndị agọziri n’igwè ehi unu nile, n’igwè anụ ụlọ unu nile na ala ubi unu nile, na n’ime ụlọ unu nile, na ezi n’ụlọ unu nile.

12 Ka ndị odibo m Ezra T. Benson na Erastus Snow hazie otu ọgbakọ.

13 Na ka ndị odibo m Orson Pratt na Wilford Woodruff hazie otu ọgbakọ.

14 Otu aka ahụ, ka ndị odibo m Amasa Lyman na George A. Smith hazie otu ọgbakọ.

15 Na rọpụta ndị-isi nduzi nile na ndị ọchị-agha nile nke narị nile na nke iri ise nile na nke iri nile.

16 Na ka ndị odibo m nile ndị a rọpụtaworo gaa na kuzie nke a bụ uche obi m nye ndị-nsọ nile ka ha wee dị na njikere ịga n’ala nke udo.

17 Gaa nke gị na mee dịka m gwaworo gị, na atụla egwu ndị-iro gị nile, n’ihi na ha agaghị enwe ike ịkwụsị ọrụ m.

18 Zaịọn ga-enweta mgbapụta n’oge nke m akara aka.

19 Na ọbụrụ na onye ọbụla ga-achọ iwuli onwe ya elu, na ọ chọghị ndụmọdụ m, onye ahụ a gaghị enwe ike, na a ga-eme ka nzuzu ya pụta ìhè.

20 Chọọ nụ na dobe ihe aka-ebe nile unu, onye na ibe ya, na e nwela anya ukwu banyere nke ahụ bụ nke nwanna gị.

21 Wezuga onwe unu nile site na ihe ọjọọ nke iwere aha nke Onye-nwe n’ihe efu, n’ihi abụ m Onye-nwe Chineke unu, ọbụna Chineke nke nna unu ha, Chineke nke Abraham na Aịsak na nke Jekọb.

22 Abụ m onye ahụ dupụtara ụmụ Israel site n’ala Ijipt, na ogwe-aka m ka m setipuworo n’ụbọchị ikpeazụ nile ịzọpụta ndị m Israel.

23 Kwụsị ịdọ ndọrọ ndọrọ, onye n’ibe ya, kwụsị ikwu ihe ọjọọ onye gbasara ibe ya.

24 Kwụsị ịn̄ụbiga mmanya oke, na ka okwu unu na-ebuli mụọ onye na ibe ya-elu.

25 Ọbụrụ na ị gbaziiri ihe n’aka onye agbata obi gị, ị ga-akwụghachi ihe ahụ nke ị gbaziiri, ma ọbụrụ na i nweghị ike ịkwụ, gaa ozugbo na gwa onye agbata obi gị, ka ọ ghara ịma gị ikpe.

26 Ọbụrụ na-ịga achọta nke ahụ funarịrị onye agbata obi gị, ị ga-eme mgbalị ịchọ ya ruo mgbe i ga-enye ya ihe ahụ ọzọ.

27 Ị ga-eme mgbalị ichekwa ihe i nwere, ka ị wee bụrụ onye ọrụ nwere amamihe, n’ihi na ọ bụ onyinye nke Onye-nwe Chineke gị nyere gị n’efu, na gị onwe gị bụ onye ọrụ ya.

28 Ọbụrụ na ị na-an̄ụrị ọn̄ụ, jiri ịbụ abụ jaa Onye-nwe mma, jiri egwu, jiri ite egwu, na jiri ekpere nke ịja mma na inye-ekele.

29 Ọbụrụ na ị nọ na iru uju, kpọkue Onye-nwe Chineke gị n’ekpere, ka mkpụrụ obi unu nile wee n̄ụrịa.

30 Atụla egwu ndị iro gị nile, n’ihi na ha nọ n’ime aka m nile na aga m eji ha mee ihe na-atọ m ụtọ.

31 A ga-anwale ndị nke m n’ihe nile, ka ha wee kwado ịnara ebube nke m debere ha, ọbụladị ebube nke Zaịọn; na onye ahụ nke na-agaghị anagide ita ahụhụ e tozughi oke nye ala-eze nke m.

32 Ka onye ahụ nke na-amaghị ihe mụta amamihe site n’iweda onwe ya ala na kpọkuo Onye-nwe Chineke ya, ka e wee meghee anya ya nile ka ọ hụ ụzọ, na meghee ntị ya nile ka o wee nụ.

33 N’ihi na Muọ m ka e zipụworo n’ime ụwa inye ndị dị umeala na ndị na-echegharị ìhè, na nye ndị na-amaghị Chineke ikpe-ọmụma.

34 Ụmụnna unu ajụwo unu na ịgba-ama unu, ọbụladị mba ahụ nke chụpụworo unu.

35 Na ugbu a ka ụbọchị nhuju anya ha na-abịa, ọbụna ụbọchị nile nke mwute, dịka nwanyị ime na-eme nọ n’ihe mgbu dị ike, na mwute ha ga-adị ukwuu ma-ọbụghị ma ha mere ọsọ-ọsọ chegharịa, e, oke ọsọ-ọsọ.

36 N’ihi na ha gburu ndị amụma nile, na ndị ahụ nke e ziteworo nye ha, na ha akwafuwo ọbara ndị ikpe n’amaghị nke na-ebe akwa site n’ime ala megide ha.

37 Ya mere, ka ihe ndị a nile ghara iju unu anya, n’ihi na unu adịbeghị ọcha, unu enweghi ike ịnagide ebube m, mana unu ga-ahụ ya na ọbụrụ na unu ekwesị ntụkwasị obi na-idobe okwu m nile nke m nyeworo unu, site na ụbọchị nile nke Adam ruo Abraham, site Abraham ruo Moses, site Moses ruo Jisus na ndị-ozi ya nile, na site Jisus na ndị-ozi ya nile ruo Joseph Smith, onye nke m kpoworo site na ndị mụọ-ozi m nile, ndị odibo na-ezisa ozi m nile, na site n’olu okwu m si n’ime elu-igwe nile iweta ọrụ m;

38 Nke ntọ-ala ya nke ya onwe ya tọrọ, na o kwesiwo ntụkwasị-obi; na akpọrọwo m ya nye onwe m.

39 Ọtụtụ ka o juworo anya n’ihi ọnwụ ya, mana ọ dị mkpa bụ ya iji ọbara ya rachie ịgba-ama ya, ka e wee sọpụrụ ya, na ka e wee maa ndị na-eme ihe ọjọọ ikpe.

40 Ọbụ na m anapụtaghị unu site n’aka ndị-iro unu nile, nanị na nke ahụ, ahapuwo m rịị aka-ebe nke aha m?

41 Ugbu a, ya mere, n̄aa nụ ntị O unu ndị nke nzukọ-nsọ m, na unu ndị okenye nile gekọọ nụ ntị, unu enwetawo ala-eze m.

42 Nwee nụ mgbalị na-idobe iwu nsọ m nile, ka ikpe nile ghara ịdakwasị unu, na okwukwe unu a kwatue unu, na ndị-iro unu nile emerie unu. Ya mere, a gaghị m enye unu ọzọ n’oge nke a. Amen na Amen.