Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 11


Nkeji 11

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye nwanne ya nwoke Hyrum Smith, na Harmony, Pennsylvania, Mee 1829 (History of the Church, 1:39–46). A natara mkpughe nke a site na Urim na Tumim n’ọzịza nye arịrịọ na ajụjụ nke Joseph. History of the Church na-atụ ero na e nwetara mkpughe a mgbe mwetaghachi nke Ọkwa Nchụ-aja Erọn gasịrị.

1–6, Ndị-ọrụ n’ubi-vine ga-enweta nzọpụta; 7–14, Chọọ amamihe; tie mkpu nchegharị, tụkwasị obi n’ime Mụọ; 15–22, Debe iwu-nsọ nile, ma mụọ okwu nke Onye-nwe; 23–27, Agọnarịkwala mụọ nke mkpughe na nke ibu-amụma; 28–30, Ndị nabatara Kraịst ga-abụ ụmụ nke Chineke.

1 aOke ọrụ dị ịtụ n’anya na-abịa ị pụta n’etiti ụmụ nke mmadụ.

2 Lee, a bụ m Chineke; agee ntị bn’okwu m, nke dị ndụ ma dịkwa cike, dịkwa dnkọ karịa nma-agha ọbụla nke nwere iru abụọ, rue na n’nkewa nke ma njikọ nile na ụmị; ya mere gee nti n’okwu m.

3 Lee, ubi ahụ achara-acha na-eche owuwe ihe-ubi; ya mere, onye ọbụla chọrọ ịghọ ka ọ tụba nma iwe ihe-ubi ya n’ike ya ma ghọọ mgbe oge dị, ka o wee bkpakọtara mkpụrụ-ọbị ya cnzọpụta nke mgbe nile na-adigide n’ime ala-eze nke Chineke.

4 E, onye ọbụla nke ga-atụba anma iwe ihe-ubi ya ma ghọọ, onye ahụ bụ onye Chineke kpọrọ.

5 Ya mere, ọ bụrụ na ị aga-arịọ m; ị ga-anata; ọbụrụ na ị ga-akụ-aka a ga-emeghere gị.

6 Ugbụ a, dịka ị jụrụ, lee, a sị m gị, debe iwu-nsọ m nile, ma chọọ iwepụta ma hiwe ụzọ nke aZaịọn.

7 A chọla aakụ na ụba kama chọọ bamamihe; ma, lee, ihe-omimi nile nke Chineke ka a ga-egosi gị, ma mgbe ahụ ka a ga-eme ka ị bụrụ ọgaranya. Lee, onye ahụ nke nwere ndụ ebighi-ebi bụ ọgaranya.

8 N’ezie, n’ezie, a sị m gị, ọbụna dịka ị chọrọ n’aka m otu a ka a ga emere gị; ma, ọbụrụ na ị chọọ, ị ga-abụ ụzọ nke ime nnukwu ihe ọma n’ọgbọ nke a.

9 aEkwula ihe ọbụla kama bnchegharị nye ọgbọ nke a. Debe iwu-nsọ m nile, ma nye aka iwepụta ọrụ nke m, cdịka iwu-nsọ m nile siri dị, ma ị ga-abụ onye a gọzịrị-agọzị.

10 Lee, ị nwere aonyinye, ma-ọbụ ị ga-enwe onyinye ma ị rịọ m n’okwukwe, bn’obi ezi-okwu, na-ekwere n’ike nke Jisus Kraịst, ma-ọbụ n’ike m nke na-ekwuru gị okwu;

11 N’ihi, lee, ọ bụ m na-ekwu; lee a bụ m aìhè nke na-enwu n’ọchịchịrị, ma site bn’ike m enye m gị okwu ndị a.

12 Ma ugbụ a, n’ezie, n’ezie, a sị m gị, tinye antụkwasị-obi gị na bMụọ ahụ nke na-edụba n’ime ihe ọma—e, ime ihe ziri-ezi, cije-ije dn’umeala, eikpe-ikpe n’ezi-omume; ma nke a bụ Mụọ m.

13 N’ezie, n’ezie, a sị m gị, a ga m ekenye gị Mụọ m, nke aga-agba ama nye bechiche gị, nke ga-emeju mkpụrụ-obi gị cn’ọn̄ụ;

14 Ma mgbe ahụ ka ị ga-amata, ma-ọbụ site na nke a ka ị ga-amata, ihe nile ọbụla bụ nke ị chọrọ n’aka m, n’ihe nile gbasara ihe nile nke aezi-omume, n’okwukwe na-ekwere na m na ị ga-anata.

15 Lee, e nye m gị iwu na ị kwesighi iche na a kpọrọ gị ka ị kwusaa ozi-ọma rue mgbe a akpọrọ gị.

16 Chere nwa oge nta, rue mgbe ị ga-enweta okwu m, ankume m, nzukọ-nsọ m, na ozi-ọma m, ka i nwerike ịmata aghaghị-imezu nke ozizi m.

17 Ma mgbe ahụ, lee, dịka ọchịchọ gị nile siri dị, e, ọbụna dịka ọkwukwe gị siri dị ka a ga emere gị.

18 Debe iwu-nsọ m nile; daa jụụ; rịọ Mụọ nke m;

19 E, arapara n’arụ m jiri obi gị nile, ka ị wee nye-aka n’iwepụta ìhè ihe ndị ahụ nile ekwuworo—e, ntụgharị-asụsụ nke ọrụ m; nwee ndidi rue mgbe ị ga-arụcha ya.

20 Lee, nke a bụ ọrụ gị, aidebe iwu-nsọ m nile, e, n’ike gị nile, uche na ume.

21 A chọla ka ị kwupụta okwu m kama na mbụ chọọ ka i anweta okwu m, ma mgbe ahụ a ga-atọghepụ ire gị; mgbe ahụ, ọbụrụ na ị chọọ, ị ga-enwe Mụọ m na okwu m, e, ike nke Chineke ruo n’ime ka ndị mmadụ kwere.

22 Ma ugbụ a daa jụụ; mụọ aokwu m nke gapụworo n’iru n’etiti ụmụ nke mmadụ, nakwa bmụọ cokwu m nke ga-apụta n’etiti ụmụ mmadụ, ma-ọbụ nke ahụ ana-atụgharị-asụsụ ya ugbụ a, e, rue mgbe ị ga-enwetacha ihe nile nke m dga-enye ụmụ mmadụ nke ọgbọ a, ma mgbe ahụ a ga-atụkwasị kwa ihe nile na ya.

23 Lee ị bụ aHyrum, nwa m nwoke; bchọọ ala-eze nke Chineke, ma ihe nile ka a ga-atụkwasị dịka ihe ahụ ziri-ezi siri dị.

24 Wuo n’elu aoke nkume m, nke bụ bozi-ọma m.

25 Agọnarịla mụọ nke amkpughe, ma-ọbụ mụọ nke bibu-amụma, n’ihi ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ga-agọnarị ihe ndịa nile;

26 Ya mere, achekwaa n’ime obi gị rue mgbe oge nke nọ na amamihe m na ị ga-agapụ.

27 Lee, a na m ekwuru ndị nile nwere ọchịchọ ọma nile, ma ana-atụbawo kwa nma iwe ihe-ụbị ha ka ha ghọọ.

28 Lee, a bụ m aJisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke. A bụ m ndụ na bìhè nke ụwa nile.

29 A bụ m otu onye ahụ bịakwụtere ndị nke m, ma ha anabataghị m;

30 Kama n’ezie, n’ezie, a sị m unu, ma ka ha ra bụ ndị nabataworo m, ha ka m ga-enye aike ịghọ bụmụ nwoke nke Chineke, ọbụna ndị ahụ nke kwenyere n’aha m. Amen.