Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 12


Nkeji 12

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Joseph Knight, Ukwụ, na Harmony, Pennsylvania, Mee 1829 (History of the Church, 1:47–48). Joseph Knight kwenyere na nkwupụta nile nke Joseph Smith gbasara njide nke epekele nile nke Akwụkwọ nke Mọmọn na ọrụ nke ntụgharị-asụsụ nke na-aga n’iru mgbe ahụ ma ọtụtụ oge nye wo kwara inye-aka nke ihe onwunwe nye Joseph Smith, na onye ode-akwụkwọ ya, nke nyere aka ha ịga n’iru n’ọrụ ntụgharị-asụsụ. N’arịrịọ nke Joseph Knight, Onye-amụma chọrọ iru Onye-nwe ma nweta mkpụghe a.

1–6, Ndị ọrụ n’ụbị vine ga-enweta nzọpụta; 7–9, Ndị nile chọrọ ma tozụokwa oke nwere ike inye-aka n’ọrụ nke Onye-nwe.

1 aOke ọrụ dị ịtụ n’anya na-abịa ị pụta n’etiti ụmụ nke mmadụ.

2 Lee, a bụ m Chineke; gee ntị n’ọkwu m, nke dị ndụ ma dịkwa ike, dị kwa nkọ karịa nma-agha ọbụla nke nwere iru abụọ, rue na nkewa nke ma njikọ nile na ụmị; ya mere gee ntị n’okwu m.

3 Lee, ụbị ahụ chara-acha na-eche owuwe ihe-ụbị; ya mere, onye chọrọ ịghọ ka ọ tụba nma iwe ihe-ubi ya n’ike ya ma ghọọ mgbe oge dị, ka ọ wee kwadoro mkpụrụ-ọbị ya nzọpụta nke mgbe nile na-adigide n’ime ala-eze nke Chineke.

4 E, onye ọbụla nke ga-atụba nma iwe ihe-ubi ya ma ghọọ, onye ahụ bụ onye Chineke kpọrọ.

5 Ya mere, ọbụrụ na ị ga-arịọ m; ị ga-anata; ọbụrụ na ị ga-akụ-aka a ga-emeghere gị.

6 Ugbụ a, dịka ị jụrụ, lee a sị m gị debe iwu-nsọ m nile, ma chọọ iwepụta ma hiwe ụzọ nke Zaịọn.

7 Lee, ana m ekwuru gị, nakwa nye ndị nile nwere ọchịchọ nile ịwepụta ma hiwe ọrụ nke a;

8 Ma onweghị onye ọbụla ga-enye aka n’ọrụ a m’ọbụghị ma ọ dị aumeala ma jupụtakwa bn’ịhụ n’anya, nwee cokwukwe, dolile-anya, na eafọ-ọma, nwee anya udo n’ihe nile, ihe ọbụla a ga-enyefe n’aka ya.

9 Lee, a bụ m ìhè ahụ na ndụ nke ụwa, nke na-ekwu okwu ndị a, ya mere gee-ntị n’ike gị nile ma mgbe ahụ gị ka-akpọrọ. Amen.