Nkeji 101
Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 16 Disemba 1833 (History of the Church, 1:458–464). N’oge nke a, ndị nsọ ndị gbakọworo na Missouri nọ na-ata ahụhụ oke mkpagbu. Ndị Ọgba-aghara a chụpụwo ha site n’ebe obibi ha nile na Ógbè Jackson; ma ụfọdụ ndị nsọ ahụ achọwo ihiwe onwe ha na Ógbè Van Buren, mana mkpagbu sochiri ha. Isi Ọgbakọ nke Ndị-nsọ n’oge ahụ di na Ógbè Clay, Missouri. Mmaja-ọnwụ megide ndị otu nke Nzukọ-nsọ kariri akarị. Ndị mmadụ tufuru ngwo-ngwo ụlọ ha nile, uwe, anụ-ụlọ ha nile, na arịa nke aka ha ndị ọzọ ebe ebibisiri mkpụrụ akụkụ ha nile.
1–8, Ndị nsọ nile ka a tara ahụhụ ma nye nsogbu n’ihi njehie ha nile; 9–15, Iwe-ọku nke Onye-nwe ga-adakwasị mba nile, mana ndị nke Ya, ka a ga-akpọkọta ma kasie obi; 16–21, Zaịọn na stek ya nile ka a ga-ehiwe; 22–31, udi obibi ndụ n’oge Jisus ga-abia n’uwa chia otu puku afọ ka akọwara; 32–42, Ndị nsọ nile ka a ga-agọzi ma kwụọ ụgwọ-ọrụ mgbe ahụ; 43–62, Ilu nke ọgaranya ahụ na osisi olive nile gosipụtara ihe nsogbu nile na mgbapụta ikpe-azụ nke Zaịọn; 63–75, Ndị nsọ nile ga-aga n’iru na-agbakọta otu ebe; 76–80, Onye-nwe hiwere Akwụkwọ iwu nke United States; 81–101, Ndị nsọ nile ga-arịọ arịrịọ ka akwụghachi ihe ọjọọ nile dị ka ilu nke nwanyị ahụ na onye-ikpe ahụ na-ekpe ikpe n’ezighi ezi.
1 N’ezie a si m unu, gbasara ụmụnna unu ndị esogbuworo na ndị nwetara mkpagbu, na nchụpụ achụpụrụ ha site n’ala nke ihe nketa ha—
2 Mu, Onye-nwe, kwenyere ka mkpagbu nke a bịakwasi ha, nke ejiworo sogbue ha, maka njehie ha nile;
3 Otu ọ dị, ha ga-abụ nke m, m ga-enwekwa ha n’ụbọchị ahụ mgbe m ga-abia ịhọzu ọla-ịchọ mma m nile.
4 Ya mere, o kwesịrị ịta ha ahụhụ ma nwalee ha, ọbụna dika Abraham, onye e nyere iwu ka o nye nwa ya nwoke ọ mụrụ nanị ya.
5 N’ihi ndị nile n’agaghị anagide ịta ahụhụ, ma gọnari m, enweghi ike ịbụ ndị edoro nsọ.
6 Lee, a si m unu, enwere ịkwa emo nile, na ndọrọ-ndọrọ nile, na ntaji anya nile, na esem-okwu nile na agụụ anụ arụ na anya ukwu n’etiti ha; ya mere site n’ihe ndị a ha meruru ihe nketa ha nile.
7 Ha emeghị ngwa n’in̄a nti nye olu Onye-nwe Chineke ha; ya mere Onye-nwe ha Chineke emeghị ngwa n’in̄a nti na-ekpere ha nile, iza ha n’ụbọchị nke nsogbu ha.
8 N’ụbọchị nke udo ha, ha weere ndụmọdụ nke m ihe efu; mana, n’ụbọchị nke nsogbu ha, n’ihi mkpa, ha enwee mmetuta gbasoo m.
9 N’ezie a si m unu, na-agbanyeghị mmehie ha nile, afọ m nile juputara n’ọmiko n’ebe ha nọ. Agaghị m achụpụcha ha kpam kpam, ma n’ụbọchị nke oke iwe a ga m echeta ebere.
10 An̄uwo m iyi, ma iwu ọkụ ahụ apụwo site na iwu nsọ nke m nyeworo unu, na m ga-ekwe ka ọ daa bụ mma agha nke oke iwe m n’aha ndị nke m; ma ọbụna dịka m kwuworo, ọ ga-abia na mmezu.
11 Iwe ọkụ nke m ga-awụpụ n’oge na-adịghị anya, n’enweghi atụ, n’elu mba nile; ma nke a ka m ga-eme mgbe iko nke ajọ omume ha juru.
12 Ma n’ụbọchị ahụ ndị nile ahụrụ n’elu ụlọ-nche ma-ọbụ n’okwu ọzọ, Israel nke m nile, ka a ga-azọpụta.
13 Ma ha ndị ekposasiworo ka a ga-ekpokọta.
14 Ma ha nile ndị ruworo uju ka-aga akasi obi.
15 Ma ha nile ndị nyeworo ndụ ha n’ihi aha m ka a ga-ekpuwe okpu-eze.
16 Ya mere, ka akasie unu obi gbasara Zaịọn; n’ihi anụ arụ nile nọ n’aka m; dere duu ma mata na a bụ m Chineke.
17 Zaịọn agaghị abụ ihe ewepụrụ n’ọnọdụ ya, na-agbanyeghị n’ekposasịrị ụmụ ya.
18 Ndị ha, ndị fọdụrụ, ma dị kwa ọcha n’obi, ga-alọta ma bịakute ihe nketa ha nile, ha na ụmụ ha, jiri abụ nile nke ọn̄ụ mgbe nile na-adigide, iwulite nkpọnkpọ ebe nile nke Zaịọn—
19 Ma ihe ndị a nile bụ ka e mezue ihe nile ndị amụma kwuru.
20 Ma, lee, onweghị ebe ọzọ a họputara karia nke ahụ m họpụtaworo, ọ bụghi ma n’aga-enwe ebe ọzọ a họpụtara karia nke ahụ m họpụtara maka ọrụ nke mkpọkọta nke ndị nsọ m nile—
21 Ruo mgbe ụbọchị ahụ ga-abia mgbe a na-agaghị achọta ohere maka ha; mgbe ahụ e nwere m ebe ndị ọzọ nke m ga-ahọpụtara ha, ma a ga-akpọ ha stek nile, maka akwa-mkpuchi nile ma-ọbụ ike nke Zaịọn.
22 Lee, ọ bụ uche m ka ha nile ndị na-akpọku aha m, ma na-akpọ isiala nye m dịka ozi-ọma mgbe nile na-adigide siri dị, ga-agbakọta, ma guzo n’ebe nsọ nile.
23 Ma jikere maka mkpughe nke ga-abia, mgbe akwa-mgbochi nke mkpuchi temple, n’ime ụlọ-nzukọ m, nke zoro ụwa, ka aga ewepu, ma anụ arụ nile ga-ahụzu m n’otu.
24 Ma ihe nile nke rere ure, ma nke mmadụ, ma-ọbụ anụ ọhịa nile, ma-ọbụ anụ ufe nile nke elu-igwe, ma-ọbụ azụ nile nọ na osimiri, nke bi, n’iru elu ụwa nile ahụ, ka a ga-erepịa.
25 Na kwa akọrọngwa di n’ime ya ga-agbaze site n’oke okpomọkụ ma ihe nile ga-aghọ ihe ọhụrụ, ka ọmụma ihe m na ebube m nọrọ n’elu ụwa nile.
26 Ma n’ụbọchị ahụ ịkpọ asi nke mmadụ, na ịkpọ asi nke anụmanụ nile, e, ịkpọ asi nke anụ arụ nile ga-akwụsị idi n’iru m.
27 Ma n’ụbọchị ahụ ihe ọbula nke onye ọbula ga-arịọ, a ga-enye kwa ya.
28 Ma n’ụbọchị ahụ Setan a gaghị enwe ike ịnwa mmadụ ọbụla ọnwụnwa.
29 Ma agaghị enwe kwa iri uju n’ihi na ọnwụ adịghịkwa.
30 N’ụbọchị ahụ nwata agaghị kwa anwụ ruo mgbe ọ kara nka; ma ndụ ya ga-adị dị ka afọ nke osisi;
31 Ma mgbe ọ nwụrụ ọ gaghị arahụ-ụra, nke ahụ bụ ka asi n’ime ala, mana a ga-agbanwe ya n’otu ntabi anya, ma aga-ewelikọ ya, ma izu-ike ya ga-adị ebube.
32 E, n’ezie a si m unu, n’ụbọchị ahụ mgbe Onye-nwe ga-abia, ọ ga-ekpughe ihe nile—
33 Ihe nile ndị gara aga, na ihe nzuzo nile nke n’enweghi onye ma ha, ihe nile nke ụwa, nke e jiri kee ya ma ebum-n’obi na ọgwụgwụ nke ya—
34 Ihe nile dị oke ọnụ-ahịa, ihe nile dị n’elu, na ihe nile dị n’okpuru, ihe nile dị n’ime ụwa, na n’elu ụwa na n’ime elu-igwe.
35 Na ha nile ndị esogburu n’ihi aha m, ma ha anọgide n’okwukwe, ọ bụ ezie n’akpọrọ ha ịtọgbọ ndụ ha n’ihi m, otu ọ dị, ha ga-eketa oke n’ebube nke a nile.
36 Ya mere, atụla ụjọ ọbuna ruo n’ọnwu, n’ihi n’ime ụwa nke a ọn̄ụ unu ezughị oke ma n’ime m ọn̄ụ unu zuru oke.
37 Ya mere, enwela nchekasi maka arụ ahụ, ma-ọbụ ndụ nke arụ, mana nwee nchekasi maka mkpụrụ obi ahụ, ma n’ihi ndụ nke mkpụrụ obi ahụ.
38 Ma chọọ iru nke Onye-nwe oge nile, ka n’ime ndidi, ka unu nweta mkpụrụ obi unu nile, na unu ga-enweta ndụ ebighi-ebi.
39 Mgbe a kpọrọ ndị mmadụ n’ozi-ọma mgbe nile na-adigide nke m, ma jiri ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide, ha ka a ga-agụ ka nnu nke ụwa na ụtọ nke mmadụ;
40 Ha ka akpọrọ ịbụ ụtọ nke mmadụ; ya mere, ọ bụrụ nnu ahụ nke ụwa etufuo ụtọ ya, lee, ọ dịghị kwa sịte mgbe ahụ ihe ọ di mma ya nani ka atụfuo ya na ka ndị mmadụ na-azọ ya ụkwụ;
41 Lee, n’ebe a ka amamihe dị, gbasara ụmụ nke Zaịọn, ọbụna ọtụtụ, mana ọbụghị ha nile, a chọpụtara ha ndị mmehie, ya mere a garịrị ịta ha ahụhụ—
42 Onye nke n’ebulite onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye nke n’ewedata onwe ya a ga-ebuli ya elu.
43 Ma ugbụ a, a ga-egosi unu otu ilu, ka unu wee mara uche m gbasara mgbapụta nke Zaịọn.
44 Otu ọgaranya nwoke nwere otu mpekele ala nke mara mma; ma ọ sịrị ndị odibo ya: gaa nụ n’ubi vine m, ọbụna n’elu ala nke a mara mma, ma kụọ osisi olive iri na abụọ;
45 Ma dota ndị nche gburugburu ha, ma wuo ụlọ-elu tọwa, ka otu onye legide ala nke nọ gburugburu. Ka onye nche nọ n’elu n’ụlọ nche legide anya ka aghara ịgbaji osisi olive nke m mgbe onye iro ahụ ga-abia imebi ma were mkpuru nke ubi vine nke m.
46 Ugbụ a, ụmụ odibo ọgaranya nwoke ahụ pụrụ ma mee ka onye-nwe ha nyere ha n’iwu, ma kụọ ọtụtụ osisi olive, ma wuo ọgba gburugburu, ma tinye ndị nche, ma malite iwu ụlọ-elu tọwa.
47 Ma mgbe ha nọrịị na ntọ-ala ya, ha malitere na-asị n’etiti onwe ha. Olee mkpa onye-nwe nwere maka ụlọ-elu tọwa nke a?
48 Ma ha tụgharịrị uche ogologo oge, na-asi n’etiti onwe ha. Mkpa gịnị ka onye-nwe nwere maka ụlọ-elu tọwa nke a, ebe oge a bụ nke udo?
49 E nweghị ike iwere ego a tinye n’aka ndị na-agbanwe ego? N’ihi na enweghi mkpa maka ihe ndị a.
50 Ma mgbe ha nọ n’enweghi nkwekọrịta n’etiti ha, ha ghọrọ ndị ume-ngwụ, ma ha egeghị kwa ntị n’iwu-nsọ nile nke onye-nwe ha.
51 Ma onye-iro ahụ biara n’abali ma kwatue ọgba ahụ; ma ndị odibo, nke ọgaranya nwoke ahụ bilitere n’ụjọ ma gbafue. Ma onye-iro ahụ bibisiri ọrụ ha nile, ma kwatue osisi olive nile ahụ.
52 Ugbụ a, lee, ọgaranya nwoke ahụ, onye-nwe ubi vine, kpọrọ ụmụ odibo ya, ma si ha, Gịnị! Olee ihe kpatara oke ihe ọjọọ nke a?
53 Unu ekwesighi ime ọbụna dị ka m nyere unu n’iwu, na—mgbe unu kụsịrị ubi vine ahụ, ma wuo ọgba ahụ gburugburu, na tinye ndị nche na mgbidi ya nile ebe ahụ—wuo kwa ụlọ-elu tọwa, ma dota onye nche n’ụlọ-elu tọwa ahụ, ma lekọta ubi vine m, na ghara ịrahụ ụra, eleghị anya onye-iro ahụ abiakute unu?
54 Ma lee, onye nche ahụ nọ n’elu ụlọ-elu tọwa gaara ahụ onye iro ahụ mgbe ọ nọ n’ebe dị anya; ma mgbe ahụ unu gaara-adi na njikere ma kwusị onye iro ahụ site n’ikwatu ọgba ahụ, ma zọpụta ubi vine m n’aka onye mbibi ahụ.
55 Ma onye-nwe ubi vine ahụ sịrị otu n’ime ndị odibo ya. Gaa ma chikọta ndị fọdụrụ n’ime ụmụ odibo m, ma were ume nile nke ụlọ m, nke bụ ndị ọlụ agha m, ụmụ okorọbịa m, na ndị dimkpa n’ime ndị odibo m nile, ndị bụ ume nke ụlọ m, ewezuga ndị ahụ nanị m họpụtara ka ha nọrọ;
56 Ma gaa nụ ugbụ a n’ala nke ubi vine m ahụ, ma gbapụta ubi vine m, n’ihi ọ bụ nke m; a zụtawo m ya n’ego.
57 Ya mere, gaa nụ ugbụ a banye n’ala m; kwatue mgbidi nile nke ndị iro m; kụda ụlọ-elu tọwa ha, ma chụpụsia ndị nche ha—
58 Ma ọbụrụraa na ha a kpọkọta n’otu megide unu, bọọrọ m ọbọ nke ndị iro m, ka n’oge na-adịghị anya a ga m abia mụ na ndị fọdụrụ n’ụlọ m, ma nwere ala ahụ.
59 Ma nwa odibo ahụ sịrị onye-nwe ya: Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ?
60 Ma ọ sịrị nwa odibo ya: Mgbe m chọrọ; gaa nụ ugbụ a, ma mee ihe nile dịka m nyere unu n’iwu;
61 Ma nke a ga-abụ ihe nrachi m na ngọzi nye gị—onye-ọrụ maara ihe ma kwesi ntụkwasị-obi n’ime ụlọ nke m, onye ọchịchị n’ala eze nke m.
62 Ma nwa odibo ya gara otu mgbe ahụ, ma mee ihe nile ọbụla, dịka onye-nwe ya nyere ya n’iwu; ma mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ihe nile mezuru.
63 Ọzọ, n’ezie a si m unu, a ga m egosi unu amamihe n’ime m gbasara Nzukọ-nsọ nile, ọ bụrụ na ha nọ na njikere ka e duzie ha n’ụzọ ziri ezi ma di mma maka nzọpụta ha—
64 Ka ọrụ ahụ nke mkpọkọta n’otu nke ndị nsọ m wee gaa n’iru na-agan’iru, ka m wee nwe ike wulie ha elu nye aha m, n’ebe dị nsọ nile; n’ihi oge owuwe ihe ubi a bịawo, ma okwu m kwesịrị imezu.
65 Ya mere, aghaghị m ikpọkọta ndị m otu ebe, dịka ilu nke ata nile na ọka, ka echekwaa ọka n’ime ọba ọka nile inweta ndụ ebighi-ebi; ma e jiri ebube nke selestịal kpube ya okpu, mgbe m ga-abịa n’ala eze nke nna m inyeghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri di.
66 Ebe a ga-ekekọta ata nile ahụ n’ukwu, e mesie edebe ha iche, ka ha wee ree n’ime ọkụ anapụghi imenyụ emenyu.
67 Ya mere, iwu-nsọ ka m na-enye nzukọ-nsọ nile, ka ha gaa-n’iru na-agbakọta na n’otu ebe nile nke m họpụtara.
68 Otu o sila dị, dịka m kwuworo nye gị na iwu-nsọ mgbe mbu, ka mgbakọ unu ghara ị bụ ọsọ ọsọ, ma-ọbụ site na mgbapụ; kama ka akwado ihe nile n’iru unu.
69 Ma ime ka-akwado ihe nile n’iru unu, debe iwu-nsọ ahụ nke m nyeworo gbasara ihe ndị a nile—
70 Nke sịrị, ma-ọbụ kuzie, ka azụta ala nile n’ego, ndị e nwere ike ịzụta n’ego, n’ime mpaghara nile gbaa gburu-gburu ala ahụ nke m họpụtara ị bụ ala nke Zaịọn, maka mmalite nke mkpọkọta nke ndị nsọ m nile.
71 Ala nile enwere ike ịzụta na ógbè Jackson, n’obodo nile gbaa-gburu-gburu, ma hapụ nke fọdụrụ n’aka m.
72 Ugbụ a, n’ezie a sị m unu, ka nzukọ-nsọ nile wekọta ego ha nile otu ebe; ka e mee ihe ndị a nile n’oge ha, mana ọbụghị ọsọ ọsọ; ma hụkwa na enwetara ihe nile akwadoro n’iru unu.
73 Ma ka ahọpụta ndị nile a maara aha ha, ọbụna ndị nwere uche, ma zipụ ha ịzụta ala ndị a nile.
74 Ma nzukọ-nsọ nile nọ na mba ọwụwa anyanwụ nile, mgbe ewusiri ha, ọ bụrụ na ha ga-ege nti na ndụmọdụ nke a, ha nwere ike zụọ ala nile ma gbakọta na ha, ma site otu a ha enwee-ike hiwe Zaịọn.
75 E nwere ọbụna ugbụ a ihe akwadoro zuru oke, e ọbụna maa ụma, ịgbapụta Zaịọn, ma hiwe mkpọ mkpọ ebe ya nile, a gaghị akwatu ya ọzọ, ma-asị na nzukọ-nsọ nile, ndị kpọrọ onwe ha n’aha m, chọrọ ịn̄a nti n’olu m.
76 Ma ọzọ a sị m unu, ndị ahụ ndị-iro ha kposasịrị, ọ bụ uche m ka ha gaa-n’iru ịrịo maka ndozi, na mgbapụta, site n’aka ndị ahụ etinyere dịka ndị ọchịchị na-achị ha—
77 Dịka iwu nile na akwụkwọ iwu nke ndị mmadụ, nke m kweworo ka ehiwe, ma kwesi ka akwado ya maka oke ruru-onye na nchekwa nke anụ arụ nịle, dịka ụkpụrụ nile ziri ezi na dị nsọ;
78 Ka onye ọbụla jee ije na ozizi na ụkpụrụ metụtara ọdị n’iru dịka ohere ịhọrọ n’etiti mma na njọ nke m nyeworo ya, ka onye ọbụla nwee-ike ịzara onwe ya maka mmehie ya nile n’ụbọchị nke ikpe.
79 Ya mere, ọ dịghị mma ka mmadụ ọbụla nọrọ n’agbụ, otu onye nye ibe ya.
80 Ma n’ihi ebum n’obi nke a, ka m jiri hiwe akwụkwọ iwu nke obodo nke a, site n’aka ndị nwere uche, ndị m welitere maka ebum n’obi nke a, ma gbapụta ala ahụ site na nkwafu ọbara.
81 Ugbụ a, gịnị ka m ga-eji atụnyere ụmụ nke Zaịọn? A ga m atụnyere ha ka ilu nke nwanyị na onye ọka-ikpe ahụ na-ekpe ikpe n’ezighi ezi, n’ihi na mmadụ kwesịrị i nọ n’ekpere oge nile ma ghara ịda mba, nke sịrị—
82 E nwere n’otu obodo onye ọka ikpe nke na-anaghi atụ egwu Chineke, ọbụghị ma ọ na-asọpụrụ mmadụ.
83 Ma e nwere otu nwanyị isi-mkpe n’obodo ahụ, ma ọ bịakutere ya, na-asị, bọọ-rọm ọbọ nke onye-iro m.
84 Ma ọ chọghi ime ya na mbụ, mana emesịa ọ sịrị n’onwe ya: Ọ bụ ezie na-adịghị m atụ-egwu Chineke, ma-ọbụ nwee nsọpụrụ ebe mmadụ nọ, ma n’ihi na nwanyị nke a di ya nwụrụ na-esogbu m, a ga m abọrọ ya ọbọ, ma ọbụghị otu a, site na ọbịbịa ya mgbe na mgbe ọ ga-eme ka ike gwụ m.
85 Otu a ka m ga-eji atụnyere ụmụ nke Zaịọn.
86 Ka ha rịọ n’ụkwụ onye ọka-ikpe ahụ.
87 Ma ọ bụrụ na o geghị ha nti, ka ha rịọ n’ụkwụ nke aka na-achị obodo ahụ,
88 Ma ọ bụrụ onye na-achị obodo e geghị ha nti, ka ha rio n’ụkwụ nke onye-isi ala;
89 Ma ọ bụrụ na onye-isi-ala e geghị ha nti, mgbe ahụ ka Onye-nwe ga-ebili ma pụta site n’ebe nzuzo ya, na n’iwe siri ike nke ya, Ọ ga-ewesi mba ahụ iwe;
90 Na n’iwe ya dị ọkụ, na n’ime ọnụma ya, n’oge nke ya, ọ ga-egbuchapụ ndị ajọ omume ahụ, n’ekwesighi ntụkwasị obi, na ndị ọrụ n’ekpe ikpe n’ezighi ezi, ma họpụtara ha oke ha n’etiti ndị iru-abụọ, na ndị n’ekweghị ekwe;
91 Ọbụna n’oke ọchịchịrị ebe e nwere oke ịkwa-akwa, na iri uju, na ịta-ikikere eze.
92 Kpee nụ ekpere, ya mere, ka nti ha nile wee mepee nụrụ akwa nile unu, ka m nwee obi-ebere nye ha, ka ihe nile ụdị a ghara ịdakwasị ha.
93 Ihe m kwuworo nye unu, ahaghị ịbụ, ka mmadụ nile ghara inwe ngọpụ.
94 Ka ndị amamihe na ndị ọchịchị wee nụrụ ma mara ihe nke ha n’echetabeghi;
95 Ka m wee gaa n’iru iweta na mmezu omume m nke bụ ahụrụ mbụ, ma ruo ọrụ m, ọrụ bụ ahụrụ mbụ, ka ndị mmadụ mara ihe di iche site na onye ezi omume na onye ajọọ-omume, ka Chineke unu kwuru.
96 Ma ọzọ, a si m unu, o megidere iwu-nsọ m na uche nke m ka nwa odibo m Sidney Gilbert ga-ere ụlọ-aku m, nke m họpụtaworo nye ndị m, nye n’aka ndị-iro m.
97 Ekwela ka nke ahụ m họpụtaworo wee bụrụ ihe emerụrụ site n’aka ndị-iro m, sitekwa na nkwekọrịta nke ndị ahụ ndị kpọrọ onwe ha n’aha m;
98 N’ihi nke a bụ nnukwu mmehie ruru-inyi megide m, ma megide ndị m, n’ihi ihe ndị ahụ nile nke m nyeworo n’iwu ọkụ, na nke na-aga ịdakwasị mba nile.
99 Ya mere ọ bụ ụche m ka ndị m nara na jịdekwa nke ahụ m họpụtara nye ha, ọ bụ ezie na-agaghị ekwe ha biri ebe ahụ.
100 Otu o sila di, asighi m na ha agaghị ebiri ebe ahụ; n’ihi ọ bụrụ na ha-amịpụta mkpụrụ na ọrụ nile kwesịrị ala-eze nke m ha ga-ebi ebe ahụ.
101 Ha ga-ewu ụlọ ma onye ọzọ agaghị eketa ya; ha ga-akọ ubi vine, ma ha ga-eri mkpụrụ si na ya. Ọbụna otu a. Amen.